< 1 Corinthiens 7 >

1 Quant aux choses dont vous m’avez écrit, il est avantageux à l’homme de ne toucher aucune femme;
Ugbu a, okwu banyere ihe unu dere nʼakwụkwọ: “Ọ dị mma ka nwoke ghara ịmetụ nwanyị aka.”
2 Mais, à cause de la fornication, que chaque homme ait sa femme, et chaque femme son mari.
Ma nʼihi ọtụtụ ihe omume banyere ịkwa iko, ka nwoke ọbụla nwee nwunye nke aka ya, nwanyị ọbụla di nke aka ya.
3 Que le mari rende à la femme ce qu’il lui doit, et pareillement la femme à son mari.
Ka nwoke ọbụla jisie ike na-akwụ nwunye ya ụgwọ mmekọ o ji ya. Nwanyị ọbụla ga-emekwara di ya otu aka ahụ.
4 La femme n’a pas puissance sur son corps; c’est le mari. De même le mari n’a pas puissance sur son corps, c’est la femme.
Nʼihi na nwanyị ọbụla lụrụ di adịghịkwa achị ahụ ya, kama ọ bụ di ya na-achị ya. Otu aka ahụ, di anakwaghị achị ahụ ya, kama ọ bụ nwunye ya na-achị ya.
5 Ne vous refusez point l’un à l’autre ce devoir, si ce n’est de concert, pour un temps, afin de vaquer à la prière; et revenez ensuite comme vous étiez, de peur que Satan ne vous tente par votre incontinence.
Ka di na nwunye hapụ igbochi ibe ha mmekọrịta nke anụ ahụ ruuru ha. Karịakwa maọbụ na mkpebi ha nwere nʼetiti onwe ha ịnọrọ iche nwa oge nta nʼihi inyefe onwe ha ikpe ekpere. Mgbe oge a gasịrị, ha ga-agakwa nʼihu na mmekọrịta ha, ka e site otu a hapụ inye ekwensu ohere ịnwa ha ọnwụnwa nʼihi enweghị ike ha ijide onwe ha aka.
6 Or je dis ceci par condescendance, et non par commandement.
Anaghị m enye nke a dị ka iwu, kama ọ bụ alo ka m na-atụnyere unu.
7 Car je voudrais que vous fussiez tous comme moi; mais chacun reçoit de Dieu son don particulier, l’un d’une manière et l’autre d’une autre.
Asị m kwuo, aga m asị na ọ ga-aka mma ka mmadụ niile nọrọ dị ka m. Ma onye ọbụla nwere onyinye nke Chineke nyere ya. O nyere otu onye nke a, onye ọzọ nke ọzọ.
8 Mais je dis à ceux qui ne sont pas mariés et aux veuves, qu’il leur est avantageux de rester ainsi, comme moi-même.
Ma ana m agwa ndị na-anọghị nʼọnọdụ di na nwunye na ndị di ha nwụrụ anwụ, na ọ ka mma ka ha nọdụ na-alụghị di maọbụ nwunye, dịka m onwe m nọ.
9 Que s’ils ne peuvent se contenir, qu’ils se marient. Car il vaut mieux se marier que de brûler.
Ma ọ bụrụ na ha apụghị ijide onwe ha, ha gaa chọrọ di maọbụ nwunye lụọ. Ọ ka mma ịlụ di maọbụ nwunye, karịa mmadụ ịgba ara site nʼagụụ nke anụ ahụ.
10 Pour ceux qui sont mariés, ce n’est pas moi, mais le Seigneur, qui commande que la femme ne se sépare point de son mari;
Ugbu a, unu ndị nwere di na ndị nwere nwunye niile, enwere m iwu m na-enye unu. (O sighị nʼaka m, kama o si nʼaka Onyenwe anyị): O kwesighị ka nwanyị ọbụla hapụ di ya.
11 Que si elle en est séparée, qu’elle demeure sans se marier, ou qu’elle se réconcilie avec son mari. Que le mari, de même, ne quitte point sa femme.
A sịkwa na ọ hapụ di ya, ya nọọrọ onwe ya, maọbụ ya laghachikwuru di ya. Ka nwoke ọbụla gharakwa ịgba nwunye ya alụkwaghị m.
