< I Na Lii 2 >
1 HOOKOKOKE mai la hoi na la o Davida e make ai; a kauoha mai la oia ia Solomona i kana keiki, i mai la,
Mgbe ụbọchị ọnwụ eze Devid na-abịaru nso, o nyere nwa ya Solomọn iwu sị ya,
2 Ke hele nei au i ka aoao o ko ka honua a pau: e hooikaika oe, a e hookanaka hoi;
“Oge ọnwụ m eruola,” ka ọ sịrị, “Ya mere, dị ike, meekwa dịka nwoke.
3 A e malama oe i ke kauoha a Iehova kou Akua, e hele ma kona mau aoao, me ka malama i kona mau kapu, a me kana mau kauoha, a me kona mau kanawai, a me kana mau olelo me ia i kakauia'i ma ke kanawai ia Mose, i pomaikai oe ma na mea a pau au e hana aku ai, a i na wahi a pau e huli ae ai oe:
Debe iwu niile Onyenwe anyị bụ Chineke gị nyere, bie ndụ nʼụzọ ya niile. Debekwa ụkpụrụ na ihe niile o nyere nʼiwu, na ntụziaka ya niile dịka e dere ya nʼakwụkwọ iwu Mosis. Mee nke a ka ihe niile ị ga-eme gaara gị nke ọma, nʼihe niile ị na-eme, nʼebe ọbụla ị na-eche ihu gị.
4 I hooko iho ai o Iehova i kana olelo ana i olelo mai ai no'u, i ka i ana mai, Ina e malama kau mau keiki i ko lakou aoao, e hele imua o'u me ka oiaio, me ko lakou naau a pau, a me ko lakou uhane a pau, aole oe e nele i ke kanaka ole (wahi ana) e noho maluna o ka nohoalii o ka Iseraela.
Ka Onyenwe anyị mezuo nkwa o kwere banyere m, sị ‘Ọ bụrụ na ụmụ gị na ụmụ ụmụ ha elezie anya nʼotu ha si ebi ndụ, ọ bụrụ na ha ejegharịa nʼụzọ ikwesi ntụkwasị obi nʼihu m, jiri obi ha niile na mkpụrụobi ha mee nke a, ị gaghị achọ onye ga-anọkwasị nʼoche eze Izrel achọ.’
5 A ua ike no hoi oe i ka mea a Ioaba ke keiki a Zeruia i hana mai ai ia'u, a me ka mea ana i hana'ku ai i na luna elua o ka poe koa o ka Iseraela, ia Abenera ke keiki a Nera, a ia Amasa ke keiki a Ietera; ua pepehi oia ia laua, a ua hookahe oia i ke koko o ke kaua i ka wa maluhia, ua kau hoi oia i ke koko o ke kaua ma kona kaei i kaeiia'i kona puhaka, a ma kona mau kamaa i hookomoia'i kona mau wawae.
“Ugbu a, gị onwe gị maara ihe Joab nwa Zeruaya mere m, ya bụ ihe o mere mmadụ abụọ bụ ndịisi agha Izrel, Abna nwa Nea, na Amasa nwa Jeta. O gburu ha, wufuo ọbara ha nʼoge udo, dịka a ga-asị na ọ bụ ihe e mere nʼagha. O jikwa ọbara ahụ merụọ ihe okike o kere nʼukwu na akpụkpọụkwụ o yi nʼụkwụ.
6 Nolaila e hana oe mamuli o kou akamai, i ole ai e iho maluhia kona poohina i ka luakupapau. (Sheol )
Ị bụ nwoke maara ihe, ị makwaara ihe ị ga-eme. Ekwela ka Joab, nʼagbanyeghị isi awọ ya, nwụọ nʼudo. (Sheol )
7 Aka, e lokomaikai aku oe i na keiki a Barezilai no Gileada, o lakou kekahi o ka poe e ai ana ma kou papaaina; no ka mea, pela lakou i hele mai ai ia'u i ko'u hee ana imua o Abesaloma kou hoahanau.
