< Ezekiyel 20 >

1 A shekara ta bakwai, a wata na biyar a rana ta goma, waɗansu dattawan Isra’ila suka zo don su nemi nufin Ubangiji, suka kuwa zauna a ƙasa a gabana.
O ruo, nʼọgwụgwụ ọnwa ise, nʼafọ nke asaa, ụfọdụ nʼime ndị okenye Izrel bịara ịjụta Onyenwe anyị ase. Ha nọdụrụ ala nʼihu m.
2 Sai maganar Ubangiji ta zo mini cewa,
Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
3 “Ɗan mutum, ka yi magana da dattawan Isra’ila ka ce musu, ‘Ga abin da Ubangiji Mai Iko Duka yana cewa kun zo ne ku nemi shawarata? Muddin ina raye, ba zan bari ku nemi shawarata ba, in ji Ubangiji Mai Iko Duka.’
“Nwa nke mmadụ, gwa ndị okenye Izrel okwu sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ajụ, Ọ bụ ịjụpụta ase nʼaka m ka unu bịara? Dịka mụ onwe m na-adị ndụ, agaghị m ekwe ka unu jụọ m ase ọbụla, ọ bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’
4 “Za ka hukunta su? Za ka hukunta su, ɗan mutum? To, sai ka kalubalance su da ayyukan banƙyamar kakanninsu
“Ị ga-ekpe ha ikpe? Ị ga-ekpe ha ikpe, nwa nke mmadụ? Mee ka ha mara banyere ihe arụ niile nna nna ha mere.
5 ka ce musu, ‘Ga abin da Ubangiji Mai Iko Duka yana cewa a ranar da na zaɓi Isra’ila, na ɗaga hannuna, na rantse wa zuriyar gidan Yaƙub na kuma bayyana kaina gare su a Masar da hannun da na ɗaga na ce musu, “Ni ne Ubangiji Allahnku.”
Gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, nʼụbọchị m họpụtara Izrel, eweliri m aka m ṅụọrọ ya na ụmụ ya bụ ụlọ Jekọb iyi ma kpugheekwa onwe m gosi ha nʼala Ijipt. Site nʼiweli aka m, agwara m ha okwu sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu.”
6 A ranar na yi musu rantsuwa cewa zan fitar da su daga Masar zuwa ƙasar da na samo musu, ƙasa mai zub da madara da zuma, ƙasa mafi kyau cikin dukan ƙasashe.
Nʼụbọchị ahụ, aṅụụrụ m ha iyi na m ga-esi nʼala Ijipt dupụta ha baa nʼala nke m chọpụtara ha, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, bụ ala nke kachasị ibe ya mma.
7 Na kuma ce musu, “Kowannenku ya zubar da mugayen siffofin da kuka kafa idanunku a kai, kuma kada ku ƙazantar da kanku da gumakan Masar. Ni ne Ubangiji Allahnku.”
Mgbe ahụ, agwara m ha, “Onye ọbụla nʼime unu, wezuganụ oyiyi ihe arụ niile ndị ahụ bụ nke unu legidere anya, unu ejikwala arụsị niile nke Ijipt merụọ onwe unu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu.”
8 “‘Amma sai suka yi tawaye a kaina ba su kuwa saurare ni ba; ba su zubar da mugayen siffofin da suka kafa idanunsu a kai ba, balle su ƙi gumakan Masar. Saboda haka zan zubo hasalata a kansu in kuma aukar musu da fushina a Masar.
“‘Ma ha nupuru isi megide m. Ha aṅaghị m ntị. Ha ewezugakwaghị oyiyi ihe arụ ndị a, bụ nke ha lekwasịrị anya, maọbụ hapụkwanụ arụsị niile nke ndị Ijipt. Nʼihi ya, aga m awụkwasị ha oke iwe m, meekwa ka iwe m zuo oke nʼahụ ha nʼIjipt.
9 Amma saboda sunana na yi abin da zai kiyaye shi daga ƙazantuwa a idanun al’umman da suka zauna a ciki da kuma a idanun al’ummai da na bayyana kaina ga Isra’ilawa ta wurin fitar da su daga Masar.
Ma nʼihi aha m, e si m Ijipt kpọpụta ha. E mere m nke a ka a ghara imerụ aha m bụ nke dị nsọ, nʼanya ndị mba dị iche iche nʼetiti ndị ha binyere, bụ ndị mkpughere onwe m nye Izrel nʼihu ha.
