< Jérémie 46 >

1 La parole de l'Eternel qui fut [adressée] à Jérémie le Prophète contre les nations.
Ndị a bụ okwu Onyenwe anyị, nke ruru Jeremaya onye amụma ntị, banyere mba dị iche iche.
2 A l'égard de l'Egypte, contre l'armée de Pharaon-Neco Roi d'Egypte, qui était auprès du fleuve d'Euphrate, à Carkémis, laquelle Nébucadnetsar Roi de Babylone défit en la quatrième année de Jéhojakim, fils de Josias Roi de Juda.
Nke dịrị Ijipt: Ndị a bụ okwu dị megide usuu ndị agha Fero Neko, bụ eze Ijipt, ndị Nebukadneza eze Babilọn meriri nʼagha na Kakemish, nʼakụkụ osimiri Yufretis, nʼafọ nke anọ nke ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya, bụ eze Juda.
3 Préparez le bouclier et l'écu, et approchez-vous pour la bataille.
“Kwadoonụ ọta agha unu, ndị ukwu na ndị nta, zọpụnụ ije maka ibu agha.
4 Attelez les chevaux, et [vous] cavaliers, montez; présentez-vous avec les casques, fourbissez les lances, revêtez les cuirasses.
Kegidezienụ ịnyịnya unu, rịkwasịkwanụ nʼelu ha. Guzokwanụ nʼọnọdụ ibu agha unu, ma kpukwasịkwanụ onwe unu okpu agha unu. Mụọnụ ùbe unu ka ọ dị nkọ, yikwasịkwanụ uwe agha unu.
5 D'où vient que je vois [ceci]? Ils sont effrayés; ils tournent en arrière; leurs hommes forts ont été défaits, et s'enfuient avec précipitation, sans regarder derrière eux; la frayeur les environne, dit l'Eternel.
Gịnị ka anya m abụọ hụrụ? Ụjọ na-atụ ha, ha na-agbaghachikwa azụ; lee, a na-etipịa ndị ha bụ dike nʼagha. Ha na-agbasi ọsọ ike, na-eleghị anya nʼazụ. Egwu dịkwa nʼakụkụ niile,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
6 Que l'homme léger à la course ne s'enfuie point, et que le fort ne se sauve point; ils sont renversés et tombés vers l'Aquilon, auprès du rivage du fleuve d'Euphrate.
“Ndị nwere ụkwụ ọsọ enweghị ike ịgbalaga, ndị dị ike enweghị ike isi nʼebe ahụ wezuga onwe ha. Ha na-asọ ngọngọ daa, nʼakụkụ ugwu dị nso nʼosimiri Yufretis.
7 Qui est celui-ci qui s'élève comme une rivière, et duquel les eaux sont émues comme les fleuves?
“Onye bụ onye a, nke na-ebili ọtọ dịka osimiri Naịl, na dịka osimiri nke mmiri ya na-amagharị?
8 C'est l'Egypte; elle s'élève comme une rivière, et [ses] eaux s'émeuvent comme les fleuves; et elle dit: je m'élèverai, je couvrirai la terre, je détruirai les villes, et ceux qui y habitent.
Ijipt na-ebili elu dịka osimiri Naịl, dịka osimiri nke mmiri ya na-amagharị. Ọ na-asị, ‘Aga m ebili kpuchie ụwa niile. Aga m ebibi obodo ukwu dị iche iche, na ndị mmadụ bi nʼime ha.’
9 Montez chevaux, agissez en furieux, [venez] chariots, et que les hommes forts sortent: ceux de Cus et de Put qui manient le bouclier, et les Ludiens qui manient [et] bandent l'arc.
Gbabanyenụ nʼọgbọ agha, unu ịnyịnya niile. Gbanụ ọkụ ọkụ, unu ndị na-agba ụgbọ agha. Zọọnụ ike ike, unu ndị bụ dike nʼagha, unu ndị ikom Kush na Put, ndị na-ebu ọta, na unu ndị ikom Lidiya ndị na-agba ụta.
10 Car c'est ici la journée du Seigneur l'Eternel des armées, journée de vengeance, pour se venger de ses adversaires. L'épée dévorera, et elle sera rassasiée [et] enivrée de leur sang; car il y a un sacrifice au Seigneur l'Eternel des armées dans le pays de l'Aquilon, auprès du fleuve d'Euphrate.
