< Psaumes 39 >
1 Pour la fin, à Idithun lui-même, cantique de David. J’ai dit: Je garderai mes voies, afin que je ne pèche point par ma langue.
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ maka Jedutun. Abụ Ọma Devid. Asịrị m, “Aga m elezi anya nʼụzọ m niile ma debe ire m ka m ghara ikwuhie; aga m eji ihe kechie ọnụ m mgbe m nọ nʼetiti ndị ajọ omume.”
2 Je me suis tu, et je me suis humilié, et j’ai passé sous silence des bonnes choses; et ma douleur a été renouvelée.
Ma mgbe m mechiri ọnụ m ma nọrọ duu, jụ ikwu ọ bụladị ihe ọbụla dị mma, oke ihe mgbu m mụbara.
3 Mon cœur s’est échauffé au dedans de moi: et dans ma méditation un feu s’est embrasé.
Obi m kporo ọkụ nʼime m, ma mgbe m na-atụgharị ihe ndị a nʼuche, ọkụ ahụ nọ na-ere; mgbe ahụ ekwuru m okwu sị:
4 J’ai dit par ma langue: Seigneur, faites-moi connaître ma fin,
“O Onyenwe anyị, gosi m ọgwụgwụ nke ndụ m na ọnụọgụgụ ụbọchị m niile; mee ka m mara na ndụ m na-agafe ngwangwa.
5 Voilà que vous avez fait mes jours mesurables: mon être est comme rien devant vous.
I meela ka ụbọchị m niile bụrụ naanị ihe dị nta; ogologo afọ m niile adịghị ka ihe ọbụla nʼihu gị. Ndụ onye ọbụla bụ naanị otu nkuume ọbụladị ndị dịka ha guzosirike. (Sela)
6 En vérité, comme une ombre passe un homme; et c’est bien en vain qu’il se trouble.
“Nʼezie onye ọbụla na-ejegharị dịka onyinyo nʼefu ka ha na-ekwogharị nʼotu ebe na nke ọzọ, na-akpakọba akụ, na-amaghị onye ọ ga-abụ nke ya nʼikpeazụ.
7 Et maintenant quelle est mon attente? N’est-ce pas le Seigneur? Oui, mon Dieu, tout mon bien est en vous.
“Ma ugbu a, Onyenwe m, gịnị ka m na-ele anya ya? Olileanya m dị nʼime gị.
8 Arrachez-moi à toutes mes iniquités: vous m’avez rendu un objet d’opprobre pour l’insensé.
Zọpụta m site na mmehie m niile; ekwela ka m bụrụ ihe ọchị nye ndị nzuzu.
9 Je suis resté muet, et je n’ai pas ouvert ma bouche: parce que c’est vous qui l’avez fait.
Agbachiri m nkịtị, ajụrụ m ikwu okwu, nʼihi na ọ bụ gị mere ihe a.
10 Détournez de moi vos coups.
Kwụsị iti m ihe; ihe otiti nke aka gị ezuola m ahụ.
11 Par la force de votre main, moi j’ai défailli au milieu de vos réprimandes: à cause de son iniquité, vous avez puni un homme.
Ị na-abara ndị mmadụ mba ma na-ata ha ahụhụ nʼihi mmehie ha; ị na-eripịa akụnụba ha dịka nla, mmadụ ọbụla bụ naanị otu nkuume. (Sela)
12 Exaucez ma prière, Seigneur, et ma supplication: prêtez l’oreille à mes larmes.
“O Onyenwe anyị, nụrụ ekpere m, gekwaa ntị nʼakwa m maka enyemaka; emechila ntị gị nye ibe akwa m. Nʼihi ana m ebinyere gị dịka onye ọbịa, dịka onye ije, dịka nna nna m ha mere.
13 Donnez-moi quelque relâche, afin que je reprenne des forces, avant que je m’en aille et que je ne sois plus.
Lepụ anya na-ebe m nọ, ka m nwee ike kporie ndụ ọzọ, tupu m hapụ ebe a laa, a gaghị ahụkwa m ọzọ.”