< Isaïe 19 >

1 Oracle contre l'Egypte. Voici, l'Éternel est monté sur un nuage léger, et s'avance contre l'Egypte; et les idoles de l'Egypte tremblent à son aspect, et le cœur des Égyptiens se fond au dedans d'eux.
Nke a bụ amụma megide Ijipt: Lee, Onyenwe anyị na-abịa imegide Ijipt, ọ na-anọkwasịkwa nʼeluigwe ojii nke na-agba ọsọ. Arụsị ndị Ijipt niile na-ama jijiji nʼihu ya. Ọzọ, nʼihi ụjọ obi ndị Ijipt na-agbaze nʼime onwe ha.
2 Et j'arme Égyptien contre Égyptien, afin qu'ils se battent frère contre frère, ami contre ami, ville contre ville, royaume contre royaume.
“Aga m akpali ndị Ijipt mee ka ha lụọ ọgụ nʼetiti onwe ha. Nwanne ga-emegide nwanne ya, onye agbataobi ga-emegidekwa onye agbataobi ya; obodo ga-emegide isi obodo; otu a kwa, alaeze ga-emegidekwa alaeze.
3 Et l'esprit disparaîtra du cœur des Égyptiens, et j'anéantirai leur prudence; alors ils s'adresseront aux idoles et aux devins, aux nécromans et aux habiles;
Ndị Ijipt ga-ada mba nʼime mmụọ ha, aga m eme ka nzube ha niile bụrụ ihe efu, ha ga-ajụta arụsị na mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase, jụọkwa ndị na-ajụta mmụọ ọjọọ ase na ndị dibịa afa.
4 et je livrerai l'Egypte à un maître rigide, et un roi dur les assujettira, dit le Seigneur, l'Éternel des armées.
Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ya sị, Ọ bụ nʼaka eze afọ tara mmiri, nke na-adịghị eme ebere, ka m ga-enyefe ndị Ijipt, ka ọ bụrụ onye ga-achị ha.”
5 Et l'eau du fleuve sera tarie, et la rivière mise à sec et aride,
Mmiri dị nʼosimiri ga-atada; ọ ga-atakwa takọrọkwa.
6 et les ruisseaux seront infects, et les canaux d'Egypte chétifs et desséchés, et les roseaux et les joncs malades.
Ụzọ niile osimiri Ijipt ahụ si asọgharị ga-atalata bido nʼisi isi. Ahịhịa riidi niile na amị niile ga-akpọnwụsịkwa.
7 Les prairies du fleuve, des bords du fleuve, et tous les guérets du fleuve seront desséchés, dépouillés et détruits.
Ahịhịa ndụ niile dị nʼakụkụ Naịl ga-akpọnwụ, ifufe ga-efesakwa ha. Mkpụrụ niile a kụrụ nʼebe ahụ ga-ala nʼiyi, ihe niile ga-anwụ.
8 Alors gémiront les pêcheurs, et tous ceux qui jettent l'hameçon dans le fleuve seront en deuil, et ceux qui étendent le filet sur les eaux seront dans la stupeur,
Ndị ọkụ azụ ga-asụ ude, kwaa ụwa, na ndị niile na-atụba nko azụ nʼime Naịl, ndị na-agha ụgbụ nʼelu mmiri ga-ata ahụ.
9 et ceux qui travaillent le lin sérancé et tissent de blanches étoffes, dans la confusion.
Ndị nʼarụ ọrụ flakisi etiri eti ga-eru ụjụ, na ndị na-akpa akwa ọcha ka olileanya ha ga-agharịpụ.
10 Et les colonnes du pays sont brisées, et tous les mercenaires ont l'âme attristée.
Obi ụtọ agaghị adịkwara ndị na-esite nʼịkpa akwa enweta ego, ha na ndị ọrụ dị iche iche a na-akwụ ụgwọ.
11 Les Princes de Tsoan ne sont que des insensés, et des sages conseillers de Pharaon la prudence devient stupidité. Comment diriez-vous à Pharaon: « Je suis un fils des sages, un fils des anciens rois »?
Naanị ndị nzuzu ka ndịisi Zoan bụ, ndụmọdụ na-enweghị isi ka ndị na-adụ eze Ijipt ọdụ na-enye. Ị ga-esi aṅaa gwa Fero, “Abụ m otu nʼime ndị maara ihe, onye si nʼagbụrụ ndị eze ochie”?
12 Où sont-ils donc tes sages? Eh! qu'ils t'annoncent, afin qu'on le sache, ce qu'a arrêté l'Éternel des armées contre l'Egypte.
Ebee ka ndị ikom gị ahụ maara ihe nọ ugbu a? Ka ha gosi gị ma meekwa ka ị maara, ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zubere megide Ijipt.
13 Les Princes de Tsoan sont aliénés, les Princes de Noph abusés, et l'Egypte égarée par les chefs de ses tribus.
Ndịisi obodo Zoan aghọọla ndị nzuzu, ndịisi obodo Memfis aghọkwaala ndị e duhiere eduhie; ndị bụ nkume isi nkuku nke ndị ya niile eduhiela ndị Ijipt ụzọ.
