< I Oihanaalii 25 >
1 EIA hoi kekahi, hookaawale ae la o Davida a me na lunakaua i na keikikane a Asapa me ka Hemana a me ka Iedutuna, no ka oihana; na lakou e wanana mai me na lira, na pesaleteria, a me na kimebala: a eia ka poe lawehana e like me ka lakou hana ana;
Devid na ndịisi agha ndị Izrel họpụtara ndị ga na-ebu amụma mgbe ndị ji ụbọ akwara, une na ogene na-eti egwu. Ha sitere nʼụmụ Asaf, Heman na Jedutun, họpụta ha. Ndị a bụ aha ndị rụrụ ọrụ nke a:
2 No na keikikane a Asapa; o Zakura, o Iosepa, o Netania, a o Asarela, na keikikane a Asapa, malalo no o na lima o Asapa, nana i wanana mai, e like me ke kauoha a ke alii.
Ndị amụma na-ebu amụma, ndị nke bụ ụmụ Asaf: Zakua, Josef, Netanaya na Asarela bụ ụmụ Asaf nọ nʼokpuru Asaf, onye nọ nʼokpuru eze bụ onyeisi ha.
3 No Iedutuna: o na keikikane a Iedutuna; o Gedalia, o Zeri, o Iesaia, o Hasabia, a o Matitia, eono, malalo o na lima o ko lakou makuakane o Iedutuna, nana i wanana mai me ka lira, e hooaloha aku a e hoolea ia Iehova.
Ma nye Jedutun, ụmụ ndị ikom ya: Gedaliya, Zeri, Jeshaya, Shimei, Hashabaya na Matitaia. Ha dị isii nʼọnụọgụgụ nọrọ nʼokpuru nna ha bụ Jedutun, onye na-ebu amụma, na-eji une na-enye Onyenwe anyị ekele na otuto.
4 No Hemana: o na keikikane a Hemana; o Bukia, o Matania, o Uziela, o Sebuela, o Ierimota, o Hanania, o Hanani, o Eliata, o Gidaleti, o Romameti-ezera, o Iosebekasa, o Maloti, o Hotira a o Mahaziota.
Ma nye Heman, ụmụ ndị ikom ya: Bukaya, Matanaya, Uziel, Shubuel, Jerimot, Hananaya, Hanani, Eliata, Gidalti, Romamti-Eza, Joshbekasha, Maloti, Hotia, na Mahaziot.
5 O lakou nei a pau na keikikane a Hemana, a ke kaula o ke alii ma na mea o ke Akua, e hookiekie ae i ka pu. A haawi mai la ke Akua i na keikikane he umikumamaha, a me na kaikamahine ekolu na Hemana.
Ndị a niile bụ ụmụ Heman, onye bụ ọhụ ụzọ eze. Dịka nkwa Chineke kwere maka ibuli ya elu, Chineke nyere ya ụmụ ndị ikom iri na anọ, na ụmụ ndị inyom atọ.
6 O keia poe a pau, malalo o na lima o ko lakou makuakane no ka mele iloko o ka hale o Iehova, me na kimebala, na pesaleteria, a me na lira, no ka oihana ma ka hale o ke Akua, e like me ke kauoha a ke alii ia Asapa, ia Iedutuna, a me Hemana.
Ụmụ ndị ikom ndị a niile nọ nʼokpuru nna ha, maka ịbụ abụ nʼụlọ Onyenwe anyị na-eji ịkpọ ụbọ na une na iti ọla na-ada ụda, nʼihi ofufe ụlọ Chineke. Asaf, na Jedutun, na Heman nọkwa nʼokpuru nlekọta eze.
7 A o ka huina o lakou a pau, me ko lakou poe hoahanau, i aoia i na mele no Iehova, o ka poe akamai a pau, he alua haneri me ke kanawalukumamawalu.
Ọnụọgụgụ ha tinyere ụmụ nne ha ndị e nyere ọzụzụ nʼihe gbasara abụ, bụ ndị nwere nghọta nʼihe banyere abụ a na-abụku Onyenwe anyị, dị narị abụọ, na iri asatọ na asatọ.
8 A puu iho la lakou, o kekahi papa e ku pono ana i kekahi papa, o na mea nui a me na mea uuku, o ke kumu a me ka haumana.