“Ma meere ụmụ Bazilai onye Gilead ebere. Meekwa ka ha bụrụ ndị na-eso gị rie ihe na tebul gị nʼihi na ha ji obi ha zute m mgbe m na-agba ọsọ ndụ nʼihi nwanne gị Absalọm.
8 Aia hoi me oe o Simei ke keiki a Gera ka Beniamina no Bahurima, ua hoino wale mai oia ia'u me ka olelo hoino loa i ka la i hele aku ai au i Mahanaima; aka, ua hele ae ia e halawai me au ma Ioredane, a hoohiki aku la au nona, ma o Iehova la, i aku la, Aole au e pepehi aku ia oe me ka pahikaua.
“Cheta Shimei, nwa Gera, onye Benjamin ahụ bi nʼobodo Bahurim, onye kọchara m nkọcha jọgburu onwe ya nʼụbọchị ahụ m jere Mahanaim. Mgbe ọ bịara izute m na Jọdan, eji m aha Onyenwe anyị ṅụọrọ ya iyi sị ya, ‘Agaghị m eji mma agha gbuo gị.’
9 Ano hoi, mai hoapono oe ia ia, no ka mea, he kanaka naauao no oe, a ua ike oe i kau mea e pono ai ke hana aku ia ia; aka, e hooiho oe i kona poohina ilalo i ka luakupapau me ke koko. (Sheol )
Ma achọghị m ka ị hapụ ya dịka onye ikpe na-amaghị. Ị bụ nwoke maara ihe. Ị makwaara ihe ị ga-eme ya. Mee ka o jiri isi awọ ọbara juru baa nʼili.” (Sheol )
10 Alaila hiamoe iho la o Davida me kona mau makua, a ua kanuia ma ke kulanakauhale o Davida.
Emesịa, Devid sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ. E liri ya na obodo Devid.
11 A o na la i alii ai o Davida maluna o ka Iseraela he kanaha mau makahiki ia; ma Heberona i alii ai oia i na makahiki ehiku, a ma Ierusalema i alii ai oia i na makahiki he kanakolukumamakolu.
Ma ọ chịrị Izrel iri afọ anọ; ọ chịrị afọ asaa na Hebrọn, chịakwa iri afọ atọ na atọ na Jerusalem.
12 Alaila noho iho la o Solomona maluna o ka nohoalii o kona makuakane, a ua hooku paa loa ia kona aupuni.
Solomọn nọdụrụ nʼocheeze nna ya Devid dịka eze. Alaeze ya guzosiri ike nke ukwuu. Ọchịchị ya gakwara nke ọma.
13 Alaila hele mai la o Adoniia ke keiki a Hagita io Bateseba la ka makuwahine o Solomona. Ninau aku la oia, Ua hele mai nei anei oe me ke aloha? I mai la ia, Me ke aloha.
Otu ụbọchị, Adonaịja nwa Hagit, bịakwutere Batsheba, nne Solomọn. Mgbe Batsheba hụrụ ya, ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Ọ bụkwa ọbịbịa udo ka ị bịara?” Adonaịja zara sị ya, “E, abịara m nʼudo.”
14 A olelo mai la hoi ia, He wahi manao ka'u e olelo aku ai ia oe. A i aku la kela, E olelo mai.
O kwuru sị, “O nwere ihe m nwere ịgwa gị.” Nne Solomọn zara sị ya, “Kwuo.”
15 Olelo mai la ia, Ua ike no oe, ia'u no ke aupuni, a ua kau na maka o ka Iseraela a pau ia'u i alii ae au; aka, ua hoohuliia ke aupuni, a ua lilo ae nei i ko'u hoahanau: no ka mea, nona no ia, mai Iehova mai.
Ọ zara sị, “Dịka ị maara, ọ bụ m nwe alaeze a. Ndị Izrel niile lekwara anya na m ga-abụ eze ha. Ma otu ọ dị, ihe niile adịghịkwa ka ọ dị na mbụ, alaeze a aghọọla nke nwanne m, nʼihi na o si nʼaka Onyenwe anyị rute ya aka.
