< Yoshuwa 15 >
1 An raba wa kabilar Yahuda gādonsu ta wurin yin ƙuri’a, bisa ga iyalansu, rabon ya kai har zuwa sashen Edom, zuwa Jejin Zin can kurewar kudu.
Ala ndị a ka e nyere ndị Juda dịka ikwu dị nʼebo ahụ si dị. Ikwu ọbụla ketara ala nke ha site nʼife nza. Ala Juda gbatịrị nnọọ ruo nʼoke ala Edọm, gbatịakwa ruo nʼọzara Zin, kwụsị nʼọnụ ọnụ ndịda ọzara a.
2 Iyakarsu a kudanci ta tashi tun daga kurewar kudu na Tekun Gishiri,
Nʼakụkụ ndịda, oke ala ha malitere nʼọnụ ọnụ ndịda osimiri Nnu.
3 zuwa kudancin Hanyar Kunama, ta ci gaba har zuwa Zin, zuwa kudancin Kadesh Barneya. Sa’an nan ta kurɗa zuwa Hezron har zuwa Addar, ta kuma karkata zuwa Karka.
Site nʼebe akụkụ ndịda nrigo Akrabim, gafee ruo nʼọzara Zin, ma rigoo nʼakụkụ nke ndịda Kadesh Banea, gafee Hezrọn rigoruo na Aada, gba gburugburu gaa Kaka;
4 Sai ta wuce zuwa Azmon ta haɗu da Rafin Masar, ta ƙarasa a Bahar Rum. Wannan shi ne iyakarsu ta kudu.
site nʼebe ahụ ruo Azmọn, pụọ gbasoro iyi dị nʼoke ala ndị Ijipt gagide ruo nʼosimiri Mediterenịa. Nke a bụ oke ala nʼebe ndịda.
5 Iyakarsu ta gabas kuwa ita ce Tekun Gishiri wadda ta zarce har zuwa gaɓar Urdun. Iyakarsu ta arewa ta fara ne daga Tekun Gishiri a bakin Urdun,
Oke ala ha nʼọwụwa anyanwụ bụ oke osimiri Nnu, ruo nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan. Oke ala ha nʼakụkụ ugwu bidoro nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan,
6 wajen Bet-Hogla ta wuce har zuwa arewancin Bet-Araba, zuwa Dutsen Bohan ɗan Ruben.
gbatịrị ruo Bet-Hogla, ma ruo nʼugwu Bet-Araba, rukwaa na nkume Bohan, nwa Ruben.
7 Sai iyakar ta haura zuwa Debir daga Kwarin Akor ta juya arewa da Gilgal, wadda take fuskantar hawan Adummim a kudancin kwari, ta ci gaba zuwa ruwan En Shemesh, ta ɓullo ta En Rogel.
Site nʼebe ahụ, ọ gbatịrị ruo na Ndagwurugwu Akọ na Debịa, tụgharịa gbatịrịkwa ruo Gilgal, na ncherita ihu ala ala Adumim nke dị nʼakụkụ ndịda ndagwurugwu ahụ. Site nʼebe ahụ ọ gbatịrị ruo na mmiri En-Shemesh, kwụsị na En-Rogel.
8 Sai kuma ta gangara zuwa Kwarin Ben Hinnom a gangaren kudancin birnin Yebusiyawa (wato, Urushalima). Daga can ta haura zuwa kan tudun a yammancin Kwarin Hinnom, a arewancin ƙarshen Kwarin Refayim.
Oke ala ahụ gbagoro Ndagwurugwu nke Ben Hinom, rukwaa nʼakụkụ ndịda Jebus nʼebe e wuru obodo Jerusalem. Oke ala ahụ sitekwara ebe ahụ gbagoo ruo nʼelu dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke Ndagwurugwu Hinom, na nsọtụ ugwu nke Ndagwurugwu Refaim.
9 Daga kan tudun, iyakar ta nufi maɓulɓular ruwa na Neftowa, ta ɓullo a garuruwan da suke a Dutsen Efron, ta gangara zuwa Ba’ala (wato, Kiriyat Yeyarim).
