< 1 Tarihi 11 >

1 Dukan Isra’ila fa suka taru wurin Dawuda a Hebron suka ce, “Mu jiki da jininka ne.
Ndị Izrel niile gbakọtara bịakwute Devid na Hebrọn sị ya, “Lee, ọkpụkpụ gị na anụ ahụ gị ka anyị bụ.
2 A dā, ko a lokacin da Shawulu yake sarki, ai, kai ne kake shugabantar Isra’ila a yaƙe-yaƙe. Kuma Ubangiji Allahnka ya ce maka, ‘Za ka zama makiyayin mutanena Isra’ila, za ka kuma zama mai mulkinsu.’”
Nʼoge gara aga, ọ bụladị mgbe Sọl bụ eze, ọ bụ gị duuru ndị agha Izrel nʼọgụ niile, ma ọpụpụ ma mbata. Onyenwe anyị bụ Chineke gị, sịrị gị, ‘Ị ga-azụ ndị m, bụ Izrel, ị ga-abụkwa onye ga-achị ha.’”
3 Sa’ad da dukan dattawan Isra’ila suka zo wurin Sarki Dawuda a Hebron, suka yi yarjejjeniya da shi a gaban Ubangiji, suka kuwa shafe Dawuda ya zama sarki a bisa Isra’ila, yadda Ubangiji ya yi alkawari ta wurin Sama’ila.
Mgbe ndị okenye Izrel niile bịakwutere eze Devid na Hebrọn, ya na ha gbara ndụ nʼihu Onyenwe anyị na Hebrọn. Ha tere ya mmanụ ịbụ eze Izrel, dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa site nʼọnụ Samuel.
4 Dawuda tare da dukan Isra’ilawa suka taka zuwa Urushalima (wato, Yebus). Yebusiyawan da suke zama a wurin
Devid na ndị Izrel zọọrọ ije garuo Jerusalem nke bụ Jebus. Ma ndị Jebus bi nʼebe ahụ,
5 suka ce wa Dawuda, “Ba za ka shiga nan ba.” Duk da haka, Dawuda ya ci kagarar Sihiyona, Birnin Dawuda.
gwara Devid sị, “Ị gaghị abata nʼebe a.” Nʼagbanyeghị okwu ndị a, Devid dọtara ebe ahụ e wusiri ike nke Zayọn nʼagha, ya bụ obodo Devid.
6 Dawuda ya ce, “Duk wanda ya jagoranci yaƙi a kan Yebusiyawa zai zama babban shugaban mayaƙa.” Yowab ɗan Zeruhiya ya fara haurawa, ta haka ya zama shugaba.
Devid ekwuolarị sị, “Onye ọbụla buru ụzọ buo agha megide ndị Jebus ga-abụ onyeisi ọchịagha ndị agha.” Joab nwa Zeruaya bụ onye mbụ gara, nʼihi ya, o nwetara ike ịbụ ọchịagha.
7 Dawuda zauna a kagarar, ta haka aka kira ta Birnin Dawuda.
Devid biiri nʼebe ahụ e wusiri ike. Ọ bụ nke a mere e ji akpọ ya obodo Devid.
8 Sai ya gina birni kewaye da shi, daga madogaran gini zuwa katangar da take kewaye, yayinda Yowab ya maido da sauran birnin.
O wuru obodo gburugburu ya, site na Milo ruo na mgbidi gbara ya gburugburu. Ma Joab wuzikwara akụkụ obodo ahụ nke fọdụrụ.
9 Dawuda kuwa ya ƙara ƙarfi, domin Ubangiji Maɗaukaki yana tare da shi.
Ma Devid gara nʼihu na-adị ukwuu karịa, nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nọnyeere ya.
10 Waɗannan su ne manyan jarumawan Dawuda, su ne, tare da dukan Isra’ila, suka ba wa mulkinsa goyon baya mai ƙarfi da ya kai bisa dukan ƙasar, yadda Ubangiji ya yi alkawari.
