< Psaumes 24 >

1 Psaume de David, pour le premier jour de la semaine. La terre est au Seigneur, et tout ce qu'elle contient, le monde et ceux qui l'habitent.
Abụ Ọma Devid. Ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke Onyenwe anyị; ụwa na ndị niile bi nʼime ya.
2 Il l'a fondée sur la mer, il l'a préparée sur les fleuves.
Ọ tọrọ ntọala ya nʼime oke osimiri niile, o mekwara ka o guzosie ike.
3 Qui montera sur la montagne du Seigneur? qui se tiendra dans son sanctuaire?
Onye bụ onye ahụ nwere ike irigo nʼelu ugwu Onyenwe anyị? Onye nwere ike ịbata guzo nʼime ụlọnsọ ya?
4 Celui dont les mains sont innocentes et dont le cœur est pur; qui n'a point reçu en vain son âme; qui n'a point trompé son prochain par de faux serments.
Ọ bụ onye aka ya emeghị ihe ọjọọ, obi ya dịkwa ọcha, onye na-adịghị atụkwasị obi na chi arụsị, maọbụ ṅụọ iyi aghụghọ.
5 Celui-là recevra la bénédiction du Seigneur, et la miséricorde de Dieu son Sauveur.
Ha ga-anata ngọzị site nʼaka Onyenwe anyị, natakwa mkpepụta site nʼaka Chineke Onye nzọpụta ha.
6 Telle est la génération de ceux qui le cherchent, qui cherchent la face du Dieu de Jacob. Interlude.
Otu a ka ọ ga-adịrị ọgbọ ndị ya, bụ ndị na-achọ ihu gị, Chineke nke Jekọb. (Sela)
7 Princes, levez vos portes; ouvrez-vous, portes éternelles, et le Roi de gloire entrera.
Welitenụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ama, meenụ ka isi unu bụrụ ihe e welitere, unu ọnụ ụzọ ama ochie, ka eze ebube nwee ike ịbata.
8 Quel est donc le Roi de gloire? C'est le Seigneur fort et puissant, le Seigneur puissant au combat.
Onye bụ eze ebube a? Ọ bụ Onyenwe anyị, onye bụ dimkpa na dike. Ọ bụ Onyenwe anyị, onye bụ dike nʼagha.
9 Princes, levez vos portes; ouvrez-vous, portes éternelles, et le Roi de gloire entrera.
Welitenụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ama, buliekwanụ ha elu, unu ọnụ ụzọ ama ochie, ka Eze ebube nwee ike ịbatakwa.
10 Quel est donc ce Roi de gloire? C'est le Dieu des vertus, c'est lui qui est le Roi de gloire.
Onye bụ eze ebube a? Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ọ bụ ya bụ Eze ebube! (Sela)

< Psaumes 24 >