< דברי הימים ב 19 >

וישב יהושפט מלך יהודה אל ביתו בשלום--לירושלם 1
Mgbe Jehoshafat, eze Juda, laghachiri nʼụlọ ya na Jerusalem nʼudo.
ויצא אל פניו יהוא בן חנני החזה ויאמר אל המלך יהושפט הלרשע לעזר ולשנאי יהוה תאהב ובזאת עליך קצף מלפני יהוה 2
Jehu nwa Hanani, onye ọhụ ọhụ, pụrụ gaa izute ya; ọ sịrị eze Jehoshafat, “O kwesiri ka i nyere onye ọjọọ aka? Ọ bụkwa ndị na-akpọ Onyenwe anyị asị ka ị na-ahụ nʼanya? Nʼihi nke a iwe ọkụ Onyenwe anyị adakwasịla gị.
אבל דברים טובים נמצאו עמך כי בערת האשרות מן הארץ והכינות לבבך לדרש האלהים 3
Ma otu ọ dị, achọtara ezi ihe nʼime gị, i sitela nʼala a wezuga ogidi Ashera niile, dozieekwa obi gị ịchọ Chineke.”
וישב יהושפט בירושלם וישב ויצא בעם מבאר שבע עד הר אפרים וישיבם אל יהוה אלהי אבותיהם 4
Jehoshafat biri na Jerusalem. Ọ pụrụ gagharịa nʼetiti ndị ya site na Bịasheba ruo nʼobodo ugwu ugwu Ifrem, laghachikwutekwa Onyenwe anyị, bụ Chineke nke nna nna ha.
ויעמד שפטים בארץ בכל ערי יהודה הבצרות--לעיר ועיר 5
Ọ họpụtara ndị ikpe nʼala ahụ, nʼotu nʼotu nʼobodo ndị ahụ niile e wusiri ike nke Juda.
ויאמר אל השפטים ראו מה אתם עשים--כי לא לאדם תשפטו כי ליהוה ועמכם בדבר משפט 6
Ọ gwara ha si, “Lezienụ anya ihe unu na-eme nʼihi na ọ bụghị mmadụ ka unu na-ekpere ikpe kama ọ bụ Onyenwe anyị, onye na-anọnyere unu mgbe unu na-ekpebi ikpe.
ועתה יהי פחד יהוה עליכם שמרו ועשו--כי אין עם יהוה אלהינו עולה ומשא פנים ומקח שחד 7
Ugbu a, kwenụ ka egwu Onyenwe anyị dịrị nʼime unu. Kpeenụ ikpe ziri ezi, nʼihi na nʼebe Onyenwe anyị Chineke anyị nọ, ikpe ikpe na-ezighị ezi, maọbụ ile mmadụ anya nʼihu maọbụ iri ngarị adịghị ya.”
וגם בירושלם העמיד יהושפט מן הלוים והכהנים ומראשי האבות לישראל למשפט יהוה ולריב וישבו ירושלם 8
Ọzọkwa, nʼime Jerusalem, Jehoshafat họpụtara ụfọdụ ndị Livayị, na ndị nchụaja, na ndịisi ezinaụlọ Izrel ka ha bụrụ ndị na-ahazi iwu nke Onyenwe anyị na-edozikwa esemokwu. Ha bikwa na Jerusalem.
ויצו עליהם לאמר כה תעשון ביראת יהוה באמונה ובלבב שלם 9
O nyere ha iwu ndị a, “Jirinụ ikwesi ntụkwasị obi, na ịtụ egwu Onyenwe anyị rụọ ọrụ unu.
וכל ריב אשר יבוא עליכם מאחיכם הישבים בעריהם בין דם לדם בין תורה למצוה לחקים ולמשפטים והזהרתם אתם ולא יאשמו ליהוה והיה קצף עליכם ועל אחיכם כה תעשון ולא תאשמו 10
Mgbe ọbụla ụmụnna unu ndị bi nʼobodo unu dị iche iche buteere unu ikpe igbu mmadụ maọbụ ikpe mmebi iwu ọbụla, maọbụ ihe megidere ihe e nyere nʼiwu, maọbụ nke megidere ụkpụrụ, ma ọ bụkwanụ megide iwu na usoro ime ihe, unu ga-adọ ha aka na ntị ka ha ghara imehie megide Onyenwe anyị. Ọ bụrụ na unu emeghị otu a, iwe Onyenwe anyị ga-adakwasị unu na ụmụnna unu. Ma ọ bụrụ na unu arụọ ọrụ unu nke ọma, unu agaghị emehie.
והנה אמריהו כהן הראש עליכם לכל דבר יהוה וזבדיהו בן ישמעאל הנגיד לבית יהודה לכל דבר המלך ושטרים הלוים לפניכם חזקו ועשו ויהי יהוה עם הטוב 11
“Amaraya, onyeisi nchụaja, ga-abụ onyeisi unu nʼihe ọbụla metụtara Onyenwe anyị. Zebadaya nwa nwoke Ishmel, onyeisi nke ebo Juda ga-abụ onyeisi unu nʼihe o bụla metụtara eze. Ndị Livayị ga-abụ ndịisi ozi nʼihu unu. Bụrụkwanụ ndị dị ike, unu atụkwala ụjọ, ka Onyenwe anyị nọnyere ndị na-eme nke ọma.”

< דברי הימים ב 19 >