< דברים 3 >
ונפן ונעל דרך הבשן ויצא עוג מלך הבשן לקראתנו הוא וכל עמו למלחמה--אדרעי | 1 |
Ihe ọzọ bụ na anyị chigharịrị, gbagoo nʼụzọ gawara Bashan. Ma Ọg, eze Bashan, ya na ndị agha ya niile biliri chịrị agha pụta izute anyị nʼagha na Edrei.
ויאמר יהוה אלי אל תירא אתו--כי בידך נתתי אתו ואת כל עמו ואת ארצו ועשית לו--כאשר עשית לסיחן מלך האמרי אשר יושב בחשבון | 2 |
Ma Onyenwe anyị gwara m okwu, sị, “Atụla ya egwu, nʼihi na ewerela m ya na ndị agha ya niile, na ala ya, nyefee gị nʼaka. Mee ya ihe i mere Saịhọn eze ndị Amọrait, onyeisi obodo Heshbọn.”
ויתן יהוה אלהינו בידנו גם את עוג מלך הבשן--ואת כל עמו ונכהו עד בלתי השאיר לו שריד | 3 |
Ya mere, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị nyefere Ọg, eze Bashan na ndị agha ya niile nʼaka anyị. Anyị gbuchapụkwara ha niile, na-ahapụghị onye ọbụla ndụ.
ונלכד את כל עריו בעת ההוא--לא היתה קריה אשר לא לקחנו מאתם ששים עיר כל חבל ארגב ממלכת עוג בבשן | 4 |
Nʼoge ahụ, anyị lụgburu obodo ya. Ọ dịghị obodo ọbụla nʼime iri obodo isii ahụ niile nke anyị na-anaraghị ha, ya bụ akụkụ Agob niile bụ alaeze Ọg nʼime Bashan.
כל אלה ערים בצרת חומה גבהה--דלתים ובריח לבד מערי הפרזי הרבה מאד | 5 |
Obodo ndị a bụ obodo e wusiri ike, nwechara mgbidi dị elu nke ukwuu, nwekwaa ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ha. Anyị lụgbukwara ọtụtụ obodo nta ndị ọzọ, ndị na-enweghị mgbidi.
ונחרם אותם--כאשר עשינו לסיחן מלך חשבון החרם כל עיר מתם הנשים והטף | 6 |
Anyị bibiri ihe niile dị nʼobodo Bashan, dịka anyị mere nʼobodo Saịhọn, eze Heshbọn. Anyị gburu mmadụ niile bi nʼime ha, nwoke, nwanyị, na ụmụntakịrị.
וכל הבהמה ושלל הערים בזונו לנו | 7 |
Ma anụ ụlọ ha niile, na ihe nkwata si nʼobodo ha niile, bụ ihe anyị lụtara nʼagha nye onwe anyị.
ונקח בעת ההוא את הארץ מיד שני מלכי האמרי אשר בעבר הירדן--מנחל ארנן עד הר חרמון | 8 |
Mgbe ahụ, anyị napụrụ ala ahụ site nʼaka eze abụọ ndị Amọrait, ya bụ ala ndị dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Ha dị site na ndagwurugwu Anọn ruo nʼugwu Hemon.
צידנים יקראו לחרמון שרין והאמרי יקראו לו שניר | 9 |
(Aha ndị Saịdọn na-akpọ ugwu Hemon bụ Siriọn, ma ndị Amọrait na-akpọ ya Senia.)
כל ערי המישר וכל הגלעד וכל הבשן עד סלכה ואדרעי--ערי ממלכת עוג בבשן | 10 |
Anyị meriri obodo ndị ahụ niile dị nʼala dị larịị, meriekwa Gilead niile na Bashan, tutu ruo obodo Saleka na Edrei, obodo ndị dị nʼalaeze Ọg, eze Bashan.
כי רק עוג מלך הבשן נשאר מיתר הרפאים--הנה ערשו ערש ברזל הלה הוא ברבת בני עמון תשע אמות ארכה וארבע אמות רחבה--באמת איש | 11 |
(Ọg, eze ndị Bashan bụ naanị onye fọdụrụ ndụ nʼagbụrụ ndị Refaim. E ji igwe kwaa ihe ndina ya, nke ogologo ya dị mita anọ, nke obosara ya bụkwa mita abụọ. Ihe ndina a dị ruo taa nʼobodo Raba, otu nʼime obodo ndị Amọn.)
ואת הארץ הזאת ירשנו בעת ההוא מערער אשר על נחל ארנן וחצי הר הגלעד ועריו--נתתי לראובני ולגדי | 12 |
Mgbe anyị nwetara ala ndị a, eweere m ya nye ndị Ruben, na Gad, ya bụ, oke ala dị nʼebe obodo ugwu Aroea, nke dị nʼakụkụ ndagwurugwu Anọn. Tinyekwara ọkara obodo ugwu Gilead, na obodo niile dị nʼime ya.
ויתר הגלעד וכל הבשן ממלכת עוג--נתתי לחצי שבט המנשה כל חבל הארגב לכל הבשן ההוא יקרא ארץ רפאים | 13 |
Ala fọdụrụ na Gilead nakwa Bashan niile na alaeze Ọg ka m nyere otu ọkara ebo Manase. Nke a bụ ala Agob niile dị na Bashan, bụ ndị amaara dịka ala ndị Refaim.
יאיר בן מנשה לקח את כל חבל ארגב עד גבול הגשורי והמעכתי ויקרא אתם על שמו את הבשן חות יאיר עד היום הזה | 14 |
Jaịa, onye si nʼebo Manase, were ala niile dị nʼAgob, ọ bụladị ruo nʼoke ala ndị Geshua na ndị Maaka. Ọ kpọrọ ya nʼaha ya, nke mere na ruo taa ihe a na-akpọ Bashan bụ Havọt Jaịa, nke pụtara, obodo Jaịa.
