< Zepania 2 >
1 E HOAO ia oukou iho, a e hoaoia hoi, e ka lahuikanaka hilahila ole;
Chịkọtaanụ onwe unu, e, chịkọtaanụ onwe unu, unu ndị mba ihe ihere dịrị.
2 Mamua o ka hiki ana mai o ka olelopaa, Mamua o ka hele ana o ka la e like me ka opala; Mamua mai o ke kau ana mai o ka inaina enaena o Iehova ia oukou; Mamua mai o ke kau ana mai o ka la o ko Iehova inaina ia oukou.
Tupu ụkpụrụ ahụ ewere ọnọdụ, a chịpụ ụbọchị ahụ dịka igbugbo ọka nke ikuku na-ebufu, tupu iwe ọkụ Onyenwe anyị abịakwasị gị, tupu ụbọchị ọnụma nke Onyenwe anyị abịakwasị gị.
3 E imi oukou ia Iehova, e ka poe akahai a pau o ka honua, Ka poe i hahai i kona makemake: E imi i ka pono, e imi i ke akahai; I maluhia ai paha oukou i ka la o ko Iehova inaina.
Chọọnụ Onyenwe anyị, unu ndị niile dị umeala nʼobi nọ nʼala ahụ, unu bụ ndị na-eme ihe o nyere nʼiwu. Gbasoonụ ezi omume, gbasoonụ ịdị umeala nʼobi, ma eleghị anya, a ga-echebe unu nʼụbọchị iwe Onyenwe anyị.
4 No ka mea, e haaleleia auanei o Gaza, E neoneo auanei hoi o Asekelona. E hookukeia auanei o Asedoda i ka wa awakea, A e hookahuliia o Ekerona.
Nʼihi na o nwekwaghị ndị ga-ebi nʼobodo Gaza, obodo Ashkelọn ga-atọgbọrọ nʼefu. Nʼetiti ehihie ka a ga-ekpochapụ ndị niile bi nʼAshdọd; a ga-ehopukwa Ekrọn.
5 Auwe ka poe e noho ana ma kahakai! O ka poe Kereti! ke ku e nei ka olelo a Iehova ia oukou. E Kanaana, ka aina o ko Pilisetia, E hoopau auanei au ia oe i koe ole kekahi kanaka.
Ahụhụ dịrị unu ndị bi nʼakụkụ oke osimiri, unu bụ ndị Keret; okwu Onyenwe anyị na-emegide unu, Kenan, ala ndị Filistia. Ọ sịrị, “Aga m ala gị nʼiyi, ruo na ọ dịghị onye ga-afọdụ ndụ nʼime gị.”
6 A e lilo auanei ka aina kahakai i wahi no na hale kahuhipa, a me na pahipa.
Ala nke dị nʼakụkụ oke osimiri ahụ, ga-aghọ ebe ahịhịa jupụtara nye ndị ọzụzụ atụrụ na ọgba igwe ewu na atụrụ.
7 A e lilo ua aina la no ke koena o ka ohana a Iuda; E ai auanei lakou iloko olaila: A i ke ahiahi, e moe lakou iloko o na hale o Asekelona; No ka mea, e ike mai auanei o Iehova ko lakou Akua ia lakou, A e hoihoi mai i ko lakou poe pio.
Ala nke dị nʼakụkụ oke osimiri ga-aghọ ala nke ndị ahụ fọdụrụ na Juda, ebe ha ga-achọtara anụ ụlọ ha ahịhịa. Ha ga-anọkwa nʼụlọ ndị Ashkelọn nke tọgbọrọ nʼefu, dinaa ala zuru ike nʼoge uhuruchi. Onyenwe anyị Chineke ha ga-elekọta ha, mekwaa ka ha nwetaghachi ihe nketa ha niile.
8 Ua lohe au i ka hoohewa ana mai a ka Moaba, A me ka olelo hoino ana a ka Amona, I ka mea a lakou i hoino ai i ko'u poe kanaka, A hookiekie ae la e ku e mai i ko lakou palena aina.
“Anụla m okwu ọjọọ niile, nke ndị Moab, na ịkwa emo niile nke ndị Amọn, nụkwa ịbasị mba ike ha megide ndị nke m na-anya isi na ha ga-ewere ala ha.