16 Ano la hoi, hookahi mea a'u e noi ai ia oe, mai hoole mai oe ia'u. I aku la oia ia ia, E olelo mai no.
Ugbu a, enwere m otu ihe m na-arịọ nʼaka gị. Biko ajụkwala imere m ya.” Batsheba sịrị ya, “Gịnị bụ arịrịọ gị? Kwuo ihe ọ bụ.”
17 I mai la hoi oia, Ke noi aku nei au ia oe e olelo oe ia Solomona ke alii, (no ka mea aole oia e hoole ia oe, ) e haawi mai oia ia Abisaga no Sunama ia'u i wahine.
Ọ zaghachiri ya sị, “Biko rịọrọ m Solomọn eze, nʼihi na amaara m na ọ ga-eme ihe ọbụla ị rịọrọ ya, ka ọ kpọnye m Abishag, nwanyị Shunem ahụ, ka ọ bụrụ nwunye m.”
18 I aku la o Bateseba, He pono, e olelo aku no wau i ke alii, nou.
Batsheba zara sị ya, “Ọ dị mma, aga m agwara gị eze okwu.”
19 Hele aku la o Bateseba i ke alii ia Solomona, e i aku ia ia no Adoniia. Ku ae la hoi ke alii iluna e halawai me ia, a kulou iho la ia ia, a noho iho la ma kona nohoalii, a ua hoonoho iho i ka noho no ka makuwahine o ke alii; a noho iho oia ma kona lima akau.
Emesịa, Batsheba bịakwutere eze Solomọn ịgwa ya okwu banyere Adonaịja. Mgbe ọ na-abata, eze sitere nʼocheeze ya bilie gaa izute ya, kpọkwaa isiala nye ya nọdụ ala nʼocheeze ya. O mere ka e butere nne eze ocheeze, ọ nọdụkwara ala nʼaka nri ya.
20 Alaila i ae la ia, Hookahi mea iki ka'u e noi aku ai ia oe; mai hoole mai oe ia'u. A olelo ae la ke alii ia ia, E olelo mai no oe, e kuu makuwahine, no ka mea, aole au e hoole aku ia oe.
Ọ sịrị, “Enwere m arịrịọ nta m chọrọ ịrịọ gị. Ajụkwala i mere m ya.” Eze zaghachiri, “Rịọọ ya nne m. Agaghị m ajụ i mere gị ya.”
21 I ae la kela, E haawiia'ku o Abisaga no Sunama ia Adoniia kou hoahanau i wahine.
Ya mere ọ sịrị, “Biko, kwere ka enye nwanne gị nwoke Adonaịja Abishag nwanyị Shunem, ka ọ bụrụ nwunye ya.”
22 Olelo ae la ke alii Solomona, i ae la i kona makuwahine, No ke aha la oe i noi mai nei ia Abisaga no Sunama na Adoniia? E noi mai oe i ke aupuni kekahi nona, no ka mea, o ko'u kaikuaana no ia, nona hoi, a no Abiatara ke kahuna, a no Ioaba ke keiki a Zeruia.
Eze Solomọn zara nne ya sị, “Gịnị mere i ji rịọọ m ka m nye Adonaịja naanị Abishag nwanyị Shunem ka ọ bụrụ nwunye ya? Ị gaara arịọkwa m sị m nye ya alaeze m. Nʼihi na ọ bụ ya tọrọ m” Ị gaara arịọkwa nʼihi Abịata onye nchụaja ma Joab nwa Zeruaya.
23 Alaila hoohiki Solomona ke alii ma o Iehova la, i aku la, Me ia e hana mai ai ke Akua ia'u, a e hui hou, ke olelo ku e ole o Adoniia i keia olelo i kona ola iho.
Mgbe ahụ, eze Solomọn ji Onyenwe anyị ṅụọ iyi sị, “Ka Chineke mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na Adonaịja ejighị ndụ ya kwụọ ụgwọ nʼihi arịrịọ a.
24 Ano hoi, me ke ola ana o Iehova, ka mea nana i hooku paa mai ia'u, a i hoonoho ia'u ma ka nohoalii o Davida ko'u makuakane, ka mea nana i hana i hale no'u, e like me kana olelo hoopomaikai, e make no o Adoniia i keia la.