ולראובני ולגדי נתתי מן הגלעד ועד נחל ארנן תוך הנחל וגבל--ועד יבק הנחל גבול בני עמון | 16 |
Ma Ebo Ruben na Gad ka m nyere ala niile dị site na Gilead ruo nʼetiti ndagwurugwu Anọn, na site na ndagwurugwu a ruo nʼiyi Jabọk, nke bụ oke ala ụmụ Amọn. Etiti ndagwurugwu Anọn bụkwa oke ala ebo Ruben na Gad.
והערבה והירדן וגבל--מכנרת ועד ים הערבה ים המלח תחת אשדת הפסגה מזרחה | 17 |
Oke ala ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ bụ osimiri Jọdan nke dị nʼAraba. Oke ala a sitere na Kineret gbatịa ruo nʼOsimiri Araba (ya bụ Osimiri Nnu), nke dị na mgbada ugwu Pisga.
ואצו אתכם בעת ההוא לאמר יהוה אלהיכם נתן לכם את הארץ הזאת לרשתה--חלוצים תעברו לפני אחיכם בני ישראל כל בני חיל | 18 |
Enyekwara m unu iwu nʼoge ahụ sị, “Onyenwe anyị Chineke unu enyela unu ala a ka unu nwere ya. Ma ndị unu niile, ndị bụ dimkpa, ndị jikeere maka agha, ga-agafe nọrọ ndị Izrel ndị ọzọ nʼihu.
רק נשיכם וטפכם ומקנכם ידעתי כי מקנה רב לכם--ישבו בעריכם אשר נתתי לכם | 19 |
Otu ọ dị, ebe ọ bụ na unu nwere ọtụtụ anụ ụlọ, ndị nwunye unu na ụmụntakịrị unu ga-ebi nʼobodo ndị m nyere unu, lekọtaa anụ ụlọ unu anya,
עד אשר יניח יהוה לאחיכם ככם וירשו גם הם את הארץ אשר יהוה אלהיכם נתן להם בעבר הירדן ושבתם איש לירשתו אשר נתתי לכם | 20 |
tutu ruo mgbe Onyenwe anyị ga-enye ụmụnna unu mmeri dịka o nyere unu. Mgbe ha nwetara ala Onyenwe anyị Chineke anyị na-enye ha nʼofe Jọdan, onye ọbụla nʼime unu nwere ike lọghachi bịa biri nʼala unu.”
ואת יהושוע צויתי בעת ההוא לאמר עיניך הראת את כל אשר עשה יהוה אלהיכם לשני המלכים האלה--כן יעשה יהוה לכל הממלכות אשר אתה עבר שמה | 21 |
Nʼoge ahụ, agwara m Joshua okwu sị, “I jirila anya gị hụ ihe Onyenwe anyị Chineke gị mere eze abụọ ndị a. Otu a ka ọ ga-emekwa alaeze niile dị nʼofe Jọdan ebe unu na-aga.
לא תיראום כי יהוה אלהיכם הוא הנלחם לכם | 22 |
Atụla ha egwu, nʼihi Onyenwe anyị Chineke gị ga-alụrụ gị ọgụ.”
ואתחנן אל יהוה בעת ההוא לאמר | 23 |
Nʼoge ahụ, arịrịọ m Onyenwe anyị arịrịọ sị ya,
אדני יהוה אתה החלות להראות את עבדך את גדלך ואת ידך החזקה--אשר מי אל בשמים ובארץ אשר יעשה כמעשיך וכגבורתך | 24 |
“Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ị malitela igosi mụ bụ ohu gị ịdị ukwuu gị na ike gị. O nweghị chi ọzọ dị nʼeluigwe maọbụ nʼụwa pụrụ ịrụ ọrụ ebube niile ị rụrụ.
אעברה נא ואראה את הארץ הטובה אשר בעבר הירדן ההר הטוב הזה והלבנן | 25 |
Kwere ka m gafee hụ ala ọma ahụ dị nʼofe ọzọ nke Jọdan, ala ugwu ugwu ahụ mara mma, na Lebanọn.”
ויתעבר יהוה בי למענכם ולא שמע אלי ויאמר יהוה אלי רב לך--אל תוסף דבר אלי עוד בדבר הזה | 26 |
Ma nʼihi unu, Onyenwe anyị wesoro m iwe jụ ige m ntị! Onyenwe anyị gwara m okwu sị m, “O zuola! Agwakwala m ihe ọbụla banyere okwu a.
עלה ראש הפסגה ושא עיניך ימה וצפנה ותימנה ומזרחה--וראה בעיניך כי לא תעבר את הירדן הזה | 27 |
Gaa, rigoruo nʼelu ugwu Pisga, site nʼebe ahụ lepụ anya nʼakụkụ ugwu na ndịda ma nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ. Ọ bụ anya gị ka ị ga-eji hụ ala ahụ, nʼihi na ị gaghị agafe osimiri Jọdan.
וצו את יהושע וחזקהו ואמצהו כי הוא יעבר לפני העם הזה והוא ינחיל אותם את הארץ אשר תראה | 28 |
Nye Joshua ike ka ọ nọchie ọnọdụ gị. Gbaakwa ya ume, nʼihi na ọ bụ ya ga-edu ndị a gafee Jọdan iketa ala ahụ niile ị ga-ahụ.”
ונשב בגיא מול בית פעור | 29 |
Ya mere, anyị nọdụrụ na ndagwurugwu ahụ dị nso na Bet-Peoa.