< Ƙidaya 26 >

1 Bayan annobar, sai Ubangiji ya yi magana da Musa da Eleyazar ɗan Haruna, firist ya ce,
Mgbe ihe otiti ahụ niile gasịrị, Onyenwe anyị gwara Mosis na Elieza nwa Erọn, onye nchụaja okwu sị ha,
2 “Ku ƙidaya dukan jama’ar Isra’ila daga mai shekaru ashirin zuwa gaba da za su iya aikin sojan Isra’ila.”
“Gaanụ gụọ, chọpụta ọnụọgụgụ nzukọ niile nke ụmụ Izrel dịka ezinaụlọ ha si dị; ndị niile gbara iri afọ abụọ gafee. Chọpụta ọnụọgụgụ ndị nwere ike ije agha.”
3 Musa da Eleyazar firist suka yi musu magana a filayen Mowab kusa da Urdun daga ƙetaren Yeriko, suka ce,
Ya mere, na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu Jeriko, ka Mosis na Elieza onye nchụaja nọ gwa ha okwu sị ha,
4 “Ku ƙidaya maza daga mai shekara ashirin zuwa gaba yadda Ubangiji ya umarci Musa.” Waɗannan su ne Isra’ilawan da suka fito daga Masar.
“Gụọnụ ndị ikom gbara iri afọ abụọ gafee ọnụ, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.” Ndị a bụ ndị Izrel si Ijipt pụta:
5 Zuriyar Ruben ɗan fari na Isra’ila, daga Hanok; kabilar Hanokawa; daga Fallu; kabilar Falluyawa;
Ụmụ ụmụ Ruben, ọkpara Izrel, bụ ndị a: site na Hanok, ikwu Hanok, site na Palu, ikwu Palu,
6 daga Hezron, kabilar Hezronawa; daga Karmi, kabilar Karmiyawa.
site na Hezrọn, ikwu Hezrọn site na Kami, ikwu Kami
7 Waɗannan su ne kabilan Ruben; jimillarsu ta kai 43,730.
Ndị a bụ agbụrụ Ruben. Ọnụọgụgụ ha dị iri puku anọ, puku atọ na narị asaa na iri atọ.
8 Ɗan Fallu kuwa shi ne Eliyab,
Nwa Palu bụ Eliab,
9 ’ya’yan Eliyab maza kuwa su ne, Nemuwel, Datan da Abiram. Datan da Abiram nan, su ne shugabannin mutanen da suka tayar wa Musa da Haruna, suna kuma cikin waɗanda suka bi Kora sa’ad da ya tayar wa Ubangiji.
ụmụ Eliab bụ Nemuel, Datan na Abiram. Datan na Abiram bụ ndị ndu ọgbakọ ahụ nupuru isi megide Mosis na Erọn. Ha sonyere ndị ahụ so Kora mgbe ha nupuru isi megide Onyenwe anyị.
10 Ƙasa kuwa ta buɗe ta haɗiye su tare da Kora, wanda ƙungiyarsa ta mutu sa’ad da wuta ta cinye mutum 250. Wannan kuwa ya zama alamar faɗakarwa.
Ala meghere ọnụ ya, loo ha na Kora, ma ọkụ rechapụrụ narị mmadụ abụọ na iri ise ndị ọzọ ahụ sonyere ha. Ọnwụ ha ghọrọ ihe ịdọ aka na ntị.
11 Amma fa, zuriyar Kora ba tă mutu ba.
Otu ọ dị, ndị niile si nʼezinaụlọ Kora anwụchaghị.
12 Zuriyar Simeyon bisa ga kabilansu, daga Nemuwel, kabilar Nemuwelawa; daga Yamin, kabilar Yaminawa; daga Yakin, kabilar Yakinawa;
Ụmụ ụmụ Simiọn dịka ikwu ha si dị bụ, site na Nemuel, ikwu Nemuel, site na Jamin, ikwu Jamin, site na Jakin, ikwu Jakin,
13 daga Zera, kabilar Zerawa; daga Sha’ul, kabilar Sha’ul.
