< איוב 19 >
עד-אנה תוגיון נפשי ותדכאונני במלים | 2 |
“Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ata m ahụhụ? Ruo ole mgbe ka unu ga-ewere okwu ọnụ unu zọpịa m?
זה עשר פעמים תכלימוני לא-תבשו תהכרו-לי | 3 |
Ugboro iri ndị a ka unu kọcharala m, ihere adịghị eme unu na unu na-ebuso m agha?
ואף-אמנם שגיתי אתי תלין משוגתי | 4 |
A sịkwarị na m bụ onye mmehie, ọ bụ naanị mụ onwe m ka ọ gbasara.
אם-אמנם עלי תגדילו ותוכיחו עלי חרפתי | 5 |
Ọ bụrụ na unu na-ebuli onwe unu elu karịa m, ma were ọnọdụ ịdị ala m megide m,
דעו-אפו כי-אלוה עותני ומצודו עלי הקיף | 6 |
mgbe ahụ, maranụ na Chineke emejọọla m, were ụgbụ ya tụọ m gburugburu.
הן אצעק חמס ולא אענה אשוע ואין משפט | 7 |
“Ọ bụ ezie na m na-eti mkpu akwa sị: ‘A na-emejọ m.’ Ma ọ dịghị ọsịsa m na-anata; ọ bụ ezie na m na-eti mkpu ka e nyere m aka ma ikpe ziri ezi adịghị.
ארחי גדר ולא אעבור ועל נתיבותי חשך ישים | 8 |
Ọ nọchiela ụzọ m ka m ghara ịgafe; o jirila ọchịchịrị kpuchie ụzọ m.
כבודי מעלי הפשיט ויסר עטרת ראשי | 9 |
O yipụla m ugwu m, wepụkwa okpueze m kpu nʼisi.
יתצני סביב ואלך ויסע כעץ תקותי | 10 |
Ọ na-eti m ihe otiti nʼakụkụ niile, ruo mgbe m gabigara; ọ na-ehopu olileanya m dịka osisi.
ויחר עלי אפו ויחשבני לו כצריו | 11 |
Iwe ya dị ọkụ megide m; ọ na-agụnyekwa m dịka onye iro ya.
יחד יבאו גדודיו--ויסלו עלי דרכם ויחנו סביב לאהלי | 12 |
Ndị agha ya ji ike na-abịa; ha ewuola mgbidi were nnọchibido m ha agbaala ụlọ ikwu m gburugburu imegide m.
אחי מעלי הרחיק וידעי אך-זרו ממני | 13 |
“O meela ka ụmụnne m na ndị enyi m si nʼebe m nọ pụọ.
חדלו קרובי ומידעי שכחוני | 14 |
Ndị ikwu m anaghị etinyekwa uche nʼihe banyere m; ndị ezi enyi m niile echefuola m.
גרי ביתי ואמהתי לזר תחשבני נכרי הייתי בעיניהם | 15 |
Ndị ọbịa nọ nʼụlọ m na ndị odibo m nwanyị na-agụ m dịka onye ala ọzọ; adị m ka onye mba ọzọ nʼebe ha nọ.
לעבדי קראתי ולא יענה במו-פי אתחנן-לו | 16 |
Ana m akpọ odibo m oku ma ọ dịghị aza m, ọ bụladị mgbe m jiri ọnụ m rịọ ya.
רוחי זרה לאשתי וחנתי לבני בטני | 17 |
Iku ume m abụrụla ihe nwunye m apụghị ịnagide; abụrụla m ihe arụ nye ụmụnne m.
גם-עוילים מאסו בי אקומה וידברו-בי | 18 |
Ọ bụladị ụmụntakịrị nwoke na-akwa m emo; ha na-ejikwa m eme ihe ọchị mgbe ọbụla m pụtara.
תעבוני כל-מתי סודי וזה-אהבתי נהפכו-בי | 19 |
Ndị ahụ m kpọrọ ndị enyi ọma m na-ele m anya dịka m bụ ihe arụ; ndị ahụ niile m hụrụ nʼanya echigharịakwala megide m
בעורי ובבשרי דבקה עצמי ואתמלטה בעור שני | 20 |
Abụ m naanị ọkpụkpụ ọkpụkpụ; ihe m ji gbanarị ọnwụ adịghị ukwuu.
חנני חנני אתם רעי כי יד-אלוה נגעה בי | 21 |
“Meerenụ m ebere, ndị enyi m, meerenụ m ebere, nʼihi na aka Chineke na-emegide m.
למה תרדפני כמו-אל ומבשרי לא תשבעו | 22 |
Gịnị mere unu ji achụ m dịka Chineke si achụ m? Ọ ga-abụ na ahụhụ m ejubeghị unu afọ?
מי-יתן אפו ויכתבון מלי מי-יתן בספר ויחקו | 23 |
“Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na e dekọrọ okwu m nʼakwụkwọ,
בעט-ברזל ועפרת-- לעד בצור יחצבון | 24 |
na e ji mkpisi igwe dee ha, maọbụ kakwasị ha nʼelu mbadamba nkume ruo mgbe ebighị ebi.
ואני ידעתי גאלי חי ואחרון על-עפר יקום | 25 |
Amara m na onye mgbapụta m na-adị ndụ, amakwaara m na ọ ga-eguzo nʼelu ụwa nʼoge ikpeazụ.
ואחר עורי נקפו-זאת ומבשרי אחזה אלוה | 26 |
Mgbe e mebisikwara akpụkpọ ahụ m, ma nʼanụ ahụ m aga m ahụ Chineke.
אשר אני אחזה-לי--ועיני ראו ולא-זר כלו כליתי בחקי | 27 |
Mụ onwe m ga-eji anya m abụọ hụ ya, mụ onwe m, ọ bụghị onye ọzọ. Lee ka obi m si anụ ọkụ nʼime m maka nke a!
כי תאמרו מה-נרדף-לו ושרש דבר נמצא-בי | 28 |
“Ọ bụrụ na unu asị, ‘Anyị ga-emegide ya nʼihi na nsogbu a si nʼaka ya,’
גורו לכם מפני-חרב--כי-חמה עונות חרב למען תדעון שדין (שדון) | 29 |
unu onwe unu kwesiri ịtụ egwu mma agha; nʼihi na iwe ga-ebute ịta ahụhụ nke mma agha, mgbe ahụ, unu ga-ama na ikpe dị.”