< ירמיה 43 >
ויהי ככלות ירמיהו לדבר אל כל העם את כל דברי יהוה אלהיהם אשר שלחו יהוה אלהיהם אליהם--את כל הדברים האלה | 1 |
Mgbe Jeremaya gwasịrị ndị ahụ niile okwu ahụ Onyenwe anyị Chineke ha ziri ya ka o zie ha,
ויאמר עזריה בן הושעיה ויוחנן בן קרח וכל האנשים הזדים אמרים אל ירמיהו שקר אתה מדבר--לא שלחך יהוה אלהינו לאמר לא תבאו מצרים לגור שם | 2 |
Azaraya nwa Hoshaya, Johanan nwa Kariya na ndị nganga niile nọ nʼebe ahụ, gwara Jeremaya okwu sị ya, “Ọ bụ okwu ụgha ka i kwuru! Onyenwe anyị Chineke anyị ezighị gị ka i kwuo na anyị ekwesighị ịga biri nʼIjipt,
כי ברוך בן נריה מסית אתך בנו--למען תת אתנו ביד הכשדים להמית אתנו ולהגלות אתנו בבל | 3 |
Kama ọ bụ Baruk nwa Neraya na-akwalị gị megide anyị, nʼihi na ọ chọrọ inyefe anyị nʼaka ndị Babilọn ka ha gbuo anyị, maọbụ buru anyị gaa Babilọn dịka ndị a dọtara nʼagha.”
ולא שמע יוחנן בן קרח וכל שרי החילים וכל העם--בקול יהוה לשבת בארץ יהודה | 4 |
Ya mere, Johanan nwa Kariya na ndịisi agha ahụ niile, nakwa ndị mmadụ ahụ niile nupuru isi nʼiwu Onyenwe anyị, jụụ ịnọgide nʼala Juda.
ויקח יוחנן בן קרח וכל שרי החילים את כל שארית יהודה--אשר שבו מכל הגוים אשר נדחו שם לגור בארץ יהודה | 5 |
Kama Johanan nwa Kariya, na ndịisi agha ahụ, duuru ndị ahụ fọdụrụ na Juda pụọ, ha na ndị ahụ si na mba ndị ọzọ dị iche iche, ebe ha gbagara lọta.
את הגברים ואת הנשים ואת הטף ואת בנות המלך ואת כל הנפש אשר הניח נבוזראדן רב טבחים את גדליהו בן אחיקם בן שפן ואת ירמיהו הנביא ואת ברוך בן נריהו | 6 |
Ha duuru ndị ikom niile na ndị inyom niile na ụmụntakịrị niile, na ụmụ ndị inyom eze niile, bụ ndị ahụ Nebuzaradan ọchịagha ndị nche eze Babilọn tinyere na nlekọta Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan na Jeremaya onye amụma na Baruk nwa Neraya.
ויבאו ארץ מצרים כי לא שמעו בקול יהוה ויבאו עד תחפנחס | 7 |
Ya mere, ha nupuru isi nʼebe Onyenwe anyị nọ site nʼịbanye ala Ijipt. Ha jegidere ije ruo nʼobodo Tapanhis.
ויהי דבר יהוה אל ירמיהו בתחפנחס לאמר | 8 |
Mgbe ha nọ na Tapanhis, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya,
קח בידך אבנים גדלות וטמנתם במלט במלבן אשר בפתח בית פרעה בתחפנחס--לעיני אנשים יהודים | 9 |
“Mgbe ndị Juu nọ na-ele gị anya, chịrị ụfọdụ nkume buru ibu nʼaka gị, gaa zoo ha nʼime ụrọ dị na mpụta ihu ụlọ e ji aja ụrọ wuo, nke dị nʼọnụ ụzọ e si abata nʼụlọ Fero dị na Tapanhis.
ואמרת אליהם כה אמר יהוה צבאות אלהי ישראל הנני שלח ולקחתי את נבוכדראצר מלך בבל עבדי ושמתי כסאו ממעל לאבנים האלה אשר טמנתי ונטה את שפרורו (שפרירו) עליהם | 10 |
Mgbe ahụ sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel sịrị, Aga m ezi ozi kpọta ohu m bụ Nebukadneza, eze Babilọn. Aga m edokwasịkwa ocheeze ya nʼelu nkume ndị a m zoro nʼebe a, ọ ga-agbasa ụlọ ndo nke ịbụ eze ya nʼelu ha.
ובאה (ובא) והכה את ארץ מצרים--אשר למות למות ואשר לשבי לשבי ואשר לחרב לחרב | 11 |
Ọ ga-abịa buso Ijipt agha, si otu a mee ka ha nwụọ, bụ ndị ahụ a kwadobere maka ọnwụ, mee ka a dọta ha nʼagha, bụ ndị ahụ a kwadobere na-aga adọta nʼagha; mekwaa ka ha nwụọ site na mma agha bụ ndị ahụ a kwadobere na ha ga-anwụ site na mma agha.
והצתי אש בבתי אלהי מצרים ושרפם ושבם ועטה את ארץ מצרים כאשר יעטה הרעה את בגדו ויצא משם בשלום | 12 |
Ọ ga-esunyekwa ọkụ nʼụlọ ebe a nọ na-efe chi niile nke ndị Ijipt. Ọ ga-esure ụlọ ndị a ọkụ, dọtakwa chi ha niile nʼagha. Dịka onye ọzụzụ atụrụ si ewepụcha igwu site na uwe ya, ọ ga-esikwa otu a wezuga onwe ya nʼudo site nʼIjipt pụọ.
ושבר את מצבות בית שמש אשר בארץ מצרים ואת בתי אלהי מצרים ישרף באש | 13 |
Nʼime ụlọnsọ anyanwụ dị nʼIjipt, ka ọ ga-akwatu ogidi nsọ niile, surekwaa ụlọnsọ niile nke chi dị iche iche nʼIjipt ọkụ.’”