Ha ji ife nza kee ọrụ ha, ma onye ukwu ma onye nta nʼime ha, ndị nwere nghọta ma ndị a na-azụ azụ, nʼotu aka ahụ.
9 A puka mai la ka puu mua no Asapa ia Iosepa: o ka lua ia Gedalia, oia me na hoahanau ona a me na keikikane, he umikumamalua:
Nza nke mbụ e fere mara Josef nwa Asaf, ya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ. Nke abụọ, Gedaliya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
10 O ke kolu ia Zakura; o na keikikane ana a me kona mau hoahanau, he umikumamalua:
Nke atọ, Zakua na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
11 O ka ha ia Izeri; o na keikikane ana, a me kona mau hoahanau, he umikumamalua:
Nke anọ, Izri na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
12 O ka lima ia Netania; o na keikikane ana, a me kona mau hoahanau, he umikumamalua:
Nke ise, Netanaya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
13 O ke ono ia Bukia; o na keikikane ana, a me kona mau hoahanau, he umikumamalua:
Nza nke isii mara Bukaya, na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
14 O ka hiku ia Iesarela; o kana mau keikikane, a me na hoahanau ona, he umikumamalua:
Nke asaa, Jesarela na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
15 O ka walu ia Iesaia; o kana mau keikikane, a me na hoahanau ona, he umikumamalua:
Nke asatọ, Jeshaya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
16 O ka iwa ia Matania; o kana mau keikikane, a me na hoahanau ona, he umikumamalua:
Nke itoolu, Matanaya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
17 O ka umi ia Simei, o kana mau keikikane, a me na hoahanau ona, he umikumamalua:
Nke iri, Shimei na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
18 O ka umikumamakahi ia Azareela; o kana mau keikikane a me na hoahanau ona, he umikumamalua:
Nke iri na otu, Azarel na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
19 O ka umikumamalua ia Hasabia; o kana mau keikikane, a me na hoahanau ona, he umikumamalua:
Nza nke iri na abụọ mara Hashabaya, na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
20 O ka umikumamakolu ia Subaela; o kana mau keikikane, a me na hoahanau ona, he umikumamalua:
Nke iri na atọ, Shubuel na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
21 O ka umikumamaha ia Matitia; o kana mau keikikane, a me na hoahanau ona, he umikumamalua:
Nke iri na anọ, Matitaia na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
22 O ka umikumamalima ia Ieremota; o kana mau keikikane a me na hoahanau ona, he umikumamalua:
Nke iri na ise, Jeremot na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
23 O ka umikumamaono ia Hanania; o kana mau keikikane a me na hoahanau ona, he umikumamalua:
Nke iri na isii, Hananaya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
24 O ka umikumamahiku ia Iosebekasa; o kana mau keikikane, a me na hoahanau ona, he umikumamalua:
Nke iri na asaa, Joshbekasha na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
25 O ka umikumamawalu ia Hanani; o kana mau keikikane, a me kona mau hoahanau, he umikumamalua:
Nza nke iri na asatọ mara Hanani, na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
26 O ka umikumamaiwa ia Maloti; o kana mau keikikane, a me na hoahanau ona, he umikumamalua:
Nke iri na itoolu, Maloti na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
27 O ka iwakalua ia Eliata; o kana mau keikikane, a me na hoahanau ona, he umikumamalua:
Nke iri abụọ, Eliata na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
28 O ka iwakaluakumamakahi ia Hotira; o kana mau keikikane a me na hoahanau ona, he umikumamalua:
Nke iri abụọ na otu, Hotia na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
29 O ka iwakaluakumamalua ia Gidaleti; o kana mau keikikane a me na hoahanau ona, he umikumamalua:
Nke iri abụọ na abụọ, Gidalti na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
30 O ka iwakaluakumamakolu ia Mahaziota; o kana mau keikikane, a me na hoahanau ona, he umikumamalua:
Nke iri abụọ na atọ, Mahaziot na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
31 O ka iwakaluakumamaha ia Romametiezera: o kana mau keikikane, a me na hoahanau ona, he umikumamalua.
Ebe nza nke iri abụọ na anọ mara Romamti-Eza, na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.