Ma ụbọchị ahụ dịrị Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. Ọ bụ ụbọchị ịbọ ọbọ ya, ụbọchị ọ ga-abọrọ ọbọ nʼahụ ndị iro ya. Mma agha ga-eripịa ha tutu afọ eju ya, e, tutu ruo mgbe ọ ṅụjuru ọbara afọ. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-achụ aja nʼala ahụ dị nʼugwu, nke dị nso osimiri Yufretis.
11 Monte en Galaad, et prends du baume, vierge fille d'Egypte. En vain emploies-tu remède sur remède; car il n'y a point de guérison pour toi.
“Rigoro Gilead ka i weta mmanụ a na-ete nʼọnya, gị Ada Ijipt na-amaghị nwoke. Ma ọ bụ nʼefu ka ị na-ewebata ọgwụ ndị a niile, nʼihi na ọgwụgwọ ọbụla agaghị adịrị gị.
12 Les nations ont appris ton ignominie, et ton cri a rempli la terre; car le fort est tombé sur le fort, et ils sont tombés tous deux ensemble.
Mba niile ga-anụ akụkọ ihe ihere bịakwasịrị gị. Nʼakụkụ niile nke ụwa ka a ga-anụkwa ịkwa akwa gị. Otu dike nʼagha na-asọ ngọngọ na-adakwasị dike ibe ya; ha abụọ na-adakwa nʼala.”
13 La parole que l'Eternel prononça à Jérémie le Prophète touchant la venue de Nébucadnetsar Roi de Babylone, pour frapper le pays d'Egypte:
Okwu ndị a ka Onyenwe anyị gwara Jeremaya onye amụma, banyere ọbịbịa nke Nebukadneza, bụ eze Babilọn, onye na-abịa ibuso Ijipt agha.
14 Faites savoir en Egypte, et publiez à Migdol, à Noph, et à Taphnés; [et] dites: présente-toi, et te tiens prêt; car l'épée a dévoré ce qui est autour de toi.
“Kwupụtanụ ihe ndị a nʼIjipt. Kwusaa ya na Migdol. Kwusaakwa ya na Memfis, na nʼobodo Tapanhis. Guzozienụ onwe unu nʼusoro, nọọkwanụ na njikere, nʼihi na mma agha na-eripịa ndị gbara unu gburugburu.
15 Pourquoi chacun de tes vaillants hommes a-t-il été emporté? il n'a pu tenir ferme, parce que l'Eternel l'a poussé.
Gịnị mere a ga-eji gbudasịa ndị gị niile bụ dike nʼagha? Ha agaghị enwe ike guzokwa, nʼihi na Onyenwe anyị ga-akwada ha.
16 Il en a terrassé un grand nombre, et même chacun est tombé sur son compagnon, et ils ont dit: lève-toi, retournons à notre peuple, et au pays de notre naissance, loin de l'épée de l'oppresseur.
Ha ga-asọ ngọngọ mgbe mgbe, ha ga-adakwasịkwa nʼelu ibe ha. Ha ga-asịkwa, ‘Bilienụ ọtọ, bịanụ ka anyị laghachikwuru ndị anyị, ka anyị laghachikwa nʼala ebe a mụrụ anyị, ka anyị wezugakwa onwe anyị site na mma agha nke ndị mmegbu.’
17 Ils ont crié là, Pharaon Roi d'Egypte n'est que bruit; il a laissé passer le temps assigné.
Nʼebe ahụ ka ha ga-anọ tie mkpu sị, ‘Fero eze Ijipt bụ naanị onye oke okwu. Lee, oge a kara aka nye ya efunarịla ya.’
18 Je suis vivant, dit le Roi dont le Nom est l'Eternel des armées, que comme Tabor [est] entre les montagnes, et comme Carmel [est] dans la mer, [ainsi] viendra-t-il.
“Dịka mụ onwe m na-adị ndụ,” ka Eze ahụ kwupụtara, onye aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, “otu onye ga-abịa, onye dị ukwuu dịka ugwu Taboa si dị ukwuu nʼebe ugwu ndị ọzọ dị, na dịka Kamel si dịrị nʼakụkụ osimiri.
19 Ô fille habitante de l'Egypte, équipe-toi pour déloger, car Noph sera désolée, et rendue déserte, sans qu'[il y ait] plus d'habitants.
Kwakọtaanụ ngwongwo unu, jikerenụ maka ije biri nʼala ọzọ, unu ndị bi nʼIjipt, nʼihi na a ga-eme ka Memfis ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Ọ ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe, nke mmadụ na-agaghị ebi nʼime ya.
20 L'Egypte est une très belle génisse; [mais] la destruction vient, elle vient de l'Aquilon.
“Ijipt mara mma dịka nne ehi, ma ijiji nke si nʼakụkụ ugwu, na-abịa imegide ya.