Site na Zera, ikwu Zera, site na Shaul, ikwu Shaul.
14 Waɗannan su ne kabilan Simeyon; jimillarsu ta kai 22,200.
Ndị a bụ ndị agbụrụ Simiọn. Ọnụọgụgụ ndị ikom ha dị iri puku abụọ, puku abụọ na narị abụọ.
15 Zuriyar Gad bisa ga kabilansu, daga Zafon, kabilar Zafonawa; daga Haggi, kabilar Haggiwa; daga Shuni, kabilar Shunawa;
Ụmụ ụmụ Gad dịka ikwu ha si dị bụ ndị a: ikwu Zefọn, site na Zefọn, ikwu Hagi, site na Hagi, ikwu Shuni, site na Shuni,
16 daga Ozni, kabilar Ozniyawa daga Eri, kabilar Eriyawa;
ikwu Ozni, site na Ozni, ikwu Eri, site na Eri,
17 daga Arod, kabilar Arodiyawa; daga Areli, kabilar Areliyawa.
ikwu Arodi, site na Arodi, ikwu Areli, site na Areli,
18 Waɗannan su ne kabilan Gad, jimillarsu ta kai 40,500.
Ndị a bụ agbụrụ Gad. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku anọ na narị ise.
19 Er da Onan,’ya’yan Yahuda ne, amma sun mutu a Kan’ana.
Ụmụ ndị ikom Juda abụọ, Ịa na Onan, nwụrụ nʼala Kenan.
20 Zuriyar Yahuda bisa ga kabilansu, daga Shela, kabilar Shelayawa daga Ferez, kabilar Ferezawa; daga Zera, kabilar Zerawa;
Ma ụmụ ụmụ Juda ndị ọzọ, dịka ikwu ha dị iche iche si dị bụ ndị a: ikwu Shela, site na Shela, ikwu Perez, site na Perez, ikwu Zera, site na Zera.
21 Zuriyar Ferez kuwa, daga Hezron, kabilar Hezronawa; daga Hamul; kabilar Hamulawa.
Ikwu abụọ ọzọ si nʼagbụrụ Perez bụ ndị a: Ikwu Hezrọn, site na Hezrọn, Ikwu Hamul, site na Hamul.
22 Waɗannan su ne kabilan Yahuda; jimillarsu ta kai 76,500.
Ndị a bụ agbụrụ Juda. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku asaa, puku isii na narị ise.
23 Zuriyar Issakar bisa ga kabilansu, daga Tola, kabilar Tolatawa; daga Fuwa, kabilar Fuwayawa;
Ụmụ ụmụ Isaka dịka ikwu ha si dị bụ ndị a: ikwu Tola, site na Tola, ikwu Pua, site na Pua
24 daga Yashub, kabilar Yashubawa; daga Shimron, kabilar Shimronawa.
ikwu Jashub, site na Jashub, ikwu Shịmrọn, site na Shịmrọn.
25 Waɗannan su ne kabilan Issakar; jimillarsu ta kai 64,300.
Ndị a bụ agbụrụ Isaka. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku isii, puku anọ na narị atọ.
26 Zuriyar Zebulun bisa ga kabilansu, daga Sered, kabilar Seredawa; daga Elon kabilar Elonawa; daga Yaleyel; kabilar Yaleyewa.
Ụmụ ụmụ Zebụlọn dịka ikwu ha si dị bụ ndị a: ndị Sered, site nʼikwu Sered, ndị Elọn, site nʼikwu Elọn, ndị Jaliil, site nʼikwu Jaliil.
27 Waɗannan su ne kabilan Zebulun, jimillarsu ta kai 60,500.
Ndị a bụ agbụrụ Zebụlọn. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku isii na narị ise.
