< Ishaya 36 >
1 A shekara ta goma sha huɗu ta mulkin Sarki Hezekiya, Sennakerib sarkin Assuriya ya kai wa dukan birane masu kagaran Yahuda yaƙi ya kuma kame su.
Nʼafọ nke iri na anọ nke ọchịchị eze Hezekaya, Senakerib, bụ eze Asịrịa, busoro obodo Juda niile e wusiri ike agha, meriekwa ha.
2 Sai sarkin Assuriya ya aiki sarkin yaƙinsa tare da mayaƙa masu yawa daga Lakish zuwa wurin Sarki Hezekiya a Urushalima. Sa’ad da sarkin yaƙi ya tsaya a wuriyar Tafkin Tudu, a hanya zuwa Filin Mai Wanki,
Mgbe ahụ, eze Asịrịa sitere na Lakish zipụ ọchịagha ya, ya na usuu ndị agha ijekwuru Hezekaya na Jerusalem. Mgbe ọchịagha ahụ kwụsịrị nʼụzọ mmiri nke ọdọ mmiri dị Elu, nʼụzọ jere nʼebe ọhịa Ọsụ akwa.
3 Eliyakim ɗan Hilkiya sarkin fada, Shebna magatakarda, da Yowa ɗan Asaf marubuci suka fita zuwa wurinsa.
Eliakịm, nwa Hilkaya, onye nlekọta ụlọeze, na Shebna, bụ ode akwụkwọ eze, na Joa nwa Asaf, onye ndekọ akụkọ ihe mere, pụrụ jekwuru ya.
4 Sai sarkin yaƙin ya ce musu, “Ku faɗa wa Hezekiya. “‘Ga abin da babban sarki, sarkin Assuriya, ya faɗa. A kan me kake dangana wannan ƙarfin halinka?
Ọchịagha ahụ sịrị ha, “Gwanụ Hezekaya: “‘Otu a ka eze ukwu ahụ, bụ eze Asịrịa, na-ekwu, Ọ bụ na gịnị ka ntụkwasị obi gị dabere?
5 Ka ce kana da dabara da kuma ƙarfin mayaƙa, amma kana magana banza ce kawai. Ga wa ka dogara, da kake tayar mini?
Ị na-ekwu na i nwere ndụmọdụ na ike ibu agha, maọbụ naanị egbe ọnụ ka ị na-agba. Ọ bụ onye ka ị na-atụkwasị obi, mere i ji enupu isi nʼokpuru m?
6 Yanzu duba, kana dogara ga Masar, wannan ɗan tsinken kyauron dogarawa, wanda zai soki hannun mutum yă kuma ji masa rauni in ya dangana a kansa! Haka Fir’auna sarkin Masar yake ga duk wanda ya dogara da shi.
Lee, amatara m na ị na-atụkwasị obi nʼIjipt, mkpanaka achara ahụ gbajiri agbaji, nke na-adụwa aka onye ọbụla na-adabere na ya. Otu a ka Fero, eze Ijipt dị nye ndị niile na-atụkwasị ya obi.
7 Kuma in ka ce mini, “Mun dogara ga Ubangiji Allahnmu ne” ba shi ba ne Hezekiya ya rurrushe masujadan kan tudunsa da bagadansa, yana ce wa Yahuda da Urushalima, “Dole ku yi sujada wa gaban wannan bagade”?
Ma ọ bụrụ na unu asị m, “Anyị na-atụkwasị Onyenwe anyị bụ Chineke anyị obi.” Ọ bụghị ya ka Hezekaya wezugara ebe ya niile dị elu na ebe ịchụ aja ya niile, na-asị Juda na Jerusalem, “Unu aghaghị ịkpọ isiala nʼebe ịchụ aja a?”
8 “‘Yanzu fa, bari in yi ciniki da maigidana, sarki Assuriya. Zan ba ka dawakai dubu biyu, in za ka sa mahaya a kansu!
“‘Ma ugbu a, bịa kwee nna m ukwu, bụ eze Asịrịa nkwa. Aga m enye gị puku ịnyịnya abụọ ma ọ bụrụ na i nwere ike ịchọta ndị ga-agba ha.
9 Yaya za ka ƙi hafsan mafi ƙanƙanci na hafsoshin maigidana, ko da yake kana dogara ga Masar don kekunan yaƙi da mahayan dawakai?
Ị ga-esi kwa aṅaa jụ otu onyeisi nke dịkarịsịrị nta nʼime ndịisi ọrụ onyenwe m, na-agbanyeghịkwa na i na-atụkwasị obi nʼIjipt maka inweta ụgbọ agha na ndị na-agba ịnyịnya?
10 Ban da haka kuma, na zo ne in faɗa in kuma hallaka wannan ƙasa ba tare da Ubangiji ba? Ubangiji kansa ya faɗa mini in tasar wa wannan ƙasa in kuma hallaka ta.’”
Tinyere nke a, abịara m ibuso ala a agha na ibibi ya ma ọ bụghị nkwado Onyenwe anyị? Onyenwe anyị ya onwe ya gwara m ka m bilie megide obodo a, lakwaa ya nʼiyi.’”
11 Sai Eliyakim, Shebna da Yowa suka ce wa sarkin yaƙin, “Ka yi haƙuri ka yi wa bayinka magana da Arameyanci, da yake muna jinsa. Kada ka yi mana magana da Yahudanci a kunnen mutanen da suke kan katanga.”