10 Saboda haka na fisshe su daga Masar na kawo su cikin hamada.
Nʼihi ya, esitere m nʼIjipt dupụta ha, dubata ha nʼọzara.
11 Na ba su ƙa’idodina na kuma sanar musu da dokokina, gama mutumin da ya yi biyayya da su zai rayu ta wurinsu.
Nʼebe ahụ ka m nọ nye ha iwu m niile, gosikwa ha ụkpụrụ m, gwa ha na onye ọbụla debere ha ga-adị ndụ.
12 Na kuma ba su Asabbataina kamar alama tsakaninmu, domin su san cewa Ni Ubangiji ne yake tsarkake su.
Ọzọ, e nyekwara m ha ụbọchị izuike, ka ọ bụrụ ihe ịrịbama dị nʼetiti mụ na ha, ka ha maara na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, na-edo ha nsọ.
13 “‘Duk da haka mutanen Isra’ila suka yi mini tawaye a cikin hamada. Ba su bi ƙa’idodina ba amma suka ki dokokina, ko da yake mutumin da ya yi biyayya da su zai rayu ta wurinsu, suka ɓata Asabbataina ƙwarai. Saboda haka na ce zan zuba hasalata a kansu in kuma hallaka su a hamada.
“‘Ma ụlọ nke Izrel nupuru isi megide m. Nʼime ọzara ahụ, ha jụrụ idebe iwu m. Ha agbasoghị usoro m, ọ bụ ezie na ịgbaso ya pụtara ịdị ndụ. Ha edebeghị ụbọchị izuike m nsọ. Nʼihi ya, ekpebikwara m na m ga-awụkwasị ha iwe ọkụ m, ka m kpochapụ ha nʼime ọzara.
14 Amma saboda sunana na yi abin da zai kiyaye shi daga ƙazantuwa a idanun al’umman da a idonsu na fisshe su.
Ma nʼihi aha m, e mere m ihe ga-eme ka a ghara ime ya ka ọ hapụ ịdị nsọ nʼanya ndị mba niile, bụ ndị hụrụ mgbe m si Ijipt kpọpụta ha.
15 Na kuma ɗaga hannu na rantse musu a hamada cewa ba zan kawo su ƙasar da na ba su ba, ƙasa mai zub da madara da zuma, ƙasa mafi kyau cikin dukan ƙasashe,
Ma nʼime ọzara ahụ, eweliri m aka ṅụọrọ ha iyi na m agaghị eduba ha nʼala ahụ m nyere ha, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, ala ahụ kachasị ala niile ọzọ dị nʼụwa mma.
16 domin sun ƙi dokokina ba su kuwa bi ƙa’idodina ba suka kuma ƙazantar da Asabbataina. Gama zukatansu sun fi so su bauta wa gumakansu.
Nʼihi na ha jụrụ iwu m, ha jụkwara ịgbaso ụkpụrụ m niile. Ha merụrụ ụbọchị izuike m, nʼihi na obi ha niile dị nʼebe arụsị ha dị.
17 Duk da haka na dube su ta tausayi ba zan hallaka su ko in kawo ƙarshensu a hamada ba.
Ma eji m obi ebere lee ha anya ma ghara ịla ha nʼiyi. Ekpochapụghị m ha nʼọzara.
18 Na faɗa wa’ya’yansu a hamada, “Kada ku bi farillai kakanninku ko ku kiyaye dokokinsu ko ku ƙazantar da kanku da gumakansu.
Mgbe ahụ, agwara m ụmụ ha okwu nʼọzara, “Unu agbasola nzọ ụkwụ nna unu ha maọbụ debe iwu ha maọbụ jiri arụsị ha merụọ onwe unu.
19 Ni ne Ubangiji Allahnku; ku bi ƙa’idodina ku kuma kula ku kiyaye dokokina.
Mụ onwe m bụ Onyenwe na Chineke gị. Gbasoonụ iwu m niile, lezie anya ka ị sorokwa ụzọ m niile.
20 Ku kiyaye Asabbataina da tsarki, don su zama alama tsakaninmu. Ta haka za ku san cewa ni ne Ubangiji Allahnku.”
Doonụ ụbọchị izuike m nsọ, ka ha ghọọkwa ihe ịrịbama nʼetiti mụ na unu. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe na Chineke unu.”