12 Mais aux autres, je dis, moi, et non le Seigneur: Si l’un de nos frères a une femme infidèle, et qu’elle consente à demeurer avec lui, qu’il ne se sépare point d’elle.
Ma ana m agwa mmadụ ndị ọzọ (nke a abụghị iwu nke Onyenwe anyị nyere). Ọ bụrụ na nwanna alụọ nwanyị nke na-ekweghị ekwe, ya achụpụla ya ma ọ bụrụ na nwanyị ahụ achọọ ịnọgide dịka nwunye ya.
13 Et si une femme fidèle a un mari infidèle, et qu’il consente à demeurer avec elle, qu’elle ne se sépare point de son mari;
Ọ bụrụkwa na nwanyị kwere ekwe alụọ di nke na-ekweghị ekwe, ya agbarala di ya alụkwaghị m, ma ọ bụrụ na di ya chọrọ ịnọgide dịka di ya.
14 Car le mari infidèle est sanctifié par la femme fidèle, et la femme infidèle est sanctifiée par le mari fidèle; autrement vos enfants seraient impurs, tandis que maintenant ils sont saints.
Nʼihi na edoola di ahụ na-ekweghị ekwe nsọ site na nwunye ya, otu a kwa a na-edokwa nwunye ahụ na-ekweghị ekwe nsọ site na di ya, bụ onye kwere ekwe. Ọ bụrụ na ọ dịghị otu a, ụmụ unu ga-abụ ndị na-adịghị ọcha. Ma otu ọ dị, ha dị nsọ.
15 Que si l’infidèle se sépare, qu’il se sépare; car notre frère ou notre sœur n’est plus asservie en ce cas; mais Dieu nous a appelés à la paix.
Ma ọ bụrụ na onye ahụ nke na-ekweghị ekwe ekewapụ onwe ya, ya dịrị otu ahụ, nke a emeghị ka nwanna anyị nwoke maọbụ nwanna anyị nwanyị bụrụ ohu nʼọnọdụ dị otu a, nʼihi na Chineke kpọrọ anyị ka anyị bie ndụ udo.
16 Car, que savez-vous, femme, si vous sauverez votre mari? ou que sais-tu, homme, si tu sauveras ta femme?
Gị nwunye, ị mara maọbụ gị ga-azọpụta di gị? Ma, gị bụ di, si aṅa mara maọbụ gị ga-azọpụta nwunye gị?
17 Seulement, que chacun marche selon que le Seigneur lui a départi, et selon que Dieu l’a appelé, et c’est ce que j’enseigne dans toutes les Eglises.
Ka onye ọbụla bie ndụ ya dịka amara Onyenwe anyị nyere ya si dị, nakwa nʼọnọdụ nke Chineke kpọrọ ya. Nke a bụ iwu m na-enye nʼụlọ chọọchị niile.
18 Un circoncis a-t-il été appelé? Qu’il ne se donne point pour incirconcis. Est-ce un incirconcis qui a été appelé? Qu’il ne se fasse point circoncire.
Akpọrọ onye ọbụla mgbe e biri ya ugwu? Ya achọla iwepụ akara obibi ugwu ya. Ka onye a na-ebighị ugwu tupu ọkpụkpọ ya hapụ inye onwe ya nsogbu ịchọ ụzọ a ga-esi bie ya ugwu.
19 La circoncision n’est rien, et l’incirconcision n’est rien, mais l’observation des commandements de Dieu est tout.
Nʼihi na ọ dịghị mkpa ma e biri gị ugwu ma e bighị gị ugwu. Ihe kachasị mkpa bụ idebe iwu Chineke.
20 Que chacun persévère dans la vocation où il était quand il a été appelé.
Ka onye ọbụla nọgide dịka ọ dị mgbe a kpọrọ ya.
21 As-tu été appelé étant esclave, ne t’en inquiète pas; et même, si tu peux devenir libre, profites-en plutôt.
Ị bụ ohu mgbe a kpọrọ gị? Echegbula onwe gị nʼihi ya. Kama ọ bụrụ na ọ dị ụzọ ị pụrụ isi nwere onwe gị, were ohere ahụ mee ihe ugbu a.
