< Mattiyu 26 >

1 Sa’ad da Yesu ya gama faɗin dukan waɗannan abubuwa, sai ya ce wa almajiransa,
Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị,
2 “Kamar yadda kuka sani, Bikin Ƙetarewa sauran kwana biyu, za a kuma ba da Ɗan Mutum don a gicciye shi.”
“Dị ka unu maara nke ọma, Mmemme Ngabiga ga-amalite mgbe ụbọchị abụọ gasịrị. Nʼoge ahụ, a ga-ararakwa Nwa nke Mmadụ nye ka a kpọgide ya nʼobe.”
3 Sai manyan firistoci da dattawan mutane, suka taru a fadan babban firist, mai suna Kayifas,
Nʼoge ahụ, ndịisi nchụaja, na ndị okenye zukọtara nʼụlọeze otu onyeisi nchụaja a na-akpọ Kaịfas.
4 suka ƙulla shawara su kama Yesu da makirci, su kuma kashe shi.
Ha gbara izu ịchọpụta ụzọ ha ga-esi jide Jisọs na nzuzo gbuo ya.
5 Suka ce, “Amma ba a lokacin Biki ba, don kada mutane su tā da rikici.”
Ha kwekọrịta sị, “Ọ gaghị abụ nʼoge mmemme ka ọgbaaghara hapụ ịdị nʼetiti ndị mmadụ.”
6 Yayinda Yesu yake a Betani, a gidan wani mutumin da ake kira Siman Kuturu,
Mgbe Jisọs nọ na Betani, nʼụlọ Saimọn onye ekpenta,
7 wata mace ta zo wurinsa da wani ɗan tulun alabasta na turaren mai tsada sosai, wanda ta zuba a kansa a lokacin da yake cin abinci.
otu nwanyị bu karama alabasta nke mmanụ otite isi ụtọ dị oke ọnụahịa dị nʼime ya, bịakwutere ya, nke ọ wụsara ya nʼisi dị ka ọ na-anọdụ ala nʼeri nri.
8 Sa’ad da almajiransa suka ga wannan, sai suka yi fushi. Suka ce, “Wannan almubazzaranci fa!
Ma mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, iwe were ha nke ukwuu. Ha sịrị, “Olee ụdị ịla nʼiyi dị nke a!
9 Wannan turare ai, da an sayar da shi da kuɗi mai yawa a ba matalauta kuɗin.”
A gaara erepụta mmanụ a ego dị ukwuu were ego e retara ya nyere ndị ogbenye aka.”
10 Sane da wannan, Yesu ya ce musu, “Me ya sa kuke damun macen nan? Ta yi mini abu mai kyau ne.
Ebe Jisọs matara ihe ha na-atamu nʼobi ha, ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji esogbu nwanyị a? O merela m ihe dị mma.
11 Matalauta za su kasance tare da ku kullum, amma ni ba zan kasance tare da ku kullum ba.
Unu na ndị ogbenye ga-anọ oge niile, ma ọ bụghị mụ na unu ga-anọ mgbe niile.
12 Sa’ad da ta zuba turaren nan a jikina, ta shirya ni ne don jana’izata.
Nʼihi na site nʼịwụ m mmanụ otite a nʼahụ, o doziela m maka olili.
13 Gaskiya nake gaya muku, duk inda aka yi wa’azin bisharan nan a duniya duka, abin da matan nan ta yi, za a riƙa faɗarsa don tunawa da ita.”
Nʼezie, ana m agwa unu, nʼebe ọbụla ezisara oziọma a nʼụwa niile, a ga na-echeta nwanyị a nʼihi ihe ọma a o meere m.”
14 Sai ɗaya daga cikin Sha Biyun nan, wanda ake kira Yahuda Iskariyot, ya je wurin manyan firistoci
Mgbe ahụ otu nʼime mmadụ iri na abụọ na-eso ụzọ ya, onye aha ya bụ Judas Iskarịọt, jekwuuru ndịisi nchụaja.
15 ya ce, “Me za ku ba ni, in na bashe shi gare ku?” Sai suka ƙirga masa kuɗi azurfa talatin.
Ọ jụrụ ha sị, “Gịnị ka unu ga-enye m ma m rara ya nye nʼaka unu?” Ha kwụrụ ya iri mkpụrụ ọlaọcha atọ.
