< Ƙidaya 32 >
1 Mutanen Ruben da mutanen Gad, da suke da garken shanu da kuma garke tumaki masu yawa, suka ga cewa ƙasashen Yazer da Gileyad wurare ne masu kyau don kiwon shanu da tumaki.
Mgbe ndị Izrel rutere ala Jeza na Gilead, ndị ebo Ruben na Gad ndị nwere ọtụtụ igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ chọpụtara na ala ahụ dị mma nke ukwuu maka ịzụ anụ ụlọ.
2 Saboda haka suka zo wurin Musa da Eleyazar da kuma shugabannin jama’a, suka ce,
Ya mere, ha bịakwutere Mosis na Elieza onye nchụaja, na ndị ndu nzukọ Izrel, sị ha,
3 “Atarot, Dibon, Yazer, Nimra, Heshbon, Eleyale, Sebam, Nebo da Beyon,
“Ala ndị a: Atarọt, Dibọn, Jeza, Nimra, Heshbọn, Eleale, Sebam, Nebo, na Beon,
4 ƙasar da Ubangiji ya ci da yaƙi a gaban mutane Isra’ila, suna da kyau don dabbobi, bayinku kuma suna da dabbobi.”
bụ ala nke Onyenwe anyị meriri nʼagha nʼihu nzukọ Izrel, dị mma maka ịzụ anụ ụlọ. Anyị onwe anyị kwa nwere igwe ewu na atụrụ.
5 Suka ce, “In mun sami tagomashi daga gare ka bari a ba da wannan ƙasa ga bayinka, tă zama mallakanmu. Kada ka sa mu haye Urdun.”
Ọ bụrụ na anyị achọtala amara nʼihu unu, biko, kwerenụ ka akụkụ ala a bụrụ ihe nketa nke anyị bụ ohu unu. Unu emekwala ka anyị soro ndị Izrel gafee nʼakụkụ nke ọzọ nke osimiri Jọdan.”
6 Musa ya ce wa mutanen Gad da mutanen Ruben, “Wato, sai’yan’uwanku su yi ta yaƙi ku kuwa ku zauna nan?
Mosis jụrụ ndị Gad na Ruben ajụjụ sị, “Unu na-ekwu na unu chọrọ ịnọ nʼebe a mgbe ụmụnna unu ndị ikom niile ga-agafe osimiri Jọdan ịlụ agha niile ahụ dị na-eche ha?
7 Don me za ku karya zuciya Isra’ilawa daga hayewa zuwa ƙasar da Ubangiji ya ba su?
Ọ bụ nʼihi gịnị ka unu ji eme ka ndị Izrel daa mba ghara ịgafe banye nʼala ahụ Onyenwe anyị nyerela ha?
8 Haka iyayenku suka yi sa’ad da na aike su daga Kadesh Barneya don su dubo ƙasar.
Otu a ka nna unu ha mere mgbe m si Kadesh Banea zipụ ha inyocha ala ahụ.
9 Gama bayan suka haura Kwarin Eshkol suka hangi ƙasar, sai suka karya zuciyar Isra’ilawa daga shigar ƙasar da Ubangiji ya ba su.
Mgbe ha letasịrị ala ahụ si na Ndagwurugwu Eshkọl lọghachi, ha mere ka obi ndị Izrel niile daa mba ịbanye nʼala ahụ Onyenwe anyị nyere ha.
10 A ranar kuwa Ubangiji ya husata har ya yi wannan rantsuwa cewa,
Nʼihi nke a Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide ha nʼụbọchị ahụ. Ọ ṅụrụ iyi kwuo sị,
11 ‘Tabbatacce ba wani daga cikin mutanen da suka fito daga Masar, tun daga mai shekara ashirin zuwa gaba, da zai ga ƙasar da na rantse zan ba Ibrahim, da Ishaku, da Yaƙub, domin ba su bi ni sosai ba,
‘Nʼihi na unu jụrụ iji obi unu niile gbasoo m, o nweghị onye ọbụla nʼime ndị ahụ o si nʼala Ijipt kpọpụta, ndị gbara iri afọ abụọ rigoo, ga-ahụ ala ahụ m kwere Ebraham na Aịzik na Jekọb nkwa inye ha.’
12 ba ko ɗaya sai dai Kaleb ɗan Yefunne Bakenizze da Yoshuwa ɗan Nun, don su ne kaɗai suka bi Ubangiji da zuciya ɗaya.’
Naanị ndị ọṅụṅụ iyi a na-emegideghị bụ Kaleb, nwa Jefune onye Keniz, na Joshua nwa Nun, nʼihi na ha jiri obi ha niile sogide Onyenwe anyị.
13 Ubangiji ya husata da Isra’ila har ya sa suka yi ta yawo a hamada shekara arba’in, sai da dukan tsaran da suka aikata wannan mugunta a gabansa, suka mutu.
Iwe Onyenwe anyị dịịrị ọkụ megide Izrel, o mere ka ha wagharịa nʼọzara iri afọ anọ, tutu ruo mgbe ọgbọ ahụ niile nke mere ihe ọjọọ nʼanya ya nwụchara.
14 “Ga shi ku kuma, tarin masu zunubi, kuna tsaya a matsayin kakanninku, kuna sa Ubangiji yă sāke husata da Isra’ila.
“Ma lee unu ugbu a, agbụrụ ndị mmehie, ọ bụkwa otu ihe ahụ ka unu na-eme! Unu na-achọ ime ka iwe dị ukwuu wee Onyenwe anyị megide ndị Izrel.
15 In kun juye daga binsa, zai sāke barin dukan wannan mutane a hamada, ku ne kuwa za ku zama sanadin hallakarsu.”
Ọ bụrụ na unu ajụ iso Onyenwe anyị ugbu a, Onyenwe anyị ga-emekwa ka ndị Izrel nọgide nʼọzara. Mbibi na ịla nʼiyi nke ga-abịakwasị ha ga-abụkwa nke unu ji aka unu kpatara ha.”
16 Sai suka zo wurin Musa, suka ce, “Muna so mu gina katangar dutse don dabbobinmu, da kuma birane don matanmu da’ya’yanmu a nan.
Ma ha zara sị ya, “Ọ gaghị adị otu a! Anyị ga-ewuru anụ ụlọ anyị ụlọ, tinye igwe ewu na atụrụ anyị nʼime ha. Anyị ga-ewukwara ndị nwunye anyị na ụmụntakịrị anyị obodo ebe ha ga-anọ.
17 Matanmu da’ya’yanmu za su zauna a biranen da suke da katanga, don kāriya daga mazaunan ƙasar, amma mu, za mu ɗauki makamai mu tafi tare da sauran Isra’ilawa, har mu kai su wuraren zamansu.
Ma anyị onwe anyị ga-eburu ngwa agha anyị, buru ndị Izrel niile ọzọ ụzọ gaa nʼihu ịlụ ọgụ, tutu anyị edubata ha nʼala nke ha ga-eketa. Ma ndị nwunye anyị na ụmụntakịrị anyị ga-anọ nʼobodo e wusiri ike, ikpuchite ezinaụlọ anyị niile site nʼaka ndị iro bi anyị gburugburu.
18 Ba za mu koma gidajenmu ba sai kowane mutumin Isra’ila ya sami gādonsa.
Anyị agaghị alọta nʼụlọ anyị tutu onye Izrel ọbụla enweta ihe nketa nke ya.
19 Ba za mu ci gādo tare da su a wancan hayin Urdun ba, domin mun sami gādonmu a wannan hayin gabashin Urdun.”
Anyị achọghị ihe nketa, nʼofe Jọdan nke ọzọ, nʼihi na anyị ewerela oke nke anyị nʼebe a, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan.”
20 Sai Musa ya ce musu, “In za ku yi haka, in za ku sha ɗamara da makamai a gaban Ubangiji, ku tafi yaƙi,
Mgbe ahụ, Mosis zara sị ha, “Ọ dị mma, ọ bụrụ na unu ga-eme dịka unu kwuru, jikere onwe unu, nʼihu Onyenwe anyị, ibu agha.
