< 2 Chroniques 28 >
1 Achaz était âgé de vingt ans quand il commença à régner, et il régna seize ans à Jérusalem; mais il ne fit point ce qui est droit devant l'Eternel, comme [avait fait] David son père.
Ehaz gbara iri afọ abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịkwara afọ iri na isii nʼime Jerusalem, ma o meghị ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, dịka nna ya Devid mere.
2 Mais il suivit le train des Rois d'Israël, et même il fit des images de fonte aux Bahalins.
Ọ gbasoro ụzọ niile nke ndị eze Izrel, kpụọkwa arụsị dị iche iche maka ofufe arụsị Baal.
3 Il fit aussi des encensements dans la vallée du fils de Hinnom, et fit brûler de ses fils au feu, selon les abominations des nations que l'Eternel avait chassées de devant les enfants d'Israël.
O surere ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ dị iche iche nʼime Ndagwurugwu nke Ben Hinom, surekwaa ụmụ ya nʼọkụ. Ọ gbasoro omenaala niile rụrụ arụ nke ndị mba ọzọ, ndị ahụ Onyenwe anyị chụpụrụ site nʼihu ndị Izrel.
4 Il sacrifiait aussi et faisait des encensements dans les hauts lieux, et sur les coteaux, et sous tout arbre verdoyant.
Ọ chụrụ aja surekwaa ihe nsure ọkụ aja na-esi isi ụtọ nʼebe niile dị elu, nʼelu ugwu niile, na nʼokpuru osisi ndụ ọbụla.
5 C'est pourquoi l'Eternel son Dieu le livra entre les mains du Roi de Syrie; tellement que [les Syriens] le défirent, et prirent sur lui un grand nombre de prisonniers, qu'ils emmenèrent à Damas; il fut aussi livré entre les mains du Roi d'Israël, qui fit une grande plaie à [son Royaume].
Nʼihi ya, Onyenwe anyị Chineke ya nyefere ya nʼaka eze ndị Aram. Ndị Aram lụgburu ya, kpọrọ ọtụtụ nʼetiti ndị ya dịka ndị mkpọrọ kpọta ha nʼDamaskọs. E nyefekwara ya nʼaka eze Izrel, onye gburu ọtụtụ ndị agha ya.
6 Car Pékach fils de Rémalia tua en un jour six vingt mille hommes de ceux de Juda, tous vaillants hommes, parce qu'ils avaient abandonné l'Eternel le Dieu de leurs pères.
Nʼotu ụbọchị, Peka nwa Remalaya gburu narị puku ndị agha Juda na iri puku abụọ. Ihe ndị a mere nʼihi na ha gbakụtara Onyenwe anyị Chineke nna nna ha azụ.
7 Et Zicri, homme puissant d'Ephraïm, tua Mahaséja fils du Roi, et Hazrikam qui avait la conduite de la maison, et Elcana qui tenait le second [rang] après le Roi.
Zikri onye Ifrem, onye bụ dike nʼagha, gburu Maaseia, nwa eze, na Azrikam onye na-elekọta ụlọeze. O gbukwara Elkena onye na-esota eze.
8 Et les enfants d'Israël emmenèrent prisonniers, de leurs frères, deux cent mille personnes, tant femmes, que fils et filles, et ils firent aussi sur eux un gros butin, et ils amenèrent le butin à Samarie.
Ndị Izrel sitere nʼetiti ụmụnne ha ndị Juda dọta ndị inyom, na ụmụ okorobịa, na ụmụ agbọghọbịa ọnụọgụgụ ha dị narị puku abụọ nʼagha. Ha bukọkwaara ọtụtụ ihe ndị ọzọ ha kwatara nʼagha laghachi na Sameria.
9 Or il y avait là un Prophète de l'Eternel, nommé Hoded, lequel sortit au devant de cette armée, qui s'en allait entrer à Samarie, et leur dit: Voici, l'Eternel le Dieu de vos pères, étant indigné contre Juda, les a livrés entre vos mains, et vous les avez tués en furie, de sorte que cela est parvenu jusqu'aux cieux.
Ma Oded, onye amụma Onyenwe anyị, nọ na Sameria nʼoge a. Ọ pụrụ jekwuru ndị agha ahụ na Sameria sị ha, “Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha mere ka unu merie ndị Juda nʼihi na ha na-efe arụsị. Ma unu ji ọnụma gbuo ha, nke mere na ụzụ tụrụ ruo nʼeluigwe.