Ugbu a, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye ahụ mere ka m nọgidesie ike nʼocheeze nna m Devid, onye mere ka ọchịchị eze m malite dịka o kwere na nkwa, a ga-eme ka Adonaịja nwụọ taa.”
25 Kena ae la o Solomona ke alii ma ka lima o Benaia ke keiki a Iehoiada; lele aku la oia ia ia a make ia.
Eze Solomọn zigara Benaya nwa Jehoiada ka ọ gaa gbuo Adonaịja. Benaya gakwara tigbuo Adonaịja.
26 A olelo mai la ke alii ia Abiatara ke kahuna, E hele aku oe i Anatota, i kau mau mahinaai ponoi; no ka mea, he pono ke make oe: aka, aole au e pepehi aku ia oe i keia mau la, no ka mea, ua hali oe i ka pahuberita o ka Haku Iehova imua o Davida ko'u makuakane, a ua hookaumahaia oe i na mea a pau i hookaumahaia'i ko'u makuakane.
Eze kpọkwara Abịata onye nchụaja sị ya, “Laghachi azụ nʼubi gị nʼAnatot. I kwesiri ịnwụ ọnwụ ma ọ bụghị ugbu a ka a ga-egbu gị nʼihi na i buru igbe ọgbụgba ndụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị nʼoge nna m Devid dị ndụ. I sokwa ya hụọ ahụhụ nʼoge ahụ niile o nwere nsogbu.”
27 Pela i kipaku aku ai o Solomona ia Abiatara mai kona kahuna ana no Iehova, i hooko i ka olelo a Iehova ana i olelo ai no ka ohana a Eli ma Silo.
Ya mere, Solomọn chụpụrụ Abịata ka ọ ghara ịbụ onye nchụaja Onyenwe anyị ọzọ. Otu a ka o si mezuo bụ okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru banyere ezinaụlọ Elayị na Shaịlo.
28 Alaila hiki ae la ka olelo ia Ioaba; no ka mea, ua huli ae o Ioaba mamuli o Adoniia aole nae ia i huli mamuli o Abesaloma: a holo aku la o Ioaba i ka halelewa o Iehova, a lalau ae la i na pepeiaohao o ke kuahu.
Ma mgbe Joab nụrụ na Adonaịja anwụọla, ọ gbaara ọsọ gaa nʼụlọ nzute Onyenwe anyị jigide mpi dị nʼakụkụ ebe ịchụ aja aka. Ọ bụ ezie na Joab so Adonaịja gbaa izu imegide Solomọn, ma o soghị Absalọm gbaa izu imegide Devid.
29 A ua haiia'ku i ke alii ia Solomona, Ua holo aku o Ioaba i ka halelewa o Iehova, aia hoi ia ma ke kuahu. Alaila kena ae la o Solomona ia Benaia ke keiki a Iehoiada, i ae la, E hele oe e lele aku ia ia.
Mgbe a gwara eze Solomọn, na Joab a gbabala nʼụlọ ikwu Onyenwe anyị, nọdụ nʼakụkụ ebe ịchụ aja. Solomọn nyere Benaya, nwa Jehoiada iwu sị, “Gaa, tituo ya nʼala.”
30 A hele aku la o Benaia i ka halelewa o Iehova, i aku la ia ia, Ke i mai nei ke alii, E hele mai oe. I mai kela, Aole, aka, maanei au e make ai. A hoi hoike o Benaia i ke alii, i aku la, Pela i olelo mai ai o Ioaba, a pela i hoike mai ai oia ia'u.
Benaya banyere nʼime ụlọ nzute Onyenwe anyị, sị Joab, “Eze sị gị, ‘pụta ezi!’” Ma ọ zara, “Mba, aga m anwụ nʼebe a.” Nʼihi nke a, Benaya jekwuru eze gwa ya ihe Joab kwuru.
