< Zabura 106 >

1 Yabi Ubangiji. Yi godiya ga Ubangiji, gama nagari ne shi; ƙaunarsa madawwamiya ce har abada.
Toonu Onyenwe anyị. Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma; Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
2 Wane ne zai furta manyan ayyukan Ubangiji ko yă furta cikakken yabonsa?
Onye pụrụ ikwupụtasịcha ihe ukwu niile nke Onyenwe anyị na-arụ maọbụ kwupụta otuto ya niile?
3 Masu albarka ne waɗanda suke yin adalci, waɗanda kullum suke yin abin da yake daidai.
Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ikpe ziri ezi, ndị ahụ na-eme ezi ihe mgbe niile.
4 Ka tuna da ni, ya Ubangiji, sa’ad da ka nuna alheri ga mutanenka, ka zo ka taimake ni sa’ad da ka cece su,
O Onyenwe anyị, cheta m mgbe ị ga-egosi ndị gị ihuọma, bịa leta m, mgbe ị na-azọpụta ha,
5 don in ji daɗin nasarar zaɓaɓɓunka, don in sami rabo cikin farin cikin al’ummarka in kuma shiga gādonka cikin yin yabo.
ka m soro keta oke na ngọzị ndị gị ị họpụtara, ka m keta oke nʼọṅụ ahụ dịrị mba gị sorokwa ihe nketa gị nye otuto.
6 Mun yi zunubi, kamar yadda kakanninmu suka yi; mun yi ba daidai ba muka kuma aikata mugunta.
Anyị emehiela, dịka nna nna anyị ha mehiere; anyị emeela ihe ọjọọ, rụọkwa ọrụ ajọ omume.
7 Sa’ad da kakanninmu suke a Masar, ba su damu da mu’ujizanka ba; ba su tuna yawan alheranka ba, suka kuma yi tayarwa a teku, Jan Teku.
Mgbe nna nna anyị ha nọ nʼIjipt, ha echeghị uche banyere ọrụ ebube gị niile; ha echetakwaghị ịba ụba nke ebere gị niile, kama ha nupuru isi nʼakụkụ oke osimiri ahụ, bụ Osimiri Uhie.
8 Duk da haka ya cece su saboda sunansa, don yă sanar da ikonsa mai girma.
Ma ọ zọpụtara ha nʼihi aha ya, ime ka a mara ike ya dị ukwuu.
9 Ya tsawata wa Jan Teku, ya kuwa bushe; ya bi da su ta cikin zurfafa sai ka ce a hamada.
Ọ baara Osimiri Uhie mba, ọ tachaa; o dufere ndị ya site nʼebe dị omimi gafee dịka ọ bụ ọzara.
10 Ya cece su daga hannun maƙiyi; daga hannun abokin gāba ya fanshe su.
Ọ zọpụtara ha site nʼaka ndị kpọrọ ha asị; gbapụtakwa ha site nʼaka ndị iro ha.
11 Ruwaye suka rufe abokan gābansu; babu ko ɗaya da ya tsira.
Mmiri ahụ riri ndị iro ha niile; ọ dịghị otu onye nʼime ha fọdụrụ.
12 Sa’an nan suka gaskata alkawarinsa suka kuma rera yabonsa.
Mgbe ahụ, ha kweere okwu gị niile, ma bụkuo gị abụ otuto.
13 Amma nan da nan suka manta abin da ya yi ba su kuwa jira shawararsa ba.
Ma o teghị aka, ha chefuru ihe niile ọ rụrụ, ha e chereghị ka ndụmọdụ ya pụta ìhè.
14 A cikin hamada suka bar sha’awarsu ta mamaye su a ƙasar da babu kome suka gwada Allah.
Nʼọzara, ha sooro ọchịchọ nke obi ha; nʼala tọgbọrọ nʼefu, ha nwara Chineke ọnwụnwa.
15 Sai ya ba su abin da suka roƙa, amma ya aika musu da muguwar cuta.
Nʼihi ya, o nyere ha ihe ha rịọrọ ya, ma zite ọrịa na-efe efe ka ọ dakwasị ha.
16 A sansani suka ji kishin Musa da kuma Haruna, wanda Ubangiji ya keɓe.
Nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ha, ha kworo ekworo megide Mosis na Erọn, ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị.