10 Et maintenant vous faites votre compte de vous assujettir pour serviteurs et pour servantes les enfants de Juda et de Jérusalem; n'est-ce pas vous seuls qui êtes coupables envers l'Eternel votre Dieu?
Ugbu a, unu na-achọkwa ime ndị ikom na ndị inyom Juda na Jerusalem ndị ohu unu? Ma unu abụghị ndị ikpe mmehie mara nʼebe Onyenwe anyị Chineke unu nọ?
11 Maintenant donc écoutez-moi, et ramenez les prisonniers que vous avez pris d'entre vos frères; car l'ardeur de la colère de l'Eternel est sur vous.
Ugbu a, geenụ ntị nʼihe m na-ekwu. Kpọghachinụ ụmụnna unu ndị a unu dọtara nʼagha nʼụlọ ha, nʼihi na ugbu a Onyenwe anyị na-ewe oke iwe megide unu.”
12 Alors quelques-uns des Chefs des enfants d'Ephraïm, [savoir] Hazaria fils de Jéhohanan, Bérécia fils de Mésillémoth, Ezéchias fils de Sallum, et Hamasa fils de Hadlaï, se levèrent contre ceux qui retournaient de la guerre,
Ụfọdụ ndịisi ndị Ifrem, bụ Azaraya nwa Jehohanan, na Berekaya nwa Meshilemot, na Jehizkaya nwa Shalum, na Amasa nwa Hadlai, biliri guzogide ndị ahụ si agha na-alọta.
13 Et leur dirent: Vous ne ferez point entrer ici ces prisonniers, car vous prétendez nous rendre coupables devant l'Eternel, en ajoutant ceci à nos péchés et à notre crime, bien que nous soyons très coupables, et que l'ardeur de la colère [de l'Eternel] soit grande sur Israël.
Ha sịrị, “Unu akpọbatakwala ndị a unu dọtara nʼagha nʼebe a, nʼihi na unu mee ya, anyị ga-abụ ndị ikpe maara nʼihu Onyenwe anyị. Unu chọrọ ịtụkwasị ihe na mmehie na ikpe ọmụma anyị? Nʼihi na ikpe ọmụma anyị adịla ukwuu, iwe ya dị ọkụ na-adịkwasịkwa nʼahụ Izrel.”
14 Alors les soldats abandonnèrent les prisonniers, et le butin, devant les principaux et toute l'assemblée.
Ya mere, ndị agha ahụ hapụrụ ndị mkpọrọ ahụ na ihe niile ha bulatara, nʼihu ndị ozi na igwe mmadụ ahụ niile.
15 Et ces hommes qui ont été [ci-dessus] nommés par leurs noms, se levèrent et prirent les prisonniers, et revêtirent des dépouilles tous ceux d'entr'eux qui étaient nus; et quand ils les eurent vêtus et chaussés, et qu'ils leur eurent donné à manger et à boire, et qu'ils les eurent oints, ils conduisirent sur des ânes tous ceux qui ne se pouvaient pas soutenir, et les amenèrent à Jérico, la ville des palmes, chez leurs frères; puis ils s'en retournèrent à Samarie.
Mgbe ahụ, ndị ikom ahụ akpọrọ nʼaha nʼaha duuru ndị mkpọrọ ahụ, manye aka nʼihe ahụ niile a dọtara nʼagha wepụta uwe, na nri, na mmanya na akpụkpọụkwụ, na mmanụ, nyeghachi ha ndị ahụ niile a dọtara nʼagha. Ha bulitere ndị ọrịa nọ nʼetiti ndị ahụ a dọtara nʼagha kukwasị ha nʼelu ịnyịnya ibu. Emesịa, ha duuru mmadụ ahụ niile dughachiri ha ndị ha nọ na Jeriko, obodo nkwụ. Emesịakwa, ha laghachikwara azụ na Sameria.
16 En ce temps-là le Roi Achaz envoya vers le Roi d'Assyrie, afin qu'il lui donnât du secours.
Nʼoge ahụ, eze Ehaz zigara ndị eze Asịrịa ozi ka ọ bịa nyere ya aka.
17 Car outre cela les Iduméens étaient venus, et avaient battu ceux de Juda, et en avaient emmené des prisonniers.
Ndị Edọm bịara ọzọ buso Juda agha, ma dọrọkwa ọtụtụ nʼime ha nʼagha.