31 A i mai la ke alii ia ia, E hana aku oe e like me kana i olelo mai ai, e lele aku ia ia a e kanu ia ia, i lawe aku oe i ke koko hala ole a Ioaba i hookahe ai, mai o'u aku nei, a mai ka ohana aku a ko'u makuakane.
Mgbe ahụ, eze nyere Benaya iwu sị ya, “Gaa mee dịka o kwuru. Gbuo ya, liekwa ya. Nke a ga-eme ka ikpe ọmụma ghara ịdịrị mụ na ezinaụlọ nna m Devid nʼihi ikpe ọmụma dịrị Joab maka ọbara ndị aka ha dị ọcha ọ wụsiri.
32 A e hoihoi aku o Iehova i kona koko maluna o ke poo ona, o ka mea i lele aku i na kanaka elua ua oi aku ko laua pono me ko laua maikai mamua o kona, a pepehi aku la ia laua me ka pahikaua, me ka ike ole o Davida ko'u makuakane, ia Abenera ke keiki a Nera, ka luna o ka poe koa o ka Iseraela, a me Amasa ke keiki a Ietera ka luna o ka poe koa o ka Iuda.
Onyenwe anyị ga-emekwa ka ọbara ọ wụsiri laa ya nʼisi, nʼihi na o ji mma agha gbuo ndị ikom abụọ, ma nna m Devid amaghị maka ya. Ha abụọ, ya bụ Abna nwa Nea, ọchịagha ndị Izrel, na Amasa nwa Jeta, ọchịagha ndị Juda, ndị dị mma ma bụrụkwa ndị ezi omume karịa ya.
33 Nolaila e hoi ae ko laua koko maluna o ke poo o Ioaba, a maluna o kana mau keiki a mau aku; aka, maluna o Davida a me kana mau keiki, a me kana ohana, a me kona nohoalii, e kau mau loa'i ka pomaikai mai ka Haku mai.
Ka ikpe ọmụma dị nʼihi igbu ọchụ ndị a dịkwasị Joab na ụmụ ụmụ ya nʼisi ruo mgbe ebighị ebi. Ma nʼebe Devid na ụmụ ụmụ ya, na ụlọ ya, na ocheeze ya dị, ka udo Onyenwe anyị dịkwasị ha ruo mgbe ebighị ebi.”
34 Hele aku la hoi o Benaia ke keiki a Iehoiada, lele aku la ia ia, a pepehi aku ia ia; a ua kanuia oia iloko o kona hale i ka waonahele.
Benaya nwa Jehoiada gara gbuo Joab. E liri ya nʼala nke ya dị nʼọzara.
35 A hoonoho ae la ke alii ia Benaia ke keiki a Iehoiada, iloko o kona wahi maluna o ka poe koa, a hookomo ae la ke alii ia Zadoka i ka hakahaka o Abiatara.
Mgbe ahụ, eze họpụtara Benaya, nwa Jehoiada ka ọ bụrụ onyeisi ndị agha ya niile, ma mee Zadọk onye nchụaja nʼọnọdụ Abịata.
36 Hoouna ae la ke alii e kii ia Simei, a i ae la ia ia, E kukulu oe i hale nou ma Ierusalema, a malaila e noho ai, mai hele aku oe mai ia wahi aku.
Emesịa, eze ziri Shimei ozi sị ya, “wuoro onwe gị ụlọ na Jerusalem, biri nʼebe ahụ, esitekwala nʼebe ahụ pụọ jee ebe ọbụla.
37 No ka mea, eia, i kou la e puka aku ai maluna o ke kahawai Kederona, e ike oe he oiaio no e make io no oe, a maluna o kou poo iho kou koko.
Nʼihi na ụbọchị ị ga-apụ gafee iyi dị na Ndagwurugwu Kidrọn, mara nke ọma na ị ghaghị ịnwụ. Ọbara gị ga-adịkwa gị nʼisi.”
38 Olelo aku la hoi o Simei i ke alii, he pono ka olelo; a e like me ka olelo a kuu haku ke alii, pela no e hana aku ai kau kauwa. A noho iho la o Simei ma Ierusalema i na la he nui.