Site nʼelu ugwu ebe ahụ, oke ala ahụ gbatịrị ruo na mmiri ime ala Neftoa, pụta site nʼebe ahụ ruo obodo niile dị nso ugwu Efrọn. Site nʼEfrọn, oke ala ahụ gbadara ruo Baala (nke aha ya ọzọ bụ Kiriat Jearim).
10 Sa’an nan ta karkata yamma daga Ba’ala zuwa Dutsen Seyir, ta wuce ta gangaren Dutsen Yeyarim (wato, Kesalon), ta ci gaba zuwa Bet-Shemesh, ta bi zuwa Timna.
Oke ala ahụ mere dịka ọ ga-agba Baala gburugburu nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, site nʼebe ahụ pụta nʼugwu Sia, sitekwa nʼebe ahụ ruo nʼakụkụ ugwu Jearim (ya bụ Kesalon), gbatịa ruo na ndịda Bet-Shemesh, gafee ruo nʼọdịda anyanwụ oke ala Timna.
11 Ta wuce zuwa gangaren arewancin Ekron, ta juya zuwa Shikkeron, ta wuce zuwa Dutsen Ba’ala, ta kai Yabneyel, iyakarta ta ƙare a teku.
O sikwara ebe ahụ ruo ndịda ugwu Ekrọn, tụgharịa ruo Shikerọn, gafee ya, ruo nʼugwu Baala, sitekwa nʼebe ahụ ruo Jabneel, oke ala ahụ kwụsịrị nʼosimiri.
12 Bakin Bahar Rum nan ne iyakar yammanci. Wannan ita ce iyakar da ta kewaye jama’ar Yahuda bisa ga iyalansu.
Oke ala ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ bụ ọnụ mmiri osimiri Mediterenịa. Ndị a bụ oke ala gbara ndị Juda gburugburu dịka ikwu ha niile si dị.
13 Yoshuwa ya ba Kaleb ɗan Yefunne wuri a Yahuda, Kiriyat Arba, wato, Hebron, bisa ga umarnin Ubangiji. (Arba shi ne mahaifin Anak.)
Dịka iwu Onyenwe anyị nyere si dị, Joshua nyere Kaleb nwa Jefune oke nʼetiti ndị Juda. O kenyere ya Kiriat Aaba, ya bụ, Hebrọn. Aaba bụ nna nna Anak.
14 Daga can sai Kaleb ya kori’ya’yan Anak, maza su uku daga Hebron, wato, Sheshai, Ahiman da Talmai.
Kaleb sitere nʼobodo Hebrọn chụpụ ndị ikom atọ, bụ Sheshai, na Ahiman, na Talmai, ụmụ Anak nʼala ha.
15 Daga can ya nufi Debir ya yi yaƙi da mutanen da suke zama a can (Dā sunan Debir, Kiriyat Sefer ne).
O si nʼebe ahụ bilie ịlụso ndị bi na Debịa ọgụ. Nke a na-akpọ Kiriat Sefa nʼoge mbụ.
16 Kaleb ya ce, “Zan ba da’yata Aksa aure ga wanda zai ci Kiriyat Sefer da yaƙi.”
Kaleb sịrị, “Nwoke ọbụla ga-aga busoo Kiriat Sefa agha ma merie ya ka m ga-akpọnye Aksa, bụ nwa m nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.”
17 Otniyel ɗan Kenaz, ɗan’uwan Kaleb, ya ci Kiriyat Sefer da yaƙi; saboda haka Kaleb ya ba wa Aksa’yarsa, ya kuwa aure ta.
Ya mere, Otniel, nwa Kenaz, nwa nwanne Kaleb, lụgburu obodo ahụ nʼagha. Nʼihi nke a, Kaleb kpọnyere ya Aksa, bụ nwa ya nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.