17 Ƙasa ta buɗe ta haɗiye Datan ta binne iyalin Abiram.
Ala meghere loda Datan, o likwara Abiram, na ndị otù ya.
18 Wuta ta ƙuno a cikin mabiyansu; harshen wuta ya cinye mugaye.
Ọkụ repịara ndị niile sonyere ha; ire ọkụ repịara ndị ajọ omume.
19 A Horeb suka yi ɗan maraƙi suka yi wa gunkin zubi daga ƙarfe sujada.
Na Horeb, ha kpụrụ nwa ehi, kpọọ isiala nye arụsị e jiri igwe pịa.
20 Suka sauke Ɗaukakarsu saboda siffar bijimi, wanda yake cin ciyawa.
Ha jiri oyiyi oke ehi nke na-ata ahịhịa gbanwere Ebube ha.
21 Suka manta da Allahn da ya cece su, wanda ya aikata manyan abubuwa a Masar,
Ha chefuru Chineke, onye zọpụtara ha, onye rụrụ ọtụtụ ọrụ dị ukwuu nʼIjipt,
22 mu’ujizai a ƙasar Ham ayyukan banrazana a Jan Teku.
ọtụtụ ihe ịrịbama nʼala Ham, na ọtụtụ ọrụ ịtụnanya nʼakụkụ Osimiri Uhie.
23 Don haka ya ce zai hallaka su, amma Musa, zaɓaɓɓensa, ya yi godo a gabansa don yă kau da hasalarsa daga hallaka su.
Nʼihi ya, o kwuru na ọ ga-ala ha nʼiyi, ma Mosis, onye ya ọ họpụtara, guzoro nʼetiti ndị ahụ na Chineke, ka oke iwe ya ghara ịla ha nʼiyi.
24 Sai suka rena ƙasa mai ni’ima; ba su gaskata alkawarinsa ba.
Emesịa, ha ledara ala ọma ahụ anya, ha ekwenyeghị na nkwa ya.
25 Suka yi gunaguni a tentunansu ba su kuwa yi biyayya da Ubangiji ba.
Ha tamuru ntamu nʼime ụlọ ikwu ha; ha erubekwaghị isi nye Onyenwe anyị.
26 Saboda haka ya rantse musu ya kuma ɗaga hannu cewa zai sa su mutu a cikin hamada,
Nʼihi nke a, o weliri aka ya elu ṅụọrọ ha iyi na ọ ga-eme ka ha niile nwụọ nʼọzara,
27 ya sa zuriyarsu su mutu a cikin al’ummai ya kuma watsar da su cikin dukan ƙasashe.
mee ka agbụrụ ha daa nʼetiti mba dị iche iche, ma chụsasịa ha nʼala niile.
28 Suka haɗa kai da Ba’al-Feyor suka kuma ci hadayun da aka miƙa wa allolin da ba su da rai;
Ha dịnyeere ndị na-efe arụsị Baal nke Peoa, riekwa ihe e ji chụọrọ chi na-enweghị ndụ aja;
29 suka tsokane Ubangiji ya yi fushi ta wurin mugayen ayyukansu, sai annoba ta ɓarke a cikinsu.
ha sitere nʼajọ omume ha kpasuo Onyenwe anyị iwe, nke mere ka ọrịa na-efe efe dakwasị ha.
30 Amma Finehas ya miƙe tsaye ya ɗauki mataki, sai annobar ta daina.
Ma Finehaz guzoro ọtọ, mee ihe ziri ezi, ọrịa ahụ na-efe efe kwụsịkwara.
31 An ayana masa wannan a matsayin adalci har zamanai marar matuƙa masu zuwa.
A gụnyere nke a dịka ezi omume nye ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
32 A ruwan Meriba suka ba Ubangiji fushi, sai wahala ta zo wa Musa saboda su;
Nʼakụkụ mmiri Meriba, ha kpasuru Onyenwe anyị iwe, nʼihi ha, nsogbu dakwasịrị Mosis;
33 saboda sun yi tayarwa a kan Ruhun Allah, har mugayen kalmomi suka fito daga leɓunan Musa.
nʼihi na ha nupuru isi megide Mmụọ nke Chineke, Mosis kwuru okwu, na-echeghị echiche banyere ihe ọ na-ekwu.