18 Les Philistins aussi s'étaient jetés sur les villes de la campagne, et du Midi de Juda, et avaient pris Beth-sémes, Ajalon, Guédéroth, Soco, et les villes de son ressort, Timna, et les villes de son ressort, et Guimzo, et les villes de son ressort, et ils habitaient là.
Ndị Filistia na-ebusokwa ụfọdụ obodo Juda dị na mgbada ugwu, na Negeb agha. Ha meriri ma bichikwaa obodo ndị a; Bet-Shemesh, na Aijalon, na Gederọt, na Soko, na Timna, na Gimzo, na obodo nta niile gbara ha gburugburu.
19 Car l'Eternel avait abaissé Juda, à cause d'Achaz Roi d'Israël, parce qu'il avait détourné Juda [du service de Dieu], et s'était entièrement adonné à pécher contre l'Eternel.
Ma Onyenwe anyị wedara Juda nʼala nʼihi Ehaz, eze Izrel onye mere ka ihe ọjọọ baa ụba na Juda, na-ekwesighị ntụkwasị obi ya nye Onyenwe anyị.
20 Ainsi Tillegath-Pilnéeser Roi d'Assyrie vint vers lui, mais il l'opprima, bien loin de le fortifier.
Mgbe Tiglat-Pilesa eze ndị Asịrịa bịara, o wetaara Ehaz nsogbu kama enyemaka.
21 Car Achaz prit une partie [des trésors] de la maison de l'Eternel, et de la maison Royale, et des principaux [du peuple], et les donna au Roi d'Assyrie; qui cependant ne le secourut point.
Ehaz weere ụfọdụ ihe dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, na nke dị nʼụlọeze, sitekwa na nʼụlọ ndịisi obodo, were ha nye eze Asịrịa, ma ihe ndị a enyereghị ya aka.
22 Et dans le temps qu'on l'affligeait, il continuait toujours à pécher de plus en plus contre l'Eternel; c'était [toujours] le Roi Achaz.
Nʼoge nsogbu ya, eze Ehaz gakwara nʼihu bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị.
23 Car il sacrifia aux dieux de Damas qui l'avaient battu, et il dit: Puisque les dieux des Rois de Syrie les secourent, je leur sacrifierai, afin qu'ils me secourent aussi; mais ils furent cause de sa chute, et de celle de tout Israël.
Ọ chụrụ aja nye chi niile nke Damaskọs, bụ ndị meriri ya nʼagha. Ọ sịrị, “Nʼihi na chi nke ndị eze Aram nyeere ha aka, ha ka m ga-achụrụ aja, ka ha nwee ike nyere m aka.” Ma ha bụ ihe wetaara ya ọdịda, bụrụkwa ọdịda nye Izrel niile.
24 Et Achaz prit tous les vaisseaux de la maison de Dieu, et les brisa, les vaisseaux, dis-je, de la maison de Dieu, et il ferma les portes de la maison de l'Eternel, et se fit des autels dans tous les coins de Jérusalem.
Ehaz chịkọtara ngwongwo niile dị nʼụlọnsọ ukwu Chineke, gbujasịa ha. O mechiri ọnụ ụzọ niile e si abanye nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ma wuo ọtụtụ ebe ịchụ aja na nkuku ụzọ niile nʼime Jerusalem.
25 Et il fit des hauts lieux dans chaque ville de Juda, pour faire des encensements à d'autres dieux; et il irrita l'Eternel le Dieu de ses pères.
Nʼobodo niile ọbụla na Juda, o wuru ebe dị elu maka ịchụ aja dị iche iche nye chi ndị ọzọ, si otu a kpasuo Onyenwe anyị, bụ Chineke nna nna ya ha iwe.
26 Quant au reste de ses faits, et à toutes ses actions, tant les premières que les dernières, voilà, toutes ces choses sont écrites au Livre des Rois de Juda et d'Israël.
Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị ya, site na mmalite ruo ọgwụgwụ, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda na Izrel?
27 Puis Achaz s'endormit avec ses pères, et on l'ensevelit en la Cité, à Jérusalem, mais on ne le mit point dans les sépulcres des Rois d'Israël, et Ezéchias son fils régna en sa place.
Ehaz soro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Jerusalem, ma ọ bụghị nʼime ili ebe a na-eli ndị eze Izrel. Hezekaya nwa ya, ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.