< עזרא 8 >

ואלה ראשי אבתיהם והתיחשם העלים עמי במלכות ארתחשסתא המלך--מבבל 1
Ndị a bụ usoro ọmụmụ ndịisi ezinaụlọ ahụ niile sooro m site na Babilọn laghachi mgbe Ataksekses bụ eze:
מבני פינחס גרשם מבני איתמר דניאל מבני דויד חטוש 2
ndị ikwu Finehaz, Geshọm; ndị ikwu Itama, Daniel; ndị ikwu Devid, Hatush
מבני שכניה מבני פרעש זכריה ועמו התיחש לזכרים מאה וחמשים 3
ndị ikwu Shekanaya; ndị ikwu Parosh, Zekaraya na narị mmadụ na iri ise ndị so ya denye aha ha nʼakwụkwọ.
מבני פחת מואב אליהועיני בן זרחיה ועמו מאתים הזכרים 4
Ndị ikwu Pahat-Moab, Eliehoenai nwa Zerahaya dị narị mmadụ abụọ,
מבני שכניה בן יחזיאל ועמו שלש מאות הזכרים 5
ndị ikwu Zatu, Shekanaya nwa Jahaziel na narị mmadụ atọ so ya.
ומבני עדין עבד בן יונתן ועמו חמשים הזכרים 6
Ndị ikwu Adin, Ebed nwa Jonatan na iri mmadụ ise so ya.
ומבני עילם ישעיה בן עתליה ועמו שבעים הזכרים 7
Ndị sitere nʼikwu Elam, Jeshaya nwa Atalaya, na iri ndị ikom asaa,
ומבני שפטיה זבדיה בן מיכאל ועמו שמנים הזכרים 8
ndị sitere nʼikwu Shefataya, Zebadaya nwa Maikel, na iri ndị ikom asatọ.
מבני יואב עבדיה בן יחיאל ועמו מאתים ושמנה עשר הזכרים 9
Ndị sitere nʼikwu Joab, Ọbadaya nwa Jehiel na narị ndị ikom abụọ na iri na asatọ,
ומבני שלומית בן יוספיה ועמו מאה וששים הזכרים 10
ndị sitere nʼikwu Bani, Shelomit nwa Josifaya na narị ndị ikom na iri isii.
ומבני בבי זכריה בן בבי ועמו עשרים ושמנה הזכרים 11
Ndị sitere nʼikwu Bebai; Zekaraya nwa Bebai na ndị ikom iri abụọ na asatọ,
ומבני עזגד יוחנן בן הקטן ועמו מאה ועשרה הזכרים 12
ndị sitere nʼikwu Azgad, Johanan nwa Hakatan na narị ndị ikom na iri.
ומבני אדניקם אחרנים--ואלה שמותם אליפלט יעיאל ושמעיה ועמהם ששים הזכרים 13
Ndị sitere nʼikwu Adonikam, ndị ikpeazụ, ndị aha ha bụ Elifelet, na Jeuel na Shemaya na iri ndị ikom isii bụ ndị so ha,
ומבני בגוי עותי וזבוד (וזכור) ועמו שבעים הזכרים 14
ndị sitere nʼikwu Bigvai, Utai na Zakua na iri ndị ikom asaa bụ ndị so ha.
ואקבצם אל הנהר הבא אל אהוא ונחנה שם ימים שלשה ואבינה בעם ובכהנים ומבני לוי לא מצאתי שם 15
Akpọkọtara m ha nʼakụkụ osimiri na-erubanye nʼAhava, anyị nọrọ nʼebe ahụ ụbọchị atọ. Mgbe m leruru anya nʼetiti ndị mmadụ zukọrọnụ, ha na ndị nchụaja bịara, a chọpụtara m na o nweghị ọ bụladị otu onye Livayị nọ nʼebe ahụ.
ואשלחה לאליעזר לאריאל לשמעיה ולאלנתן וליריב ולאלנתן ולנתן ולזכריה ולמשלם--ראשים וליויריב ולאלנתן מבינים 16
Mgbe ahụ, ezigara m ozi kpọọ Elieza, Ariel, Shemaya, Elnatan, Jarib, Elnatan, Netan, Zekaraya na Meshulam, ndị bụ ndịisi. Ezikwara m ozi kpọọ Joiarib na Elnatan, bụ ndị maara ihe.
