< Mahukunta 14 >

1 Samson ya gangara zuwa Timna a can ya ga wata daga cikin’yan mata Filistiyawa.
Samsin gbadara nʼobodo Timna ebe ọ hụrụ otu nwaagbọghọ onye Filistia.
2 Da ya komo, sai ya gaya wa mahaifinsa da mahaifiyarsa ya ce, “Na ga wata mace a Timna; ku auro mini ita ta zama matata.”
Mgbe ọ lọtara nʼụlọ, ọ gwara nne na nna ya, “Ahụrụ m otu nwanyị nʼime Timna sitere nʼụmụ ndị inyom Filistia; ugbu a, lụtara m ya na nwunye.”
3 Mahaifinsa da mahaifiyarsa suka ce, “Babu wata karɓaɓɓiyar yarinya a cikin zuriyarku ko cikin dukan mutanenmu ne? Dole ne ka tafi wajen Filistiyawa marasa kaciya ka nemi aure?” Amma Samson ya ce wa mahaifinsa, “A auro mini ita dai. Ita ta dace da ni.”
Nne na nna ya zara ya, “Ọ bụ na ọ dịghị nwanyị dị nʼetiti ndị inyom ụmụnne gị, maọbụ nʼetiti ndị anyị niile? Gịnị mere o ji bụrụ nʼetiti ndị Filistia a na-ebighị ugwu ka i si lụtara onwe gị nwunye?” Ma Samsin sịrị nna ya, “Gaa lụtara m ya. Nʼihi na o ziri ezi nʼanya m.”
4 (Iyayensa ba su san cewa wannan daga wurin Ubangiji ne ba, wanda yake neman hanyar da za a kai wa Filistiyawa hari; gama a lokacin suna mulkin Isra’ila.)
(Nne na nna ya aghọtaghị na aka Onyenwe anyị dị nʼọlụlụ nwunye a Samsin chọrọ ịlụ. Nʼihi na Onyenwe anyị na-achọ ụzọ ọ ga-esi megide ndị Filistia, ndị na-achị ụmụ Izrel nʼoge ahụ.)
5 Sai Samson ya gangara zuwa Timna tare da mahaifinsa da kuma mahaifiyarsa. Da suka yi kusa da gonar inabin Timna, nan da nan sai ga ɗan zaki ya taso ya nufe shi yana ruri.
Samsin na nne na nna ya gawara obodo Timna maka ọlụlụ nwanyị a. Mgbe ha na-erute ubi vaịnị dị obodo Timna nso, otu nwa ọdụm sitere nʼọhịa mapụta, gbọrọ ụja na-abịakwute Samsin.
6 Ruhun Ubangiji kuwa ya sauko masa da ƙarfi, ya sa ya yaga zakin kashi biyu da hannu kamar yadda akan yayyage ɗan akuya. Sai dai bai gaya wa iyayensa abin da ya yi ba.
Nʼotu oge ahụ, Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị Samsin nʼike. O jekwuuru ọdụm ahụ, were aka ya abụọ dọwaa ya ọnụ, dịka a ga-asị na ọ bụ nwa ewu. Ma Samsin agwaghị nne na nna ya ihe mere.
7 Sa’an nan ya gangara ya yi magana da yarinyar, yana kuwa sonsa.
Ma mgbe ha bịaruru Timna, Samsin na nwaagbọghọ ahụ kparịtara ụka. Ihe banyere nwaagbọghọ ahụ dị Samsin ezi mma.
8 Daga baya, da ya koma don yă aure ta, sai ya ratse don yă ga gawar zakin. Sai ga taron ƙudan zuma da zuma a ciki,
Ọ laghachiri mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị ka ọ kpọrọ ya. Ma mgbe ọ tụgharịrị ka ọ hụ ozu ọdụm ahụ, ọ hụrụ na igwe aṅụ bizi nʼime ozu ọdụm ahụ, na-emepụtakwa mmanụ aṅụ.
9 wanda ya sa hannu ya ɗebo yana tafiya yana sha. Sa’ad da ya iso wurin iyayensa, ya ba su zuman, su ma suka sha. Sai dai bai gaya musu cewa ya ɗebo zuman daga gawar zaki ba.
Ọ kọpụtara mmanụ aṅụ ahụ tinye nʼaka ya, malite ịracha ka ọ na-aga nʼụzọ. Mgbe ọ bịakwutere nne na nna ya, o nyebinyere ha ụfọdụ, ha onwe ha rachakwara ya. Ma ọ gwaghị ha na o wetara ya site nʼozu ọdụm.
10 To, mahaifinsa ya gangara don yă ga yarinyar. Samson kuwa ya shirya wata liyafa a can, yadda yake bisa ga al’adar angwaye.
Nna ya gara ịhụ nwanyị ahụ ma Samsin kpọkọtara ụmụ okorobịa obodo ahụ meere ha oriri dịka omenaala ha sị di.
11 Sa’ad da ya bayyana, sai aka haɗa shi abokai talatin.
Mgbe Samsin rutere, a kpọnyere ya ndị bịara mmemme ọnụọgụgụ ha dị iri atọ.
12 Sai Samson ya ce, “Bari in yi muku kacici-kacici, in kun ba ni amsa cikin kwana bakwai na wannan biki, zan ba ku riguna lilin talatin da kuma tufafi talatin.
