< Yoshuwa 21 >
1 To, a lokacin, sai shugabannin iyalan Lawiyawa suka je wurin Eleyazar firist, Yoshuwa ɗan Nun da kuma shugabannin sauran iyalan kabilu na Isra’ila a
Emesịa, ndị ndu ezinaụlọ Livayị bịakwutere Elieza, onye nchụaja, na Joshua, nwa Nun, na ndịisi ebo Izrel,
2 Shilo cikin Kan’ana, suka ce musu, “Ubangiji ya yi umarni ta wurin Musa cewa a ba mu garuruwan da za mu zauna a ciki, da wurin kiwo mai kyau don dabbobinmu.”
na Shaịlo, nʼime ala Kenan, sị ha, “Onyenwe anyị nyere iwu site nʼaka Mosis ka enye anyị obodo ụfọdụ ebe anyị ga-ebi, na ala ebe anụ ụlọ anyị ga na-ata ahịhịa.”
3 Saboda haka kamar yadda Ubangiji ya umarta, sai Isra’ilawa suka ba wa Lawiyawa waɗannan garuruwa da wuraren kiwo daga cikin gādonsu.
Nʼihi nke a, dịka iwu Onyenwe anyị si dị, ụmụ Izrel sitere nʼihe nketa ha nye ndị Livayị obodo ụfọdụ, nyekwa ha ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri.
4 Ƙuri’a ta farko ta fāɗa a kan Kohatawa bisa ga iyalansu. Sai aka ba wa Lawiyawa waɗanda suke’yan zuriyar Haruna, firist, garuruwa goma sha uku daga kabilan Yahuda, Simeyon da Benyamin.
Ndị buru ụzọ nweta oke site nʼife nza bụ ikwu Kohat dịka ikwu ha si dị. E sitere nʼala ndị Juda, na Simiọn, na Benjamin nye ha obodo iri na atọ, ka ọ bụrụ ihe nketa ụmụ Kohat ndị si nʼebo Livayị, ndị bụkwa ụmụ ụmụ Erọn onye nchụaja.
5 Sauran Kohatawan kuma aka ba su garuruwa goma daga iyalan kabilar Efraim, Dan da kuma rabi kabilar Manasse.
Ma ndị fọdụrụ nʼụmụ Kohat ka e nyere obodo iri site nʼobodo nke ikwu ndị ebo Ifrem, na Dan, na ọkara ebo Manase.
6 Aka kuma ba wa zuriyar Gershon garuruwa goma sha uku daga iyalan kabilan Issakar, Asher, Naftali, da kuma rabin kabilar Manasse a Bashan.
Ụmụ Geshọn nwetara obodo iri na atọ site nʼife nza. Obodo ha nwetara dị na Bashan. Ha sikwa nʼala ndị ikwu ebo Isaka na Asha, na Naftalị, na ọkara ebo Manase nweta oke ahụ.
7 Aka ba wa zuriyar Merari bisa ga iyalansu, garuruwa goma sha biyu daga kabilan Ruben, Gad da Zebulun.
Ụmụ Merari dịka ikwu ha si dị ketara obodo iri na abụọ site nʼala ndị ebo Ruben, na Gad, na Zebụlọn.
8 Haka Isra’ilawa suka ba wa Lawiyawa waɗannan garuruwa da wuraren kiwo masu kyau, yadda Ubangiji ya umarta ta wurin Musa.
Ya mere, ụmụ Izrel mezuru iwu niile Onyenwe anyị nyere Mosis site nʼikenye ndị Livayị obodo ha ga-ebi, nakwa ebe anụ ụlọ ha ga-ata nri.
9 Daga kabilan Yahuda da Simeyon ne aka ba su waɗannan garuruwan da aka ambata,
Ha sitere nʼebo Juda na Simiọn, kepụta obodo ndị a akpọrọ aha
10 (ga garuruwan da aka ba wa zuriyar Haruna waɗanda suke daga iyalan Kohatawa na Lawiyawa, domin ƙuri’a ta farko ta fāɗa a kansu),
kenye ndị ikwu Kohat, ndị bụ ụmụ ụmụ Erọn, bụrụkwa ụmụ ụmụ Livayị. Ọ bụ ha ka e bụ ụzọ kenye ihe nketa site nʼife nza.
11 an ba su, Kiriyat Arba (wato, Hebron), da wurin kiwon da yake kewaye da ƙasar kan tudu ta Yahuda. (Arba shi ne kakan Anak.)
E kenyere ha obodo Kiriat Aaba, nke a na-akpọkwa Hebrọn. Obodo a dị nʼala ugwu ugwu Juda, ya na ala gbara ya gburugburu ka ọ bụrụ ebe ịta nri anụ ụlọ. (Aaba bụ nna nna ndị Anak.)
