< Halelu 24 >

1 NO Iehova ka honua a me kona mea e piha ai; O ke ao nei, a me ka poe e noho ana maloko ona.
Abụ Ọma Devid. Ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke Onyenwe anyị; ụwa na ndị niile bi nʼime ya.
2 No ka mea, nana no ia i hookumu maluna iho o na kai, A i hoopaa hoi maluna iho o na wai.
Ọ tọrọ ntọala ya nʼime oke osimiri niile, o mekwara ka o guzosie ike.
3 Owai la ka mea e pii i ka mauna o Iehova? Owai la hoi ke ku ma kona wahi hoano?
Onye bụ onye ahụ nwere ike irigo nʼelu ugwu Onyenwe anyị? Onye nwere ike ịbata guzo nʼime ụlọnsọ ya?
4 O ka mea lima paumaele ole a me ka naau maemae; O ka mea i paulele ole kona uhane i ka mea lapuwale; Aole hoi i hoohiki i ke Akua me ka wahahee:
Ọ bụ onye aka ya emeghị ihe ọjọọ, obi ya dịkwa ọcha, onye na-adịghị atụkwasị obi na chi arụsị, maọbụ ṅụọ iyi aghụghọ.
5 Oia ka mea e hoomaikaiia mai e Iehova, A e hooponoia mai hoi e kona Akua e ola'i.
Ha ga-anata ngọzị site nʼaka Onyenwe anyị, natakwa mkpepụta site nʼaka Chineke Onye nzọpụta ha.
6 Oia ka hanauna o ka poe i imi ia ia, I huli hoi i kou alo, e ke Akua o Iakoba. (Sila)
Otu a ka ọ ga-adịrị ọgbọ ndị ya, bụ ndị na-achọ ihu gị, Chineke nke Jekọb. (Sela)
7 E hapai ae, e na pani, i ko oukou mau poo; E hookiekieia'e hoi oukou, e na ipuka mau loa; A e komo no hoi ke Alii nani.
Welitenụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ama, meenụ ka isi unu bụrụ ihe e welitere, unu ọnụ ụzọ ama ochie, ka eze ebube nwee ike ịbata.
8 Owai la ia Alii nani? O Iehova ka ikaika a me ka mana; O Iehova ka mea mana i ke kaua.
Onye bụ eze ebube a? Ọ bụ Onyenwe anyị, onye bụ dimkpa na dike. Ọ bụ Onyenwe anyị, onye bụ dike nʼagha.
9 E hapai ae, e na pani, i ko oukou mau poo, E hookiekieia'e oukou, e na ipuka mau loa; A e komo no hoi ke Alii nani.
Welitenụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ama, buliekwanụ ha elu, unu ọnụ ụzọ ama ochie, ka Eze ebube nwee ike ịbatakwa.
10 Owai la ia Alii nani? O Iehova Sabaota, oia ke Alii nani. (Sila)
Onye bụ eze ebube a? Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ọ bụ ya bụ Eze ebube! (Sela)

< Halelu 24 >