< Ayuba 1 >

1 A ƙasar Uz akwai wani mutum mai suna Ayuba. Mutum ne marar laifi kuma mai adalci; yana tsoron Allah, ba ruwansa da mugunta.
Otu nwoke aha ya bụ Job bi nʼobodo Uz. Nwoke a bụ Job bụ onye na-enweghị ịta ụta ọbụla, bụrụkwa onye ezi omume nke na-atụ egwu Chineke ma na-agbara mmehie ọsọ.
2 Yana da’ya’ya maza bakwai da’yan mata uku,
Ọ mụrụ ụmụ ndị ikom asaa na ụmụ agbọghọ atọ.
3 yana da tumaki dubu bakwai, raƙuma dubu uku, shanu ɗari biyar, da jakuna ɗari biyar, yana kuma da masu yi masa aiki da yawa. A ƙasar Gabas ba wani kamar sa.
O nwere puku atụrụ asaa, na puku ịnyịnya kamel atọ, na ehi ọnụọgụgụ ha dị otu puku e jikọrọ abụọ abụọ, na narị ịnyịnya ibu ise, na ọtụtụ ndị na-ejere ya ozi. Ọ bụ nwoke dị ukwuu karịa ndị niile bi nʼọwụwa anyanwụ.
4 ’Ya’yansa maza sukan yi biki a gidajensu, wannan yă yi yă ba wancan, sai su kira’yan’uwansu mata ukun su ci, su sha tare.
Ụmụ ya ndị ikom na-eme mmemme oriri na ọṅụṅụ nʼụbọchị ọmụmụ ha nʼụlọ ha, nke ọbụla nʼime ya nʼusoro. Mgbe ha na-eme nke a, ha na-akpọkwa ụmụnne ha ndị nwanyị atọ ka ha bịa soro ha rie ma ṅụkwaa.
5 Bayan lokacin bikin ya wuce, sai Ayuba yă aika su zo don yă tsarkake su. Tun da sassafe zai miƙa hadaya ta ƙonawa domin kowannensu, don yana tunani cewa, “Mai yiwuwa’ya’yana sun yi wa Allah zunubi, ko sun la’anta shi a cikin zuciyarsu.” Haka Ayuba ya saba yi.
Mgbe oge mmemme ndị ahụ gwụsịrị, Job na-akpọkọta ụmụ ya doo ha nsọ. Nʼisi ụtụtụ ya, ọ na-achụ aja nsure ọkụ nʼihi onye ọbụla nʼetiti ụmụ ya. Echiche ya bụ, “Ma eleghị anya, ụmụ ya emehiela kọchaa Chineke nʼime obi ha.” Nke a bụ ihe Job na-eme mgbe niile.
6 Wata rana mala’iku suka kawo kansu gaban Ubangiji, Shaiɗan shi ma ya zo tare da su.
Otu ụbọchị ụmụ Chineke bịara igosi onwe ha nʼihu Onyenwe anyị ma ekwensu sonyekwara ha bịa.
7 Ubangiji ya ce wa Shaiɗan, “Daga ina ka fito?” Shaiɗan ya amsa wa Ubangiji ya ce, “Daga yawo a duniya ina kai da kawowa a cikinta.”
Onyenwe anyị sịrị Ekwensu, “Ebee ka i si abịa?” Ekwensu zara Onyenwe anyị, “Site nʼịwagharị nʼụwa na site nʼịgagharị ihu na azụ nʼime ya.”
8 Sai Ubangiji ya ce wa Shaiɗan, “Ko ka ga bawana Ayuba? A cikin duniya babu wani kamar sa; shi marar laifi ne, adali kuma, mutum ne mai tsoron Allah, ba ruwansa da mugunta.”
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Ekwensu, “I leziela ohu m nwoke Job anya? Ọ dịghị onye ọzọ nọ nʼụwa nke dịka ya. Ọ bụ nwoke zuruoke, onye na-emekwa ihe ziri ezi. Ọ bụ onye na-atụ egwu Chineke, na-adịghị etinye aka ya nʼihe ọjọọ ọbụla.”
9 Sai Shaiɗan ya amsa ya ce, “Haka kawai Ayuba yake tsoron Allah?
Ekwensu zara Onyenwe anyị sị, “Job ọ na-atụ Chineke egwu nʼefu?
10 Ba ka kāre shi da iyalinsa gaba ɗaya da duk mallakarsa ba? Ka Albarkaci ayyukan hannunsa yadda dabbobinsa duk sun cika ko’ina.
Ọ bụ na ị gbaghị Job na ezinaụlọ ya na ihe niile o nwere ogige gburugburu nʼakụkụ niile? I gọziela ọrụ aka ya, nke mere na igwe ewu na atụrụ ya na igwe ehi ya jupụtara ebe niile.
11 Ka ɗan miƙa hannunka ka raba shi da duk abin da yake da shi, ba shakka zai la’anta ka kana ji, kana gani.”
Ngwa, setịpụ aka gị metụ ihe niile o nwere aka, ka ị hụ ma ọ gaghị abụ gị ọnụ.”