28 Zuriyar Yusuf bisa ga kabilansu ta wurin Manasse da Efraim.
Ụmụ ụmụ Josef dịka ha si dị nʼagbụrụ Manase na Ifrem bụ ndị a:
29 Zuriyar Manasse, daga Makir, kabilar Makiriyawa (Makir shi ne mahaifin Gileyad); daga Gileyad, kabilar Gileyadawa.
Ụmụ ụmụ Manase bụ ndị a: ndị Makia, site nʼikwu Makia. Makia bụ nna Gilead. Ikwu Gilead, site na Gilead.
30 Waɗannan su ne zuriya Gileyad, daga Iyezer, kabilar Iyezerawa; daga Helek, kabilar Helekawa;
Ndị a bụ ụmụ ụmụ Gilead: ikwu Leza, site na Leza, ikwu Helek, site na Helek.
31 daga Asriyel, kabilar Asriyelawa; daga Shekem, kabilar Shekem;
Ikwu Asriel, site na Asriel. Ikwu Shekem, site na Shekem.
32 daga Shemida, kabilar Shemadawa; daga Hefer, kabilar Heferawa.
Ikwu Shemida, site na Shemida, ikwu Hefa, site na Hefa.
33 (Zelofehad ɗan Hefer, ba shi da’ya’ya maza;’yan mata ne kaɗai ya haifa, sunayensu kuwa su ne Mala, Nowa, Hogla, Milka da Tirza.)
(Hefa mụtara nwoke a na-akpọ Zelofehad. Ma Zelofehad amụtaghị nwoke ọbụla kama ndị inyom ndị a ka ọ mụtara, Mahla, na Noa, na Hogla, na Milka, na Tịaza.)
34 Waɗannan su ne kabilan Manasse, jimillarsu ta kai 52,700.
Ndị a bụ agbụrụ Manase. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku ise, puku abụọ na narị asaa.
35 Waɗannan su ne kabilan Efraim bisa ga kabilansu, daga Shutela, kabilar Shutelawa; daga Beker, kabilar Bekerawa; daga Tahan, kabilar Tahanawa.
Ndị a bụ ụmụ ụmụ Ifrem dịka ikwu ha si dị: ikwu Shutela site na Shutela, ikwu Beka site na Beka, ikwu Tahan site na Tahan.
36 Waɗannan su ne kabilan Shutelawa, daga Eran, kabilar Eranawa.
Ndị a bụ ụmụ ụmụ Shutela: ikwu Eran site na Eran.
37 Waɗannan su ne kabilan Efraim; jimillarsu ta kai 32,500. Waɗannan su ne kabilan Yusuf ta wurin kabilansu.
Ndị a bụ agbụrụ Ifrem. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku atọ, puku abụọ na narị ise. Ndị a bụ ụmụ ụmụ Josef dịka ikwu ha si dị.
38 Zuriyar Benyamin bisa ga kabilansu, daga Bela, kabilar Belawa; daga Ashbel, kabilar Ashbelawa; daga Ahiram, kabilar Ahiramawa;
Ndị a bụ ụmụ ụmụ Benjamin dịka ikwu ha si dị: ikwu Bela site na Bela, ikwu Ashbel site Ashbel, ikwu Ahiram site na Ahiram.
39 daga Shufam, kabilar Shufamawa; daga Hufam, kabilar Hufamawa.
Ikwu Shufam site na Shufam, ikwu Hufam site na Hufam.
40 Zuriyar Bela daga Ard da Na’aman, daga Ard, kabilar Ardawa; daga Na’aman, kabilar Na’amawa;
Ụmụ ụmụ Bela site na Aad, na Naaman bụ, ikwu Aad site na Aad, ikwu Neeman site na Neeman.
41 Waɗannan su ne kabilan Benyamin, jimillarsu ta kai 45,600.
Ndị a bụ agbụrụ Benjamin. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku anọ, puku ise na narị isii.