21 “‘Amma’ya’yan suka yi mini tawaye. Ba su bi ƙa’idodina ba, ba su kula su kiyaye dokokina ba, ko da yake mutumin da ya kiyaye su zai rayu ta wurinsu, suka kuma ƙazantar da Asabbataina. Saboda haka na ce zan zuba hasalata a kansu in kuma aukar musu da fushina a hamada.
“‘Ma ụmụ ahụ nupuru isi megide m. Ha ejegharịghị nʼụkpụrụ m, ha elezighị anya ka ha debe iwu nke m kwuru banyere ha, “Na onye ọbụla na-erubere ha isi ga-adị ndụ site na ha,” ha merụrụ ụbọchị izuike m. Nʼihi ya, asịrị m, Aga m awụkwasị ha ọnụma m, mezuokwa iwe m megide ha nʼọzara.
22 Amma na janye hannuna, kuma saboda sunana na yi abin da zai kiyaye shi daga ƙazantuwa a idanun al’umman da a idonsu na fisshe su.
Ọzọkwa, eseghachiri m aka m, nʼihi aha m, e mere m ihe ga-eme ka a ghara ime ya ka ọ hapụ ịdị nsọ nʼanya ndị mba niile, bụ ndị hụrụ mgbe m si Ijipt kpọpụta ha
23 Na kuma ɗaga hannu na rantse musu cewa zan watsar da su cikin al’ummai in kuma warwatsa su cikin ƙasashe,
E jikwa m iweli aka elu ṅụọrọ ha iyi nʼime ọzara, na m ga-achụsasị ha nʼetiti mba niile, mee ka ha gbasaa nʼakụkụ niile nke ụwa,
24 domin ba su kiyaye dokokina ba amma suka ƙi ƙa’idodina suka kuma ƙazantar da Asabbataina, idanunsu suka yi sha’awar gumakan kakanninsu.
nʼihi na ha edebeghị iwu m, kama ha jụrụ ụkpụrụ niile, lelịa ma merụọkwa ụbọchị izuike m. Naanị ihe na-agụ ha bụ arụsị niile nke nna ha.
25 Na kuma ba da su ga farillan da ba su da kyau da dokokin da ba za su rayu ta wurinsu ba;
Ahapụrụ m ha ka ha nabatara onwe ha iwu na omenaala dị iche iche nke na-abaghị uru. Nʼihi na site nʼidebe omenaala ndị a, ha apụghị inweta ndụ.
26 na bari suka ƙazantu ta wurin kyautai, hadayar kowane ɗan fari don in cika su da abin tsoro domin su san cewa ni ne Ubangiji.’
E merụrụ ha site nʼonyinye ha, bụ, iji nwa mbụ ọbụla chụọ aja, ka m si otu a menye ha egwu ka ha mara na mụ onwe m bụ Onyenwe.’
27 “Saboda haka, ɗan mutum, ka yi magana da mutanen Isra’ila ka faɗa musu cewa, ‘Ga abin da Ubangiji Mai Iko Duka yana cewa a wannan kuma kakanninku suka saɓe ni ta wurin yashe ni.
“Ya mere, nwa nke mmadụ, gwa ụlọ Izrel okwu, sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, Nna unu ha kwuluru m na nke a, site na-ekwesighị ntụkwasị obi nye m.
28 Sa’ad da na kawo su cikin ƙasar da na rantse zan ba su suka kuma ga tudu mai tsawo ko itace mai ganye, a can suka miƙa hadayunsu, suka yi sadakokin da suka tsokane ni na yi fushi, suka miƙa turaren ƙanshinsu suka kuma zuba sadakokinsu na sha.
Mgbe m dubatara ha nʼala ahụ nke m ṅụrụ nʼiyi inye ha, ha hụrụ ugwu dị elu maọbụ osisi nwere ọtụtụ akwụkwọ, ebe ahụ ha chụrụ aja ha, nyekwa onyinye ha, si otu a kpasuo m iwe. Ha doro ha ihe ndị ahụ niile na-esi isi ụtọ, wụsakwara ha aja ihe ọṅụṅụ
29 Sai na ce musu, Wane ɗakin tsafi kuke tafiya?’” (Ana ce da shi Bama har wa yau.)
Ya mere a jụrụ m ha, Gịnị ka a na-akpọ ebe ịchụ aja a unu na-aga?’” (A na-akpọ ya Baama ruo taa.)
30 “Domin haka ka faɗa wa gidan Isra’ila, ‘Ga abin da Ubangiji Mai Iko Duka yana cewa za ku ƙazantar da kanku yadda kakanninku suka yi ne ku yi sha’awar mugayen siffofinsu?