21 in kuma dukanku za ku yi ɗamara, ku ɗauki makaman yaƙi a hayin Urdun a gaban Ubangiji har lokacin da ya kori abokan gābansa daga gabansa,
Ọ bụrụ na ndị agha unu ga-eso gafee nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, soro ndị ọzọ buo agha tutu ruo mgbe Onyenwe anyị chụpụchara ndị iro ya niile,
22 to, sa’ad da aka ci ƙasar a gaban Ubangiji, kwa kuɓuta daga alhakinku ga Ubangiji da kuma Isra’ila. Ƙasan nan kuwa za tă zama mallakarku a gaban Ubangiji.
mgbe ahụ, e merichaa mba ndị ahụ niile nʼihu Onyenwe anyị, unu nwere ike ịlọghachi nʼebe a, bụrụ ndị ikpe na-amaghị nʼebe Onyenwe anyị na ndị Izrel nọ. Ala a dị nʼọwụwa anyanwụ, ga-abụ ihe nketa unu nwere site nʼaka Onyenwe anyị.
23 “Amma in ba ku yi haka ba, kun yi zunubi ke nan ga Ubangiji; kuma ku san cewa zunubinku zai tone ku.
“Ọ bụrụkwanụ na unu ajụ ime dịka unu kwuru, mgbe ahụ, ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-emehie megide. Matakwanụ na unu ga-emesịa nata ụgwọ ọrụ mmehie unu.
24 Ku gina birane domin matanku da’ya’yanku, ku gina katanga kuma domin dabbobinku, amma fa ku cika abin da kuka yi alkawari.”
Wuonụ obodo ebe ndị inyom na ụmụ unu ga-ebi, wuokwanụ ụlọ anụ maka igwe ewu na atụrụ unu, ma mezuokwanụ ihe niile unu kweere na nkwa.”
25 Mutanen Gad da mutanen Ruben, suka ce wa Musa, “Mu bayinka za mu yi yadda ranka yă daɗe ya umarta.
Ndị ebo Gad na Ruben sịrị Mosis, “Anyị bụ ndị ohu gị ga-eme dịka onyenwe anyị nyere nʼiwu.
26 ’Ya’yanmu da matanmu, garkunan shanunmu da na tumakinmu, za su kasance a nan biranen Gileyad.
Ụmụ anyị niile, na ndị inyom anyị niile, na igwe ewu na atụrụ anyị, na ehi anyị niile, ga-anọ nʼebe a, nʼobodo ndị a anyị wuru nʼala Gilead.
27 Amma bayinka, kowane mutum a cikinmu zai haye a gaban Ubangiji, zuwa yaƙi kamar yadda ranka yă daɗe ya faɗa.”
Ma anyị, ndị ohu gị, ndị niile tozuru ije agha, ga-agafe osimiri Jọdan ibu agha nʼihu Onyenwe anyị, dịka onyenwe anyị si kwuo.”
28 Sai Musa ya yi wa Eleyazar firist, da Yoshuwa ɗan Nun, da shugabannin gidajen kakannin kabilan mutanen Isra’ila kashedi a kansu,
Mgbe ahụ, Mosis nyere Elieza, bụ onye nchụaja, na Joshua nwa Nun, na ndịisi ezinaụlọ nke ebo Izrel niile iwu banyere ha,
29 ya ce, “In kowane sojan mutanen Gad da na mutanen Ruben, ya ɗauki makaman yaƙi, ya haye Urdun tare da ku a gaban Ubangiji, to, sa’ad da a ci ƙasar a gabanku, ku ba da ƙasar Gileyad tă zama mallakarsu.
Ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na ndị ebo Gad na Ruben, onye ọbụla nke jikere ịga agha, ga-eso unu gafee Jọdan nʼihu Onyenwe anyị, mgbe ahụ, oge unu lụgburu ndị ala ahụ niile, unu aghaghị inye ha ala Gilead dịka ihe nketa ha.
30 Amma in ba su haye tare da ku da shirin yaƙi ba, to, sai ku ba su gādo a wancan haye kamar sauran kabilun a Kan’ana.”
Ma ọ bụrụ na ha ajụ iso unu, ha ga-eso ndị ọzọ keta oke nʼala Kenan.”