21 Même les gens de guerre qu'elle entretient chez elle à ses gages, sont comme des veaux engraissés, car aussi ont-ils tourné le dos; ils s'en sont fuis ensemble, ils n'ont point tenu ferme, parce que le jour de leur calamité, le temps de leur punition est venu sur eux.
Ndị agha e goro ego nọ nʼetiti ha dịka ụmụ ehi gbara abụba. Ha onwe ha kwa ga-atụgharịa gbaa ọsọ, ha agaghị eguzo, nʼihi na ụbọchị nhụju anya na-abịakwasị ha, bụ ụbọchị a ga-ata ha ahụhụ.
22 Elle sifflera comme un serpent, car ils marcheront avec une puissante [armée], et ils viendront contre elle avec des cognées, comme des bûcherons.
Ijipt ga-eme mkpọtụ, dịka mkpọtụ nke agwọ na-agba ọsọ na-eme, mgbe ndị iro ya ji ike na-abịakwasị ya. Ha ga-eji anyụike bịakwasị ya, dịka ndị na-egbutu osisi.
23 Ils couperont sa forêt, dit l'Eternel, quoiqu'on n'en pût compter [les arbres]; parce que [leur armée sera] en plus grand nombre que les sauterelles, et on ne saurait la compter.
Ha ga-egbutu oke ọhịa ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “nʼagbanyeghị na ọ bụ oke ọhịa rubigara oke. Ha dị ọtụtụ karịa igurube, a pụghịkwa ịgụta ole ha dị.
24 La fille d'Egypte est rendue honteuse, elle est livrée entre les mains du peuple de l'Aquilon.
A ga-eme ka ihere mee Ada Ijipt, mgbe e nyefere ya nʼaka ndị si nʼakụkụ ugwu bịa.”
25 L'Eternel des armées, le Dieu d'Israël, a dit: voici, je m'en vais punir le grand peuple de No, et Pharaon, et l'Egypte, et ses dieux, et ses Rois, tant Pharaon, que ceux qui se confient en lui.
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, sịrị, “Ana m aga ime ka ahụhụ bịakwasị Amọn, bụ chi ndị Tibs, na Fero, na ala Ijipt na chi niile dị nʼime ya, ndị eze ya niile nakwa ndị ahụ na-atụkwasị Fero obi.
26 Et je les livrerai entre les mains de ceux qui cherchent leur vie, entre les mains, dis-je, de Nébucadnetsar Roi de Babylone, et entre les mains de ses serviteurs; mais après cela elle sera habitée comme aux temps passés, dit l'Eternel.
Aga m enyefe ha nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ ha ike, bụ Nebukadneza eze Babilọn, na ndịisi ọchịchị ya. Ma nʼikpeazụ, aga m emekwa ka ndị mmadụ birikwa nʼime ya ọzọ, dịka e si biri nʼime ya na mgbe ochie.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
27 Et toi Jacob mon serviteur, ne crains point, et ne t'épouvante point, toi Israël; car voici, je m'en vais te délivrer du pays éloigné; et ta postérité, du pays de leur captivité; et Jacob retournera, et sera en repos et à son aise, et il n'y aura personne qui lui fasse peur.
“Atụla egwu, gị Jekọb, ohu m. Adakwala mba, gị Izrel. Nʼihi na lee, aghaghị m ịzọpụta gị site nʼebe dị anya nke e mere ka ị gaa biri. Aga m azọpụtakwa ụmụ ụmụ gị site nʼala ebe e mere ka ha gbapụ ọsọ gaa biri. Jekọb ga-emesịakwa biri nʼudo, na-atụghị egwu ọbụla. Ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ọ tụọ ụjọ.
28 Toi donc, Jacob mon serviteur, ne crains point, dit l'Eternel; car je suis avec toi; et même je consumerai entièrement toutes les nations parmi lesquelles je t'aurai chassé; mais je ne te consumerai point entièrement, et je te châtierai par mesure; toutefois je ne te tiendrai pas tout à fait pour innocent.
Atụla egwu, gị Jekọb, ohu m, nʼihi na anọnyeere m gị,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “A sịkwarị na m ebibie mba ndị ahụ niile nke m mere ka ị gaa biri nʼetiti ha kpamkpam, agaghị m ebibi gị kpamkpam. Aga m adọ gị aka na ntị, ma ọ ga-abụ site nʼụzọ ikpe ikpe ziri ezi. Agakwaghị m ahapụ inye gị ahụhụ i kwesiri ịnata.”

< Jérémie 46 >