< 1 Sama’ila 24 >
1 Bayan da Shawulu ya komo daga fafaran Filistiyawa, sai aka gaya masa cewa, “Dawuda yana can a Jejin En Gedi.”
Mgbe Sọl sitere nʼịlụso ndị Filistia agha lọta, a gwara ya sị, “Devid nọ nʼọzara En-Gedi.”
2 Saboda haka Shawulu ya zaɓi mutum dubu uku daga cikin dukan Isra’ila, suka fita neman Dawuda da mutanensa kusa da Duwatsun Awakin Jeji.
Sọl chịịrị puku ndị agha atọ a zụrụ nke ọma site nʼIzrel niile, pụọ ịchọ Devid na ndị ikom ya nʼetiti ọgba nkume, na nʼakụkụ ụzọ dị warawara nke Ewu Ọhịa.
3 Da Shawulu ya isa inda ake ajiye garken tumaki a bakin hanya inda akwai kogo, sai ya shiga ciki kogon don yă yi bayan gari. Dawuda da mutanensa kuwa suna can zaune a ƙurewar kogon.
Mgbe ọ bịaruru nso nʼọgba atụrụ nke dị nʼụzọ ahụ, otu ọgba nkume dị nʼebe ahụ, Sọl banyere nʼime ya, ịga mposi. Devid na ndị ikom ya nọ nʼime ime ọgba nkume ahụ.
4 Mutanen Dawuda suka ce, wannan rana ce Ubangiji ya yi magana ya ce maka, “Zan ba da maƙiyinka a hannunka domin ka yi abin da ka ga dama da shi.” Sai Dawuda ya tashi a hankali ya je ya yanke shafin rigar Shawulu.
Ndị ikom Devid sịrị ya, “Ahaa ugbu a bụ oge gị! Taa bụ ụbọchị ahụ Onyenwe anyị kwuru okwu ya, mgbe ọ sịrị, ‘Aghaghị m inyefe gị onye iro gị nʼaka, ka i mee ya dịka o si masị gị.’” Ma Devid ji nwayọọ gaa nso ebe Sọl nọ bipụ ọnụ ọnụ uwe mwụda ya.
5 Daga baya Dawuda ya damu domin ya yanke shafin rigar Shawulu.
Emesịa, obi Devid malitere ịma ya ikpe nʼihi na o bipụrụ ọnụ ọnụ uwe mwụda Sọl.
6 Ya ce wa mutanensa, “Ubangiji yă sawwaƙe in yi abu haka ga shugabana da Ubangiji ya shafe, ko in ɗaga hannuna in kashe shi, gama shi shafaffe ne na Ubangiji.”
Ọ gwara ndị ya na ha so okwu sị, “Onyenwe anyị ekwela na m ga-emeso nna m ukwu, onye Onyenwe anyị tere mmanụ mmeso dị otu ahụ, maọbụ na m ga-eweli aka imegide ya. Nʼihi na onye Onyenwe anyị tere mmanụ ka ọ bụ.”
7 Da wannan magana Dawuda ya kwaɓi mutanensa, bai yarda su fāɗa wa Shawulu ba. Shawulu kuwa ya bar kogon ya yi tafiyarsa.
Devid sitere nʼokwu ndị a o kwuru baara ndị so ya mba. O nyeghị ha ohere ibuso Sọl agha. Emesịa, Sọl hapụrụ ọgba nkume ahụ.
8 Daga baya Dawuda ya fita daga kogon sai ya kira Shawulu ya ce, “Ranka yă daɗe, sarki!” Da Shawulu ya waiwaya, sai Dawuda ya rusuna da fuskarsa har ƙasa.
Mgbe Sọl si nʼọgba nkume ahụ pụọ ịga nʼihu nʼije ya, Devid sitere nʼime ọgba nkume ahụ pụta, kpọọ Sọl oku sị ya, “Onyenwe m, eze!” Sọl tụgharịrị ma Devid kpọrọ isiala nye ya, daa nʼala kpuo ihu ya nʼala.
9 Ya ce wa Shawulu, “Me ya sa kake saurari mutanen da suke cewa, ‘Dawuda ya dāge yă cuce ka’?
Mgbe ahụ Devid gwara Sọl okwu sị, “Gịnị mere i ji na-aṅa ntị nʼokwu ndị mmadụ na-ekwu, ndị ahụ na-asị Devid na-achọ ụzọ ọ ga-esi merụọ gị ahụ?
10 Yau ka ga da idonka yadda Ubangiji ya bashe ka a hannuna a cikin kogon nan. Waɗansu sun ce mini in kashe ka, amma na bar ka, na ce, ‘Ba zan sa hannuna a kan shugabana ba, gama shi shafaffe ne na Ubangiji.’