18 Wata rana da ta zo wurin Otniyel, sai ya zuga ta ta roƙi mahaifinta fili. Da ta sauka daga kan jakinta sai Kaleb ya tambaye ta ya ce, “Me kike so in yi miki?”
Otu ụbọchị, mgbe Aksa bịakwutere Otniel, ọ kwagidere ya ka ọ rịọọ ala ubi site nʼaka nna ya. Mgbe Aksa si nʼelu ịnyịnya ibu ya rịdata, Kaleb jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị chọrọ ka m mere gị?”
19 Ta amsa ta ce, “Ka yi mini alheri na musamman, tun da ka ba ni wuri a Negeb, ina roƙonka, ka ba ni maɓulɓulan ruwa.” Kaleb kuwa ya ba ta maɓulɓulan ruwa na tuddai da na kwari.
Ọ zaghachiri, “Nyem onyinye pụrụ iche. Ebe ọ bụ na i nyela m ala Negev, biko nyekwa m isi mmiri ụfọdụ.” Nʼihi nke a, Kaleb nyere ya isi mmiri mgbago na isi mmiri nke ndịda.
20 Wannan shi ne gādon kabilar Yahuda bisa ga iyalansu.
Nke a bụ ihe nketa ebo Juda dịka ikwu ha niile si dị.
21 Garuruwan kabilar Yahuda da suke kudu cikin Negeb zuwa iyakar Edom su ne. Kabzeyel, Eder, Yagur,
Obodo niile nke ndị ebo Juda dị na Negev, nʼakụkụ ndịda nʼoke ala Edọm bụ ndị a: Kabzeel, Eda, Jaguo,
25 Hazor-Hadatta, Keriyot Hezron (wato, Hazor),
Hazọ Hadata, Keriọt Hezrọn (ya bụ Hazoa),
27 Hazar Gadda, Heshmon, Bet-Felet,
Haza Gada, Heshmọn, Bet-Pelet,
28 Hazar Shuwal, Beyersheba, Biziyotiya,
Haza Shual, Bịasheba, Biziotịa,
30 Eltolad, Kesil, Horma,
Eltolad, Kesil, Homa,
31 Ziklag, Madmanna, Sansanna,
Ziklag, Madmanna, Sansanna,
32 Lebayot, Shilhim, Ayin, Rimmon, jimillarsu, garuruwa da ƙauyukansu duka ashirin da tara ne.
Lebaot, Shilhim, Ain na Rimọn. Ọnụọgụgụ obodo ndị a dị iri abụọ na itoolu. Obodo nta ndị ọzọ gbara ha niile gburugburu.
33 Biranen da suke a filayen kwari su ne, Eshtawol, Zora; Ashna,
Obodo niile ndị a dị na ndịda ugwu ka e nyekwara ebo Juda. Obodo ndị a bụ, Eshtaol, Zora, Ashna,
34 Zanowa, En Gannim, Taffuwa, Enam,
Zanoa, En-Ganim, Tapụọa, Enam,
35 Yarmut, Adullam, Soko, Azeka,
Jamut, Adulam, Soko, Azeka,
36 Sha’arayim, Aditayim, Gedera (Gederotayim ke nan). Garuruwa goma sha huɗu ke nan da ƙauyukansu.
Shaaraim, Aditaịm na Gedera (maọbụ Gederotaịm). Ha niile dị obodo iri na anọ. Obodo nta ndị ọzọ gbakwara ha gburugburu.
37 Zenan, Hadasha, Migdal Gad,
Ebo Juda ketara Zenan, Hadasha, Migdal Gad,
38 Dileyan, Mizfa, Yokteyel,
Dilean, Mizpa, Jekteel,
39 Lakish, Bozkat, Eglon,
Lakish, Bozkat, Eglọn,
40 Kabbon, Lahman, Kitlish,
Kabọn, Laamam, Kitlish,
41 Gederot, Bet-Dagon, Na’ama, Makkeda, garuruwa goma sha shida ke nan da ƙauyukansu.
Gederọt, Bet-Dagọn, Naama na Makeda. Obodo ndị a dị iri na isii, tinyekwara obodo nta ha. Ndị Juda ketakwara:
44 Keyila, Akzib, Maresha, garuruwa tara ke nan da ƙauyukansu.
Keila, Akzib na Maresha. Ha niile dị obodo itoolu, tinyekwara obodo nta ha niile.