12 Amma sai aka ba Kaleb ɗan Yefunne filayen da kuma ƙauyukan da suke kewaye da birnin, su zama nasa.
Ma eburularị ụzọ nye Kaleb nwa Jefune obodo ukwu na obodo nta niile, na ala ubi niile dị nʼakụkụ ya ka ọ bụrụ ihe nketa ya.
13 Sai aka ba zuriyar Haruna firist, ƙasar Hebron (garin masu neman mafaka don sun yi kisa), da Libna,
Ya mere, ụmụ ụmụ Erọn, onye nchụaja, ka e kenyere obodo Hebrọn, nke bụkwa obodo mgbaba, kenyekwa ha obodo ndị a: Libna,
14 da Yattir, da Eshtemowa,
Jatịa, Eshtemoa,
16 da Ayin, da Yutta, da kuma Bet-Shemesh, tare da wuraren kiwonsu, garuruwa tara ke nan daga kabilun nan biyu, Yahuda da Simeyon.
Ain, Juta na Bet-Shemesh. E nyekwara ha ala niile gbara obodo ndị a gburugburu ka ọ bụrụ ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri. Ya mere, ọ bụ obodo itoolu ka e si nʼala ebo Juda na Simiọn kenye ha.
17 Daga kabilar Benyamin kuwa aka ba su, Gibeyon, Geba,
Ebo Benjamin nyere ha obodo anọ ndị a, Gibiọn, Geba,
18 Anatot da Almon, tare da wuraren kiwonsu, garuruwa huɗu ke nan.
Anatot, Almon na ala dị ya gburugburu ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri, bụ obodo anọ.
19 Duka-duka garuruwan firistoci, zuriyar Haruna, su goma sha uku ne tare da wuraren kiwonsu.
Ya mere, obodo niile e nyere ndị nchụaja, ụmụ ụmụ Erọn dị iri na atọ, tinyere ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri.
20 Aka kuma ba wa sauran Kohatawa, iyalan Lawiyawa, garuruwa daga kabilar Efraim.
Ụmụ Kohat ndị fọdụrụ, ndị agbụrụ Livayị ka e kenyere obodo anọ ndị a site nʼaka ebo Ifrem.
21 A ƙasar kan tudu ta Efraim, aka ba su, Shekem (garin masu neman mafaka don sun yi kisa) da Gezer,
E sitere nʼala ugwu ugwu Ifrem nye ha: Shekem, nke bụ obodo mgbaba na Gaza,
22 Kibzayim da Bet-Horon, tare da wuraren kiwonsu, garuruwa huɗu ke nan.
Kibzaim na Bet-Horon, tinyere ebe ịta ahịhịa nke anụ ụlọ ha, bụ obodo anọ.
23 Haka kuma daga kabilar Dan, aka ba su, Elteke, Gibbeton,
Ha sitere nʼala ndị ebo Dan keta obodo anọ ndị a: Elteke na Gibeton,
24 Aiyalon da Gat-Rimmon, tare da wuraren kiwonsu, garuruwa huɗu ke nan.
Aijalon na Gat Rimọn, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, bụ obodo anọ.
25 Daga rabin kabilar Manasse kuwa aka ba su, Ta’anak da Gat-Rimmon, tare da wuraren kiwonsu, garuruwa biyu ke nan.
Ọkara ebo Manase nyere ha obodo abụọ, Teanak, Gat Rimọn na ebe ịta ahịhịa nke anụ ụlọ ha.
26 Dukan garuruwan nan goma tare da wuraren kiwonsu ne aka ba sauran iyalan Kohatawa.
Ya mere, obodo niile na ebe ịta ahịhịa nke anụ ụlọ e nyere ndị fọdụrụ nʼikwu Kohat dị iri.
27 Aka ba wa zuriyar Gershon, waɗanda suke Lawiyawa, rabo. Daga rabin kabilar Manasse, Golan a cikin Bashan (garin masu neman mafaka don sun yi kisa), da Be’eshtera, tare da wuraren kiwonsu, garuruwa biyu ke nan;
Ụmụ Geshọn, ndị agbụrụ Livayị, ketara obodo abụọ ndị a, ya na ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha. Ọkara ebo Manase nyere: Golan, nʼime Bashan, nke bụ obodo mgbaba, na Be Eshtera.
28 daga kabilar Issakar kuma aka ba su Kishiyon, Daberat,
Ebo Isaka nyere ha obodo anọ. Obodo ndị a bụ, Kishiọn, Daberat,
29 Yarmut da En Gannim, tare da wuraren kiwonsu, garuruwa huɗu ke nan;
Jamut na En-Ganim, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, obodo anọ.
