< 1 Istwa 25 >
1 Apre sa, wa David ak chèf moun Levi ki reskonsab sèvis nan Tanp lan te chwazi branch fanmi Asaf, branch fanmi Eyman ak branch fanmi Jedoutoun pou ba yo travay pa yo. Se yo ki pou bay mesaj Bondye yo, antan y'ap jwe gita, bandjo ak senbal. Men lis moun yo te chwazi yo ak travay yo chak:
Devid na ndịisi agha ndị Izrel họpụtara ndị ga na-ebu amụma mgbe ndị ji ụbọ akwara, une na ogene na-eti egwu. Ha sitere nʼụmụ Asaf, Heman na Jedutun, họpụta ha. Ndị a bụ aha ndị rụrụ ọrụ nke a:
2 Asaf te gen kat pitit: Zakou, Jozèf, Netama ak Acharela. Yo te sou zòd Asaf. Se li ki te konn fè konnen mesaj Bondye yo chak lè wa a mande l' pou l' fè l'.
Ndị amụma na-ebu amụma, ndị nke bụ ụmụ Asaf: Zakua, Josef, Netanaya na Asarela bụ ụmụ Asaf nọ nʼokpuru Asaf, onye nọ nʼokpuru eze bụ onyeisi ha.
3 Jedoutoun te gen sis pitit: Gedalya, Zeri, Izayi, Chimèy, Asabya ak Matatya. Yo te sou zòd Jedoutoun, papa yo. Se yo ki te konn fè konnen mesaj Bondye yo antan y'ap jwe gita, pou fè lwanj Bondye, pou di l' mèsi.
Ma nye Jedutun, ụmụ ndị ikom ya: Gedaliya, Zeri, Jeshaya, Shimei, Hashabaya na Matitaia. Ha dị isii nʼọnụọgụgụ nọrọ nʼokpuru nna ha bụ Jedutun, onye na-ebu amụma, na-eji une na-enye Onyenwe anyị ekele na otuto.
4 Eyman te gen katòz pitit: Boukija, Matanya, Ouzyèl, Sebwèl, Jerimòt, Ananya, Anani, Elyata, Gidalti, Womanti-Ezè, Josbekacha, Maloti, Oti ak Maziòt.
Ma nye Heman, ụmụ ndị ikom ya: Bukaya, Matanaya, Uziel, Shubuel, Jerimot, Hananaya, Hanani, Eliata, Gidalti, Romamti-Eza, Joshbekasha, Maloti, Hotia, na Mahaziot.
5 Bondye te bay Eyman, pwofèt wa a, katòz pitit gason sa yo ak twa pitit fi, dapre pwomès li te fè l' pou l' te ba li anpil pouvwa. Lè yo t'ap fè konnen mesaj Bondye yo, se yo ki te pou kònen twonpèt yo.
Ndị a niile bụ ụmụ Heman, onye bụ ọhụ ụzọ eze. Dịka nkwa Chineke kwere maka ibuli ya elu, Chineke nyere ya ụmụ ndị ikom iri na anọ, na ụmụ ndị inyom atọ.
6 Se Eyman, papa yo, ki t'ap dirije yo lè y'ap chante nan sèvis y'ap fè nan Tanp Bondye a, antan y'ap jwe gita, bandjo ak senbal. Asaf, Jedoutoun ak Eyman te sou zòd wa a.
Ụmụ ndị ikom ndị a niile nọ nʼokpuru nna ha, maka ịbụ abụ nʼụlọ Onyenwe anyị na-eji ịkpọ ụbọ na une na iti ọla na-ada ụda, nʼihi ofufe ụlọ Chineke. Asaf, na Jedutun, na Heman nọkwa nʼokpuru nlekọta eze.
7 Sa te fè antou desankatrevenwit (288) mizisyen ki te fò nan fè mizik, ansanm ak tout lòt moun Levi parèy yo ki te aprann chante pou Seyè a.
Ọnụọgụgụ ha tinyere ụmụ nne ha ndị e nyere ọzụzụ nʼihe gbasara abụ, bụ ndị nwere nghọta nʼihe banyere abụ a na-abụku Onyenwe anyị, dị narị abụọ, na iri asatọ na asatọ.
8 Yo fè tout moun piye, gran kou piti, ni sa ki te fò nan fè mizik, ni sa ki te fèk konmanse aprann, pou yo te ka konnen lè pou yo fè travay yo nan sèvis la.
Ha ji ife nza kee ọrụ ha, ma onye ukwu ma onye nta nʼime ha, ndị nwere nghọta ma ndị a na-azụ azụ, nʼotu aka ahụ.
9 Desankatrevenwit (288) mesye sa yo te separe chak fanmi apa. Sa te fè vennkat gwoup. Chak gwoup te gen douz moun. Nan chak gwoup te gen yon chèf ak pitit gason l' yo ansanm ak frè l' yo. Men nan ki lòd yo te soti apre yo fin piye a. Premye a te Jozèf nan fanmi Asaf la, dezyèm lan Gedalya,
Nza nke mbụ e fere mara Josef nwa Asaf, ya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ. Nke abụọ, Gedaliya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
Nke atọ, Zakua na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
Nke anọ, Izri na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
Nke ise, Netanaya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
Nza nke isii mara Bukaya, na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
Nke asaa, Jesarela na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
Nke asatọ, Jeshaya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
Nke itoolu, Matanaya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
Nke iri, Shimei na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
Nke iri na otu, Azarel na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
Nza nke iri na abụọ mara Hashabaya, na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
20 trèzyèm lan Choubayèl,
Nke iri na atọ, Shubuel na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
Nke iri na anọ, Matitaia na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
Nke iri na ise, Jeremot na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
Nke iri na isii, Hananaya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
24 disetyèm lan Josbekacha,
Nke iri na asaa, Joshbekasha na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
Nza nke iri na asatọ mara Hanani, na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
Nke iri na itoolu, Maloti na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
Nke iri abụọ, Eliata na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
Nke iri abụọ na otu, Hotia na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
29 venndezyèm lan Gidalti,
Nke iri abụọ na abụọ, Gidalti na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
30 venntwazyèm lan Maziòt,
Nke iri abụọ na atọ, Mahaziot na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.
31 vennkatryèm lan Womanti-Ezè.
Ebe nza nke iri abụọ na anọ mara Romamti-Eza, na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ.