< Ioba 27 >

1 A OLELO hou mai la o Ioba i kana olelonane, i mai la,
Ma Job gakwara nʼihu nʼokwu ya sị:
2 Ma ke ola o ke Akua, nana i lawe aku kuu pono; A ma ka Mea mana, nana i hooawahia kuu uhane;
“Nʼezie, dịka Chineke na-adị ndụ, onye jụrụ ikpere m ikpe ziri ezi, Onye pụrụ ime ihe niile, onye mere ka m hụ ihe ilu nke mkpụrụobi.
3 I ka manawa a pau o kuu hanu iloko o'u, A o ke ola o ke Akua iloko o kuu mau puka ihu;
Ogologo mgbe m nwere ndụ nʼime m, mgbe iku ume Chineke dịkwa nʼimi m,
4 Aole e olelo kuu lehelehe i ka hewa, A o kuu elelo aole e hoike aku i ka wahahee.
egbugbere ọnụ m agaghị ekwu ihe ọjọọ, ire m agakwaghị ekwu okwu aghụghọ.
5 Aole loa wau e hoapono aku ia oukou, a make au; Aole owau e lawe aku i kuu pono mai o'u aku la.
Agaghị m ekwenye na ihe unu kwuru ziri ezi; ruo mgbe m ga-anwụ, agaghị m agọnarị izuoke m.
6 Ma kuu pono ke hoopaa nei au, aole au e hookuu aku; Aole e hoino mai ia'u kuu naau i kekahi o kuu mau la.
Aga m ejigidesi ezi omume m aka ike, agaghị m ahapụ ya; o nwekwaghị mgbe obi m ga-ata m ụta ogologo ụbọchị niile nke ndụ m.
7 E hoohalikeia kuu enemi me ka mea hewa, A o ka mea ku e mai ia'u me he mea pono ole la.
“Ka ndị iro m dịrị ka ndị ajọ omume, ka ndị na-ebili imegide m dịrị ka ndị na-emebi iwu.
8 No ka mea, heaha ka manaelana o ka aia, i ka wa e hoopau ai ia ia, I ku wa e kaili aku ai ke Akua i kona uhane?
Nʼihi nke a, gịnị bụ olileanya onye na-amaghị Chineke nwere mgbe e bipụrụ ya, mgbe Chineke wepụrụ ndụ ya?
9 E hoolohe mai anei ke Akua i kona auwe ana, I ka manawa e hiki mai ai ka popilikia maluna ona?
Chineke ọ na-anụ ịkwa akwa ya mgbe nsogbu dakwasịrị ya?
10 E hauoli anei ia i ka Mea mana? E kahea mau loa anei ia i ke Akua?
Ọ ga-achọta ihe ụtọ nʼime Onye pụrụ ime ihe niile? Ọ ga-akpọku Chineke mgbe niile?
11 E ao aku au ia oukou ma ka lima o ke Akua: Aole au e huna i ka mea me ka Mea mana.
“Aga m akụziri unu maka ike nke Chineke; agaghị m ezo ihe banyere ụzọ Onye pụrụ ime ihe niile.
12 Aia hoi, o oukou a pau, ua hoomaopopo oukou ia; No ke aha la oukou i manao lapuwale ai pela?
Unu onwe unu ahụla ihe ndị a, gịnị mere unu ji ekwu okwu ndị a na-enweghị isi?
13 Eia ka uku no ke kanaka hewa imua o ke Akua, O ka hooilina a ka poe hookaumaha e loaa'i, mai ka Mea mana mai.
“Nke a bụ oke Chineke na-ekenye ndị ajọ omume, nke a bụkwa ihe nketa nke onye ahụ na-adịghị eme ebere na-anata site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile.
14 Ina e hoonuiia kana poe keiki, no ka pahikaua no; A o kana poe mamo, aole e maona i ka berena.
Nʼagbanyeghị ọnụọgụgụ ụmụ ya, oke ha bụ mma agha; ụmụ ya agaghị enwe ihe oriri ga-ezuru ha.
15 O kona poe e koe ana, e kanuia i ka make: Aole hoi e kanikau kana mau wahinekanemake.
Ọrịa na-efe efe ga-egbu ndị ya fọrọ ndụ; ọzọ, ụmụ nwanyị ha hapụrụ nwụọ agaghị akwa akwa nʼihi ha.
16 Ina e hoiliili oia i ke kala e like me ka lepo, A e hoomakaukau i ka lolekomo e like me ka palolo;
Ọ bụrụ na ọ kpakọta ọlaọcha dịka uzuzu, ma tụkọtakwa uwe dịka aja ụrọ,
17 E hoomakaukau no, aka, na ka mea pono e hookomo, A o ke kala, na ka mea hala ole e puunaue.
ihe ndị ọ kpakọtara bụ onye ezi omume ga-eyi ha, ndị aka ha dị ọcha ga-ekekwa ọlaọcha ya.
18 Kukulu no ia i kona hale me he mu la, A e like me ke kamala a ke kiai i hana'i.
Ụlọ o wuru dị ka ụlọ nla, dịkwa ka ụlọ ntu nke onye nche wuru.
19 Moe iho ilalo ka mea waiwai, aole e kanuia; Wehe ae ia i kona maka, aole iho la ia.
Ọ na-edina ala dịka ọgaranya ma ọ gaghị edinakwa dịka ọgaranya ọzọ; mgbe ọ saghere anya ya abụọ, ihe niile efuola.
20 Kau mai la na weliweli ia ia, e like me na wai, I ka po, lawe aku ka puahiohio ia ia.
Oke egwu na-adakwasị ya dịka idee mmiri; oke ebili mmiri na-ebufu ya nʼabalị.
21 Na ka makani hikina ia e lawe aku, a hele aku ia, A o ka ino e lawe ia ia mai kona wahi aku.
Ifufe si nʼọwụwa anyanwụ na-ebufu ya, agaghị ahụkwa ya anya ọzọ; ọ na-azachapụ ya site nʼọnọdụ ya.
22 E hoolei aku [ke Akua] ia ia, aole ia e minamina: I ka holo ana, e holo no ia mai kona lima aku.
Ọ na-atụfu ya na-enweghị ebere mgbe ọ na-eme ngwangwa ịgbapụ site nʼike ya.
23 E pai lakou i ko lakou lima ia ia, A e kipaku ia ia mai kona wahi aku.
Ọ na-akụkọta aka ya nʼịkwa emo, were ịma ọsụ wezuga ya nʼọnọdụ ya.”

< Ioba 27 >