< Na Helu 11 >

1 I KA ohumu ana a na kanaka, ua hewa ia i na pepeiao o Iehova; lohe ae la o Iehova, a hoaia kona inaina; a aku la ke ahi o Iehova iwaena o lakou, a ai aku la ma ka palena o kahi hoomoana.
Mgbe na-adịghị anya ụmụ Izrel bidoro itamu ntamu nʼihi ihe ike niile ha na-ezute nʼije ha. Ma ntamu a ruru Onyenwe anyị ntị. Nʼihi ya, Onyenwe anyị were iwe dị ukwuu megide ha. Ọkụ sitere nʼebe Onyenwe anyị nọ, ree nʼetiti ha, repịa ụfọdụ ndị bi nʼakụkụ ngwụsị ọmụma ụlọ ikwu ahụ.
2 Kahea aku la na kanaka ia Mose, a pule aku la o Mose ia Iehova, alaila pio iho la ke ahi.
Mgbe nke a mere, ụmụ Izrel tikuru Mosis mkpu akwa. Mosis kpere ekpere nye Onyenwe anyị nʼihi ha, ọkụ ahụ kwụsịkwara.
3 Kapa aku la ia i ka inoa o ia wahi, o Tabera; no ka mea, ua ai mai ke ahi o Iehova iwaena o lakou.
Nʼihi ya, a kpọrọ ebe ahụ Tabera, nʼihi ọkụ ahụ si nʼebe Onyenwe anyị nọ ree nʼetiti ha.
4 A o ka poe e i hui pu ia mai me lakou, kuko nui aku lakou: a uwe hou iho la na mamo a Iseraela, i ae la, Nawai la e haawi mai i ka io na kakou e ai ai?
Ndị amakekwu so ụmụ Izrel nʼije a malitere itamu ntamu banyere nri ndị ọzọ na-agụ ha agụụ. Nke a mere ka ụmụ Izrel malite ịkwa akwa, na-asị, “A sịkwarị na anyị nwere anụ anyị ga-ata.
5 Ke hoomanao nei makou i ka ia a makou i ai wale iho ai ma Aigupita; i na kaukama me na ipuaimaka, i na leka me na akaakai, a me na galika.
Anyị chetara azụ anyị tara nʼIjipt, nke na-adịghị efu anyị ego, ya na kukumba, na melọn, na liik, na ayo na galiik.
6 Ano hoi, ua maloo loa ko kakou naau; aohe mea e ae, o ka mane wale no imua o ko kakou maka.
Ma ugbu a, anyị enweghịkwa agụụ iri nri, nʼihi na site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, ọ bụ naanị mánà bụ ihe oriri anyị nwere.”
7 Ua like ka mane me ka hua koriana, a o kona helehelena ua like ia me ka deliuma.
Mánà dịka mkpụrụ kọrianda, na-acha ka eso osisi kpọrọ nkụ.
8 A hele ae la na kanaka, a hoiliili iho la, a wawahi iho la maloko o na mea wili; a i ole ia, kui iho la lakou iloko o na ipukui, kahu iho la a moa ma na pa, a hana iho la ia i popo. A o ka hoao ana o ia mea, ua like me ka hoao ana i ka aila hou.
Ndị Izrel na-ejegharị na-achịkọta ha. Emesịa, ha na-eji nkume e ji akwọ nri na-akwọri ha. Oge ụfọdụ, ha na-eji ikwe nri sụọ ya. Emesịa, ha na-esi ya esi, maọbụ ghee ya eghe. Ọ na-atọ dịka ihe e ji mmanụ oliv ghee.
9 Aia haule iho ka hau maluna o kahi hoomoana i ka po, haule pu no hoi ka mane me ia.
Mánà ndị a na-ada mgbe igirigi dara nʼọmụma ụlọ ikwu nʼabalị.
10 Alaila lohe ae la o Mose i na kanaka e uwe ana me ka lakou mau ohana, o kela kanaka keia kanaka ma ka puka o kona halelewa: hoa nui ia ka inaina o Iehova; a ukiuki iho la hoi o Mose.
Mosis nụrụ mkpu akwa ụmụ Izrel niile, nke na-ada nʼezinaụlọ ọbụla nʼakụkụ ọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha. Iwe were Onyenwe anyị nke ukwuu. Otu a kwa, obi jọrọ Mosis njọ nke ukwuu.
