< עזרא 10 >
וכהתפלל עזרא וכהתודתו בכה ומתנפל לפני בית האלהים נקבצו אליו מישראל קהל רב מאד אנשים ונשים וילדים--כי בכו העם הרבה בכה | 1 |
Mgbe Ezra na-ekpe ekpere, na-ekwupụta mmehie ndị a, na-akwa akwa, na-atụ onwe ya nʼala nʼihu ụlọ Chineke, igwe ndị Izrel dị ukwuu, bụ ndị nwoke, na nwanyị, na ụmụntakịrị gbara ya gburugburu soro ya na-akwa akwa dị ilu.
ויען שכניה בן יחיאל מבני עולם (עילם) ויאמר לעזרא--אנחנו מעלנו באלהינו ונשב נשים נכריות מעמי הארץ ועתה יש מקוה לישראל על זאת | 2 |
Mgbe ahụ, Shekanaya nwa Jehiel, onye agbụrụ Elam, sịrị Ezra, “Anyị emehiela megide Chineke anyị, nʼihi nʼịlụ ndị inyom mba ọzọ ndị gbara anyị gburugburu. Ma otu ọ dị, olileanya ka dịrị ndị Izrel.
ועתה נכרת ברית לאלהינו להוציא כל נשים והנולד מהם בעצת אדני והחרדים במצות אלהינו וכתורה יעשה | 3 |
Ugbu a ka anyị gbaa ndụ nʼihu Chineke anyị, izilaga ndị inyom ndị mba ọzọ ndị a na ụmụ ha dịka ndụmọdụ onyenwe m Ezra, na ndị na-atụ egwu iwu Chineke anyị si dị. Ka e mee ihe ndị a dịka iwu si dị.
קום כי עליך הדבר ואנחנו עמך חזק ועשה | 4 |
Biko, bilie gwa anyị ụzọ anyị ga-esi dozie ihe niile mebiri emebi. Anyị ga-eme ihe i kwuru.”
ויקם עזרא וישבע את שרי הכהנים הלוים וכל ישראל לעשות כדבר הזה--וישבעו | 5 |
Mgbe ahụ, Ezra biliri jụọ ndịisi ndị nchụaja na ndị Livayị, na Izrel niile, ma ha ga-eme ihe Shekanaya kwuru. Ha niile ṅụrụ iyi kwenye na ha ga-eme ya.
ויקם עזרא מלפני בית האלהים וילך אל לשכת יהוחנן בן אלישיב וילך שם לחם לא אכל ומים לא שתה--כי מתאבל על מעל הגולה | 6 |
Mgbe ahụ, Ezra si nʼihu ụlọ Chineke pụọ banye nʼime ọnụụlọ Jehohanan, nwa Eliashib. Mgbe ọ nọ nʼebe ahụ, o righị nri ọbụla, ọ ṅụghị mmiri ọbụla, nʼihi na ọ nọgidere na-eru ụjụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi nke ndị si nʼebe a dọtara ha nʼagha lọta.
ויעבירו קול ביהודה וירושלם לכל בני הגולה--להקבץ ירושלם | 7 |
E zisara ozi na Juda na Jerusalem niile na a chọrọ ịhụ ndị niile si esi lọta na Jerusalem.
וכל אשר לא יבוא לשלשת הימים כעצת השרים והזקנים--יחרם כל רכושו והוא יבדל מקהל הגולה | 8 |
Ndịisi na ndị okenye kpebiri na onye ọbụla nke na-abịaghị nʼụbọchị atọ, dịka atụmatụ ha si dị, na a ga-anara onye ahụ akụ niile o nwere, kewapụkwa onye ahụ site na mkpọkọta ndị Izrel e mere ka ha gaa biri nʼala ọzọ.
ויקבצו כל אנשי יהודה ובנימן ירושלם לשלשת הימים הוא חדש התשיעי--בעשרים בחדש וישבו כל העם ברחוב בית האלהים מרעידים על הדבר ומהגשמים | 9 |
Mgbe ụbọchị atọ ahụ zuru, ndị ikom Juda na Benjamin niile zukọrọ na Jerusalem. Nʼụbọchị nke iri abụọ nke ọnwa itoolu, mmadụ niile zukọrọ nọdụ nʼama dị nʼihu ụlọnsọ Chineke. Mmiri dị ukwuu zoro nʼụbọchị ahụ. Ụjọ tụkwara ndị ahụ niile zukọrọ nʼihi oke mmiri ozuzo ahụ na nʼihi okwu ahụ.