22 Car celui qui a été appelé au Seigneur, lorsqu’il était esclave, devient affranchi du Seigneur; de même celui qui a été appelé étant libre, devient esclave du Christ.
Nʼihi na onye ọbụla Onyenwe anyị Chineke kpọrọ mgbe o bụ ohu, aghọọla onye nweere onwe ya nʼime Onyenwe anyị. Otu aka ahụ, onye nwerela onwe ya mgbe Onyenwe anyị kpọrọ ya aghọọla ohu nke Kraịst.
23 Vous avez été achetés chèrement; ne vous faites point esclaves des hommes.
Akwụọla ụgwọ isi unu, unu abụkwala ohu mmadụ ọzọ.
24 Que chacun, mes frères, persévère devant Dieu dans l’état où il était, lorsqu’il a été appelé.
Ụmụnna m, nʼọnọdụ ọbụla mmadụ nọ mgbe a kpọrọ ya, ya nọgidesie ike nʼime Chineke.
25 Quant aux vierges, je n’ai pas reçu de commandement du Seigneur, mais je donnerai un conseil, comme ayant obtenu de la miséricorde du Seigneur d’être fidèle.
Ihe banyere ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke. Enweghị m iwu ọbụla site nʼaka Onyenwe anyị banyere ajụjụ a, ma aga m ekwu uche nke aka m dịka onye sitere nʼebere nke Onyenwe anyị kwesiri ntụkwasị obi.
26 J’estime donc que cela est avantageux, parce qu’à cause de la nécessité pressante il est avantageux à l’homme d’être ainsi.
Echere m na ọ ka mma ugbu a, nʼihi nsogbu nke na-abịanụ ka onye ọbụla nọdụrụ onwe ya dịka o siri nọrọ ugbu a.
27 Es-tu lié à une femme? ne cherche pas à te délier. N’es-tu point lié à une femme? ne cherche pas de femme.
Ị lụọla nwanyị? Achọla nkewa. Ọ bụ na ị lụbeghị nwanyị? Ejela ịchọ onye ị ga-alụ.
28 Cependant, si tu prends une femme, tu ne pèches pas; et si une vierge se marie, elle ne pèche pas. Toutefois ces personnes auront les tribulations de la chair. Pour moi, je vous pardonne.
Ma ọ bụrụ na i kpebie nʼobi gị ịlụ nwunye, i meghị mmehie ọbụla; ọ bụrụkwa na nwaagbọghọ ekpebie na ọ ga-alụ di, o meghị mmehie. Ndị lụrụ di na nwunye ga-enwe ọtụtụ nsogbu nʼime ụwa. Ọ ga-amasị m igbochiri unu nsogbu ndị ahụ.
29 Voici donc, mes frères, ce que je vous dis: Le temps est court; il faut que ceux même qui ont des femmes soient comme n’en ayant pas;
Ihe unu kwesiri ịma, ụmụnna, bụ na oge anyị nwere fọdụrụ naanị ntakịrị, site ugbu a gaa nʼihu ndị nwere nwunye ga-adị ndụ ha dịka ndị na-enweghị.
30 Et ceux qui pleurent, comme ne pleurant pas; ceux qui se réjouissent, comme ne se réjouissant pas: ceux qui achètent, comme ne possédant pas;
Ka ndị na-akwa akwa bie ndụ dịka ndị ihe anaghị ewute, ka ndị na-achị ọchị dịrị ka ndị obi na-adịghị atọ ụtọ. Ka ndị na-azụ ahịa dịrị dịka ndị na-enweghị ngwa ahịa ọbụla.
31 Et ceux qui usent de ce monde, comme s’ils n’en usaient pas; car elle passe, la figure de ce monde.
Ka ndị na-etinye oge nʼihe ụtọ nke ụwa hapụ ibi ndụ ịchọ iritecha ihe niile dị nʼụwa nʼuru. Nʼihi na ụwa, otu ọ dị ugbu a, bụ ihe na-agabiga agabiga.
32 Je voudrais que vous fussiez exempts de soucis. Celui qui est sans femme met sa sollicitude dans les choses du Seigneur, comment il plaira au Seigneur.