“Nʼihi nke a, gwa ụlọ Izrel, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Unu ọ ga-emerụ onwe unu dịka nna nna unu ha mere site nʼịchụso oyiyi ihe arụ ha dị iche iche?
31 Sa’ad da kuka miƙa kyautai naku, hadayar’ya’yanku maza a wuta, kuna cin gaba da ƙazantar da kanku da duka gumakanku har wa yau. Zan bari ku nemi shawarata, ya gidan Isra’ila? Muddin ina raye, in ji Ubangiji Mai Iko Duka, ba zan bari ku nemi shawarata ba.
Mgbe unu na-enye onyinye unu, na-eme ka ụmụ unu site nʼọkụ gafee, unu na-aga nʼihu jiri arụsị unu niile na-emerụ onwe unu ruo taa. Mụ onwe m, m ga-ekwe ka unu jụta m ase, O ụlọ Izrel? Dịka mụ onwe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, agaghị m ekwe ka unu jụọ m ase.
32 “‘Kukan ce, “Kuna so ku zama kamar sauran al’ummai, kamar sauran mutanen duniya, waɗanda suke bauta wa itace da dutse.” Amma abin da kuke tunani ba zai taɓa faruwa ba.
“‘Unu na-ekwu nʼobi unu sị, “Anyị chọrọ ịdị ka mba ndị ọzọ, dịka agbụrụ ndị ọzọ nọ nʼụwa, ndị na-akpọ isiala nye osisi na nkume.” Ma ihe unu bu nʼobi agaghị emezu.
33 Muddin ina raye, in ji Ubangiji Mai Iko Duka, zan yi mulki a kanku da hannu mai iko da kuma hannu mai ƙarfi da kuma fushi.
Dịka m na-adị ndụ, aga m eji aka ike na ogwe aka e setịrị eseti nakwa nwụpụ nke oke iwe m chịa unu, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.
34 Zan fitar da ku daga al’ummai in tattara ku daga ƙasashe inda aka warwatsa ku, da hannu mai iko da kuma hannu mai ƙarfi da kuma fushi.
Aga m akpọpụta unu site na mba dị iche iche, chịkọtaa unu site na mba ndị ahụ a chụsasịrị unu. Ọ bụ aka m dị ike, aka m setịpụrụ na ọnụma a wụpụrụ ka m ga-eji mee ya.
35 Zan kawo ku cikin hamadar al’ummai a can kuwa, fuska da fuska, zan hukunta ku.
Aga m akpọbata unu nʼọzara nke mba niile, nọdụ nʼebe ahụ kpee unu ikpe nʼihu nʼihu.
36 Yadda na hukunta kakanninku a hamadar ƙasar Masar, haka zan hukunta ku, in ji Ubangiji Mai Iko Duka.
Dịka m kpere nna nna unu ha ikpe nʼọzara nke dị nʼala Ijipt, otu a ka m ga-esi kpee unu ikpe, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
37 Zan lura da ku yayinda kuke wucewa ƙarƙashin sanda, zan kuma kawo ku cikin daurin alkawari.
Aga m eme ka unu si nʼokpuru mkpanaka m gafee, aga m akpọbata unu na njikọ nke ọgbụgba ndụ ahụ.
38 Zan fitar da waɗanda suke mini tayarwa da kuma’yan tawaye. Ko da yake zan fitar da su daga ƙasar da suke zama, duk da haka ba za su shiga ƙasar Isra’ila ba. Sa’an nan za ku san cewa ni ne Ubangiji.
Aga m esi nʼetiti unu wezuga ndị na-ekwe ntị ike ma na-enupu isi megide m. Ọ bụ ezie na m ga-akpọpụta ha site nʼala ahụ ha bi, ma ha agaghị abata nʼala Izrel. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
39 “‘Game da ku, ya gidan Isra’ila, ga abin da Ubangiji Mai Iko Duka yana cewa ku tafi ku bauta wa gumakanku, kowannenku! Amma daga baya tabbatacce za ku saurare ni ba kuwa za ku ƙara ɓata sunana mai tsarki da hadayunku da gumakanku ba.
“‘Ma banyere unu, bụ ụlọ Izrel, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Gaanụ fee arụsị unu niile dị iche iche, onye ọbụla nʼime unu. Ma emesịa, unu aghaghị ịṅa m ntị, ọ dịghịkwa mgbe unu ga-eji onyinye na arụsị unu niile merụọ aha nsọ m.