ואוצאה (ואצוה) אותם על אדו הראש בכספיא המקום ואשימה בפיהם דברים לדבר אל אדו אחיו הנתונים (הנתינים) בכספיא המקום--להביא לנו משרתים לבית אלהינו 17
Enyere m ha iwu ka ha gakwuru Ido, onyendu nọ na Kasifia. Agwara m ha ihe ha ga-agwa Ido na ndị Livayị ibe ya, bụ ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ dị na Kasifia, ka ha zite ndị ga-eje ozi ka ha bịakwute anyị maka ụlọnsọ Chineke.
ויביאו לנו כיד אלהינו הטובה עלינו איש שכל--מבני מחלי בן לוי בן ישראל ושרביה ובניו ואחיו שמנה עשר 18
Chineke gosikwara anyị obiọma zitere anyị nwoke a na-akpọ Sherebaya na ụmụ ya, na ụmụnne ya, ndị ọnụọgụgụ ha dị iri na asatọ. Sherebaya bụ nwa Mahali, nwa Livayị nwa Izrel, bụrụkwa nwoke nwere ezi uche.
ואת חשביה--ואתו ישעיה מבני מררי אחיו ובניהם עשרים 19
Chineke sitere nʼikwu Merari zite Hashabaya, na Jeshaya, tinyere ụmụnne ya na ụmụ ha ndị ikom, ndị ọnụọgụgụ ha dị iri ndị ikom abụọ.
ומן הנתינים שנתן דויד והשרים לעבדת הלוים--נתינים מאתים ועשרים כלם נקבו בשמות 20
Ha zitekwara narị abụọ na iri abụọ site na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ. Otu nke Devid na ndịisi ya họpụtara hiwee, maka inyere ndị Livayị aka. E deturu aha ha niile nʼotu nʼotu.
ואקרא שם צום על הנהר אהוא להתענות לפני אלהינו--לבקש ממנו דרך ישרה לנו ולטפנו ולכל רכושנו 21
Nʼebe ahụ, ka m nọ kpọsaa obubu ọnụ nʼakụkụ osimiri Ahava, nʼihi iweda onwe anyị ala nʼihu Chineke anyị, na ịrịọ ya ka o duo anyị, ụmụ anyị na akụ anyị niile, nʼụzọ ziri ezi nʼije anyị, ma nọnyekwara anyị.
כי בשתי לשאול מן המלך חיל ופרשים--לעזרנו מאויב בדרך כי אמרנו למלך לאמר יד אלהינו על כל מבקשיו לטובה ועזו ואפו על כל עזביו 22
Nʼihi na ihere ekweghị m rịọ eze ka o dunyere anyị ndị agha, na ndị na-agba ịnyịnya ga-edu anyị, ichebe anyị nʼụzọ, site nʼaka ndị iro. Nʼihi na anyị agwalarị eze na Chineke, onye anyị na-efe, na-echebe ndị niile na-efe ya; gwakwa ya na oke iwe ya na-adakwasị ndị niile gbakụtara ya azụ.
ונצומה ונבקשה מאלהינו על זאת ויעתר לנו 23
Ya mere, anyị buru ọnụ, kpee ekpere, rịọ Chineke ka o chebe anyị. O chebekwara anyị.
ואבדילה משרי הכהנים שנים עשר--לשרביה חשביה ועמהם מאחיהם עשרה 24
Ahọpụtara m ndị nchụaja iri na abụọ ndị a: Sherebaya, Hashabaya na mmadụ iri ndị ọzọ bụ ụmụnna ha ka ha hụ maka ọlaọcha, na ọlaedo, na efere ọlaedo ahụ, na ihe ndị ọzọ ahụ eze na ndị na-adụ ya ọdụ, na ndịisi ọchịchị ya, na ụmụ Izrel niile nyere maka ụlọnsọ ukwu Chineke anyị.
ואשקולה (ואשקלה) להם את הכסף ואת הזהב ואת הכלים--תרומת בית אלהינו ההרימו המלך ויעציו ושריו וכל ישראל הנמצאים 25
Eji m ihe ọtụtụ tụọ onyinye ọlaọcha na ọlaedo na ihe ndị ọzọ eze, na ndị ndụmọdụ ya, na ndịisi ozi ya, na ndị Izrel nyere maka ụlọnsọ ukwu Chineke.
ואשקלה על ידם כסף ככרים שש מאות וחמשים וכלי כסף מאה לככרים זהב מאה ככר 26
E jiri m ihe ọtụtụ tụnye ha ọlaọcha dị narị talenti isii na iri ise (ya bụ 650), na ngwongwo ọlaọcha dị otu narị talenti (ya bụ 100), na ọlaedo dị otu narị talenti (ya bụ 100).