Ndị a bụ ndịisi ndị dike nʼetiti ndị agha Devid. Ha na ndị Izrel niile nyere ịchị eze Devid ezi nkwado ime ka ọchịchị ya ruo nʼakụkụ niile nke ala ahụ, dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa.
11 Ga jerin sunayen jarumawan Dawuda. Yashobeyam wani ɗan Hakmoni, shi ne babban shugaba; ya ɗaga māshinsa a kan mutum ɗari uku, waɗanda ya kashe a ƙarawa guda kawai.
Nke a bụ ndekọ ọnụọgụgụ ndị dike nʼagha Devid nwere: Jashobeam, onye Hakmon, bụ onyeisi nʼetiti ndịisi ndị ọzọ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom atọ, bụ ndị o gburu nʼotu mgbe ibu agha.
12 Biye da shi, shi ne Eleyazar ɗan Dodo mutumin Aho, ɗaya daga cikin jarumawa uku.
Onye nke na-eso ya bụ Elieza nwa Dodayi, onye Ahohi, onye bụ otu nʼime ndị dike atọ ndị ahụ.
13 Yana tare da Dawuda a Fas Dammim sa’ad da Filistiyawa suka taru can don yaƙi. A wani wuri inda akwai gona cike da sha’ir, sojoji suka gudu daga Filistiyawa.
Ya na Devid nọ na Pas Damin mgbe ndị Filistia zukọrọ nʼebe ahụ ibu agha. Nʼotu ebe, nke e nwere otu ubi jupụtara nʼọka balị, ma ndị agha Izrel si nʼọgbọ agha gbapụ ọsọ nʼihi ndị Filistia.
14 Sai shi da Dawuda suka shiga gonar sha’ir ɗin, suka tsaya ciki don su tsare ta. Suka ragargaza Filistiyawa, Ubangiji kuma ya kawo babban nasara.
Ma ha were ọnọdụ ha nʼetiti ubi ahụ, ha napụtara ya, tigbuo ndị Filistia niile ahụ. Onyenwe anyị nyere mmeri dị ukwuu.
15 Wata rana uku cikin manyan mutanen nan talatin suka gangara wurin Dawuda zuwa dutse a kogon Adullam, yayinda ƙungiyar Filistiyawa suke sansani a Kwarin Refayim.
Mmadụ atọ nʼime iri ndịisi agha atọ ahụ jekwuru Devid na nkume dị nʼọgba Adulam, na mgbe otù ndị Filistia mara ụlọ ikwu ha na Ndagwurugwu Refaim.
16 A lokacin Dawuda yana cikin mafaka, sojojin Filistiyawa kuma suna a Betlehem.
Ma Devid nọ nʼebe ahụ ewusiri ike nʼoge ahụ, ma ọnọdụ ndị agha ndị Filistia dị na Betlehem.
17 Dawuda ya ji marmarin ruwan sha sai ya ce, “Kash, a ce wani zai sami mini ruwan sha daga rijiya kusa da ƙofar Betlehem mana!”
Agụụ mmiri gụrụ Devid nke ukwuu, ọ sị, “Ọ ga-amasị m ma ọ bụrụ na o nwere onye ga-ekunye m mmiri ọṅụṅụ site nʼolulu mmiri dị nso nʼọnụ ụzọ ama Betlehem!”
18 Sai Ukun suka kutsa kai cikin sansanin Filistiyawa, suka ja ruwa daga rijiyar da take kusa da ƙofar Betlehem suka ɗauko shi suka kawo wa Dawuda. Amma ya ƙi yă sha; a maimako, sai ya zubar da shi a gaban Ubangiji.
