< Alawii 12 >

1 Ningĩ Jehova akĩĩra Musa atĩrĩ,
Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya,
2 “Ĩra andũ a Isiraeli ũũ: ‘Mũndũ-wa-nja angĩgĩa nda aciare kahĩĩ, nĩagaikara arĩ na thaahu mĩthenya mũgwanja o ta ũrĩa aikaraga arĩ na thaahu ihinda rĩake rĩa mweri.
“Nye ụmụ Izrel iwu ndị a sị ha, ‘Mgbe nwanyị tụụrụ ime mesịa mụọ nwa nwoke, ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ụbọchị asaa, dịka o si adị mgbe ọ nọ nʼadịghị ọcha nke nsọ ya nʼoge a kara aka.
3 Na mũthenya wa kanana wakinya, kahĩĩ kau nĩgakaaruithio.
Nʼụbọchị nke asatọ site nʼoge a mụrụ ya, a ga-ebi nwa nwoke ahụ ugwu.
4 Nake mũndũ-wa-nja ũcio no nginya eterere mĩthenya mĩrongo ĩtatũ na ĩtatũ nĩguo atherio thaahu wa kuura thakame. Ndakanahutie kĩndũ kĩamũre kana atoonye handũ-harĩa-haamũre o nginya matukũ ma gũtherio gwake mathire.
Nʼime iri abalị atọ na atọ site nʼụbọchị nwanyị ahụ mụsịrị nwa ahụ, ọ ga-anọkwa na-adịghị ọcha nke ọbara gbara ya. Ọ gaghị emetụ ihe dị nsọ aka, maọbụ banye nʼime ebe nsọ, ruo mgbe ụbọchị ime ya ka ọ dị ọcha gasịrị.
5 No angĩciara mwana wa kairĩtu, agaaikara arĩ na thaahu ciumia igĩrĩ, o ta ũrĩa aikaraga arĩ na thaahu ihinda rĩake rĩa mweri. Ningĩ no nginya eterere mĩthenya mĩrongo ĩtandatũ na ĩtandatũ nĩguo atherio thaahu wa kuura thakame.
Mgbe nwanyị dị ime mụrụ nwa nwanyị, ọ ga-abụ onye nʼadịghị ọcha iri ụbọchị na anọ, dịka o si adị mgbe ọ nọ na nsọ ya. Ọ ga-echere tutu iri ụbọchị isii agwụsịa, ime ya ka ọ dị ọcha.
6 “‘Hĩndĩ ĩrĩa matukũ make ma gũtherio, marĩ ma kahĩĩ kana ma kairĩtu, makahinga-rĩ, nĩakarehera mũthĩnjĩri-Ngai gatũrũme ka mwaka ũmwe hau itoonyero-inĩ rĩa Hema-ya-Gũtũnganwo, karĩ iruta rĩa njino, na atware gatutura kana ndirahũgĩ ya iruta rĩa kũhoroherio mehia.
“‘Mgbe ụbọchị ịdị ọcha ya zuru, ma ọ mụrụ nwa nwoke maọbụ nwa nwanyị, ọ ga-ewetara onye nchụaja nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute otu nwa atụrụ gbara otu afọ maka onyinye aja nsure ọkụ, na otu nwa kpalakwukwu maọbụ otu nduru maka onyinye aja mmehie.
7 Nake mũthĩnjĩri-Ngai nĩagacirutĩra hau mbere ya Jehova nĩguo amũhoroherie, nake mũndũ-wa-nja ũcio nĩagathirwo nĩ thaahu wa kuuma gwa thakame. “‘Macio nĩmo mawatho ma mũndũ-wa-nja ũrĩa ũciarĩte kahĩĩ kana kairĩtu.
Onye nchụaja ga-anarakwa ha chee ha nʼihu Onyenwe anyị, chụọrọ ya aja ikpuchi mmehie. Mgbe ahụ ka ọ ga-adị ọcha site nʼịsọ ọbara ya. “‘Nke a bụ usoro iwu dịịrị nwanyị ọbụla mụrụ nwa nwoke, maọbụ nwa nwanyị.
8 Angĩkorwo ndangĩhota kũruta gatũrũme, nĩakaruta ndirahũgĩ igĩrĩ kana tũtutuura twĩrĩ, kamwe ka iruta rĩa njino na karĩa kangĩ ka iruta rĩa kũhoroherio mehia. Ũguo nĩguo mũthĩnjĩri-Ngai akaamũhoroheria, nake mũndũ-wa-nja ũcio nĩagathera.’”
Ọ bụrụ na aka erughị ya iweta nwa atụrụ, ọ ga-eweta ụmụ kpalakwukwu abụọ, maọbụ ụmụ nduru abụọ. Otu ga-abụ maka aja nsure ọkụ, nke ọzọ ga-abụ maka aja mmehie. Onye nchụaja ga-ewere ha chụọrọ ya aja ikpuchi mmehie, ka ọ dịkwa ọcha ọzọ.’”

< Alawii 12 >