וכפרי זהב עשרים לאדרכנים אלף וכלי נחשת מצהב טובה שנים--חמודת כזהב 27
Iri efere ọlaedo abụọ nke ọnụahịa ya bụ puku darik, tinyere efere bronz abụọ e hichaziri nke ọma, nke dị oke ọnụahịa dị ka efere ọlaedo.
ואמרה אלהם אתם קדש ליהוה והכלים קדש והכסף והזהב נדבה ליהוה אלהי אבתיכם 28
Emesịa, agwara m ha okwu sị ha, “Lee, unu onwe unu na ihe ndị a niile bụ ihe dị nsọ nye Onyenwe anyị. Ọlaọcha na ọlaedo ndị a bụkwa onyinye afọ ofufu e nyere Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha.
שקדו ושמרו עד תשקלו לפני שרי הכהנים והלוים ושרי האבות לישראל--בירושלם הלשכות בית יהוה 29
Chenụ ha nche, debekwa ha nke ọma, tupu ruo mgbe unu ga-atụ ha nʼihu ndịisi nchụaja, na ndịisi Livayị, na ndịisi ụlọ nke Izrel nʼime Jerusalem, nʼime ụlọakụ nke ụlọ Onyenwe anyị.”
וקבלו הכהנים והלוים משקל הכסף והזהב והכלים--להביא לירושלם לבית אלהינו 30
Ya mere, ndị nchụaja na ndị Livayị kwenyere ibu ọlaọcha na ọlaedo, na ngwongwo ihe nsọ ndị ahụ, buga ha nʼụlọnsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem.
ונסעה מנהר אהוא בשנים עשר לחדש הראשון--ללכת ירושלם ויד אלהינו היתה עלינו ויצילנו מכף אויב ואורב על הדרך 31
Anyị hapụrụ osimiri Ahava nʼụbọchị nke iri na abụọ nke ọnwa mbụ, chee ihu anyị ịga Jerusalem. Chineke nọnyekwaara anyị, dọpụta anyị site nʼaka ndị iro ọbụla, na nʼaka ndị ohi.
ונבוא ירושלם ונשב שם ימים שלשה 32
Nʼikpeazụ, anyị rutere Jerusalem nʼudo, zukwaa ike ụbọchị atọ.
וביום הרביעי נשקל הכסף והזהב והכלים בבית אלהינו על יד מרמות בן אוריה הכהן ועמו אלעזר בן פינחס ועמהם יוזבד בן ישוע ונועדיה בן בנוי--הלוים 33
Nʼụbọchị nke anọ, site nʼoge anyị ruru, e jiri ihe ọtụtụ tụọkwa ọlaọcha na ọlaedo ahụ, ha na ngwongwo ihe nsọ ndị ọzọ ahụ. E mere nke a nʼụlọnsọ ukwu Chineke. Ndị tụrụ ha bụ Meremot nwa Ụraya onye nchụaja, na Elieza nwa Finehaz. Jozabad nwa Jeshua, na Noadaya nwa Binui, ndị Livayị, sokwa tụọ ha.
במספר במשקל לכל ויכתב כל המשקל בעת ההיא 34
Ihe niile zuru ezu dịka ịdị arọ ha si dị. E dekwara ọnụọgụgụ ihe a tụpụtara nʼakwụkwọ nʼoge ahụ.
הבאים מהשבי בני הגולה הקריבו עלות לאלהי ישראל פרים שנים עשר על כל ישראל אילים תשעים וששה כבשים שבעים ושבעה צפירי חטאת שנים עשר הכל עולה ליהוה 35
Emesịa, onye ọbụla nʼime anyị si esi lọta chụụrụ Chineke Izrel aja nsure ọkụ. E ji oke ehi iri na abụọ chụọ aja maka ebo Izrel niile, ya na iri ebule itoolu na isii, na iri ụmụ ebule asaa na asaa. Ma e ji mkpi iri na abụọ chụọ aja mmehie. E jichakwa ha niile chụọ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
ויתנו את דתי המלך לאחשדרפני המלך ופחוות עבר הנהר ונשאו את העם ואת בית האלהים 36
E nyere ndịisi ọrụ eze niile, na ndịisi ọchịchị niile dị nʼofe ọdịda anyanwụ osimiri Yufretis akwụkwọ iwu ahụ eze nyere. Ndịisi a nyekwara aka nʼọrụ iwughachi ụlọnsọ Chineke ahụ.

< עזרא 8 >