16 Daga wannan lokaci, Yahuda ya yi ta neman zarafin da zai miƙa shi.
Site nʼoge ahụ na-aga, ọ chọrọ ohere ịrara ya nye nʼaka ha.
17 A rana ta fari ta Bikin Burodi Marar Yisti, sai almajiran suka zo wurin Yesu suka yi tambaya suka ce, “Ina kake so mu je mu shirya maka wurin da za ka ci Bikin Ƙetarewa?”
Nʼụbọchị mbụ nke mmemme achịcha na-ekoghị eko, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya jụọ ya sị, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị gaa kwadoro gị ihe gị maka oriri Ngabiga?”
18 Ya amsa ya ce, “Ku shiga gari wurin wāne, ku ce masa, ‘Malam ya ce, lokacina ya yi kusa. Zan ci Bikin Ƙetarewa tare da almajiraina a gidanka.’”
Ọ zara ha sị, “Jekwurunụ otu nwoke nʼime obodo sị ya, Onye ozizi sị, ‘Oge m abịala nso. Mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-eri oriri Ngabiga nʼụlọ gị.’”
19 Saboda haka almajiran suka yi yadda Yesu ya umarce su, suka kuwa shirya Bikin Ƙetarewa.
Ndị na-eso ụzọ ya mere dị ka Jisọs gwara ha, doziekwa oriri Ngabiga ahụ nʼebe ahụ.
20 Da yamma ta yi, sai Yesu ya zauna don cin abinci tare da Sha Biyun.
Nʼuhuruchi ụbọchị ahụ, ya na ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ ahụ nọdụrụ ala nʼoche nri ahụ.
21 Yayinda suke cin abinci, sai ya ce, “Gaskiya nake gaya muku, ɗayanku zai bashe ni.”
Mgbe ha na-eri nri, o kwuru sị, “Nʼezie ana m agwa unu, na otu onye nʼime unu ga-arara m nye.”
22 Suka yi baƙin ciki ƙwarai, suka fara ce masa da ɗaya-ɗaya, “Gaskiya nake gaya muku, ɗayanku zai bashe ni.”
Ha nwere oke mwute, ma malite ịjụ ya nʼotu nʼotu sị, “Onyenwe anyị, ọ bụ m?”
23 Yesu ya amsa ya ce, “Wanda ya sa hannunsa a kwano tare da ni ne, zai bashe ni.
Ma ọ zara ha sị, “Ọ bụ onye ahụ mụ na ya na-amanyekọta aka nʼotu efere ga-arara m nye.
24 Ɗan Mutum zai tafi kamar yadda aka rubuta game da shi. Amma kaiton mutumin da zai bashe Ɗan Mutum! Da ma ba a haifi mutumin nan ba, da ya fi masa.”
Lee Nwa nke Mmadụ ga-ala dị ka e si buo ya nʼamụma. Ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ onye a ga-esite nʼaka ya rara Nwa nke Mmadụ nye. Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.”
25 Sa’an nan Yahuda, wanda zai bashe shi ya ce, “Tabbatacce ba ni ba ne, ko, Rabbi?” Yesu ya amsa ya ce, “I, kai ma ka fada.”
Judas, onye ahụ raara ya nye jụrụ ya sị, “Onye ozizi ọ bụ m?” Ọ zara sị, “Gị onwe gị ekwuola ya.”
26 Yayinda suke cikin cin abinci, Yesu ya ɗauki burodi, ya yi godiya ya kuma kakkarya, ya ba wa almajiransa yana cewa, “Ku karɓa ku ci; wannan jikina ne.”
Mgbe ha nọkwa na-eri nri, Jisọs were ogbe achịcha ahụ, mgbe o nyechara ekele, ọ nyawara ya nye ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Naranụ nke a rie, nʼihi na nke a bụ anụ ahụ m.”
27 Sa’an nan ya ɗauki kwaf, ya yi godiya, ya kuma ba su, yana cewa, “Ku shassha daga cikinsa, dukanku.
Mgbe ahụ kwa, o burukwara iko mmanya, ma mgbe o nyechara ekele, o bunyere ya ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Unu niile ṅụọnụ site nʼiko a.
28 Wannan jinina ne na sabon alkawari, wanda aka zubar saboda mutane da yawa, don gafarar zunubai.
Nʼihi na nke a bụ ọbara m nke bụ akara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. A na-awụsa ya maka ọtụtụ mgbaghara mmehie.
