< Ayuba 38 >

1 Sa’an nan Ubangiji ya amsa wa Ayuba. Ya ce,
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sitere nʼoke ifufe gwa Job okwu sị:
2 “Wane ne wannan da yake ɓata mini shawarata da surutan wofi?
“Onye bụ onye a nke ji okwu ihe ọmụma na-adịghị na ya na-eme ka atụmatụ m ghara ịpụta ìhè?
3 Ka sha ɗamara kamar namiji; zan yi maka tambaya, za ka kuwa amsa mini.
Ugbu a, jikere onwe gị dịka dimkpa nʼihi na enwere m ajụjụ m ga-ajụ gị nke m chọrọ ka i nye m ọsịsa ha.
4 “Kana ina lokacin da na aza harsashen duniya? Gaya mini, in ka sani.
“Ebee ka ị nọ mgbe m tọrọ ntọala ụwa? Gwa m ma ọ bụrụ na ị ghọtara.
5 Wane ne ya zāna girmanta? Ba shakka ka sani! Wane ne ya ja layin aunawa a kanta?
Onye kpebiri ihe ụwa ga-aha ka ya? Nʼezie ị maara, onye setịrị ihe ọtụtụ e ji tụọ ya nʼelu ya?
6 A kan me aka kafa tushenta, ko kuma wa ya sa dutsen kan kusurwarta,
Nʼelu gịnị ka a tọrọ ntọala ya, onye doro nkume mbụ e ji tọọ ntọala ya?
7 yayinda taurarin safe suke waƙa tare dukan mala’iku kuma suka yi sowa don farin ciki.
Mgbe kpakpando nke isi ụtụtụ zukọrọ bụọ abụ, ụmụ Chineke niile tisikwara mkpu ọṅụ ike?
8 “Wane ne ya rufe teku a bayan ƙofofi, lokacin da ya burtsatso daga cikin ciki.
“Onye kara akara nye osimiri iwu ebe ọ ga-ejedebe mgbe o nupụtara dịka a ga-asị na o si nʼakpanwa pụta,
9 Lokacin da na yi wa gizagizai riga na kuma naɗe su a cikin duhu sosai,
mgbe m yikwasịrị ha igwe ojii dịka uwe, werekwa ọchịchịrị meere ya akwa okike,
10 sa’ad da na yi masa iyaka na sa masa ƙofofi da wurin kullewa.
mgbe m kpaara ya oke ebe ọ ga-akwụsị, tinye ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ya,
11 Sa’ad da na ce ga iyakar inda za ka kai, ga inda raƙuman ruwanka za su tsaya?
mgbe m sịrị, ‘Ruo ebe a ka ị ga-asọrute, ị gaghị agabiga ya, nʼebe a ka a ga-akwụsị ebili mmiri mpako gị’?
12 “Ko ka taɓa ba safiya umarni ko kuma ka sa asuba ta fito,
“O nweela oge i nyere ụtụtụ iwu, maọbụ mee ka chi ọbụbọ maara ọnọdụ ya,
13 don ta kama gefen duniya ta kakkaɓe mugaye daga cikinta?
ka o jide akụkụ niile nke ụwa aka ma site nʼụwa yọpụ ndị mmebi iwu?
14 Ƙasa ta sāke siffa kamar laka da aka yi wa hatimi; ta fito a fili kamar riga.
Ụwa na-ewere ụdịdị ya dịka ụrọ a kakwasịrị akara; ụdịdị ya na-egosipụta dịka uwe.
15 An hana mugaye haskensu, hannun da suka ɗaga an karya shi.
A na-eme ka ndị na-emebi iwu ghara inwe ìhè, meekwa ka aka e weliri elu bụrụ nke a nyajiri.
16 “Ko ka taɓa tafiya zuwa maɓulɓulan teku, ko kuma ka taɓa zuwa cikin zurfin lungun teku?
“I jeruola nʼisi iyi mmiri dị nʼosimiri, ka i jegharịala nʼebe miri emi nke ogbu mmiri?
17 Ko an taɓa nuna maka ƙofar mutuwa? Ko ka taɓa ganin ƙofar inuwar duhun mutuwa?
O nweela onye gosiri gị ọnụ ụzọ ọnwụ? Ka i jirila anya gị hụ ọnụ ụzọ nke onyinyo ọnwụ?
18 Ko ka gane fāɗin duniya? Gaya mini, in ka san wannan duka.
Ị ghọtara ịdị ukwu nke ụwa na otu o si gbasapụ? Gwa m, ma ọ bụrụ na ị maara ihe ndị a niile.
19 “Ina ne hanyar zuwa gidan haske? Kuma a ina duhu yake zama?
“Olee ụzọ e si aga ebe ìhè bi? Olee ebe ọchịchịrị bi?
20 Ko za ka iya kai su wurarensu? Ka san hanyar zuwa wurin da suke zama?
Ị nwere ike iduru ha jee nʼebe ha bi? Ị maara ụzọ e si eje ebe obibi ha?
21 Ba shakka ka sani, gama an riga an haife ka a lokacin! Ka yi shekaru da yawa kana rayuwa.
Nʼezie ị maara, nʼihi na a mụọla gị tupu e kee ihe ndị a! Ị bikwaala ọtụtụ afọ.
