< קֹהֶלֶת 3 >

לכל זמן ועת לכל חפץ תחת השמים 1
Ihe ọbụla nwere oge; mgbe dịkwara ihe ọbụla a na-eme eme nʼeluigwe.
עת ללדת ועת למות עת לטעת ועת לעקור נטוע 2
Oge ịmụ nwa na oge ịnwụ anwụ, oge ịkụ ihe na oge ihopu,
עת להרוג ועת לרפוא עת לפרוץ ועת לבנות 3
oge igbu egbu; na oge ịgwọ ọrịa, oge itikpọ na oge iwuzi ewuzi,
עת לבכות ועת לשחוק עת ספוד ועת רקוד 4
oge ịkwa akwa, na oge ịchị ọchị, oge iru ụjụ na oge ite egwu,
עת להשליך אבנים ועת כנוס אבנים עת לחבוק ועת לרחק מחבק 5
oge ikposa nkume na oge ịchịkọta nkume, oge ịbakụ na oge ịkwụsị ịbakụ,
עת לבקש ועת לאבד עת לשמור ועת להשליך 6
oge ịchọ ihe, na oge ntufu, oge ịchịkọba, na oge ichifusi,
עת לקרוע ועת לתפור עת לחשות ועת לדבר 7
oge ndọwasị, na oge ndụkọta, oge ịgba nkịtị, na oge ikwu okwu,
עת לאהב ועת לשנא עת מלחמה ועת שלום 8
oge ịhụnanya na oge ịkpọ asị, oge ibu agha, na oge ime udo.
מה יתרון העושה באשר הוא עמל 9
Gịnị bụ nnọọ ihe mmadụ na-enweta site na ndọgbu niile nke nʼọrụ niile ọ na-arụ?
ראיתי את הענין אשר נתן אלהים לבני האדם--לענות בו 10
Ahụla m ibu arọ nke Chineke bokwasịrị ndị mmadụ e kere eke.
את הכל עשה יפה בעתו גם את העלם נתן בלבם--מבלי אשר לא ימצא האדם את המעשה אשר עשה האלהים מראש ועד סוף 11
O meela ka ihe niile maa mma nʼoge nke ya. O tinyekwala ebighị ebi nʼime obi ndị mmadụ; ma o nweghị ka mmadụ ghọta ọrụ Chineke site na mmalite ruo nʼọgwụgwụ.
ידעתי כי אין טוב בם--כי אם לשמוח ולעשות טוב בחייו 12
Nʼihi ya, ekpebiri m na ihe dịịrị mmadụ ịchọ bụ obi ụtọ na inwe aṅụrị na ndụ ya niile.
וגם כל האדם שיאכל ושתה וראה טוב בכל עמלו--מתת אלהים היא 13
Ihe ọzọ bụ ka mmadụ rie, ṅụọ, ma nwee afọ ojuju na ndọgbu niile ọ na-adọgbu onwe ya, nʼihi na ha bụ onyinye si nʼaka Chineke.
ידעתי כי כל אשר יעשה האלהים הוא יהיה לעולם--עליו אין להוסיף וממנו אין לגרע והאלהים עשה שיראו מלפניו 14
Amaara m na ihe niile Chineke mere na-adịgidekwa. O nweghị ihe apụrụ itinye na ya, o nweghịkwa ihe apụrụ iwepụkwa site na ya. Chineke na-eme nke a ka ndị mmadụ tụọ egwu ya.
מה שהיה כבר הוא ואשר להיות כבר היה והאלהים יבקש את נרדף 15
Ihe ọbụla dị ugbu a, adịlarị na mgbe ochie, ihe ọbụla gaje ịdị dịlarị na mbụ. Chineke na-eme ka ihe niile mere na mgbe gara aga megharịakwa ọzọ.
ועוד ראיתי תחת השמש מקום המשפט שמה הרשע ומקום הצדק שמה הרשע 16
Ọzọkwa, achọpụtara m otu ihe nʼokpuru anyanwụ, na ọnọdụ ezi ikpe naanị mmebi iwu jupụtara, nʼebe e kwesiri inwe ikpe ziri ezi ị ga-achọpụta na ihe ọjọọ dịkwa ya.
אמרתי אני בלבי--את הצדיק ואת הרשע ישפט האלהים כי עת לכל חפץ ועל כל המעשה שם 17
A gwara m onwe m, “Chineke ga-ekpe, ndị ezi omume na ndị ajọ omume ikpe, nʼihi na a ga-enwe oge maka ihe ọbụla a na-eme eme, oge dịkwa maka ikpe ọrụ niile nke mmadụ ikpe.”
אמרתי אני בלבי--על דברת בני האדם לברם האלהים ולראות שהם בהמה המה להם 18
Echere m nʼobi sị, “Ebe mmadụ nọ, Chineke na-anwale ya, ka mmadụ mata na ha dị ka anụmanụ.
כי מקרה בני האדם ומקרה הבהמה ומקרה אחד להם--כמות זה כן מות זה ורוח אחד לכל ומותר האדם מן הבהמה אין כי הכל הבל 19
Nʼihi na ihe na-eche mmadụ na anụmanụ bụ otu. Ha abụọ na-eku ume, ha abụọ na-anwụkwa anwụ. Ọ dịghị ihe mmadụ ji karịa anụmanụ. Ihe niile bụ ihe efu.
הכל הולך אל מקום אחד הכל היה מן העפר והכל שב אל העפר 20
Ha niile na-alaghachi nʼotu ebe; ọ bụ nʼaja ka ha si pụta, ebe ahụ kwa ka ha ga-alaghachi.
מי יודע רוח בני האדם--העלה היא למעלה ורוח הבהמה--הירדת היא למטה לארץ 21
Onye pụrụ iguzo gbaa akaebe na mmụọ mmadụ na-ala nʼelu ma nke anụmanụ na-ala nʼaja?”
וראיתי כי אין טוב מאשר ישמח האדם במעשיו--כי הוא חלקו כי מי יביאנו לראות במה שיהיה אחריו 22
Nʼihi ya, ahụrụ m na ọ dịghị ihe ọzọ ụmụ mmadụ kwesiri ime karịakwa inwe ọṅụ nʼọrụ ha, nʼihi na nke ahụ bụ oke ha nʼebe a. Onye ga-eme ka ha bịaghachi hụ ihe ga-eme nʼazụ ha?

< קֹהֶלֶת 3 >