Mgbe ahụ, Samsin gwara ha okwu sị ha, “O nwere ajụjụ, gwa m, gwa m, gwa m, m chọrọ ka unu kọwaara m. Ọ bụrụ na unu enwee ike kọwaa ya, site taa ruo nʼụbọchị asaa nke mmemme a, aga m enye unu iri uwe mwụda atọ, nyekwa unu iri uwe mwụda atọ ọzọ akpara akpa.
13 In kuma ba ku iya ba ni amsar ba, dole ku ba ni rigunan lilin talatin da tufafi talatin.” Suka ce, “Ka gaya mana kacici-kacicin.”
Ọ bụrụkwanụ na unu enweghị ike kọwaa ya, unu ga-enye m iri uwe mwụda atọ, na iri uwe mwụda atọ akpara akpa.” Ha niile kwenyere sị, “Ọ dị mma. Kwuo ka anyị nụ.”
14 Sai ya ce, “Daga mai ci, abinci ya fito; daga mai ƙarfi, abu mai zaki ya fito.” Har kwana uku ba su iya ba da amsa ba.
Ọ gwara ha sị, “Ihe oriri si nʼime onye na-eri eri na-apụta, ọzọkwa, ihe dị ụtọ si nʼime onye dị ike pụta.” Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ha enwebeghịkwa ike kọwaa ya.
15 A rana ta huɗu suka ce wa matar Samson “Ki rarrashi mijinki yă bayyana mana kacici-kacicin, ko kuwa mu ƙone ki da gidan mahaifinki duka da wuta. Kun kira mu domin ku yi mana fashi ne?”
Ma nʼụbọchị nke anọ, ha jekwuuru nwunye Samsin gwa ya okwu sị, “Chọọ ụzọ rafụta di gị ọnụ, ka ọ gwa gị ihe okwu a pụtara. Ma ọ bụghị ya, anyị ga-akpọ gị na ezinaụlọ nna gị ọkụ. Ọ bụ ịnapụ anyị ihe anyị nwere ka unu ji kpọọ anyị oku bịa nʼebe?”
16 Sa’an nan matar Samson ta kwanta masa a jiki tana kuka tana cewa, “Kai maƙiyina ne, lalle ba ka ƙaunata, ka yi wa mutanena kacici-kacici, amma ba ka gaya mini amsar ba.” Ya amsa ya ce, “Ban ma bayyana wa mahaifina ko mahaifiyata ba, to, don me zan bayyana miki?”
Mgbe ahụ nwunye Samsin buuru onwe ya tụọ nʼelu ahụ ya, nʼebe akwa, sị, “Ị kpọrọ m asị! Nʼezie, ị hụghị m nʼanya. Ị tụụrụ ndị m ilu, ma ị gwaghị m ọsịsa ya.” Ọ sịrị ya, “Lee, agwaghị m nne na nna m, ọ bụkwa gị ka m ga akọwara ya?”
17 Ta yi ta kuka har kwana bakwai na bikin. Saboda haka a rana ta bakwai sai ya gaya mata, don ta dame shi. Ita kuwa ta bayyana kacici-kacicin wa mutanenta.
Ma nwanyị ahụ kwagidere akwa abalị asaa ha nọ na mmemme ahụ. Nʼikpeazụ, nʼụbọchị nke asaa, Samsin kọwaara ya okwu ahụ nʼihi na ọ nọgidere na-enye ya nsogbu. Nwanyị ahụ gakwara kọwaara ụmụ okorobịa obodo ihe okwu ahụ pụtara.
18 Kafin rana ta fāɗi a rana ta bakwai mutane garin suka ce masa, “Me ya fi zuma zaki? Me ya fi zaki ƙarfi?” Samson ya ce musu, “Da ba don kun haɗa baki da matata ba, da ba za ku san amsar kacici-kacici ba.”
Ma tupu anwụ adaa nʼụbọchị nke asaa ahụ, ndị ikom obodo ahụ sịrị ya, “Olee ihe dị ụtọ karịa mmanụ aṅụ? Gịnị dịkwa ike karịa ọdụm?” Ma Samsin zara sị ha, “A sị na unu enyeghị nwa ehi m nsogbu, unu agaraghị enwe ike kọwaa ya.”
19 Sa’an nan Ruhun Ubangiji ya sauko masa da iko. Sai ya fita ya gangara zuwa Ashkelon, ya kashe mutanensu talatin, ya kwashe kayansu ya kuma ba da rigunarsu ga waɗanda suka bayyana kacici-kacicin. Cike da fushi, ya haura zuwa gidan mahaifinsa.
Otu mgbe ahụ kwa, Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị ya. O sitere nʼebe ahụ pụọ, gaa nʼobodo Ashkelọn. Nʼebe ahụ ka ọ nọ tigbuo iri mmadụ atọ, napụ ha uwe ha niile, chịrị ha chịnye ndị ahụ kọwaara ya ilu ahụ. Ma site nʼoke iwe, o laghachiri nʼụlọ nna ya.
20 Aka kuma ɗauki matar Samson aka ba wa ɗaya daga cikin waɗanda suka yi masa hidima a bikin.
E duuru nwunye Samsin dunye enyi Samsin ka ha abụọ bụrụ di na nwunye.

< Mahukunta 14 >