12 Ubangiji ya ce wa Shaiɗan, “To, shi ke nan, duk abin da yake da shi yana hannunka, amma kada ka taɓa shi, shi kansa.” Sai Shaiɗan ya bar Ubangiji.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị zara ekwensu sị ya, “Lee Job, jiri niile o nwere mee ihe ọbụla ị chọrọ, kama emetụkwala ndụ ya aka.” Emesịa, ekwensu sitere nʼihu Onyenwe anyị pụọ.
13 Wata rana lokacin da’ya’yan Ayuba suke cikin biki a gidan babban ɗansa,
Otu ụbọchị, mgbe ụmụ Job ndị nwoke na ụmụnne ya ndị nwanyị zukọrọ iri ihe oriri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ nʼụlọ nwanne ha nwoke nke okenye.
14 sai ɗan aika ya zo wurin Ayuba ya ce masa, “Shanu suna huɗa, jakuna kuma suna kiwo nan kusa,
Otu onye nʼime ndị na-eje ozi bịakwutere Job sị, “Mgbe ehi anyị na-akọ ọrụ na mgbe ịnyịnya ibu anyị na-ata nri nʼebe dị nso,
15 sai Sabenawa suka auka musu suka kwashe su suka tafi, suka karkashe masu yi maka aiki duka, ni kaɗai na tsira na zo in gaya maka!”
ndị Sheba bịara lụsoo anyị ọgụ ma chịkọrọ ha laa. Ha ji mma agha gbuo ndị ọhụ gị, maọbụ naanị m bụ onye gbapụtara ịgwa gị.”
16 Yana cikin magana sai ga wani ɗan aika ya zo ya ce, “Wutar Allah ta sauko daga sama ta ƙona dukan tumaki da masu lura da su, wato, bayinka, ni kaɗai na tsira na zo in gaya maka!”
Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, onyeozi ọzọ gbabatara kwuo sị, “Ọkụ Chineke zitere sitere na mbara eluigwe daa rechapụ igwe atụrụ na ndị ohu niile. Ọ bụ naanị m bụ onye gbapụtara ịgwa gị ihe mere.”
17 Yana cikin magana sai ga wani ɗan aika ya zo ya ce, “Ƙungiyoyin mahara uku na Kaldiyawa sun auka wa raƙumanka sun kwashe su duka, suka kuma karkashe masu yi maka aiki, ni kaɗai ne na tsira na zo in gaya maka!”
Mgbe onye nke ahụ nọ na-ekwu okwu, onyeozi ọzọ batara kwuokwa sị, “Ndị agha ndị Kaldịa kere onwe ha ụzọ atọ bịakwasị ịnyịnya kamel gị niile, dọta ha nʼagha, kpụrụ ha laa. Ha ji mma agha gbuo ndị ohu gị niile gbalaa. Ọ bụ naanị m bụ onye gbapụtara ịgwa gị ihe mere.”
18 Yana cikin magana, sai ga wani ɗan aika ya zo ya ce, “’Ya’yanka maza da mata suna biki, suna ci suna sha a gidan babban ɗanka,
Mgbe ọ kpụ okwu ya nʼọnụ, onyeozi ọzọ batakwara kwuo sị, “Ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom nọ nʼụlọ nwanne ha nke okenye na-eri na-aṅụ,
19 sai wata iska mai ƙarfi daga hamada ta auka ta rushe gidan, gidan kuwa ya fāɗi a kan’ya’yanka ya kashe su, ni kaɗai na tsira na zo in gaya maka!”
na mberede, oke ifufe dị ukwuu nke si nʼọzara feere tie akụkụ anọ nke ụlọ ahụ, mee ka ọ dakwasị ha. Ha niile nwụrụ, ma ọ bụkwa naanị m gbapụtara ịgwa gị ihe mere.”
20 Da jin haka sai Ayuba ya tashi ya yayyaga tufafin jikinsa, ya aske kansa. Ya fāɗi a ƙasa ya yi sujada
Mgbe Job nụrụ ihe ndị a, o sitere nʼebe ọ nọ bilie ọtọ, dọwaa uwe ya, kpụchaa agịrị isi ya, ọ dara nʼala ma kpọọ isiala,
21 ya ce, “Tsirara na fito daga cikin mahaifiyata, tsirara kuma zan koma. Ubangiji ya bayar, Ubangiji kuma ya karɓa; yabo ya tabbata ga Ubangiji.”
kwuo sị: “Ọtọ ka m gba mgbe m si nʼafọ nne m pụta nʼọnọdụ ịgba ọtọ ka m ga-eji laghachikwa. Onyenwe anyị nyere ihe niile, Onyenwe anyị ewerekwala ihe niile, ka aha Onyenwe anyị bụrụ ihe a gọziri agọzi.”
22 Cikin wannan duka Ayuba bai yi wa Allah zunubi ta wurin ba shi laifi ba.
Nʼime ihe ndị a niile, Job emehieghị site nʼibo Chineke ebubo ime ihe ọjọọ.

< Ayuba 1 >