9 Nolaila, ma kuu ola ana, wahi a Iehova o na kaua, O ke Akua no ka Iseraela, E like auanei o Moaba me Sodoma, a o ka Amona e like me Gomora, He nahelehele ooi, me na lua paakai, a me ka neoneo mau loa: Na ke koena o ko'u poe kanaka lakou e hao aku, A e lilo lakou no ke koena o ko'u poe kanaka.
Nʼihi ya, dịka m na-adị ndụ,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwubiri ya, “aghaghị m ime ka Moab dịrị ka Sọdọm, mekwaa ka Amọn dịka Gọmọra. Ha ga-aghọ ala ebe ahịhịa na-adụ ogwu ogwu na-eru, ebe olulu nnu jupụtara, na ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi. Ndị m, ndị fọdụrụ ga-akwakọrọ akụnụba ha, ndị fọdụrụ ndụ na mba m ga-eketa ala ha.”
10 E hiki no ia mea ia lakou, no ko lakou hoohanohano ana, No ka olelo hoino ana a lakou i haanou ai, A me ka hookiekie ku e i ka poe kanaka o Iehova o na kaua.
Ihe ndị a bụ ụgwọ ọrụ ha ga-anata nʼihi ịnya isi ha, na nʼihi nkọcha na ịkwa emo ha megide ndị nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
11 He mea hooweliweli auanei o Iehova ia lakou; No ka mea, e hoohoka auanei oia i na akua a pau o ka honua; A e hoomana aku ia ia ko na aina a pau o kanaka e, O kela mea keia mea ma kona wahi iho.
Onye dị egwu ka Onyenwe anyị ga-abụ nʼebe ha nọ, mgbe ọ lara chi niile nke ụwa nʼiyi. Mba niile dị nʼebe dị anya ga-akpọ isiala nye ya, onye ọbụla nʼala nke aka ya nʼụwa niile.
12 Oukou no hoi, e ko Aitiopa, E houia auanei hoi oukou i kuu pahikaua.
“Unu ndị Itiopia, a ghaghị iji mma agha gbuo unu.”
13 E o aku hoi oia i kona lima e ku e i ke kukulu akau, A e luku aku ia Asuria; a e hooneoneo ia Nineva, A panoa e like me ka waoakua.
Ọ ga-esetipụ aka ya megide ndị bi nʼakụkụ ugwu, laa Asịrịa nʼiyi. Ninive ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu, ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ, dịka ọzara.
14 E moe iho na ohana hipa iloko ona, A me na holoholona a pau o na aina: E moe no hoi ka pelikana, a me ke kipoda maluna o na kia pohaku ona: E hookani ko lakou leo ma na puka makani ona; He neoneo ma na paepae puka, no ka mea, e weheia auanei na papa kedera ona.
Igwe anụmanụ dị iche iche na igwe ehi ga-amakpu nʼebe ahụ, ha na ihe e kere eke dị iche iche. Ikwighịkwighị nke ọzara na okwolo ga-anọ ọnọdụ abalị nʼisi ogidi ya niile ahụ. Ụda olu ha ka a ga-anụ site na mpio-ikuku, mkpọmkpọ aja ga-adị na mbata nke ọnụ ụzọ niile, ibo ọnụ ụzọ niile e ji osisi sida mee ga-egherekwa oghe.
15 O keia ke kulanakauhale olioli i noho nanea, Ka mea i olelo iho iloko o kona naau, Owau wale no, aohe lua! Nani kona lilo ana i mea neoneo, kahi e moe ai na holoholona hihiu! O ka mea e maalo ana ae ia wahi, e kahaha ia me ka hooluliluli aku i kona lima.
Nke a bụ obodo ukwu ahụ, nke na-aṅụrị ọṅụ oriri, nke na-ebikwa na-enweghị ihe egwu ọbụla; nke na-asị onwe ya, “Ọ bụ mụ onwe m! Ọ dịghị onye ọzọ ma ewezuga m.” Ma ugbu a, lee otu o si bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu; lee ka o si bụrụ ebe ụmụ anụ ọhịa bi. Onye ọbụla si nʼakụkụ ya na-agafe aghaghị ịma ọsụ, ma fufekwaa isi ya.