< Yoshuwa 14 >

1 Ga wuraren da Isra’ilawa suka sami gādo a ƙasar Kan’ana waɗanda Eleyazar firist, Yoshuwa ɗan Nun da kuma shugabannin iyalai kabila-kabila na Isra’ila suka raba musu.
Otu a ka esi kenye ndị Izrel ala Kenan, bụ nke Elieza onye nchụaja, na Joshua, nwa Nun, na ndị ndu ikwu niile dị nʼebo Izrel kere.
2 Ta wurin yin ƙuri’a aka raba wa kabilan nan tara da rabi, yadda Ubangiji ya umarta ta wurin Musa.
Ebo ọbụla nʼime ebo itoolu na ọkara ahụ fọdụrụ nwetara ihe nketa ha site nʼife nza, dịka Onyenwe anyị nyere ya Mosis nʼiwu.
3 Musa ya ba wa kabilan biyu da rabin nan gādonsu gabashin Urdun, amma bai ba wa Lawiyawa gādo a cikin sauran ba,
Ma Mosis enyelarị ebo abụọ na ọkara ala nke ha nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ. Ma o kenyeghị ndị Livayị ihe nketa ọbụla nʼetiti ha.
4 gama’ya’yan Yusuf sun zama kabilu biyu, Manasse da Efraim. Ba a ba Lawiyawa gādon ba sai dai garuruwan da aka ba su su zauna a ciki, da wurin kiwo mai kyau domin dabbobinsu.
Nʼihi na ụmụ Josef dị ebo abụọ, ya bụ Manase na Ifrem. Enyeghị ndị Livayị oke nʼala ahụ, karịa obodo ụfọdụ ebe ha ga-ebi na ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha.
5 Haka Isra’ilawa suka raba ƙasar, yadda Ubangiji ya umarci Musa.
Ndị Izrel keere ala ahụ nʼusoro dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
6 Mutanen Yahuda kuma suka je wurin Yoshuwa a Gilgal, sai Kaleb ɗan Yefunne Bakenizze ya ce wa Yoshuwa, “Ka san abin da Ubangiji ya gaya wa Musa, mutumin Allah a Kadesh Barneya game da kai da ni.
Nʼoge a, ụmụ Juda zipụrụ ndị ozi ndị jekwuuru Joshua na Gilgal. Kaleb, nwa Jefune, onye Keniz so ha nʼije a. Mgbe ha bịarutere, Kaleb gwara Joshua okwu sị ya, “I chetakwara okwu ahụ Onyenwe anyị gwara Mosis onye nke Chineke banyere gị na banyere mụ onwe m, mgbe anyị nọ na Kadesh Banea?
7 Ina da shekara arba’in lokacin da Musa bawan Ubangiji ya aike ni zuwa Kadesh Barneya in leƙi asirin ƙasar. Na kuwa kawo masa rahoto daidai yadda na ga ƙasar,
Agbara m iri afọ anọ nʼoge ahụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị si na Kadesh Banea zipụ anyị ịga iledo ala ndị Kenan anya. Mgbe anyị lọghachiri, agwara m ya okwu, kọwaara ya ihe m chere nʼobi m bụ eziokwu.
8 amma’yan’uwana waɗanda muka je tare su suka ba da rahoton da ya sa zukatan mutane suka narke don tsoro. Ni kam na bi Ubangiji Allah da dukan zuciyata.
Ma ụmụnna anyị, ndị anyị na ha so gaa, menyere ụmụ Izrel egwu, mee ka obi ha daa mba ịchọ ịbanye nʼala ahụ e kwere anyị na nkwa. Ma ebe m nọgidere jiri obi m niile soro Onyenwe anyị Chineke m,
9 Saboda haka a ranan nan Musa ya rantse mini cewa, ‘Ƙasar da ka taka za tă zama ƙasarka ta gādo kai da’ya’yanka har abada, domin ka bi Ubangiji Allahna da dukan zuciyarka.’
Mosis ṅụrụ iyi sị m, ‘Ebe ọ bụ na i ji obi gị niile soro Onyenwe anyị Chineke m, ala ahụ i jegharịrị ije nʼelu ya ga-abụ ihe nketa nye gị na ụmụ gị ruo mgbe ebighị ebi.’
10 “Ga shi, kamar yadda Ubangiji ya yi alkawari, ya bar ni da rai har na ƙara shekaru arba’in da biyar tun daga lokacin da ya gaya wa Musa wannan, a lokacin da Isra’ilawa suke yawo a cikin jeji. Ga ni nan yau shekaruna tamanin da biyar!
“Ugbu a, dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa, o meela ka m dị ndụ. Nke a bụ iri afọ anọ na ise kemgbe Onyenwe anyị gwara Mosis okwu ndị a, mgbe Izrel na-awagharị nʼọzara. Ma ugbu a, lee, agbaala m iri afọ asatọ na ise taa.
11 Ina nan da ƙarfina kamar yadda nake da ƙarfi a lokacin da Musa ya aike ni; zan iya fita zuwa yaƙi da ƙwazo yanzu kamar yadda nake zuwa a dā.
M dị ike taa dịka m dị nʼụbọchị ahụ Mosis zipụrụ m. Dịka ike m dị mgbe ahụ, adịkwa m ike ugbu a, ịpụ buo agha ma batakwa
12 Yanzu sai ka ba ni wannan ƙasar da take kan tudu wadda Ubangiji ya yi alkawari zai ba ni a ranan nan. Kai ma ka ji a lokacin, yadda Anakawa suke a can, biranensu manya ne kuma sun kewaye su sosai, amma na sani Ubangiji zai taimake ni, zan kore su kamar yadda ya faɗa.”
Ya mere, nye m ala ugwu ugwu ahụ Onyenwe anyị kwere m nkwa nʼụbọchị ahụ. Gị onwe gị nụrụ nʼoge ahụ na ụmụ Anak bi nʼebe ahụ, na obodo ha bukwara ibu, na e jikwa mgbidi e wusiri ike gbaa ha gburugburu. Ma site nʼinyeaka Onyenwe anyị, aga m achụpụ ha dịka Onyenwe anyị kwuru.”
13 Sai Yoshuwa ya sa wa Kaleb ɗan Yefunne albarka, ya ba shi Hebron.
Nʼihi nke a, Joshua gọziri Kaleb nwa Jefune. O nyere ya obodo Hebrọn ka ọ bụrụ ihe nketa ya.
14 Saboda haka Hebron ta zama ƙasar Kaleb ɗan Yefunne Bakenizze tun daga lokacin nan, domin ya bi Ubangiji, Allah na Isra’ila da dukan zuciyarsa.
Ya mere, obodo Hebrọn ghọrọ ihe nketa Kaleb nwa Jefune onye Keniz bido mgbe ahụ, nʼihi na o ji obi ya niile soro Onyenwe anyị, Chineke Izrel.
15 (Dā a kan kira wannan Hebron, Kiriyat Arba. Wannan Arba kuwa shi ne wani katon mutum a cikin Anakawa.) Sa’an nan ƙasar ta huta daga yaƙi.
Tupu oge a, aha a na-akpọ Hebrọn bụ Kiriat Aaba, nke pụtara Obodo Aaba. Aaba bụkwa aha nwoke kachasị ịdị ukwuu nʼetiti ndị Anak niile. Site nʼoge a gaa nʼihu, e nwere udo nʼala ahụ niile.

< Yoshuwa 14 >