29 Ina gaya muku, ba zan ƙara shan ruwan inabin nan ba har sai ranar da zan sha shi sabo tare da ku a mulkin Ubana.”
Ana m agwa unu, na-agaghị m aṅụ mmanya sitere na mkpụrụ vaịnị ọzọ, tutu ruo ụbọchị ahụ mụ na unu ga-aṅụ ya nʼụzọ dị iche nʼalaeze Nna m.”
30 Da suka rera waƙa, sai suka fita, suka tafi Dutsen Zaitun.
Mgbe ha bụsịrị abụ, ha pụrụ gaa nʼUgwu Oliv.
31 Sai Yesu ya ce musu, “A wannan dare, dukanku za ku ja da baya saboda ni, gama a rubuce yake cewa, “‘Zan bugi makiyayin, tumakin garken kuwa za su fasu.’
Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Nʼabalị taa, unu niile ga-agbahapụ naanị m. Nʼihi na e dere ya, sị: “‘Aga m etigbu onye ọzụzụ atụrụ, atụrụ nke igwe atụrụ ahụ ga-agbasasịkwa.’
32 Amma bayan na tashi, zan sha gabanku zuwa Galili.”
Ma mgbe e mere ka m si nʼọnwụ bilite, aga m ebu unu ụzọ gaa Galili.”
33 Bitrus ya amsa ya ce, “Ko da duka sun ja da baya saboda kai, ba zan taɓa ja da baya ba.”
Pita sịrị, “Ọ bụrụ na mmadụ niile agbahapụ gị gbalaga, agaghị m ahapụ gị.”
34 Yesu ya amsa ya ce, “Gaskiya nake gaya maka, a daren nan, kafin zakara yă yi cara, za ka yi mūsun sanina sau uku.”
Jisọs sịrị, “Nʼezie agwa m gị, nʼabalị taa, tupu oke ọkụkụ akwaa akwa, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.”
35 Bitrus ya furta, “Ko da ma zan mutu ne tare da kai, ba zan taɓa yin mūsun saninka ba.” Dukan sauran almajiran ma suka faɗa haka.
Ma Pita kwuru sị, “Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka m soro gị nwụọ, agaghị m agọnarị gị.” Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ndị ahụ niile na-eso ụzọ ya kwuru.
36 Sa’an nan Yesu ya tafi da almajiransa zuwa wani wurin da ake kira Getsemane, ya ce musu, “Ku zauna nan, in je can in yi addu’a.”
Mgbe Jisọs bịara nʼogige ahụ a na-akpọ Getsameni, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Nọdụnụ nʼebe a ka m gaa nʼihu nke nta kpee ekpere.”
37 Ya ɗauki Bitrus da’ya’ya biyun nan na Zebedi tare da shi, sai ya fara baƙin ciki, ya kuma damu.
Ọ kpọọrọ Pita tinyere onwe ya, na ụmụ Zebedi abụọ. Ọ malitere inwe obi mwute nʼime onwe ya. Obi malitekwara ịlọ ya mmiri.
38 Sai ya ce musu, “Raina yana cike da baƙin ciki har kamar zan mutu. Ku dakata a nan, ku kuma yi tsaro tare da ni.”
Mgbe ahụ ọ gwara ha sị, “Ọ na-ewute mkpụrụobi m nke ukwuu ruo nʼọnụ ọnwụ. Nọgidenụ nʼebe a soro m na-eche nche.”
39 Da ya yi gaba kaɗan, sai ya fāɗi a ƙasa, ya yi addu’a ya ce, “Ubana, in mai yiwuwa ne, a ɗauke mini wannan kwaf. Amma ba nufina ba, sai naka.”
Ọ gara nʼihu nke nta daa, kpuo ihu ya nʼala, kpee ekpere sị, “Nna m, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, napụ m iko a. Ma ọ bụghị ka e mee uche m, kama ka e mee uche gị.”
40 Sa’an nan ya komo wurin almajiransa, ya tarar suna barci. Ya tambayi Bitrus ya ce, “Ashe, ba za ku iya yin tsaro tare da ni ko na sa’a guda ba?
Ya mere, ọ bịakwutere ndị na-eso ụzọ ya, hụ ha ka ha na-arahụ ụra. Ọ sịrị Pita, “Ọ bụ na unu enweghị ike i soro m chee nche, ọ bụladị otu awa?