11 I aku la o Mose ia Iehova, No ke aha la oe i hoopilikia mai ai i kau kauwa? no ke aha hoi i loaa ole mai ai ia'u ka lokomaikaiia mai imua o kou maka, i kau mai ai oe maluna o'u i ke kaumaha o keia poe kanaka a pau?
Mosis jụrụ Onyenwe anyị sị, “Gịnị mere i ji bokwasị ohu gị nsogbu dị otu a nʼisi? Gịnị ka m mere na m ahụtakwaghị amara nʼebe ị nọ, nke mere i ji bukwasị m ibu arọ nke ilekọta ndị a?
12 Na'u no anei i hoohapai i keia poe kanaka a pau? Ua hoohanau no anei au ia lakou, i olelo mai ai oe ia'u, E hiipoi oe ia lakou ma kou umauma, e like me ka hali aua a ka makua hanai i ke keiki omo waiu, a hiki aku i ka aina au i hoohiki ai i na kupuna o lakou?
Ọ bụ m tụrụ ime ndị a niile? Ọ bụ m mụrụ ha? Gịnị mere i ji si m kuru ha nʼaka m gawa nʼala ahụ ị ṅụrụ nʼiyi inye nna nna ha, dịka m bụ nne nwa na-ekugharị nwantakịrị?
13 Nohea la e loaa mai ai ia'u ka io e haawi aku ai na keia poe kanaka a pau? No ka mea, ke uwe mai uei lakou ia'u, me ka olelo mai, E haawi mai oe na makou i io, e ai iho ai makou.
Ebee ka m ga-achọta anụ ga-ezuru igwe mmadụ ndị a? Lee na ha na-akwasa m akwa na-asị m, ‘Nye anyị anụ!’
14 Aole e hiki ia'u, owau wale no ke halihali i keia poe kanaka a pau; no ka mea, he mea kaumaha loa ia no'u.
Agaghị m ebulite ibu ịchịkọta ndị a niile nʼonwe m! Ibu a dị m arọ nke ukwuu.
15 A i hana mai oe pela ia'u, ea, ke nonoi aku nei au ia oe, e pepehi mai oe ia'u a make, ina paha i loaa ia'u ka lokomaikaiia mai imua o kou mau maka, a ike ole au i kuu popilikia ana.
Ọ bụrụ na ị ga-esi otu a meso m mmeso, biko napụ m ndụ m ugbu a, nʼihi na ọnwụ m ga-egosi na m natara amara nʼebe ị nọ. Site nʼọnọdụ a ga-ewetara m mbibi wezuga m.”
16 Olelo mai la o Iehova ia Mose, E houluulu mai oe io'u nei i na kanaka he kanahiku o ka poe kahiko o ka Iseraela, i na mea au e ike ai he poe kahiko o na kanaka, a he poe luna hoi no lakou; a e kai mai oe ia lakou ma ka halelewa o ke anaina i ku ai lakou me oe ilaila.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Kpọkọta iri ndị okenye ụmụ Izrel asaa, ndị ị maara na ha bụ ndị ndu, na ndị nlekọta ije ozi nʼetiti ụmụ Izrel. Kpọta ha nʼụlọ nzute m ka ha soro gị guzoro.
17 A e iho no au ilalo, e kamailio pu me oe ilaila; a e lawe au i ko ka Uhane maluna ou, a e kau aku maluna o lakou; a e amo pu lakou me oe i ke kaumaha o na kanaka, i halihali ole ai oe, o oe wale no, ia mea.
Aga m abịa nʼebe ahụ gwa gị okwu. Mgbe ahụ kwa, aga m ewere ụfọdụ nʼime Mmụọ m dị nʼime gị tinye nʼime iri ndị ndu asaa ahụ. Ha ga-enyere gị aka ibu ibu arọ nke ịchịkọta ụmụ Izrel. Nʼụzọ dị otu a, ọ gaghị abụkwa ibu dịrị naanị gị ibu.
18 E olelo aku hoi oe i na kanaka, E huikala oukou ia oukou iho no ka la apopo, a e ai auanei oukou i ka io; no ka mea, ua uwe aku oukou maloko o na pepeiao o Iehova, ua i aku, Nawai la e haawi mai i ka io na kakou e ai ai? Ua pono kakou ma Aigupita: no ia mea, e haawi mai no o Iehova i io na oukou, a e ai iho hoi oukou.