45 Ekron da ƙauyukan da suke kewaye da ita;
Ha ketakwara Ekrọn, na obodo nta ya niile.
46 yammancin Ekron da dukan garuruwa da ƙauyukan da suke kusa da Ashdod.
Ọ bụ ha nwekwa obodo niile dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ Ekrọn, ndị dị nso nso Ashdọd, na obodo nta niile dị ha nso.
47 Ashdod da garuruwa da kuma ƙauyukan da suke kewaye da ita, Gaza da garuruwanta da ƙauyukanta har zuwa Rafin Masar da kuma Bahar Rum.
Ma Ashdọd nʼonwe ya, na ụmụ obodo nta ya niile, na Gaza na obodo nta ya niile, ruo nʼiyi Ijipt, na ruo nʼoke osimiri Mediterenịa.
48 Birane na cikin ƙasar tuddai kuwa, su ne, Shamir, Yattir, Soko,
Ha nwetakwara ala ndị dị nʼugwu ugwu bụ, Shamia, Jatịa, Sokoh,
49 Danna, Kiriyat Sanna (wato, Debir),
Dana, Kiriat-Sana (ya bụ Debịa),
51 Goshen, Holon, Gilo, garuruwa goma sha ɗaya ke nan da ƙauyukansu.
Goshen, Họlọn na Gailo, ha niile dị obodo iri na otu tinyere obodo nta ha niile.
Obodo ndị ọzọ bụ Arab, Duma, Eshan,
53 Yanum, Bet-Taffuwa, Afeka,
Janim, Bet-Tapụọa, Afeka,
54 Humta, Kiriyat Arba (wato, Hebron) da Ziyor, garuruwa tara ke nan da ƙauyukansu.
Humta, Kiriat Aba nke bụ Hebrọn na Zior, obodo itoolu tinyere obodo nta ha niile.
55 Mawon, Karmel, Zif, Yutta
Maon, Kamel, Zif, Juta,
56 Yezireyel, Yokdeyam, Zanowa,
Jezril, na Jokdeam, Zanoa,
57 Kayin, Gibeya, Timna, garuruwa goma ke nan da ƙauyukansu.
Kain, Gibea na Timna, obodo iri tinyere obodo nta ha niile.
58 Halhul, Bet-Zur, Gedor,
Halhaul, Bet Zoa, Gedoa,
59 Ma’arat, Bet-Anot, Eltekon, garuruwa shida ke nan da ƙauyukansu.
Maarat, Bet-Anot na Eltekọn, obodo isii tinyere obodo nta ha niile.
60 Kiriyat Ba’al (wato, Kiriyat Yeyarim) da Rabba, garuruwa biyu ke nan da ƙauyukansu.
Kiriat Baal, ya bụ, Kiriat Jearim na Raba, obodo abụọ tinyere obodo nta ha niile.
61 Biranen da suke a jeji kuwa su ne, Bet-Araba, Middin, Sekaka,
Obodo ha ndị dị nʼọzara bụ ndị a: Bet-Araba, Midin, Sekaka,
62 Nibshan, Birnin gishiri da En Gedi, garuruwa shida ke nan da ƙauyukansu.
Nibshan, Obodo Nnu na En-Gedi, obodo isii tinyere obodo nta ha niile.
63 Kabilar Yahuda kuwa ba su iya korar Yebusiyawa waɗanda suke zama cikin Urushalima ba; har wa yau Yebusiyawa suna nan zaune tare da mutanen Yahuda.
Ma ebo Juda enweghị ike ịchụpụ ndị Jebus bi nʼime Jerusalem; ruo taa ndị Jebus bi na Jerusalem, nʼetiti ụmụ Juda.