41 Ku yi tsaro, ku kuma yi addu’a, don kada ku fāɗi cikin jarraba. Ruhu yana so, sai dai jiki raunana ne.”
Na-echenụ nche, na-ekpekwa ekpere, ka unu ghara ịba nʼọnwụnwa. Nʼihi na mmụọ dị na njikere ma anụ ahụ adịghị ike.”
42 Ya sāke tafiya sau na biyu, ya yi addu’a ya ce, “Ubana, in ba zai yiwu a ɗauke wannan kwaf ba sai na sha shi, to, bari a aikata nufinka.”
Ọ laghachiri azụ nke ugboro abụọ kpeekwa ekpere sị, “Nna m, ọ bụrụ na iko a agaghị agabiga ma ọ bụghị na m ṅụrụ ya, ka e mee uche gị.”
43 Da ya dawo, har yanzu ya tarar suna barci, domin idanunsu sun yi nauyi da barci.
Ọ lọghachikwara ọzọ hụkwa ka ha na-arahụ ụra, nʼihi na anya ha dị arọ.
44 Saboda haka ya sāke barinsu, ya yi addu’a sau na uku, yana maimaita iri abu guda.
Ọ hapụrụ ha ọzọ gaa kpee ekpere nke ugboro atọ, na-ekwukwa otu okwu ahụ.
45 Sa’an nan ya komo wurin almajiransa, ya ce musu, “Har yanzu kuna barci kuna hutawa ba? Ga shi, sa’a ta yi kusa, an kuma bashe Ɗan Mutum a hannuwan masu zunubi.
Mgbe ọ lọghachikwutere ndị na-eso ụzọ ya, ọ sịrị ha, “Unu ka nọ na-arahụ ụra, na-ezukwa ike? Lee, oge awa ahụ abịala, a rarala Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ndị mmehie.
46 Ku tashi, mu tafi! Ga mai bashe ni nan yana zuwa!”
Bilienụ ka anyị gawa. Lee, onye ahụ na-arara m nye na-abịa!”
47 Yayinda yana cikin magana, sai Yahuda, ɗaya daga cikin Sha Biyun nan, ya iso. Tare da shi kuwa ga taro mai yawa riƙe da takuba da sanduna, manyan firistoci da dattawan mutane ne suka turo su.
Mgbe ọ nọ na-ekwu okwu a, Judas, otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ bịaruru, ya na ọtụtụ igwe mmadụ so. Ụfọdụ ji mma agha ha, ndị ọzọ ji osisi. Ọ bụ ndịisi nchụaja na ndị okenye ndị Juu zitere ha.
48 To, mai bashe shi ɗin, ya riga ya shirya alama da su, “Wanda na yi masa sumba, shi ne mutumin; ku kama shi.”
Ma onye ahụ na-arara ya nye, nyere ha ihe ịrịbama, sị, “Onye ahụ m ga-esutu ọnụ bụ nwoke ahụ, jidesienụ ya aka ike!”
49 Da zuwansa, sai ya miƙe zuwa wurin Yesu ya ce, “Gaisuwa, Rabbi!” Sa’an nan ya yi masa sumba.
Ngwangwa o jekwuuru Jisọs sị ya, “Ekele, Onye ozizi!” ma sutukwa ya ọnụ.
50 Yesu ya amsa ya ce, “Aboki, yi abin da ya kawo ka.” Sa’an nan mutanen suka matso, suka kama Yesu suka riƙe shi.
Jisọs gwara ya sị, “Enyi m, mee ihe ị bịara ime ngwangwa.” Mgbe ahụ, ndị ikom ahụ bịara nso jide Jisọs, sekpụrụ ya nʼike.
51 Ganin haka, sai ɗaya daga cikin waɗanda suke tare da Yesu, ya zaro takobinsa ya kai wa bawan babban firist sara, ya fille masa kunne.
Otu onye nʼime ndị ha na Jisọs nọ, setịrị aka ya, mịpụta mma agha ya, gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị ya.
52 Sai Yesu ya ce, masa, “Mai da takobinka kube, gama duk masu zare takobi, a takobi za su mutu.
Ma Jisọs sịrị ya, “Mịghachi mma agha gị nʼọbọ ya, nʼihi na mmadụ ọbụla na-eji mma egbu mmadụ ibe ya ga-anwụ site na mma.