ויקם עזרא הכהן ויאמר אלהם אתם מעלתם ותשיבו נשים נכריות--להוסיף על אשמת ישראל | 10 |
Mgbe ahụ Ezra onye nchụaja, biliri ọtọ, sị ha, “Unu emehiela, nʼihi na unu lụrụ ndị inyom mba ọzọ, si otu a tụkwasị ihe nʼikpe ọmụma dịrị Izrel.
ועתה תנו תודה ליהוה אלהי אבתיכם--ועשו רצונו והבדלו מעמי הארץ ומן הנשים הנכריות | 11 |
Ugbu a, sọpụrụnụ Onyenwe anyị, bụ Chineke nna nna unu ha, meekwanụ ihe bụ nzube ya. Kewapụnụ onwe unu site nʼebe ndị mba ọzọ nọ, nakwa ebe nwunye ndị unu si mba ọzọ lụta.”
ויענו כל הקהל ויאמרו קול גדול כן כדבריך (כדברך) עלינו לעשות | 12 |
Nzukọ niile ahụ zara nʼotu olu sị. “Okwu gị ziri ezi, Anyị aghaghị ime dịka i kwuru.”
אבל העם רב והעת גשמים ואין כח לעמוד בחוץ והמלאכה לא ליום אחד ולא לשנים--כי הרבינו לפשע בדבר הזה | 13 |
Ma ha zakwara sị, “Nke a abụghị ihe anyị ga-eme nʼotu ụbọchị maọbụ nʼụbọchị abụọ, nʼihi na aka ọtụtụ mmadụ nʼime anyị dị na mmehie ahụ. Mmiri na-ezosikwa ike, anyị enwekwaghị ike ịnọgide ruo oge dị anya.
יעמדו נא שרינו לכל הקהל וכל אשר בערינו ההשיב נשים נכריות יבא לעתים מזמנים ועמהם זקני עיר ועיר ושפטיה עד להשיב חרון אף אלהינו ממנו--עד לדבר הזה | 14 |
Ka ndịisi anyị guzobe mkpọkọta niile. Ka ndị niile nọ nʼobodo anyị ndị lụrụ nwanyị site na mba ọzọ bịa nʼoge a kara aka, ha na ndị okenye na ndị ikpe nke obodo ọbụla, ruo mgbe oke iwe Chineke banyere okwu a sitere nʼebe anyị nọ pụọ.”
אך יונתן בן עשהאל ויחזיה בן תקוה עמדו על זאת ומשלם ושבתי הלוי עזרם | 15 |
Ma ndị na-ekweghị ka e mee ya otu a bụ naanị Jonatan nwa Asahel na Jazeia nwa Tikva, na Meshulam na Shabetai onye Livayị.
ויעשו כן בני הגולה ויבדלו עזרא הכהן אנשים ראשי האבות לבית אבתם וכלם בשמות וישבו ביום אחד לחדש העשירי לדריוש הדבר | 16 |
Ya mere, ndị ahụ niile si esi lọta, mere dịka mkpebi ahụ si dị. Ezra họpụtara ụfọdụ ndị ikom, ndị bụ ndịisi ezinaụlọ, e si nʼezinaụlọ ọbụla họpụta otu onye. E dekwara aha ndị niile a họpụtara nʼakwụkwọ. Ya mere, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa iri, ndị a malitere inyocha okwu ndị a.
ויכלו בכל--אנשים ההשיבו נשים נכריות עד יום אחד לחדש הראשון | 17 |
Mgbe ọnwa atọ gasịrị, ya bụ, nʼabalị mbụ nke ọnwa mbụ nʼafọ, ha rụchara ọrụ banyere ndị ikom lụrụ ndị inyom mba ọzọ.
וימצא מבני הכהנים אשר השיבו נשים נכריות מבני ישוע בן יוצדק ואחיו--מעשיה ואליעזר ויריב וגדליה | 18 |
A chọpụtara nʼetiti ụmụ ndị nchụaja, na ndị a lụrụ ndị inyom si na mba ọzọ. Ndị si nʼikwu Jeshua nwa Jozadak na ụmụnne ya bụ, Maaseia, Elieza, Jarib na Gedaliya.