“Ugbu a, gwa ndị Izrel niile si ha, ‘Doonụ onwe unu nsọ, kwadoonụ maka echi, mgbe unu ga-ata anụ. Onyenwe anyị nụrụ mgbe unu kwara akwa sị, “A sịkwa na anyị nwere anụ anyị ga-ata. Ihe dịrị anyị mma nʼIjipt karịa otu ọ dị ugbu a.”
19 E ai no oukou, aole i ka la hookahi, aole i na la elua, aole hoi i na la elima, aole no hoi i na la he umi, aole no hoi i na la he iwakalua:
Anụ unu ga-eri abụghị naanị nke otu ụbọchị, maọbụ ụbọchị abụọ, maọbụ ụbọchị ise, maọbụ iri, ma ọ bụkwanụ iri ụbọchị abụọ!
20 Aka, he malama okoa, a puka mai ia iwaho ma ko oukou mau puka ihu, a hoopailua oukou ia: no ka mea, ua hoowahawaha oukou ia Iehova e noho ana iwaena o oukou, a ua uwe oukou imua ona, me ka i ana ae, No ke aha la kakou i hele mai ai mai Aigupita mai?
Kama unu ga-eri ya otu ọnwa zuru ezu, ruo mgbe ọ ga-esi unu nʼimi sọpụta, ghọrọ unu ihe ịsọ oyi. Nʼihi na unu ajụla Onyenwe anyị, onye nọ nʼetiti unu, kwaa akwa nʼihu ya, sị, “Gịnị mere anyị ji site nʼala Ijipt pụta?”’”
21 I aku la o Mose, O ka poe kanaka a'u e noho nei iwaena, he eono haneri tausani lakou, ka poe hele wawae, a ke olelo mai nei oe, E haawi no au i io na lakou e ai ai a pau ka malama okoa.
Ma Mosis sịrị Onyenwe anyị, “Ọnụọgụgụ ndị ikom dị narị puku isii ndị ji ụkwụ eje ka m nọ nʼetiti ha, ma ị na-asị, ‘Aga m enye ha anụ otu ọnwa.’
22 E kaluaia anei na pua hipa a me na pua bipi na lakou, i mea e maona ai lakou? E hoiliiliia paha anei na ia a pau o ke kai na lakou, i mea e maona ai lakou?
Ọ ga-ezuru ha ma ọ bụrụ na e gbuoro ha igwe ehi na atụrụ? Ọ bụ azụ niile nke dị nʼoke osimiri ga-ezuru ha ma egbuo ha niile nye ha?”
23 Olelo mai la o Iehova ia Mose, Ua hoopokoleia anei ko Iehova lima? E ike auanei oe i ka hookoia ana paha o ka'u olelo ia oe, a i ka ole ana paha.
Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Aka Onyenwe anyị ọ dị mkpụmkpụ? Ugbu a, ị ga-ahụ ma m ga-emezu okwu m, maọbụ na m agaghị emezu ya.”
24 Hele aku la o Mose, a hai aku la i na kanaka i na olelo a Iehova, a houluulu ae la ia i na kanaka, he kanahiku o ka poe lunakahiko no na kanaka, a hooku ae la ia lakou a puni ka halelewa.
Ya mere, Mosis pụrụ ga gwa ụmụ Izrel ihe Onyenwe anyị kwuru. Ọ chịkọtara iri ndị okenye asaa ahụ nye ha ọnọdụ gburugburu ụlọ nzute ahụ.
25 Iho mai la o Iehova ma ke ao, a olelo mai la ia ia, a. lawe ae la ia i ko ka Uhane maluna o Mose, a haawi aku la i ka poe lunakahiko he kanahiku: a i ka manawa i kau iho ai ka Uhane maluna o lakou, alaila wanana mai la lakou, aole i hooki.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị rịdatara nʼime igwe ojii. Ya na Mosis kparịtaa ụka. Onyenwe anyị weere ụfọdụ nʼime Mmụọ dị nʼime Mosis, tinye ya nʼime iri ndị okenye asaa ndị ahụ. Mgbe Mmụọ a batara nʼime ha, ha niile buru amụma. Ma ha ebughị amụma gaa nʼihu.
26 Elua kanaka i koe aku ma kahi hoomoana, o Eledada, ka inoa o kekahi, a o Medada ka inoa o kekahi. Kau mai la ka Uhane maluna o laua: no ka poe laua i kakauia, aole nae laua i hele aku i ka halelewa, a wanana mai la laua ma kahi hoomoana.