53 Kuna tsammani ba zan iya kira Ubana, nan take kuwa yă aiko mini fiye da rundunar mala’iku goma sha biyu ba?
I cheghị na m pụrụ ịrịọ Nna m ka o zitere m ihe karịrị usuu ndị mmụọ ozi iri na abụọ nʼotu ntabi anya?
54 Amma ta yaya za a cika Nassin da ya ce dole haka yă faru?”
Ma olee otu ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ ga-esi mezuo, nke kwuru na ọ ghaghị ịdị otu a?”
55 A wannan lokaci sai Yesu ya ce wa taron, “Ina jagoran wani tawaye ne, da kuka fito da takuba da kuma sanduna domin ku kama ni? Kowace rana ina zama a filin haikali ina koyarwa, ba ku kuwa kama ni ba.
Nʼoge awa ahụ, Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ sị, “Unu pụtara chịrị mma agha na mkpọ bịa ijide m dị ka a ga-asị na m bụ onye ohi? Anọrọla m ziekwa ihe nʼụlọnsọ kwa ụbọchị, ma unu ejideghị m.
56 Amma wannan duka ya faru ne don a cika rubuce-rubucen annabawa.” Sa’an nan dukan almajiran suka yashe shi suka gudu.
Ma ihe ndị a na-eme ka ihe ndị amụma dere nʼakwụkwọ nsọ mezuo.” Nʼoge ihe ndị a niile na-eme, ndị na-eso ụzọ ya niile hapụrụ ya gbalaga.
57 Waɗanda suka kama Yesu kuwa suka kai shi wurin Kayifas, babban firist, inda malaman dokoki da dattawa suka taru.
Ndị jidere Jisọs duuru ya gaa nʼụlọ Kaịfas, onyeisi nchụaja. Ndị ozizi iwu na ndị okenye ndị Juu zukọtara nʼebe ahụ.
58 Amma Bitrus ya bi daga nesa, har zuwa cikin filin gidan babban firist. Ya shiga, ya zauna tare da masu gadi, don yă ga ƙarshen abin.
Pita sogidere Jisọs nʼazụ site nʼebe dị anya. O rutere nʼobi onyeisi nchụaja, baa nʼime ụlọ, sorokwa ndị na-eje ozi nọdụ ala, ka o nwe ike ịhụ otu ihe a ga-esi bie.
59 Sai manyan firistoci da’yan majalisa duka suka yi ta neman shaidar ƙarya a kan Yesu, don su sami dama su kashe shi.
Ndịisi nchụaja, na ndịisi ikpe nʼụlọikpe ahụ nọ na-achọ ama ụgha megide Jisọs, ka ha hụ ụzọ ha ga-esi gbuo ya.
60 Amma ba su sami ko ɗaya ba, ko da yake masu shaidar ƙarya da yawa sun firfito. A ƙarshe, biyu suka zo gaba,
Ma ọ dịghị nke ha chọtara, nʼagbanyeghị nʼọtụtụ ndị akaebe ụgha pụtara. Nʼikpeazụ, mmadụ abụọ pụtara
61 suka furta cewa, “Wannan mutum ya ce, ‘Ina iya rushe haikalin Allah, in sāke gina shi cikin kwana uku.’”
kwuo sị, “Nwoke a sịrị, ‘Enwere m ike ịkwatu ụlọnsọ ukwu nke Chineke, wughachikwa ya nʼụbọchị atọ.’”
62 Sa’an nan babban firist ya miƙe tsaye, ya ce wa Yesu, “Ba ka da wata amsa? Shaidar da mutanen nan suke yi a kanka fa?”
Onyeisi nchụaja biliri ọtọ kwuo sị, “Ọ bụ na ị nweghị ihe ọbụla ị ga-aza? Gịnị bụ ama ndị a a na-agba megide gị?”
63 Amma Yesu ya yi shiru. Sai babban firist ya ce masa, “Na haɗa ka da Allah mai rai. Faɗa mana in kai ne Kiristi, Ɗan Allah.”
Ma Jisọs ekwughị ihe ọbụla. Onyeisi nchụaja gwara ya sị, Eji m aha Chineke dị ndụ nye gị iwu, sị gị, “gwa anyị, ị bụ Kraịst, Ọkpara Chineke?”