22 “Ka taɓa shiga rumbunan dusar ƙanƙara ko ka taɓa ganin rumbunan ƙanƙara
“Ị banyela nʼụlọ niile ebe a na-achịkọba snoo, ka ị hụla ụlọ niile ebe a na-achịkọba mkpụrụ mmiri igwe,
23 waɗanda nake ajiya domin lokacin wahala, domin kwanakin yaƙi da faɗa?
nke m chekwara nye oge nsogbu, nʼoge ọgụ na nʼoge agha?
24 Ina ne hanyar zuwa wurin da ake samun walƙiya, ko kuma inda daga nan ne ake watsa iskar gabas zuwa ko’ina cikin duniya?
Kedụ ụzọ e si ejeru ebe a na-anọ ekesasị amụma egbe eluigwe, ebee ka e si ekesasị ifufe ọwụwa anyanwụ nʼelu ụwa?
25 Wane ne ya yanka hanyar wucewar ruwa, da kuma hanyar walƙiyar tsawa
Onye wara ụzọ maka oke mmiri ozuzo, onye kwa waara amụma na egbe eluigwe ụzọ?
26 don ba da ruwa a ƙasar da ba kowa a wurin jeji inda ba mai zama ciki
Si otu a mee ka mmiri zokwasị ebe mmadụ na-ebighị, ala ọzara ebe ọ dịghị onye nọ nʼime ya,
27 don a ƙosar da wurin da ya bushe a sa ciyawa ta tsiro a can?
ka mmiri ozuzo mee ka ala kpọrọ nkụ nweta mmiri iji mee ka ahịhịa pupụta nʼime ya.
28 Ruwan sama yana da mahaifi? Wa ya zama mahaifin raɓa?
Mmiri ozuzo o nwere nna? Onye mụrụ igirigi?
29 Daga cikin wane ne aka haifi ƙanƙara? Wane ne ya haifi jaura daga sammai
Site nʼakpanwa onye ka mkpụrụ mmiri si apụta? Onye kwa bụ nne oke oyi nke eluigwe,
30 lokacin da ruwa ya zama da ƙarfi kamar dutse, lokacin da saman ruwa ya daskare?
nke na-eme ka mmiri kpụkọtaa dịrị ike dịka nkume, meekwa ka ihu ogbu mmiri kpụkọta?
31 “Za ka iya daure kyakkyawar kaza da’ya’yanta? Ko za ka iya kunce igiyoyin mafarauci da kare da zomo?
“Ị pụrụ ikechi agbụ niile nke Pleiades? Ị pụrụ ịtọpụ ihe nkechikọta Orion?
32 Za ka iya tattara taurari bisa ga lokacinsu ko kuma ka bi da beyar da’ya’yanta zuwa waje?
Ị pụrụ ime ka igwe kpakpando pụta nʼoge ha maọbụ dupụta anụ ndọgbu Bịa na ụmụ ya ndị ọzọ?
33 Ka san dokokin sammai? Ko za ka iya faɗar dangantakar Allah da duniya?
Ị maara iwu na-achị ihe niile dị na mbara eluigwe? Ị pụrụ inye ha ike ịchị ụwa?
34 “Za ka iya tsawata wa gizagizai ka kuma rufe kanka da ambaliyar ruwa?
“Ị pụrụ iti mkpu ruo igwe ojii si otu a mee ka idee mmiri kpuchie gị?
35 Kai ne kake aika walƙiya da tsawa zuwa inda suke zuwa? Ko suna zuwa wurinka su ce, ‘Ga mu nan mun zo?’
Ị pụrụ izipụ amụma egbe eluigwe nʼụzọ ha? Ha na-asị gị, ‘Ebe a ka anyị nọ’?
36 Wane ne yake cika zuciya da hikima ko kuma yake ba zuciya ganewa?
Onye na-etinye amamihe nʼobi mmadụ, maọbụ na-enye oke ọkpa nghọta?
37 Wane ne yake da hikimar iya ƙirga gizagizai? Wane ne zai iya karkato bakunan tulunan sammai
Onye nwere amamihe ịgụ igwe ojii niile dị na mbara eluigwe ọnụ? Onye kwa pụrụ ịhulata karama mmiri niile nke eluigwe niile,
38 sa’ad da ƙura ta yi yawa ta daskare a wuri ɗaya?
mgbe aja dị nʼala siri ike, mgbe ọkpụrụkpụ aja dị nʼala na-akpụkọta nʼahụ ibe ha?
39 “Za ka iya farauto wa zakanya nama, ka kuma kawar wa zakoki yunwarsu.
“Ọ bụ gị na-achụtara nne ọdụm ihe oriri, mee ka afọ ju ụmụ ọdụm
40 Lokacin da suka kwanta cikin kogunansu, ko kuma lokacin da suke a wurin ɓuyansu?
mgbe ha makpuuru nʼime ọgba ha, maọbụ mgbe ha zoro onwe ha na-eche anụ nʼọhịa?
41 Wane ne yake ba hankaka abinci lokacin da’ya’yansa suke kuka ga Allah, kuma suna yawo don rashin abinci?
Onye na-edoziri ugolọma ihe oriri ya, mgbe ụmụ ya na-etiku Chineke mkpu agụ, mgbe ha na-akpagharị na-achọ ihe oriri?

< Ayuba 38 >