< Psaumes 31 >

1 Jusqu'à la Fin. Psaume de David, à l'occasion d'une grande terreur. Seigneur, j'ai espéré en toi; que je ne sois point confondu éternellement. Délivre-moi en ta justice, et sauve-moi.
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị, nʼime gị, ka m gbabara izere ndụ; ekwela ka ihere mee m; site nʼezi omume gị gbapụta m.
2 Penche vers moi ton oreille; hâte-toi de me sauver; sois-moi un Dieu protecteur, et comme une maison de refuge, afin que je sois sauvé.
Tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m, bịa ngwangwa gbapụta m; ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba, ebe mgbaba e wusiri ike maka nzọpụta m.
3 Car tu es ma force et mon refuge; et pour l'amour de ton nom tu me guideras et me nourriras.
Ebe ị bụ oke nkume m na ebe mgbaba m e wusiri ike, nʼihi aha gị, duo m ma na-edukwa m.
4 Tu me tireras de ce piège qu'ils avaient caché pour moi; car tu es mon protecteur.
Napụta m site nʼọnya nke e zobere nʼihi m, nʼihi na ọ bụ naanị gị bụ ebe mgbaba m siri ike.
5 Je remets mon âme en tes mains; tu m'as racheté, Seigneur, Dieu de vérité.
Nʼaka gị ka m na-enyefe mmụọ m; gbapụta m, o Onyenwe anyị, Chineke, onye eziokwu.
6 Tu hais ceux qui s'attachent follement aux choses vaines; pour moi, j'ai placé mon espérance dans le Seigneur.
Akpọrọ m ha asị bụ ndị niile na-efe chi mba ọzọ ndị na-abaghị uru; ana m atụkwasị Onyenwe anyị obi m.
7 Je trouverai mon bonheur et ma joie en ta miséricorde; car tu as considéré mon humiliation, tu as sauvé mon âme de sa détresse.
Aga m enwe obi ụtọ ma ṅụrịkwaa ọṅụ nʼime ịhụnanya gị, nʼihi na ị hụrụ nsogbu m marakwa ihe mgbu nke mmụọ m.
8 Tu ne m'as pas enfermé dans les mains de mes ennemis; tu as donné de l'espace à mes pieds.
I wereghị m nyefee nʼaka ndị iro m, kama i nyela m ohere ijegharị ebe ọbụla m chọrọ.
9 Aie pitié de moi, Seigneur, parce que je suis affligé; mon œil est troublé par la tristesse, et mon âme, et mes entrailles.
O Onyenwe anyị, meere m amara nʼọnọdụ ihe mgbu m. Anya m abụọ na-acha uhie uhie nʼihi ịkwa akwa; ike adịghịkwa m.
10 Ma vie s'est éteinte dans la douleur, et mes années dans les sanglots; ma force a été brisée par la misère, et mes os ébranlés.
Iru ụjụ eriela m ahụ; ịkwa akwa m ewepụla ihe nʼafọ m; ihe mgbu m mere ka ike gwụsịa m ruo na ume adịghịkwa nʼọkpụkpụ m.
11 Je suis devenu un signe d'outrage pour tous mes ennemis et surtout pour mes voisins; je suis devenu l'effroi de mes proches; ceux qui m'ont vu se sont enfuis au dehors.
Nʼihi ndị iro m niile; ndị agbataobi m na-elelị m anya. Ndị enyi m na-atụ ụjọ ịbịakwute m, ndị hụrụ m nʼokporoụzọ na-esite ụzọ ọzọ gafee.
12 J'ai été mis en oubli dans les cœurs comme un mort; on m'a traité comme un vase brisé.
Aghọọla m onye e chefuru echefu, dị ka a ga-asị na m nwụrụ anwụ. A pụrụ iji ite kụwara akwụwa tụnyere m.
13 J'ai entendu le blâme de plusieurs qui demeurent autour de moi; pendant qu'ils se réunissaient contre moi, ils ont tenu conseil pour m'ôter la vie.