Shimei zara eze, “Okwu gị dị mma. Ohu gị ga-eme dịka onyenwe m bụ eze kwuru.” Shimei biiri nʼime Jerusalem, nọọkwa ọtụtụ ụbọchị.
39 Eia kekahi, i ka pau ana o na makahiki ekolu, holo malu aku la elua o na kauwa a Simei ia Akisa ke keiki a Maaka ke alii o Gata: a olelo mai la lakou ia Simei, i mai la, Aia kau mau kauwa ma Gata.
Ma nʼọgwụgwụ afọ atọ, ndị ohu abụọ Shimei nwere gbapụrụ ọsọ gbakwuru Akish, nwa Maaka, eze Gat. Ndị mmadụ bịara gwa Shimei sị ya, “Lee, ndị ohu gị nọ na Gat.”
40 Ku ae la hoi o Simei, a kau aku la i ka noholio maluna o kona hoki a holo aku la i Gata, ia Akisa e imi ana i kana mau kauwa; a holo no Simei a hoihoi mai i kana mau kauwa mai Gata mai.
Nke a mere ka o bilie, rịkwasị nʼelu ịnyịnya ibu ya, gaa Gat, jekwuru Akish nʼihi ịchọ ndị ohu ya. Shimei gara mee ka ndị ohu ya soro ya laghachite azụ.
41 Haiia'ku la ia Solomona, ua hele aku o Simei mai Ierusalema aku i Gata, a ua hoi mai.
Mgbe a gwara Solomọn na Shimei hapụrụ Jerusalem gaa Gat ma lọghachikwa azụ,
42 Hoouna ae ke alii e kii ia Simei, a i ae la ia ia, Aole anei na'u i hoohiki ai oe ma o Iehova la, a i olelo aku au ia oe penei, I kou la e puka aku ai a hele mawaho i kahi e, e ike oe he oiaio, e make io no oe? a olelo mai la oe ia'u, He pono ka olelo a'u e lohe nei.
eze ziri ozi kpọọ Shimei sị ya, “Ọ bụ na m adọghị gị aka na ntị, jiri aha Onyenwe anyị ṅụọ iyi sị, ‘Mara nke ọma nʼụbọchị ọbụla ị ga-esi nʼebe a pụọ gaa nʼebe ọbụla ọzọ, na ị ga-anwụ?’ Nʼoge ahụ, ị zara m sị m, ‘Okwu gị dị mma. Aga m emekwa ya.’
43 No ke aha la hoi i malama ole ai oe i kau mea i hoohiki ai no Iehova, a me ke kauoha a'u i kauoha aku ai ia oe?
Ọ bụ gịnị mere i ji mebie iyi ị ṅụrụ nye Onyenwe anyị, jụkwa idebe ihe m nyere gị nʼiwu?”
44 Olelo hou ae la ke alii ia Simei, Ua ike no oe i ka hewa a pau i maopopo i kou naau, au i hana mai ai ia Davida ko'u makuakane: nolaila e hoihoi aku o Iehova i kou hewa maluna iho o kou poo;
Eze gwakwara Shimei okwu sị ya, “I maara ihe ọjọọ niile i mere megide nna m Devid. Ugbu a Onyenwe anyị ga-akwụghachi gị ụgwọ nʼihi omume ọjọọ gị.
45 A e pomaikai Solomona ke alii, a e hooku paa mau loa ia ka nohoalii o Davida ma ke alo o Iehova.
Ma eze Solomọn ga-abụ onye a gọziri agọzi. Ocheeze Devid ga-eguzosikwa ike nʼihu Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi.”
46 Alaila kena ae la ke alii ia Benaia ke keiki a Iehoiada, a puka ae ia, a lele aku ia ia a make ia. A ua hoopaaia ke aupuni iloko o ka lima o Solomona.
Mgbe ahụ, eze nyere Benaya, nwa Jehoiada iwu ka o gbuo Shimei. Ọ pụkwara tituo ya, ọ nwụọ. Sitekwa nʼoge ahụ, alaeze Solomọn guzosiri ike nʼaka ya.