40 Gama a kan dutsena mai tsarki, dutse mai tsayi na Isra’ila, in ji Ubangiji Mai Iko Duka, a can a ƙasar gidan Isra’ila gaba ɗaya za su bauta mini, a can kuwa zan karɓe su. A can zan bukaci hadayunku da sadake sadakenku mafi kyau, tare da dukan tsarkakan hadayunku.
Nʼihi na ọ bụ nʼelu ugwu m dị nsọ, nke bụ elu ugwu ukwu nke Izrel, ka Izrel niile ga-anọ fee m. Nʼebe ahụ ka m ga-anọkwa nabata onyinye unu na onyinye pụrụ iche unu, na aja nsọ unu dị iche iche. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
41 Zan karɓe ku kamar turare mai ƙanshi sa’ad da na fitar da ku daga al’ummai na kuma tattara ku daga ƙasashe inda aka warwatsa ku, zan kuma nuna kaina mai tsarki a cikinku a idon al’ummai.
Aga m anabatakwa unu dịka onyinye ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, mgbe m si na mba dị iche iche kpọlata unu, mgbe m ga-achịkọta unu site nʼobodo ahụ niile a chụgara unu. Mgbe ahụ, mba niile ga-amata na m dị nsọ.
42 Sa’an nan za ku san cewa ni ne Ubangiji sa’ad da na kawo ku cikin ƙasar Isra’ila, ƙasar da na ɗaga hannu na rantse zan ba wa kakanninku.
Mgbe m mere ka unu lọta nʼala Izrel, bụ ala ahụ m weliri aka elu ṅụọ iyi inye nna nna unu ha, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
43 A can za ku tuna da halinku da kuma dukan ayyukanku waɗanda kuka ɓata kanku da su, za ku kuwa ji ƙyamar kanku saboda mugayen abubuwan da kuka aikata.
Nʼebe ahụ, unu ga-echeta obibi ndụ na omume mmehie niile unu ji merụọ onwe unu. Unu ga-asọkwa onwe unu oyi, nʼihi ihe ọjọọ niile unu mere.
44 Za ku san cewa ni ne Ubangiji, sa’ad da na yi muku haka saboda sunana ba bisa ga mugayen hanyoyinku da ayyukanku marasa kyau ba, ya gidan Isra’ila, in ji Ubangiji Mai Iko Duka.’”
Unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m mesochara unu mmeso nʼihi aha m, na-agụghị ajọ omume unu maọbụ otu ụzọ ọjọọ niile unu si dị, unu bụ ụlọ Izrel. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.’”
45 Maganar Ubangiji ta zo mini cewa,
Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
46 “Ɗan mutum, ka kafa fuskarka wajen kudu; ka yi wa’azi a kan kudu ka kuma yi annabci a kan kurmin ƙasar kudu.
“Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼụzọ ndịda. Kwuokwa okwu megide ala ahụ dị na ndịda, na oke ọhịa niile dị na ndịda.
47 Ka faɗa wa kurmin kudanci, ‘Ji maganar Ubangiji. Ga abin da Ubangiji Mai Iko Duka yana cewa ina gab da sa maka wuta, za tă kuwa cinye dukan itatuwanki sarai, da ɗanye da busasshe. Ba za a kashe wutar da take ci ba, kuma kowace fuska a kudu zuwa arewa za tă ƙone.
Sị oke ọhịa ndịda ahụ, ‘Nụrụ okwu nke Onyenwe anyị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ana m akwado isunye gị ọkụ, nke ga-erechapụ osisi niile dị nʼime gị, ma ndị dị ndụ ma ndị kpọnwụrụ akpọnwụ. A pụghị imenyụ oke ọkụ ahụ, ọ ga-erechapụkwa ihu niile site na ndịda ruo nʼugwu niile.
48 Kowa zai san cewa Ni Ubangiji ne ya ƙuna ta; ba za a kashe ta ba.’”
Ihe niile bụ mmadụ, ga-ahụ na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, sunyere ọkụ ahụ. A gaghị emenyụkwa ya.’”
49 Sai na ce, “Kash, Ubangiji Mai Iko Duka! Suna zance a kaina cewa, ‘Ba misalai kawai yake yi ba?’”
Mgbe ahụ, ekwuru m sị, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ha na-ekwu banyere m, sị, ‘Ọ bụghị naanị ilu ka ọ na-atụ?’”

< Ezekiyel 20 >