Unu emela ihe ga-ewetara unu oke echiche. Nwoke na-alụbeghị nwanyị nwere ohere iji oge ya niile rụọra Onyenwe anyị ọrụ. O nwekwara ohere ịgbalịsị ike ime ihe ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ.
33 Au contraire, celui qui est avec une femme met sa sollicitude dans les choses du monde, comment il plaira à sa femme; et il se trouve ainsi partagé.
Ma nwoke nwere nwunye na-echegbu onwe ya banyere ihe igbo mkpa nke ụwa a, otu ọ ga-esi mee ihe ga-atọ nwunye ya ụtọ.
34 De même la femme non mariée et la vierge pensent aux choses qui sont du Seigneur, afin d’être saintes de corps et d’esprit; mais celle qui est mariée pense aux choses du monde: comment elle plaira à son mari.
Ọ na-enwekwa obi abụọ nʼihe ọbụla ọ chọrọ ime. Otu a ka ọ dịkwa nye nwaagbọghọ na-alụbeghị di maọbụ onye nke na-amabeghị nwoke, nchegbu ya bụ banyere ihe nke Onyenwe anyị. Ọchịchọ ya bụ ka ọ dị nsọ nʼanụ ahụ ya na nʼime mmụọ ya. Ma nwanyị nwere di na-echegbu onwe ya banyere ihe nke ụwa a, otu ọ ga-esi mee ihe ga-atọ di ya ụtọ.
35 Or je vous parle ainsi pour votre avantage, non pour vous tendre un piège, mais parce que c’est une chose bienséante, et qui vous donnera un moyen de prier le Seigneur sans empêchement.
Ana m ekwu ihe ndị a maka ọ dị mma nke unu onwe unu, ọ bụghị ịgbalị igbochi unu, kama ọ bụ ka unu nwee ike bie ndụ unu nʼụzọ kwesiri ekwesi, werekwa ịhụnanya zuruoke rụọra Onyenwe anyị ọrụ.
36 Si quelqu’un donc pense que ce lui soit un déshonneur que sa fille, déjà plus qu’adulte, reste vierge, et qu’il la doit marier; qu’il fasse ce qu’il voudra, il ne péchera point si elle se marie.
Ọ bụrụ na nwoke ọbụla enweghị ike ijide onwe ya nʼihi agụụ mmekọrịta nke nwoke na nwanyị na-agụ ya nʼebe nwaagbọghọ ya na ya kpebiri ịlụ nọ, ya mee ihe ọ na-achọ, o meghị mmehie ọbụla, ha lụọ di na nwunye.
37 Mais celui qui, sans nécessité, et étant pleinement maître de sa volonté, juge en son cœur de conserver sa fille vierge, fait bien.
Ma ọ bụrụ na onye ọbụla ekpebie nʼobi ya, ma nwee ike ijide onwe ya, ka o si nʼenweghị mmanye ọbụla idebe nwaagbọghọ e kwuru na ọ ga-alụ na-enweghị mmekọ ọbụla, ọ bụ ihe dị mma ka o mere.
38 Ainsi celui qui marie sa fille vierge fait bien; et celui qui ne la marie pas fait mieux.
Ya mere, onye ahụ lụrụ nwaagbọghọ o kwuru na ọ ga-alụ mere nke ọma, ma onye kpebikwara na ọ gaghị alụ mekwara nke ọma karịa.
39 La femme est liée à la loi aussi longtemps que vit son mari; que si son mari s’endort, elle est affranchie; qu’elle se marie à qui elle voudra, mais seulement selon le Seigneur.
Njikọta e jikọtara nwunye na di ya na-adị ire naanị mgbe di nwanyị dị ndụ. Ọ bụrụ na di ya anwụọ o nwere ike ịlụ di ọzọ, ma ọ lụọ ya nʼime Onyenwe anyị.
40 Cependant elle sera plus heureuse si, selon mon conseil, elle demeure comme elle est: or je pense que j’ai, moi aussi, l’Esprit du Seigneur.
Nʼuche m, ọ ga-enwe ọṅụ nʼobi ya karịa ma ọ bụrụ na ọ lụghị di ọzọ. Ana m echekwa na mụ onwe m nwekwara Mmụọ nke Chineke.

< 1 Corinthiens 7 >