< Nahum 2 >

1 Mai hari yana matsowa a kanki, Ninebe. Ki tsare mafaka, ki yi gadin hanya ki sha ɗamara ki tattaro dukan ƙarfinki!
Onye na-ebuso gị agha na-abịakwasị gị. Chee ebe gị niile e wusiri ike nche. Chee ụzọ niile nche, mee ka ụkwụ gị sie ike nʼala. Chịkọtakwa ike gị niile.
2 Ubangiji zai maido da darajar Yaƙub, kamar ta Isra’ila, ko da yake masu washewa sun washe su suka kuma lalatar da inabinsu.
Onyenwe anyị ga-eme ka ịma mma Jekọb laghachi, dịka ịma mma nke Izrel ọ bụ ezie na ndị mbibi ebibiela ha, lakwaa alaka osisi vaịnị ha niile nʼiyi.
3 Garkuwoyin sojojinsa ja wur ne; jarumawansa suna sanye da kaya masu ruwan jan garura. Ƙarafan kekunan yaƙi suna walƙiya a ranar da aka shirya su; ana kaɗa māsu da bantsoro.
Ọta ndị agha ya na-acha ọbara ọbara, ndị bụ dike nʼagha yikwa uwe na-acha uhie uhie. Igwe e ji wuo ụgbọ agha na-egbu amụma nʼụbọchị ahụ ha na-ejikere agha, otu a kwa, ha na-efegharịkwa ùbe ha eji osisi fịa mee.
4 Kekunan yaƙi sun zabura a tituna, suna kai da kawowa a dandali. Suna walƙiya kamar tocila suna sheƙawa a guje kamar walƙiya.
Ụgbọ agha na-eme mkpọtụ dị ukwuu nʼezi, ha na-agbagharị ihu na azụ nʼama niile. Ha na-enwu dịka ire ọkụ, na-agbagharịkwa dịka amụma.
5 Ninebe ta tattara rundunarta, duk da haka sun yi ta tuntuɓe a kan hanyarsu. Sun ruga zuwa katangan birnin, sun sanya garkuwar kāriya a inda ya kamata.
Ọ na-akpọkọta ndị agha ya a zụziri azụzi, ma ha na-asọ ngọngọ nʼije ha. Ha ji ọsọ gbaga ruo nʼelu mgbidi ha, dozie ọta nche ha niile nʼusoro.
6 An buɗe ƙofofin rafuffukan sai wurin ya rurrushe.
Ma e megheela ọnụ ụzọ ama nke osimiri, ụlọeze na-amakwa jijiji.
7 An umarta cewa birnin za tă tafi bauta, za a kuma yi gaba da su. Bayi’yan mata suna kuka kamar tattabaru suna buga ƙirjinsu.
E nyela ya ka ọ bụrụ iwu na obodo a aghaghị ịbụ obodo a dọtara nʼagha. Ndị ohu ha ndị inyom so ha nʼazụ na-akwa akwa dịka nduru, na-etikwa aka nʼobi.
8 Ninebe tana kama da tafki, wanda ruwanta yana yoyo. Suna kuka suna cewa, “Ku tsaya! Ku tsaya,” amma ba wanda ya waiga.
Ninive dịka ọdọ mmiri nke mmiri ya na-ehifusị. “Kwụsị! Kwụsị!” ka ha na-ebe, ma ọ dịghị onye ga-ele anya nʼazụ.
9 A washe azurfa; a washe zinariya; dukiyarsu ba ta da iyaka, arzikinsu kuma ba ya ƙarewa.
Kwakọrọnụ ọlaọcha, kwakọrọnụ ọlaedo dịka ihe a kwatara nʼagha. Akụnụba dị nʼụlọakụ ya na ihe ndị ọzọ bara uru nʼobodo ahụ, enweghị ọgwụgwụ.
10 Ta zama wofi, an washe ta, an tuɓe ta! Zukata sun narke, gwiwoyi suna kaɗuwa, jikuna suna rawa, fuskoki duk sun kwantsare!
E bibiela ya. A gbahapụla ya, hapụ ya ka ọ tọgbọrọ nʼefu. Obi ndị nọ nʼime ya na-alọ mmiri, ikpere ha niile na-ama jijiji, anụ ahụ ha niile na-amakwa jijiji, ihu niile achagharịakwala.
11 Ina kogon zakokin nan yake yanzu, inda suka ciyar da’ya’yansu, inda zaki da zakanya sukan shiga, da’ya’yansu, ba mai damunsu
Ebeekwa ka ọgba ọdụm ahụ dị ugbu a, bụ ebe ahụ ha na-anọ enye ụmụ ha nri, ebe oke ọdụm na nne ọdụm na-ejegharị, na ebe ụmụ ọdụm na-anọ na-atụghị egwu ihe ọbụla?
12 Zaki ya kashe abin da ya ishe’ya’yansa ya kuma murɗe wuyan dabbobi ya cika wurin zamansa da abin da ya kama ya cika kogwanninsa da abin da ya kashe.
Ọdụm ahụ na-adọgbu anụ na-ezuru ụmụ ya, nke na-anyagburu nne ọdụm anụ, na-ekpoju anụ ọ dọgbutara nʼụlọ ya niile. Ebe obibi ya jupụtara nʼanụ ọ dọgburu.
13 “Ina gāba da ke,” in ji Ubangiji Maɗaukaki. “Zan ƙone kekunan yaƙinki, takobi kuma zai fafare’ya’yan zakokinki. Ba kuma zan bar miki namun jejin da za ki kashe a duniya ba. Ba kuwa za a ƙara jin muryar’yan saƙonki ba.”
“Edoola m onwe m imegide gị,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri, “Aga m esure ụgbọala gị niile nʼanwụrụ ọkụ, mma agha ga-ala ụmụ ọdụm gị niile nʼiyi. Agaghị m ahapụkwara gị anụ ọbụla ị ga-adọgbu nʼụwa. A gaghị anụkwa olu ndị ozi gị ọzọ.”

< Nahum 2 >