< Cantiques 3 >

1 Sur ma couche, la nuit, j'ai désiré celui qu'aime mon âme; je l'ai cherché, et ne l'ai point trouvé; je l'ai appelé, et il ne m'a pas écouté.
Achọrọ m onye m hụrụ nʼanya nʼelu ihe ndina m nʼabalị, ma ahụghị m ya. Ebiliri m chọọ ya ma ahụghị m ya.
2 Je me lèverai donc; j'irai par la ville, les marchés, les places, et je chercherai celui qu'aime mon âme. Je l'ai cherché, et ne l'ai point trouvé.
Ugbu a, aga m ebili pụọ jegharịa nʼama niile na nʼokporoụzọ niile nke obodo ịchọ ya, m ga-achọgharị onye m hụrụ nʼanya. Ya mere, achọrọ m ya ma ahụghị m ya.
3 Les gardiens m'ont rencontrée, en faisant la ronde dans la ville: N'avez- vous pas vu celui qu'aime mon âme?
Ndị nche na-eche obodo hụrụ m, mgbe ha na-agagharị nʼobodo, ma ajụrụ m ha sị, “Biko, unu hụrụ onye ahụ m hụrụ nʼanya?”
4 À peine éloignée d'eux, j'ai trouvé celui qu'aime mon âme; je l'ai pris par la main, et ne l'ai point quitté que je ne l'eusse introduit dans la maison de ma mère, dans la chambre de celle qui m'a conçue.
Ọ dịghị anya mgbe m gafere ha, achọtara m onye m hụrụ nʼanya, ejidesiri m ya ike, ahapụghị m ya aka tutu m duta ya nʼụlọ nne m, nʼime ụlọ nwanyị tụrụ ime m.
5 Filles de Jérusalem, je vous adjure par les puissances et les vertus des campagnes, n'éveillez pas, ne réveillez pas ma bien-aimée, qu'elle ne le désire.
Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa gbaa unu iyi sị, unu akpọtela, maọbụ mee ka ịhụnanya teta ruo mgbe o masịrị ya.
6 Qui est celle qui monte du désert, comme une colonne de fumée sortant de l'encens et de la myrrhe, et de toutes les poudres dont se composent les parfums?
Onye bụ nke a na-esi nʼọzara na-abịa dịka anwụrụ ọkụ, nke tere mmanụ máá na ụda na-esi isi ụtọ, ụda nke ndị ahịa na-ere?
7 Voilà la couche de Salomon; soixante vaillants des forts d'Israël sont rangés en cercle autour d'elle.
Lee ọ bụ ụgbọ Solomọn. Iri mmadụ isii ndị ọka agha, ndị a maara aha ha karịsịa nʼala Izrel sokwa ya.
8 Tous exercés aux combats, ils ont l'épée au côté, pour en écarter les terreurs de la nuit.
Ha niile ji mma agha; ha bụ ndị a zụrụ nke ọma ibu agha. Mma agha onye ọbụla dịkwa nʼukwu ya, ịdị njikere maka ihe egwu abalị.
9 Le roi Salomon s'est fait un lit de cèdres du Liban.
Eze Solomọn rụrụ onwe ya ụgbọ a nke o ji osisi sitere Lebanọn rụọ.
10 Les montants en sont d'argent, et le siège est d'or; le marchepied est de porphyre, et l'intérieur est pavé de pierres précieuses, amour des filles de Jérusalem.
Ogidi ya ka o ji ọlaọcha mee; ala ya bụkwa ọlaedo. Ebe ịnọdụ ọdụ ya ka e ji akwa odo odo kpaa, e ji ịhụnanya dozie ebe ime ya. Ndị inyom Jerusalem,
11 Filles de Sion, sortez, contemplez le roi Salomon avec la couronne que lui a posée sa mère le jour de son mariage, le jour de la joie de son cœur.
pụtanụ, bịa hụrụ, unu ụmụ agbọghọ Zayọn, bịanụ ka unu hụ Solomọn bụ eze; lee ụdị okpueze nne ya kpunyere ya nʼisi, nʼụbọchị agbamakwụkwọ ya, nʼụbọchị obi ụtọ na ịṅụrị ọṅụ ya.

< Cantiques 3 >