14 L'Éternel a versé en eux un esprit d'erreur, afin qu'ils égarent les Égyptiens dans tous leurs actes, comme un homme ivre tourne et s'égare dans son vomissement;
Onyenwe anyị awụnyela nʼime ha mmụọ nzuzu nke uche na-ezughị oke; nke mere ka Ijipt na-adagharị nʼihe niile ọ na-eme dịka onye ṅụbigara mmanya oke si adagharị nʼihe ọ gbọrọ.
15 et il ne sort de l'Egypte pas un fait exécuté par la tête ni la queue, la branche de palmier ni le jonc.
Ọ dịghị ihe Ijipt nwere ike ime, isi maọbụ ọdụ; alaka nkwụ maọbụ osisi achara.
16 En ce jour-là, les Égyptiens seront comme des femmes, et craintifs et tremblants, en voyant s'agiter la main que l'Éternel des armées agitera sur eux.
Nʼụbọchị ahụ, ndị ikom Ijipt ga-adị ka ndị inyom, ha ga na-ama jijiji nʼegwu nʼihi aka ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile weliri elu imegide ha.
17 Alors le pays de Juda sera la terreur de l'Egypte, et tous ceux qu'on fera penser à lui prendront l'alarme, à cause de l'arrêt de l'Éternel prononcé contre elle.
Ala Juda ga-ewetara ndị Ijipt oke egwu, oke ụjọ ga-atụ onye ọbụla akpọtaara aha Juda, nʼihi ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ezube megide ha.
18 En ce même temps il y aura cinq villes au pays d'Egypte, parlant la langue de Canaan et assermentées à l'Éternel des armées: Ville de salut sera le nom de l'une d'elles.
Nʼụbọchị ahụ, obodo ise nʼime ala Ijipt ga-asụ asụsụ Kenan, ṅụọ iyi irubere Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile isi. Otu nʼime obodo ndị a ka a ga-akpọ Obodo anwụ.
19 En ce même temps, il y aura un autel de l'Éternel au sein du pays d'Egypte, et sur sa frontière un cippe consacré à l'Éternel:
Nʼụbọchị ahụ, ebe ịchụrụ Onyenwe anyị aja ga-adị nʼetiti ala Ijipt. A ga-ewukwa otu ogidi ncheta nye Onyenwe anyị nʼoke ala ha.
20 ce qui sera pour l'Éternel des armées un signe et un témoignage dans le pays d'Egypte; car ils crieront à l'Éternel contre les oppresseurs, et Il leur enverra un sauveur et un vengeur, afin de les délivrer.
Nke a ga-abụ ihe ama na ihe ngosi, na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọkwa nʼIjipt. Mgbe ha kpọkuru Onyenwe anyị maka ndị na-emegbu ha, ọ ga-aza ha, ọ ga-ezitere ha onye nzọpụta, onye ga-azọpụta ha.
21 Et l'Éternel se manifestera aux Égyptiens, et les Égyptiens apprendront à connaître l'Éternel en ce temps-là, et offriront des victimes et des oblations, et feront des vœux à l'Éternel, et les accompliront.
Ya mere, Onyenwe anyị ga-eme ka ndị Ijipt mara onye ọ bụ, nʼụbọchị ahụ, ha ga-amata Onyenwe anyị, jirikwa ịchụ aja na onyinye fee ya. Ha ga-ekwe Onyenwe anyị nkwa debekwa ya.
22 Ainsi l'Éternel frappe l'Egypte, frappant mais guérissant, et eux se convertissent à l'Éternel, qui se laisse fléchir par eux et les guérit.
Onyenwe anyị ga-eti Ijipt ihe otiti, ma ọ ga-agwọkwa ha. Ndị Ijipt ga-alọghachikwute Onyenwe anyị, ọ ga-aṅakwa ntị nʼarịrịọ ha gwọọkwa ha.
23 En ce même temps, il y aura une route d'Egypte en Assyrie, et l'Assyrien viendra en Egypte, et l'Égyptien ira en Assyrie, et l'Égyptien avec l'Assyrien servira [l'Éternel].
Nʼụbọchị ahụ, a ga-enwe okporoụzọ atụliri atụli nke ga-esite na Ijipt ruo Asịrịa. Ndị Asịrịa ga-aga Ijipt, ndị Ijipt ga-agakwa Asịrịa, ndị Ijipt na ndị Asịrịa ga-eso fee ofufe.
24 En ce même temps, Israël sera, lui troisième, uni à l'Egypte et à l'Assyrie, bénédiction au milieu de la terre
Nʼụbọchị ahụ ka Izrel ga-abụ nke atọ imezu Ijipt na Asịrịa, bụrụ ngọzị nʼụwa.
25 que bénira l'Éternel des armées en disant: Bénie soit l'Egypte, ma nation, et l'Assyrie, œuvre de mes mains, et Israël, mon héritage!
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-agọzi ha, na-asị, “Ka ngọzị dịrị Ijipt, ndị m, dịrị Asịrịa nke bụ akaọrụ m, na Izrel ihe nketa nke m.”

< Isaïe 19 >