30 daga kabilar Asher kuwa aka ba su, Mishal, Abdon,
Ebo Asha nyekwara ha obodo anọ. Ha bụ, Mishal, Abdon,
31 Helkat da Rehob, tare da wuraren kiwonsu, garuruwa huɗu ke nan;
Helkat na Rehob, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, obodo anọ.
32 daga kabilar Naftali kuma aka ba su, Kedesh a cikin Galili (garin masu neman mafaka don sun yi kisa), Hammon-Dor da kuma Kartan, tare da wuraren kiwonsu, garuruwa uku ke nan.
Ebo Naftalị nyere ha obodo atọ, nyekwa ha ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri. Obodo ndị a bụ, Kedesh, nʼime Galili, nke bụkwa obodo mgbaba, Hamot Doa na Katan.
33 Duka-duka, garuruwan iyalan Gershonawa goma sha uku ne, tare da wuraren kiwonsu.
Obodo iri na atọ, na ebe ịta ahịhịa nke anụ ụlọ ka e nyere ikwu Geshọn.
34 Aka ba wa iyalan Merari (sauran Lawiyawa) garuruwa, daga kabilar Zebulun, wato, Yokneyam, Karta,
Ndị ikwu Merari, bụ ụmụ ụmụ Livayị fọdụrụ nwetara site nʼaka: Ebo Zebụlọn, Jokneam, Kata,
35 Dimna da kuma Nahalal, tare da wuraren kiwonsu, garuruwa huɗu ke nan;
Dimna na Nahalal, obodo anọ tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha.
36 daga kabilar Ruben kuma aka ba su, Bezer, Yahza,
Ebo Ruben nyere ha obodo anọ: Beza, Jahaz,
37 Kedemot da kuma Mefa’at, tare da wuraren kiwonsu, garuruwa huɗu ke nan;
Kedemot, Mefaat na ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ kpaa nri.
38 daga kabilar Gad kuwa aka ba su, Ramot Gileyad (garin masu neman mafaka don sun yi kisa), Mahanayim,
Ebo Gad nyere ha obodo anọ. Obodo ndị a bụ, Ramọt, nʼime Gilead nke bụ obodo mgbaba, Mahanaim,
39 Heshbon da kuma Yazer, tare da wuraren kiwonsu, garuruwa huɗu ke nan.
Heshbọn na Jeza, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, bụ obodo anọ.
40 Duka-duka garuruwan da aka ba iyalan mutanen Merari, waɗanda su ne sauran Lawiyawa, garuruwa goma sha biyu ne.
Ọnụọgụgụ obodo niile e kenyere agbụrụ Merari bụ obodo iri na abụọ, ha bụ ndị fọdụrụ na ndị Livayị.
41 Jimillar birane da wurarensu na kiwon da aka ba Lawiyawa daga cikin mallakar jama’ar Isra’ila guda arba’in da takwas ne.
Ọnụọgụgụ obodo niile na ebe ịta nri nke anụ ụlọ e sitere nʼala ụmụ Izrel nye ndị Livayị dị iri anọ na asatọ.
42 Dukan garuruwan nan kowannensu yana kewaye da wurin kiwo.
Obodo ọbụla nwere ala gbara ya gburugburu ebe anụ ụlọ ga-anọ kpaa nri.
43 Ubangiji kuwa ya ba Isra’ilawa dukan ƙasar da ya yi wa kakanninsu alkawari, suka kuwa mallake ta, suka zauna a cikinta.
Ya mere, Onyenwe anyị nyere ụmụ Izrel ala ahụ ọ ṅụrụ iyi inye ndị nna nna ha. Ha nwetara ya, biri nʼime ya.
44 Ubangiji ya ba su hutawa a kowane gefe kamar yadda ya yi wa kakanninsu alkawari, ba ko ɗaya daga cikin abokan gābansu da ya iya cinsu da yaƙi.
Onyenwe anyị nyere ha izuike nʼakụkụ niile, dịka ọ ṅụrụ nʼiyi nye ndị nna nna ha. Ọ dịkwaghị otu nʼime ndị iro ha ọbụla guzogidere ha, nʼihi na Onyenwe anyị nyefere ndị iro ha niile nʼaka ha.
45 Ubangiji kuwa ya cika kowane alkawarin alherin da ya yi wa mutanen Isra’ila.
O nweghị otu nʼime nkwa ọma niile Onyenwe anyị kwere Izrel nke na-emezughị. O mezuru nkwa niile o kwere ha.