Taa, i jirila anya gị hụ na ọ bụghị eziokwu. Onyenwe anyị nyere gị nʼaka m nʼime ọgba nkume ahụ ị banyere, ụfọdụ ndị mụ na ha so gwara m ka m gbuo gị, ma ahapụrụ m gị ndụ nʼihi na m sịrị, ‘Agaghị m eweli aka m megide nna m ukwu nʼihi na ọ bụ onye Onyenwe anyị tere mmanụ.’
11 Babana, duba, ga shafin rigarka a hannuna, na yanke shafin rigarka amma ban kashe ka ba. Yanzu ka gane ka kuma sani cewa ba ni da laifin aikata kome ko tayarwa, ban yi maka laifi ba, amma kana farautar raina.
Lee, nna m, lee iberibe uwe mwụda gị nʼaka m. Ebipụtara m ọnụ ọnụ uwe gị, ma egbughị m gị. Jiri nke a ghọta ma matakwa na ikpe nnupu isi na ajọ omume megide gị amaghị m. O nweghị ụzọ m si mejọọ gị, ma ị nọ na-achọsikwa m ike iwere ndụ m.
12 Ubangiji zai shari’anta tsakanina da kai. Ubangiji zai sāka mini laifin da ka yi mini, amma ni kam ba zan taɓa ka ba.
Ka Onyenwe anyị kpebie nʼetiti mụ na gị, ka Onyenwe anyị bọọ ọbọ ihe ọjọọ niile i mere. Ma agaghị m emetụ gị aka.
13 Kamar yadda karin maganan nan na dā ya ce, ‘Daga cikin masu mugunta, mugunta ke fitowa,’ hannuna dai ba zai taɓa ka ba.
Dịka ilu ndị mgbe ochie si dị, ‘Ihe ọjọọ na-esi nʼaka ndị na-eme ihe ọjọọ,’ ma agaghị m emetụ gị aka.
14 “Wane ne sarkin Isra’ila, ka fito kake bi? Wa kake kora? Kana bin mataccen kare ko kuɗin cizo?
“Ma onye kwanụ ka eze Izrel na-achọ ijide? Onye ka ọ na-atụfu oge ya ịchọgharị? Ọ bụ ozu nkịta? Ka ọ bụ akpị?
15 Ubangiji yă zama alƙali, yă yi shari’a tsakanina da kai, bari Ubangiji yă duba, yă tsaya mini, yă nuna ba ni da laifi.”
Ka Onyenwe anyị bụrụ onye ikpe nʼetiti mụ na gị, ya kpebiekwa okwu anyị. Ya leba okwu m anya kpepụta m, ya gosi na m bụ onye ikpe na-amaghị site nʼịnapụta m nʼaka gị.”
16 Da Dawuda ya gama wannan magana, sai Shawulu ya ce, “Muryarka ke nan ɗana Dawuda?” Sai ya fasa da kuka.
Mgbe Devid kwuchara okwu ndị a, Sọl zara sị ya, “Ọ bụ olu Devid nwa m dị nke ahụ?” Ọ malitekwara ịkwa akwa.
17 Ya ce, “Ka fi ni gaskiya, ka yi mini alheri, ni kuwa na yi maka mugunta.
Ọ sịrị Devid, “Ị bụ ezi mmadụ karịa m, nʼihi na i jirila ezi omume kwụghachi m ajọ omume m.
18 Ga shi yanzu ka faɗa mini alherin da ka yi mini. Ubangiji ya bashe ni a hannunka amma ba ka kashe ni ba.
E, i gosila m oke obi ebere taa, nʼihi na mgbe Onyenwe anyị nyefere m nʼaka gị, ị gbughị m.
19 In mutum ya sami maƙiyinsa, zai bar shi yă tafi lafiya ba tare da yin masa rauni ba? Ubangiji yă sāka maka, gama ka nuna mini alheri a yau.
Ebee ka onye ahụ nọ nʼụwa niile, nke pụrụ ịhapụ onye iro ya mgbe ọ mara nʼọnya ya? Ka Onyenwe anyị kwụghachi gị ezi ihe nʼihi obi ebere i gosiri m taa.
20 Na sani tabbatacce za ka zama sarki. Masarautar Isra’ila za tă kahu a hannunka.
Ugbu a, amatala m na ị ghaghị ịbụ eze, ị ga-achịkwa alaeze Izrel.
21 Yanzu ka rantse mini da Ubangiji cewa ba za ka hallaka zuriyarta ko ka share sunana daga iyalin mahaifina ba.”
Biko, ṅụọra m iyi nʼaha Onyenwe anyị na mgbe oge ahụ ruru, na ị gaghị egbu ụmụ m, maọbụ hichapụ aha m site nʼezinaụlọ nna m.”
22 Sai Dawuda ya rantse wa Shawulu. Sa’an nan Shawulu ya koma gida, amma Dawuda da mutanensa suka haura zuwa wurin ɓuya.
Devid ṅụụrụ Sọl iyi. Emesịa, Sọl laghachiri nʼụlọ ya, ma Devid na ndị ikom ya laghachiri nʼọgba nkume ha.