Ya mere, ha atọ wakpuru ọmụma ụlọ ikwu ndị Filistia, seta mmiri site nʼolulu mmiri ahụ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Betlehem, bulatara ya Devid. Ma Devid jụrụ ịṅụ ya, kama ọ wufuru ya nʼala dịka onyinye nye Onyenwe anyị, kwuo sị,
19 Ya ce, “Allah yă sawwaƙe in yi haka, ya kamata in sha jinin waɗannan mutanen da suka yi kasai da rayukansu?” Domin sun yi kasai da rayukansu don su dawo da shi, Dawuda bai sha shi ba. Irin abubuwan da jarumawa ukun nan suka yi ke nan.
“Chineke ekwela ka m mee nke a. M ga-aṅụ ọbara ndị ikom a, bụ ndị ji ndụ ha chụọ aja nʼihi ikute mmiri a?” Nʼihi na ha ji ndụ ha chụọ aja ịga kute ya, Devid ekweghị aṅụ ya. Nke a bụ ụdị ike dike atọ ahụ kpara.
20 Abishai ɗan’uwan Yowab shi ma babba ne cikin Ukun nan. Ya ɗaga māshinsa a kan mutum ɗari uku, waɗanda ya kashe, ya kuma zama sananne kamar Ukun.
Abishai, nwanne Joab bụ onyeisi ndị ikom atọ ahụ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom atọ, tigbukwaa ha niile. Nʼihi nke a, ọ ghọrọ onye a ma ama dịka mmadụ atọ ndị a.
21 Aka ninka girmama shi bisa Ukun, sai ya zama shugaba, ko da yake ba a haɗa shi a cikinsu ba.
Nʼetiti mmadụ atọ ahụ, a na-asọpụrụ ya karịa, ọ ghọrọ onyeisi ha. Ọ bụ ezie na-agụnyeghị ya dịka otu onye nʼime ha.
22 Benahiya ɗan Yehohiyada shi ma wani barden yaƙi ne daga Kabzeyel, wanda ya yi manyan abubuwa. Ya bugi gwanayen Mowab biyu. Ya kuma gangara zuwa cikin rami a ranar da aka yi dusar ƙanƙara ya kashe zaki.
Benaya, nwa Jehoiada, onye si Kabzeel, bụ dike nʼagha, kpara ike dị ukwuu. O tigburu dimkpa abụọ ndị Moab, ndị bụ ọkaka nʼagha. O rịdakwukwara ọdụm nʼime olulu na-amị amị nʼụbọchị mkpụrụ mmiri na-ezo, gbuo ya.
23 Ya kuma kashe wani mutumin Masar mai tsayi ƙafa bakwai da rabi. Ko da yake mutumin Masar yana da māshi kamar sandan masaƙa a hannunsa, Benahiya ya yaƙe shi da kulki. Ya ƙwace māshin daga hannun mutumin Masar ya kuma kashe shi da māshin nan nasa.
O tigburu otu nwoke onye Ijipt, nke ogologo ya dị mita abụọ na ọkara. Ọ bụ ezie na onye Ijipt ahụ ji ùbe buru ezigbo ibu nʼaka, nke okporo ya dịka nke onye na-ekwe akwa ji ekwe akwa, ma Benaya ji naanị mkpọ jekwuru ya, pụnara onye Ijipt ahụ ùbe dị ya nʼaka, jiri ya magbuo ya.
24 Irin abubuwan da Benahiya ɗan Yehohiyada ya yi ke nan; shi ma sananne ne kamar waɗannan jarumawa uku.
Nke a bụ ụdị ike Benaya nwa Jehoiada kpara. Ya onwe ya nwekwara aha dịka ndị dike atọ ahụ.
25 Aka ɗauka shi da bangirma fiye da Talatin nan, amma ba a haɗa shi cikin Ukun ba. Dawuda kuwa ya sa shi yă lura da masu tsaron lafiyarsa.
A na-asọpụrụ ya nʼebe ọ dị ukwuu karịa onye ọbụla nʼetiti iri dike atọ ndị ahụ, ma o rughị ogugo ndị dike atọ mbụ ahụ. Devid mere ya onyeisi ndị na-eche ya nche.
