< 1 Sama’ila 8 >

1 Da Sama’ila ya tsufa, sai ya naɗa’ya’yansa maza su zama alƙalan Isra’ila.
Mgbe Samuel ghọrọ agadi, o mere ụmụ ya ndị ikom ka ha bụrụ ndị ikpe ndị Izrel.
2 Sunan ɗansa na fari Yowel, na biyu kuwa Abiya. Suka yi alƙalanci a Beyersheba.
Juel, ọkpara ya, na Abija, nke na-eso ya ka ọ họpụtara. Ha nọkwa na Bịasheba na-ekpe ndị Izrel ikpe.
3 Amma’ya’yansa ba su bi hanyar mahaifinsu ba. Suka mai da hankalinsu ga neman kuɗi da cin hanci, suna kuma danne gaskiya.
Ma ụmụ ya esoghị ụzọ ya. Ha na-agbaso naanị ihe ga-abara ha. Ha na-erikwa ngarị, na-ekpe ikpe na-ezighị ezi.
4 Sai dukan shugabannin Isra’ila suka taru suka zo wurin Sama’ila a Rama.
Nʼihi ya, ndị okenye ụmụ Izrel niile zukọtara, bịakwute Samuel na Rema sị ya,
5 Suka ce masa, “Ka tsufa,’ya’yanka kuma ba sa bin hanyarka, saboda haka sai ka naɗa sarkin da zai bi da mu kamar yadda sauran ƙasashe suke da su.”
“I meela agadi, ụmụ gị ndị ikom adịghịkwa eso ụzọ gị. Ugbu a họpụtara anyị onye ga-abụ eze anyị, onye ga na-edu anyị, dịka mba ndị ọzọ.”
6 Amma Sama’ila bai ji daɗi sa’ad da suka ce, “Ka ba mu sarki da zai bi da mu.” Sai ya yi addu’a ga Ubangiji.
Ma obi adịghị Samuel ụtọ mgbe ha rịọrọ sị, “Nye anyị eze ga-edu anyị.” Nʼihi ya, Samuel kpọkuru Onyenwe anyị nʼekpere.
7 Ubangiji kuwa ya ce masa, “Ka saurari dukan maganganun da mutanen suke gaya maka. Ai, ba kai ba ne suka ƙi, ni ne suka ƙi in zama sarkinsu.
Onyenwe anyị gwara ya, “Gee ntị nʼihe niile ndị a na-agwa gị; ọ bụghị gị ka ha jụrụ, kama ọ bụ mụ onwe m ka ha jụrụ ibu eze ha.
8 Haka suka yi daga tun daga ranar da na fitar da su daga Masar har zuwa yau, suka ƙi ni, suka bauta wa waɗansu alloli, haka ma suke yi maka.
Site nʼụbọchị m mere ka ha si nʼIjipt pụta ruo taa, ha na-agbakụta m azụ, na-efe chi ndị ọzọ. Ọ bụkwa otu a ka ha na-eme gị ugbu a.
9 Yanzu ka saurare su amma ka yi musu kashedi sosai, ka sa su san abin da sarkin da zai bi da su zai yi.”
Mee dịka ha rịọrọ, ma echefula ịgwa ha ụdị omume eze ahụ ga-achị ha ga-emeso ha.”
10 Sama’ila kuwa ya ce wa mutanen da suke roƙo yă naɗa musu sarki dukan abin da Ubangiji ya faɗa.
Samuel gwara ndị Izrel na-arịọ ka e nye ha eze ihe Onyenwe anyị kwuru.
11 Ya ce musu, “Ga abin da sarkin da zai yi mulkinku zai yi. Zai kwashe’ya’yanku yă sa su yi aiki da kekunan yaƙi da dawakansa, waɗansu za su riƙa gudu a gaban keken yaƙinsa.
Ọ zara sị ha, “Ihe ndị a bụ ụdị mmeso eze ahụ ga-achị unu ga-emeso unu: Ọ ga-eduru ụmụ unu ndị ikom mee ha ndị na-agba ọsọ nʼihu ụgbọ agha ya na ịnyịnya ya.