Mgbe ahụ Eliakịm, Shebna na Joa sịrị ọchịagha ahụ, “Biko, gwa ndị ohu gị okwu nʼasụsụ Aramaik, ebe ọ bụ na anyị na-aghọta ya. Agwala anyị okwu nʼasụsụ Hibru, ebe ndị nọ nʼelu mgbidi ga-anụ.”
12 Amma sarkin yaƙin ya amsa ya ce, “Kuna tsammani ga maigidanku da ku ne kawai maigidana ya aiko ni in yi waɗannan maganganu, ba ga mutanen da suke zama a kan katanga ba, waɗanda kamar ku, za su ci kashinsu su kuma sha fitsarinsu?”
Ma ọchịagha ahụ zaghachiri, “Ọ bụ nʼihi naanị nna unu ukwu na nye unu onwe unu ka nna m ukwu ji zite m, ka m kwuo ihe ndị a? Ọ bụghị nʼihi ndị mmadụ ahụ na-anọdụ nʼelu mgbidi, ndị, dịka unu, ha ga-eso rie nsị ha nyụrụ, ṅụọkwa mamịrị ha nyụrụ?”
13 Sa’an nan sarkin yaƙin ya tsaya ya kuma yi kira da Yahudanci ya ce, “Ku ji kalmomin babban sarki, sarkin Assuriya!
Mgbe ahụ, ọchịagha ahụ guzoro were oke olu kwuo nʼasụsụ Hibru, sị, “Nụrụnụ okwu niile nke eze ukwu ahụ, bụ eze Asịrịa.
14 Ga abin da sarki ya ce kada ku bar Hezekiya ya ruɗe ku. Ba zai cece ku ba!
Nke a bụ ihe eze sịrị, Unu ekwela ka Hezekaya duhie unu. Ọ pụghị ịzọpụta unu.
15 Kada ku bar Hezekiya ya rarashe ku ku dogara ga Ubangiji sa’ad da ya ce, ‘Tabbatacce Ubangiji zai cece mu; ba za a ba da wannan birni a hannun sarkin Assuriya ba.’
Unu ekwela ka Hezekaya mee ka unu tụkwasị Onyenwe anyị obi, mgbe ọ na-asị, ‘Nʼezie, Onyenwe anyị aghaghị ịnapụta anyị. A gaghị enyefe obodo a nʼaka eze Asịrịa.’
16 “Kada ku saurari Hezekiya. Ga abin da sarkin Assuriya ya faɗa. Ku nemi salama da ni ku kuma fito zuwa wurina. Ta haka kowa zai ci daga kuringarsa da kuma itacen ɓaurensa ya kuma sha ruwa daga tankinsa,
“Unu aṅakwala Hezekaya ntị. Ihe a ka eze Asịrịa kwuru: Pụkwutenụ m, bịanụ ka mụ na unu mee udo. Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼime unu ga-eri mkpụrụ si nʼubi vaịnị ya na nke si nʼosisi fiig ya, ṅụọkwa mmiri nke si nʼihe icheta mmiri ya:
17 sai na zo na kuma kwashe ku zuwa ƙasa kamar taku, ƙasar hatsi da kuma sabon ruwan inabi, ƙasar abinci da gonakin inabi.
ruo mgbe m ga-abịa duru unu gaa nʼala dịka nke unu, bụ ala mkpụrụ ọka na nke mmanya ọhụrụ, ala achịcha na ubi vaịnị jupụtara nʼime ya.
18 “Kada ku bar Hezekiya ya ruɗe ku sa’ad da ya ce, ‘Ubangiji zai cece mu.’ Allahn wata al’umma ya taɓa ceci ƙasarsa daga hannun sarkin Assuriya?
“Unu ekwela ka Hezekaya rafuo unu mgbe ọ na-asị, ‘Onyenwe anyị ga-anapụta anyị.’ O nweela chi niile nke ndị mba ọzọ, nke napụtarala ala ha site nʼaka eze Asịrịa.
19 Ina allolin Hamat da na Arfad? Ina allolin Sefarfayim? Sun fanshi Samariya daga hannuna?
Olee ebe ka chi ndị Hamat na Apad nọ? Olee ebe ka chi ndị Sefavaim nọkwa? Ha anapụtala Sameria site nʼaka m?
20 Wanne cikin dukan allolin ƙasashen nan ya iya ceton ƙasarsa daga gare ni? Yaya kuwa Ubangiji zai iya ceci Urushalima daga hannuna?”
Olee chi nʼime chi mba ndị a niile, bụ ndị zọpụtarala ala ha site nʼaka m? Unu si aṅaa chee na Onyenwe anyị pụrụ ịzọpụta Jerusalem site nʼaka m?”
21 Amma mutanen suka yi shiru ba su kuwa ce kome ba, gama sarki ya yi umarni cewa, “Kada ku amsa masa.”
Ma ndị ahụ niile gbara nkịtị, ha ekwughị ihe ọbụla, nʼihi na eze nyere ha iwu sị, “Unu azaghachila ya.”
22 Sai Eliyakim ɗan Hilkiya sarkin fada, Shebna magatakarda, da kuma Yowa ɗan Asaf marubuci suka tafi wurin Hezekiya, da rigunansu a kyakkece, suka kuwa faɗa masa abin da sarkin yaƙin ya yi ta farfaɗa.
Mgbe Eliakịm nwa Hilkaya, onyeisi ọchịchị, na Shebna ode akwụkwọ eze, na Joa nwa Asaf, ode akwụkwọ akụkọ eze laghachikwuuru Hezekaya, ha dọwara uwe ha mgbe ha na-aga igosi ya ịda mba nke obi ha. Ha gwakwara ya ihe niile onyeisi agha ndị Asịrịa kwuru.