26 Jarumawan nan su ne, Asahel ɗan’uwan Yowab, Elhanan ɗan Dodo daga Betlehem,
Ndị bụ dike nʼagha bụ ndị a: Asahel nwanne Joab, Elhanan nwa Dodo onye Betlehem,
27 Shammot mutumin Haror, Helez mutumin Felon,
Shamot onye Haroa, Helez onye Pelon,
28 Ira ɗan Ikkesh daga Tekowa, Abiyezer daga Anatot,
Ira nwa Ikesh, onye Tekoa, Abieza onye Anatot,
29 Sibbekai mutumin Husha, Ilai mutumin Aho,
Sibekai onye Husha, Ilai onye Ahohi,
30 Maharai mutumin Netofa, Heled ɗan Ba’ana mutumin Netofa,
Maharai onye Netofa, Heled nwa Baana, onye Netofa,
31 Ittai ɗan Ribai daga Gibeya a Benyamin, Benahiya mutumin Firaton,
Itai nwa Ribai, nke Gibea ụmụ Benjamin, Benaya onye Piraton,
32 Hurai daga kogunan Ga’ash, Abiyel mutumin Arba,
Hurai onye si nʼakụkụ iyi dị na Gaash, Abiel onye Arba,
33 Azmawet mutumin Harum, Eliyaba mutumin Sha’albo,
Azmavet onye Baharum, Eliaba onye Shaalbon,
34 ’ya’yan Hashem mutumin Gizon maza, Yonatan ɗan Shageye mutumin Harar,
Ụmụ Hashem onye Gizon, Jonatan nwa Shagee, onye Hara,
35 Ahiyam ɗan Sakar mutumin Harar, Elifal ɗan Ur,
Ahiam nwa Saka, onye Hara, Elifal nwa Ụọ,
36 Hefer mutumin Mekerat, Ahiya mutumin Felon,
Hefa onye Mekerat, Ahija onye Pelon,
37 Hezro mutumin Karmel, Na’arai ɗan Ezbai,
Hezro onye Kamel, Naarai nwa Ezbai,
38 Yowel ɗan’uwan Natan, Mibhar ɗan Hagiri,
Juel nwanne Netan, Miba nwa Hagri,
39 Zelek mutumin Ammon Naharai Baroti, mai ɗaukar kayan yaƙin Yowab ɗan Zeruhiya,
Zelek onye Amọn, Naharai onye Beerọt, onye na-ebu ngwa agha Joab, nwa Zeruaya,
40 Ira mutumin Itra, Gareb mutumin Itra,
Ira onye Itra, Gareb onye Itra,
41 Uriya mutumin Hitti Zabad ɗan Alai,
Ụraya onye Het, Zabad nwa Alai,
42 Adina ɗan Shiza mutumin Ruben, wanda shi ne babba na mutanen Ruben, kuma talatin suna tare da shi,
Adina nwa Shiza, onye Ruben, onye bụ onyeisi ebo Ruben na iri mmadụ atọ ahụ na-eso ya.
43 Hanan ɗan Ma’aka, Yoshafat mutumin Mit,
Hanan nwa Maaka, Joshafat onye Mitna,
44 Uzziya mutumin Ashtarot, Shama da Yehiyel’ya’yan Hotam mutumin Arower maza,
Ụzia onye Ashterat, Shama na Jeiel ụmụ Hotam, onye Aroea,
45 Yediyayel ɗan Shimri, ɗan’uwansa Yoha mutumin Tiz,
Jediael nwa Shimri, Joha nwanne ya, onye Tiza,
46 Eliyel mutumin Ma’aha, Yeribai da Yoshawiya’ya’yan Elna’am maza, Itma mutumin Mowab,
Eliel onye Mahavi, Jeribai na Joshavia ụmụ Elnaam, Itma onye Moab,
47 Eliyel, Obed da Ya’asiyel mutumin Mezob.
Eliel, Obed, na Jaasiel onye Mezoba.

< 1 Tarihi 11 >