< איוב 14 >

אדם ילוד אשה-- קצר ימים ושבע-רגז 1
“Mmadụ nke nwanyị mụrụ nwere ụbọchị ole na ole nke jupụtara na nsogbu.
כציץ יצא וימל ויברח כצל ולא יעמוד 2
Ọ na-awalite dịka okoko osisi, ma kpọnwụọkwa mgbe na-adịghị anya, dịka onyinyo, ọ na-agabiga agabiga.
אף-על-זה פקחת עינך ואתי תביא במשפט עמך 3
Ị na-elegide onye dị otu a anya? Ị ga-akpọ ya ikpe nʼihu gị?
מי-יתן טהור מטמא-- לא אחד 4
Onye pụrụ iwepụta ihe dị ọcha site nʼihe na-adịghị ọcha? Ọ dịghị onye ọ bụ.
אם חרוצים ימיו--מספר-חדשיו אתך חקו עשית ולא יעבר 5
Ị kpebiela ụbọchị ndụ nke mmadụ; ị kabiela ọnụọgụgụ nke ọnwa ya niile, kpaakwa oke ebe ọ na-agaghị agabiga.
שעה מעליו ויחדל-- עד-ירצה כשכיר יומו 6
Nʼihi nke a, wepụ anya gị nʼebe ọ nọ, hapụ ya ka ọ nọọrọ onwe ya ruo mgbe ụbọchị ya ga-ezu dịka onye e goro ọrụ.
כי יש לעץ תקוה אם-יכרת ועוד יחליף וינקתו לא תחדל 7
“Ma olileanya dịịrị osisi; nʼihi na ọ bụrụ na e gbutuo ya, ọ ga-epuchikwa, alaka ọhụrụ ya aghaghị ịwapụtakwa.
אם-יזקין בארץ שרשו ובעפר ימות גזעו 8
A sịkwarị na mgbọrọgwụ ya emeela ochie nʼala, maọbụ na ogwe ya anwụọ nʼaja,
מריח מים יפרח ועשה קציר כמו-נטע 9
mgbe ọbụla mmiri zokwasịrị ya, ọ na-epupụta dịka ihe a kụrụ akụ.
וגבר ימות ויחלש ויגוע אדם ואיו 10
Ma mmadụ na-anwụ, e lie ya; ọ na-ekubikwa ume si otu a gabiga.
אזלו-מים מני-ים ונהר יחרב ויבש 11
Dịka mmiri dị nʼoke osimiri si ata, maọbụ ka mmiri dị nʼiyi si ata nʼoge ọkọchị,
ואיש שכב ולא-יקום עד-בלתי שמים לא יקיצו ולא-יערו משנתם 12
otu a ka mmadụ si e dinaa ma ọ dịghị etetakwa ọzọ; tutu ruo mgbe eluigwe na-agaghị adịkwa; mmadụ ọbụla apụghị i si nʼụra kpọtee ya, agaghị akpọtekwa ha site nʼụra ha.
מי יתן בשאול תצפנני-- תסתירני עד-שוב אפך תשית לי חק ותזכרני (Sheol h7585) 13
“A sị na ị ga-ezo m nʼala mmụọ, na ị ga-ezobe m tutu ruo mgbe iwe gị gabigara. A sị na ị ga-akanyere m oge ma mesịa cheta m. (Sheol h7585)
אם-ימות גבר היחיה כל-ימי צבאי איחל-- עד-בוא חליפתי 14
Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ ga-adị ndụ ọzọ? Ụbọchị niile nke ọrụ ahụhụ m, aga m echere mgbe nnapụta m ga-abịa.
תקרא ואנכי אענך למעשה ידיך תכסף 15
Ị ga-akpọ, aga m azakwa gị, agụụ ọrụ aka gị ga-agụ gị.
כי-עתה צעדי תספור לא-תשמר על-חטאתי 16
Nʼihi mgbe ahụ ị ga-agụ nzọ ụkwụ m niile ọnụ, ma ị gaghị agụkọ mmehie m.
חתם בצרור פשעי ותטפל על-עוני 17
A ga-ekechi njehie m nʼakpa, ị ga-ekpuchi mmehie m.
ואולם הר-נופל יבול וצור יעתק ממקמו 18
“Ma dịka ugwu si erichasi daa, na dịka a na-enupu oke nkume nʼọnọdụ ya,
אבנים שחקו מים-- תשטף-ספיחיה עפר-ארץ ותקות אנוש האבדת 19
dịka mmiri si akwọchasị nkume, na dịka oke mmiri ozuzo si akwazekwa aja ala, otu a ka i si eme ka olileanya mmadụ laa nʼiyi.
תתקפהו לנצח ויהלך משנה פניו ותשלחהו 20
Ị na-egosi ya na ị karịrị ya ike, ma ha na-agabiga; ị na-eme ka ihu ya gbanwee, ma zilaga ya.
יכבדו בניו ולא ידע ויצערו ולא-יבין למו 21
Ọ bụrụ na a na-asọpụrụ ụmụ ha, ha adịghị amata nke a; ọ bụrụkwa na a na-eweda ha nʼala, ha ọ dịghị ahụ ya.
אך-בשרו עליו יכאב ונפשו עליו תאבל 22
Ihe mgbu nke anụ ahụ ya ka ọ na-ama ma na-erukwara naanị onwe ya ụjụ.”

< איוב 14 >