64 Sai Yesu ya amsa ya ce, “I, haka yake yadda ka faɗa. Sai dai ina gaya muku duka, nan gaba, za ku ga Ɗan Mutum zaune a hannun dama na Mai Iko, yana kuma zuwa a kan gizagizan sama.”
Jisọs gwara ya sị, “Gị onwe gị kwuru ya. Ma ana m agwa unu, site ugbu a na-aga nʼihu, unu ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-anọdụ nʼaka nri nke Onye dị ike, na-abịakwa nʼigwe ojii nke eluigwe.”
65 Sa’an nan babban firist ya yage tufafinsa ya ce, “Ya yi saɓo! Don me muke bukatar ƙarin shaidu? Ga shi, yanzu kun dai ji saɓon.
Mgbe ahụ onyeisi nchụaja dọwara uwe ya, kwuo sị, “O kwuola arụ! Olee mkpa ọ dị ịchọkwa ndị akaebe? Unu nụkwara nkwulu ya?
66 Me kuka gani?” Suka amsa, suka ce, “Ya cancanci mutuwa.”
Gịnị bụ mkpebi unu?” Ha zara sị ya, “O kwesiri ka ọ nwụọ!”
67 Sai suka tottofa masa miyau a fuskarsa, suka kuma bubbuge shi da hannuwansu. Waɗansu kuma suka mammare shi
Mgbe ahụ, ha gbụsara ya ọnụ mmiri asọ nʼihu, tiekwa ya aka. Ndị ọzọ maara ya ụra,
68 suka ce, “Yi mana annabci, Kiristi. Wa ya buge ka?”
sị ya, “Buoro anyị amụma, gị, Kraịst. Onye tiri gị ihe?”
69 To, Bitrus yana nan zaune a filin, sai wata yarinya baiwa, ta zo wurinsa. Ta ce, “Kai ma kana tare da Yesu mutumin Galili.”
Mgbe ahụ Pita nọdụrụ ala na mbara ezi nke obi ahụ. Otu nʼime ụmụ agbọghọ na-eje ozi bịakwutere ya, sị, “Ị bụkwanụ otu nʼime ndị na-eso ụzọ Jisọs onye Galili.”
70 Amma ya yi mūsu a gabansu duka. Ya ce, “Ban san abin da kike magana ba.”
Ma ọ gọrọ nʼihu ha niile sị, “Amaghị m ihe ị na-ekwu.”
71 Sa’an nan ya fito zuwa hanyar shiga, inda wata yarinya kuma ta gan shi, ta ce wa mutanen da suke can, “Wannan mutum ma yana tare da Yesu Banazare.”
Mgbe ọ pụrụ gaa nọdụ nʼọnụ ụzọ mbata, nwaagbọghọ ọzọ hụrụ ya, gwa ndị nọ nʼebe ahụ sị, “Nwoke a na Jisọs onye Nazaret nọkọrọ.”
72 Ya sāke mūsu har da rantsuwa, yana cewa, “Ban ma san mutumin nan ba!”
Ọzọkwa, o weere ịṅụ iyi gọọ, “Amaghị m onye nwoke ahụ bụ.”
73 Bayan ɗan lokaci, sai na tsattsaye a wurin, suka hauro wurin Bitrus, suka ce, “Tabbatacce, kai ɗayansu ne, don harshen maganarka, ya tone ka.”
Mgbe oge nta gasịrị, ndị guzo nʼebe ahụ bịakwutere Pita sị ya, “Nʼezie, ịbụ otu nʼime ha, nʼihi na asụsụ gị agbaala gị ama.”
74 Sai ya fara la’antar kansa, yana ta rantsuwa yana ce musu, “Ban ma san mutumin nan ba!” Nan da take, sai zakara ya yi cara.
Ọ malitere ịbụ onwe ya ọnụ, na ịṅụ iyi sị, “Amaghị m nwoke a.” Mgbe ahụkwa oke ọkpa kwara akwa.
75 Sai Bitrus ya tuna da maganar da Yesu ya yi cewa, “Kafin zakara yă yi cara, za ka yi mūsun sani na sau uku.” Sai ya fita waje, ya yi ta kuka.
Pita chetara okwu ahụ Jisọs kwuru sị, “Tupu oke ọkpa akwaa akwa, ị ga-agọnarị m ugbo atọ.” O si nʼebe ahụ pụọ, gaa kwaa akwa nke ukwuu.

< Mattiyu 26 >