42 Waɗannan su ne kabilan Dan bisa ga kabilarsu, daga Shuham, kabilar Shuhamawa. Waɗannan su ne kabilan Dan.
Ụmụ ụmụ Dan dịka ikwu ha si dị bụ ndị a: ikwu Shuham, site na Shuham. Ndị a bụ naanị ikwu dị na Dan.
43 Dukansu kabilan Shuhamawa ne, jimillarsu ta kai 64,400.
Ha niile si nʼagbụrụ Shuham. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku isii, puku anọ na narị anọ.
44 Zuriyar Asher bisa ga kabilansu, daga Imna, kabilar Imnawa daga Ishbi, kabilar Ishbiyawa; daga Beriya, kabilar Beriyawa;
Ụmụ ụmụ Asha dịka ikwu ha si dị bụ ndị a: ikwu Imna site na Imna, ikwu Ishvi, site na Ishvi, ikwu Beriya, site na Beriya.
45 daga zuriyar Beriya kuwa, daga Heber, kabilar Heberawa; daga Malkiyel, kabilar Malkiyelawa.
Ikwu e nwere site nʼụmụ ụmụ Beriya bụ ndị a: ikwu Heba, site na Heba, ikwu Malkiel, site na Malkiel.
46 (Asher yana da’ya mace da ake kira Sera.)
Asha mụtakwara otu nwa nwanyị aha ya bụ Sera.
47 Waɗannan su ne kabilan Asher; jimillarsu ta kai 53,400.
Ndị a bụ agbụrụ Asha. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku ise, puku atọ na narị anọ.
48 Zuriyar Naftali bisa ga kabilansu, daga Yazeyel, kabilar Yazeyelawa; daga Guni, kabilar Guniyawa;
Ụmụ ụmụ Naftalị dịka ikwu ha si dị bụ ndị a: ikwu Jaziil, site na Jaziil, ikwu Guni, site na Guni,
49 daga Yezer, kabilar Yezerawa; daga Shillem, kabilar Shillemawa.
ikwu Jeza, site na Jeza, ikwu Shilem, site na Shilem.
50 Waɗannan su ne kabilan Naftali, jimillarsu ta kai 45,400.
Ndị a si nʼagbụrụ Naftalị. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku anọ, puku ise na narị anọ.
51 Dukan jimillar mazan Isra’ila ta kai 601,730.
Ya mere, ọnụọgụgụ ndị ikom niile tozuru ije agha nʼIzrel dị narị puku isii, otu puku na narị asaa, na iri atọ.
52 Ubangiji ya ce wa Musa,
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
53 “Ka rarraba musu ƙasar a matsayin gādo, bisa ga yawan kabila.
“Ị ga-ekenye ha ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa ha dịka ọnụọgụgụ aha ha si dị.
54 Ga ƙungiya mafi girma, ka ba ta rabo mafi girma; ga ƙaramar ƙungiya kuwa, ka ba ta ƙarami rabo; kowane zai karɓa rabonsa ga yawan mutanen da aka rubuta.
Ndị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ ga-eketa ala dị ukwuu, ma ndị dị nta ga-eketa ala dị nta. Ihe nketa nke onye ọbụla ga-enweta ga-adị ka ọnụọgụgụ ahụ e dere.
55 Ka tabbatar an rarraba ƙasar ta wurin rabo. Abin da kowace ƙungiya ta gāda zai zama bisa ga sunayen kabilar kakanninta.
Lezie anya hụ na e kesara ala ahụ site nʼife nza. Ala ndị ọbụla ga-eketa ga-abụ dịka aha nna ochie ebo ha si dị.
56 Za a raba kowane gādo bisa ga rabo tsakanin manyan da ƙanana ƙungiyoyi.”
A ga-esite nʼife nza kenye ndị ọbụla ihe nketa nke ha dịka ịdị ukwuu maọbụ ịdị nta ha si dị.”