12 Zai sa waɗansu su zama shugabannin mutum dubu-dubu da kuma na hamsin-hamsin. Waɗansu za su yi masa noma da girbi. Waɗansu za su ƙera masa makaman yaƙi da kayayyaki don keken yaƙinsa.
Ụfọdụ ka ọ ga-eme ọchịagha, ndị ga-elekọta ọtụtụ puku ndị agha, maọbụ iri ndị agha ise; ndị ụfọdụ ga-abụ ndị ga-akọ ubi ya, ndị ọzọ ga-ewebatakwa ihe owuwe ubi ya, ma ndị ọzọ ga-akpụrụ ya ngwa agha na ihe niile e ji anya ụgbọ agha ya.
13 Zai sa’ya’yanku mata yin aikin turare da dafe-dafe da kuma toye-toye.
Ọ ga-eduru ụmụ unu ndị inyom mee ka ha bụrụ ndị na-esiri ya mmanụ otite na-esi isi ụtọ, na ndị na-esiri ya nri, na ndị na-eghere ya ihe oghịghe.
14 Zai karɓi gonakinku mafi kyau da gonakin inabinku da gonakin zaitunku yă ba wa ma’aikatansa.
Ọ ga-anarakwa unu ubi unu, na ubi vaịnị unu, na ubi oliv unu ndị kachasị mma, were ha nye ndị na-ejere ya ozi.
15 Zai kuma karɓi zakan hatsinku da na inabinku yă ba shugabannin fadarsa da sauran masu hidimarsa.
Ọ ga-ewere otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke mkpụrụ ubi unu na ubi vaịnị unu nye ndịisi ọrụ ya na ndị na-ejere ya ozi.
16 Zai ƙwace bayinku maza da mata, da shanunku, da jakunanku mafi kyau domin su yi masa aiki.
Ọ ga-akwagidekwa unu ka unu nye ya ndị ohu unu, ndị ikom nʼime ha, na ndị inyom nʼime ha, ya na anụ ụlọ unu ahụ dị ezi mma, na ịnyịnya ibu unu.
17 Zai karɓi zakan dabbobinku, ku kanku za ku zama bayinsa.
Ọ ga-ewerekwa otu ụzọ nʼụzọ iri nke igwe anụ ụlọ unu, meekwa ka unu onwe unu bụrụkwa ndị ohu ya.
18 Sa’ad da ranar ta zo, za ku yi kuka ku nemi a fishe ku daga sarkin da kuka zaɓa, Ubangiji kuwa ba zai ji ku ba.”
Mgbe ụbọchị ndị ahụ bịara, mgbe ihe ndị a bidoro imezu, unu ga-akwa akwa, rịọọ ka e wezugara unu eze ahụ unu họpụtaara onwe unu, ma Onyenwe anyị agaghị aṅa unu ntị nʼụbọchị ahụ.”
19 Amma mutanen suka ƙi jin Sama’ila, sai suka ce, “A’a, mu dai, muna son sarki yă bi da mu.”
Ma ndị Izrel jụrụ ige Samuel ntị. Ha sịrị, “Anyị chọrọ eze ga-achị anyị.
20 Ta haka za mu zama kamar sauran ƙasashe, mu kasance da sarkin da zai bi da mu, yă tafi tare da mu zuwa yaƙe-yaƙe.
Mgbe ahụ, anyị onwe anyị ga-adị ka ndị mba niile ọzọ, anyị ga-enwe eze ga na-edu anyị, na-aga nʼihu anyị na-ebukwa agha anyị.”
21 Da Sama’ila ya ji duk maganganun da mutanen suka faɗa, sai ya mayar wa Ubangiji.
Samuel gwara Onyenwe anyị ihe niile ha kwuru.
22 Ubangiji kuwa ya ce, “Ka saurare su, ka naɗa masu sarki.” Sa’an nan Sama’ila ya ce wa mutanen Isra’ila, “Kowa yă koma garinsa.”
Ma Onyenwe anyị zara ya ọzọ sị, “Mee ihe ha kwuru, nye ha eze.” Mgbe ahụ, Samuel gwara ndị ikom Izrel okwu sị ha, “Laanụ, nwoke ọbụla nʼobodo ya.”

< 1 Sama’ila 8 >