Anụla m nkwulu ha megide m; oke egwu dị nʼakụkụ niile; ha na-agba izu megide m, na-agba izu nzuzo iji napụ m ndụ m.
14 Mais moi, Seigneur, j'ai mis en toi mon espérance, et j'ai dit: tu es mon Dieu.
Ma ana m atụkwasị gị obi Onyenwe anyị. Ekwuola m ya sị, “Naanị gị bụ Chineke m.”
15 Mon sort est entre tes mains; arrache-moi de la main de mes ennemis et de ceux qui me persécutent.
Oge m niile dị gị nʼaka. Napụta m nʼaka ndị iro m na nʼaka ndị ahụ na-adịghị ezu ike ịchụ m ọsọ.
16 Montre à ton serviteur la lumière de ton visage; sauve-moi par ta miséricorde.
Mee ka amara gị mụkwasị ohu gị dịka anyanwụ; zọpụta m nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ.
17 Seigneur, que je ne sois point confondu, car je t'ai invoqué; que les impies rougissent et soient précipités en enfer. (Sheol h7585)
O Onyenwe anyị, ekwela ka ihere mee m, nʼihi na akpọkuola m gị; kama mee ka ihere mee ndị na-eme ihe ọjọọ, ka ha tọgbọrọ nʼala mmụọ debe ọnụ ha duu. (Sheol h7585)
18 Que les lèvres trompeuses deviennent muettes; car elles profèrent l'iniquité contre le juste avec orgueil et mépris.
Ka ọnụ ahụ ha ji ekwu okwu ụgha mechie kpamkpam; nʼihi na ọ bụ site na mpako na nlelị ka ha ji na-ekwu okwu megide ndị ezi omume.
19 Combien est grande, Seigneur, l'abondance de douceur que tu as réservée à ceux qui te craignent! Tu l'as rendue parfaite pour ceux qui espèrent en toi, devant les fils des hommes.
Lee ka ịdị mma gị si baa ụba, nke i na-edebere ndị niile na-atụ egwu gị, nke ị na-enye ndị na-agbaba nʼime gị, nʼihu ọha mmadụ.
20 Ceux-là tu les cacheras dans le secret de ta face pour les préserver du trouble des hommes; tu les mettras en ton tabernacle à l'abri de la contradiction des langues.
I na-ezobe ha nʼebe nzuzo gị pụọ nʼizu nzuzo nke ụmụ mmadụ; ị na-echebe ha nʼime ebe obibi gị; ka ha pụọ nʼebubo nke ire dị iche iche.
21 Béni soit le Seigneur, parce qu'il m'a merveilleusement manifesté sa miséricorde comme en une ville fortifiée.
Otuto dịrị Onyenwe anyị nʼihi na o gosila m ịhụnanya ya dị ukwuu mgbe m nọ nʼobodo ndị iro gbara gburugburu.
22 Et moi j'ai dit dans le transport de mon âme: J'ai été rejeté loin de tes yeux; c'est pourquoi. Seigneur, lorsque j'ai crié vers toi, tu as exaucé la voix de ma prière.
Akụjara m, kwuo okwu nʼụjọ sị, “Ewezugala m site nʼihu ya!” Ma ị nụrụ arịrịọ m maka ebere mgbe m kpọkuru gị ka i nyere m aka.
23 Aimez le Seigneur, vous tous qui êtes ses saints; car le Seigneur cherche la vérité, et il rétribuera abondamment les superbes.
Hụnụ Onyenwe anyị nʼanya, unu ndị ya niile kwesiri ntụkwasị obi, nʼihi na Onyenwe anyị na-anapụta ndị niile kwesiri ntụkwasị obi nye ya, ma ọ na-akwụghachi ndị mpako oke zuru ezu.
24 Soyez hommes; et que votre cœur se fortifie, vous tous qui espérez en Dieu.
Ya mere, dịrịnụ ike, ka obi siekwa unu ike, unu niile ndị olileanya ha dị nʼime Onyenwe anyị.

< Psaumes 31 >