31 Mutanen Gad da mutanen Ruben suka amsa, suka ce, “Barorinka za su yi abin da Ubangiji ya faɗa.
Ndị ebo Gad na Ruben zara sị, “Ihe ọbụla Onyenwe anyị nyere nʼiwu ka anyị ga-eme.
32 Za mu haye a gaban Ubangiji zuwa Kan’ana, amma mallakarmu ta gādo, za tă kasance a wannan hayi na Urdun.”
Anyị ga-ejikere soro Onyenwe anyị jee agha nʼala Kenan. Ma ihe nketa anyị ga-adị nʼebe a, nʼakụkụ Jọdan.”
33 Sai Musa ya ba wa mutanen Gad, mutanen Ruben, da rabin mutanen Manasse ɗan Yusuf, masarautar Sihon, sarkin Amoriyawa, da masarautar Og na Bashan, dukan ƙasar, tare da biranenta da kuma yankunan da suke kewaye.
Mosis nyere ndị ebo Gad, na Ruben, na ọkara Manase nwa Josef, alaeze niile Saịhọn eze Amọrị nakwa alaeze niile nke Ọg, eze ndị Bashan na-achị. O nyere ha ala ahụ niile, na obodo niile dị nʼala ahụ gburugburu.
34 Mutanen Gad suka gina Dibon, Atarot, Arower,
Ndị ebo Gad wugharịrị ma wusiekwa obodo ndị a, Dibọn, Atarọt, Aroea
35 Atrot Shofan, Yazer, Yogbeha,
Atrọt-Shofan, Jeza, Jogbeha,
36 Bet-Nimra, da Bet-Haran a matsayin birane masu katanga, suka kuma gina katanga don dabbobinsu.
Bet-Nimra na Bet-Haran bụ obodo e wusiri ike, wukwaara igwe ewu na atụrụ ha ụlọ anụ nʼime ya.
37 Mutanen Ruben suka sāke gina Heshbon, Eleyale, da Kiriyatayim,
Ma ndị ebo Ruben wugharịrị obodo ndị a: obodo Heshbọn, Eleale, Kiriatem,
38 haka kuma suka gina Nebo da Ba’al-Meyon (an canja waɗannan sunaye) suka kuma gina Sibma. Suka ba wa biranen da suka sāke ginawa sunaye.
Nebo na Baal-Meon (ma a gbanwere aha ha) na Sibma. Ha gbanwere aha obodo niile ndị ahụ ha wugharịrị, gụọ ha aha ọhụrụ.
39 Zuriyar Makir ɗan Manasse suka tafi Gileyad, suka ci ta da yaƙi, suka kori mutanen Amoriyawa da suke can.
Ndị agbụrụ Makia, nwa Manase gara nʼobodo Gilead lụgbuo ya, chụpụ ndị Amọrait bi nʼebe ahụ.
40 Saboda haka Musa ya ba da Gileyad ga mutanen Makir, zuriyar Manasse, suka kuma zauna a can.
Ya mere, Mosis were obodo Gilead nye Makia, ụmụ Manase ka ha biri nʼebe ahụ.
41 Yayir, wani ɗan Manasse, ya ci ƙauyukansu da yaƙi, ya kuma ba su sunan Hawwot Yayir.
Jia, onye sikwa nʼebo Manase gara buso ọtụtụ obodo nta ndị ọzọ agha, lụgbuo ha. Ọ gbanwere aha obodo nta ndị a, gụọ ha Havọt Jaịa.
42 Noba kuma ya ci Kenat da ƙauyukanta da yaƙi, ya kuma ba ta suna Noba, bisa ga sunansa.
Nʼoge a kwa, otu nwoke a na-akpọ Nọba duuru ndị agha gaa nʼobodo Kenat, na nʼobodo nta ndị ọzọ gbara ya gburugburu, lụgbuo ha, bichie nʼime ha. Ọ gbanwere aha obodo ndị ahụ niile bido ịkpọ ha Nọba, nke bụ aha ya onwe ya.