57 Waɗannan su ne Lawiyawa da a ƙidaya bisa ga kabilansu, daga Gershom, kabilar Gershonawa; daga Kohat, kabilar Kohatawa; daga Merari, kabilar Merari.
Ndị a bụ ndị Livayị a gụrụ ọnụ dịka ikwu ha si dị, ikwu Geshọn, site na Geshọn, ikwu Kohat, site na Kohat, ikwu Merari, site na Merari.
58 Waɗannan kuma su ne kabilan Lawiyawa, kabilar Libniyawa, kabilar Hebronawa, kabilar Maliyawa, kabilar Mushiyawa, kabilar Korayawa (Kohat shi ne kakan Amram;
Ndị a sikwa nʼagbụrụ Livayị: ikwu Libni, ikwu Hebrọn, ikwu Mahali, ikwu Mushi, na ikwu Kora. (Kohat bụ nna nna Amram.
59 sunan matan Amram shi ne Yokebed, ita zuriyar Lawi ce, wadda aka haifa wa Lawiyawa a Masar. A wajen Amram kuwa ta haifi Haruna, Musa da kuma’yar’uwarsu Miriyam.
Aha nwunye Amram bụ Jekobed, nwa nwa Livayị, onye a mụrụ nʼagbụrụ ndị Livayị nʼIjipt. Ọ mụtaara Amram ụmụ ndị a: Erọn na Mosis, na Miriam, nwanne ha nwanyị.
60 Haruna shi ne mahaifin Nadab, Abihu, Eleyazar da kuma Itamar.
Erọn mụtara Nadab, na Abihu, na Elieza, na Itama.
61 Amma Nadab da Abihu sun mutu sa’ad da suka miƙa hadaya da haramtacciyar wuta a gaban Ubangiji.)
Ma Nadab na Abihu nwụrụ mgbe ha chere ọkụ na-adịghị nsọ nʼihu Onyenwe anyị.)
62 Dukan’ya’yan Lawiyawa maza daga wata ɗaya zuwa gaba, jimillarsu ta kai 23,000. Ba a ƙidaya su tare da sauran Isra’ilawa ba, domin ba a ba su gādo tare da su ba.
Ọnụọgụgụ ụmụ ndị ikom Livayị niile dị otu ọnwa gaa nʼihu dị iri puku abụọ na puku atọ. Ma a gụnyekọghị ọnụọgụgụ agbụrụ Livayị nʼọnụọgụgụ ndị Izrel, nʼihi na agbụrụ Livayị enweghị oke ọbụla mgbe e kenyere agbụrụ Izrel niile ihe nketa ha.
63 Waɗannan su ne waɗanda Musa da Eleyazar firist, suka ƙidaya sa’ad da suka ƙidaya Isra’ilawa a filaye Mowab kusa da Urdun a hayen Yeriko.
Ya mere, ndị a bụ nchọpụta ọnụọgụgụ ụmụ Izrel, dịka Mosis na Elieza onye nchụaja kwadobere gụọ na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu obodo Jeriko.
64 Ba ko ɗayansu da yake cikin waɗanda Musa da Haruna firist, suka ƙidaya sa’ad da suka ƙidaya Isra’ilawa a Hamadar Sinai.
Ma nʼetiti ndị a, o nweghị otu onye ọbụla Mosis na Erọn onye nchụaja gụrụ nʼọnụọgụgụ mgbe ha gụrụ ndị Izrel ọnụ nʼọzara Saịnaị.
65 Gama Ubangiji ya riga ya gaya wa waɗancan Isra’ilawa cewa lalle za su mutu a hamada, kuma ba ko ɗayansu da ya rage, sai Kaleb ɗan Yefunne da Yoshuwa ɗan Nun.
Nʼihi na Onyenwe anyị gwara ndị Izrel ahụ na ha ga-anwụ nʼime ọzara ahụ. Naanị ndị a hapụrụ ndụ bụ Kaleb, nwa Jefune, na Joshua nwa Nun.

< Ƙidaya 26 >