ויתנו ידם להוציא נשיהם ואשמים איל צאן על אשמתם | 19 |
Ha niile jikọrọ aka kpebiekwa na ha ga-ezila ndị nwunye ha. Onye ọbụla wetara ebule site nʼigwe atụrụ dịka ihe ikpe ọmụma.
Ndị si nʼikwu Imea bụ Hanani, na Zebadaya.
ומבני חרם--מעשיה ואליה ושמעיה ויחיאל ועזיה | 21 |
Ikwu Harim: Maaseia, Ịlaịja, Shemaya, Jehiel na Uzaya.
ומבני פשחור--אליועיני מעשיה ישמעאל נתנאל יוזבד ואלעשה | 22 |
Ndị si nʼikwu Pashua: Elioenai, Maaseia, Ishmel, Netanel, Jozabad, na Eleasa.
ומן הלוים--יוזבד ושמעי וקליה הוא קליטא פתחיה יהודה ואליעזר | 23 |
Nʼime ndị Livayị: Jozabad, Shimei, Kelaya (onye a na-akpọkwa Kelita), Petahaya, Juda na Elieza.
ומן המשררים אלישיב ומן השערים שלם וטלם ואורי | 24 |
Nʼime ndị na-abụ abụ, Eliashib. Nʼime ndị nche ọnụ ụzọ: Shalum, Telem, na Uri.
ומישראל--מבני פרעש רמיה ויזיה ומלכיה ומימן ואלעזר ומלכיה ובניה | 25 |
Nʼetiti ndị Izrel ndị ọzọ: Site nʼikwu Parosh: Ramaya, Izaya, Malkija, Mijamin, Elieza, Malkija na Benaya.
ומבני עילם--מתניה זכריה ויחיאל ועבדי וירימות ואליה | 26 |
Site nʼikwu Elam: Matanaya, Zekaraya, Jehiel, Abdi, Jeremot na Ịlaịja.
ומבני זתוא--אליועני אלישיב מתניה וירמות וזבד ועזיזא | 27 |
Site nʼikwu Zatu: Elioenai, Eliashib, Matanaya, Jeremot, Zabad na Aziza.
ומבני בבי--יהוחנן חנניה זבי עתלי | 28 |
Site nʼikwu Bebai: Jehohanan, Hananaya, Zabai, na Atlai.
ומבני בני--משלם מלוך ועדיה ישוב ושאל ירמות (ורמות) | 29 |
Site nʼikwu Bani, Meshulam, Maluk, Adaya, Jashub, Sheal na Jeremot.
ומבני פחת מואב עדנא וכלל בניה מעשיה מתניה בצלאל ובנוי ומנשה | 30 |
Site nʼikwu Pahat-Moab, Adna, Kelal, Benaya, Maaseia, Matanaya, Bezalel, Binui, na Manase.
ובני חרם--אליעזר ישיה מלכיה שמעיה שמעון | 31 |
Site nʼikwu Harim: Elieza, Ishija, Malkija, Shemaya, Shimeon,
Benjamin, Maluk na Shemaraya.
מבני חשם--מתני מתתה זבד אליפלט ירמי מנשה שמעי | 33 |
Site nʼikwu Hashum, Matenai, Matata, Zabad, Elifelet, Jeremai, Manase na Shimei.
מבני בני מעדי עמרם ואואל | 34 |
Site nʼikwu Bani, Maadai, Amram, Uel,
בניה בדיה כלוהי (כלוהו) | 35 |
Benaya, Bedeia, Keluhi
Venaya, Meremot, Eliashib
מתניה מתני ויעשו (ויעשי) | 37 |
Matanaya, Matenai na Jaasu.
Site nʼikwu Bani: Binui na Shimei,
Maknadebai, Shashai, Sharai,
Azarel, Shelemaya, Shemaraya,
Shalum, Amaraya na Josef.
מבני נבו--יעיאל מתתיה זבד זבינא ידו (ידי) ויואל בניה | 43 |
Site nʼikwu Nebo: Jeiel, Matitaia, Zabad, Zebina, Jadai, Juel na Benaya.
כל אלה נשאי (נשאו) נשים נכריות ויש מהם נשים וישימו בנים | 44 |
Ndị a niile lụrụ ndị inyom site na mba ọzọ. Ha zilagara ha na ụmụ ha.