34 Ba su hallakar da mutanen yadda Ubangiji ya umarce su ba,
Ha egbuchapụghị mba niile bi nʼala ahụ dịka Onyenwe anyị dọrọ ha aka na ntị ka ha mee.
35 amma suka yi cuɗanya da al’ummai suka ɗauki al’adunsu.
Kama ha gwakọtara onwe ha na mba niile nke ala ahụ, site otu a, mụta ime ka ha na-eme.
36 Suka yi wa gumakansu sujada, waɗanda suka zama tarko gare su.
Ha fere arụsị ha ofufe, nke ghọrọ ihe ịma nʼọnya nye ha.
37 Suka miƙa’ya’yansu maza hadaya’yan matansu kuma ga aljanu.
Ha gara nʼihu were ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom chụọrọ chi na-abụghị chi aja.
38 Suka zub da jini marar laifi, jinin’ya’yansu maza da mata, waɗanda suka miƙa hadaya ga gumakan Kan’ana, ƙasar kuwa ta ƙazantu ta wurin jininsu.
Ha na-awụfu ọbara ndị na-emeghị ihe ọbụla, ọbara ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom, bụ ndị ha chụrụ dịka aja nye arụsị niile nke ala Kenan, si otu a jiri ọbara ha merụọ ala ahụ.
39 Suka ƙazantar da kansu ta wurin abin da suka yi; ta wurin ayyukansu suka yi karuwanci.
Ha sitere nʼihe ha na-eme merụọ onwe ha; site nʼaka ọrụ ha, maka uru ha nyefere onwe ha nʼaka ndị na-emerụ ha.
40 Saboda haka Ubangiji ya yi fushi da mutanensa ya ji ƙyamar gādonsa.
Nʼihi nke a, iwe were Onyenwe anyị megide ndị ya; ọ gụkwara ihe nketa ya dịka ihe rụrụ arụ.
41 Ya miƙa su ga al’ummai, maƙiyansu kuma suka yi mulki a kansu.
Ọ raara ha nye nʼaka ndị mba ọzọ dị iche iche, ndị kpọrọ ha asị chịkwara ha.
42 Abokan gābansu suka danne su suka sa su a ƙarƙashin ikonsu.
Ndị iro ha mekpara ha ahụ chie ha ọnụ nʼala nʼokpuru ike ha.
43 Sau da yawa ya cece su, amma sun nace su yi tawaye suka kuma lalace cikin zunubinsu.
Ọtụtụ oge, ọ napụtara ha, ma ha nọgidesịrị ike nʼinupu isi site na ndụmọdụ ya, bụrụ ndị lara nʼiyi nʼime mmehie ha.
44 Amma ya lura da wahalarsu sa’ad da ya ji kukansu;
Ma mgbe ọ nụrụ mkpu akwa ha, ọnọdụ mkpagbu ha metụtara ya;
45 saboda su ya tuna da alkawarinsa kuma daga yawan ƙaunarsa ya ji tausayi.
nʼihi ha, o chetara ọgbụgba ndụ ya, sitekwa nʼoke ịhụnanya ya, meere ha ebere.
46 Ya sa aka ji tausayinsu a wurin dukan waɗanda suka kame su.
Ọ na-emekwa ka ndị ahụ dọtara ha nʼagha nwee ọmịiko nʼahụ ha.
47 Ka cece mu, Ubangiji Allahnmu, ka kuma tattara mu daga al’ummai, don mu yi wa sunanka mai tsarki godiya mu kuma ɗaukaka cikin yabonka.
O Onyenwe anyị Chineke anyị, zọpụta anyị, chịkọta anyị site nʼaka mba dị iche iche, ka anyị nwee ike nye aha nsọ gị ekele ma nyaakwa isi nʼime otuto gị.
48 Yabo ga Ubangiji, Allah na Isra’ila, daga madawwami zuwa madawwami. Bari dukan mutane su ce, “Amin!” Yabo ga Ubangiji.
Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. Ka mmadụ niile sị, “Amen!” Toonu Onyenwe anyị.

< Zabura 106 >