Ma mmadụ abụọ nʼime iri ndị okenye asaa ndị ahụ, Eldad na Medad nọgidere nʼọmụma ụlọ ikwu ha. Ọ bụ ezie na e depụtara aha ha dịka ndị ndu, ma ha esoghị ndị ọzọ gaa nʼụlọ nzute. Ma Mmụọ ahụ bịakwasịrị ha nʼebe ahụ ha nọ. Ha bukwara amụma.
27 A holo mai la kekahi kanaka opiopio, a hai mai la ia Mose, i mai la, Ke wanana mai la o Eledada laua o Medada ma kahi hoomoana.
Otu okorobịa gbapụrụ ọsọ gaa kọọrọ Mosis sị ya, “Eldad na Medad na-ebu amụma nʼọmụma ụlọ ikwu ha.”
28 Pane mai la o Iosua ke keiki a Nuna, ke kauwa a Mose, he kanaka opiopio ona, i mai la, E kuu haku, e Mose, e papa aku oe ia laua.
Joshua nwa Nun, onyeozi Mosis site na mgbe ọ bụ okorobịa, gwara Mosis okwu sị ya, “Onyenwe m Mosis, mee ka ndị a kwụsị ibu amụma.”
29 I aku la o Mose ia ia, Ke huwa nei anei oe no'u? ke ake nei au e lilo ko Iehova poe kanaka a pau i poe kaula, a e kau mai o Iehova i kona Uhane maluna o lakou!
Ma Mosis zara sị, “Ọ bụ nʼihi ikwochitara m ekworo ka i ji chọọ ka m kwụsị ha? Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na ndị Onyenwe anyị niile bụ ndị amụma, ndị Onyenwe anyị ga-etinye Mmụọ ya nʼime ha!”
30 Hoi mai la o Mose i kahi hoomoana, oia a me ka poe lunakahiko o ka Iseraela.
Mgbe ahụ Mosis na ndị okenye Izrel ndị ahụ niile lọghachiri nʼebe ụlọ ikwu ha dị.
31 A huai mai la ka makani mai o Iehova mai, a hoopuka mai la i na selu mai ka moana mai, a hoohaule iho la ia lakou ma kahi hoomoana, e like me kekahi la hele ma keia aoao, a me kela aoao, a puni i kahi hoomoana, elua paha kubita maluna o ka honua.
Otu oke ifufe sitere nʼebe Onyenwe anyị nọ bịa si nʼosimiri bute ọtụtụ nnụnụ a na-akpọ kweel. O mere ka nnụnụ ndị a daa nʼebe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha, nʼime ogige ya niile. Nnụnụ ndị a fere ihe dịka otu mita site nʼelu ala, nʼakụkụ niile, ruo nʼebe mmadụ pụrụ iji ụkwụ jeruo nʼotu ụbọchị. Ha jupụtakwara ebe niile.
32 Ku ae la na kanaka iluna ia la a po, ia po a ao, a ia la aku a po; ohi iho la lakou i na selu: a o ka mea hoiliili hapa, he umi na homera kana i hoiliili ai, a kaulai aku la lakou ia mea no lakou iho a puni kahi hoomoana.
Ya mere ndị Izrel biliri ụbọchị ahụ niile, na nʼabalị ahụ niile, na echi ya niile pụọ ịchịkọta nnụnụ kweel ndị a! Onye gbutere nke nta gbutezuru ihe ọtụtụ homa iri. Ha gbasara ha akụkụ niile nke ogige ọmụma ụlọ ikwu ahụ.
33 Aia iwaena o ko lakou mau niho ka io, aole ia i nauia, aa mai la ka inaina o Iehova i na kanaka, a pepehi iho la o Iehova i na kanaka, he ahulau nui loa.
Ma mgbe anụ ndị a ka dị ha nʼọnụ, Onyenwe anyị were iwe dị ukwuu megide ha. O tiri ha nrịa nrịa na-efe efe.
34 A kapa iho la oia i ka inoa o ia wahi, o Kiberotahataava; no ka mea, malaila i kanu ai lakou i na kanaka kuko.
Nʼihi nke a, a kpọrọ aha ebe ahụ Kibrọt Hataava, nʼihi na nʼebe ahụ ka e liri ndị Izrel nwụrụ nʼihi oke ọchịchọ nri.
35 Hele aku la na kanaka mai Kiberotahataava aku a hiki i Hazerota, a noho iho la lakou i Hazerota.
Site na Kibrọt Hataava, ndị Izrel biliri njem rute Hazerọt ebe ha nọrọ.

< Na Helu 11 >