< Jérémie 48 >

1 Et le septième mois, Ismaël fils de Nathanias, fils d'Eléasa, de la famille royale, vint, avec dix hommes chez Godolias à Masphath, et ils y mangèrent ensemble.
Nke a dịrị Moab: Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, “Ahụhụ dịrị Nebo! Nʼihi na a ga-emebi ya. A ga-emekwa ka ihere mee Kiriatem, e, a ga-adọta ya nʼagha. A ga-etipịa Misgab, mee ka ihere mee ya.
2 Et Ismaël et ses dix hommes se levèrent, et ils tuèrent Godolias, que le roi de Babylone avait fait gouverneur de la terre,
Ọ dịkwaghị ndị ga-eto Moab ọzọ, kama a ga-anọ na Heshbọn pịa ọpịpịa ọdịda ya. Ha ga-asị, ‘Bịanụ ka anyị bibie mba a, ka ọ ghara ịdịkwa.’ Ọ bụladị gị bụ Madmen, ka a ga-eme ka i dere duu. A ga-ejikwa mma agha chụọ gị ọsọ.
3 Et tous les Juifs qui étaient avec lui, et tous les Chaldéens qui se trouvaient là.
Gee ntị nụrụ akwa na-ada na Horonaim, ọ bụ mkpu akwa oke mbibi na ịla nʼiyi.
4 Et le lendemain de la mort de Godolias, que nul ne savait encore,
A ga-etikpọ Moab, ụmụntakịrị ya ga-etikwa mkpu akwa.
5 Quatre-vingts hommes vinrent de Sichem, de Salem et de Samarie, le menton rasé, les vêlements déchirés, se frappant la poitrine, portant dans leurs mains de l'encens et de la manne, pour les offrir dans le temple du Seigneur.
Ha ga-eji oke ịkwa akwa na-agbago ụzọ Luhit; a ga-anụkwa mkpu akwa nke ndị e bibiri ihe ha nʼụzọ na-agbada Horonaim. A ga-anụ akwa mwute nʼihi mbibi nke bịakwasịrị ha.
6 Et Ismaël sortit de la ville à leur rencontre, et ils marchaient et ils pleuraient, et il leur dit: Entrez chez Godolias.
Gbalaganụ! Gbapụnụ ọsọ ndụ! Dịkwanụ ka osisi nta nke dị nʼọzara.
7 Et lorsqu'ils furent au milieu de la ville il les égorgea et les jeta dans un puits.
Ebe ọ bụ na unu na-atụkwasị obi nʼaka ọrụ unu, na nʼakụnụba unu, a ga-adọtakwa unu nʼagha. Ndị Kemosh ka a ga-eburu gaa mba ọzọ, ha na ndị nchụaja na ndịisi ọchịchị ya.
8 Mais il s'en trouva dix qui dirent à Ismaël: Ne nous tue pas; car nous avons dans les champs des trésors, du froment, de l'orge et de l'huile. Et il passa outre, et il ne les tua pas au milieu de leurs frères.
Onye mbibi ahụ ga-abịa megide obodo niile. O nwekwaghị obodo nke pụrụ ịgbanarị mbibi ya. A ga-ala ndagwurugwu niile nʼiyi, bibiekwa ebe dị elu nke dị larịị, nʼihi na ọ bụ okwu si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta.
9 Or le puits où Ismaël jeta ceux qu'il avait tués, c'est le grand puits que fit le roi Asa, par crainte de Baasa, roi d'Israël, et qu'Ismaël remplit de cadavres.
Wụkwasị ala Moab nnu, nʼihi na a ga-eme ka ọ ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Obodo niile dị nʼime ya ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, nke mmadụ ọbụla na-agaghị ebikwa nʼime ya.
10 Et Ismaël emmena tout le peuple qui était resté en Masphath, et les filles du roi, que le chef des cuisines avait confiées à Godolias, fils d'Achicam; et il partit pour la terre au delà des fils d'Ammon.
“Ọbụbụ ọnụ dịrị onye ahụ ji aghụghọ na-arụ ọrụ Onyenwe anyị. Ahụhụ dịrị onye na-ewezuga mma agha nʼebe iwusi ọbara dị.
11 Or Joanan, fils de Garée, et tous les chefs de l'armée qui étaient avec lui, apprirent tout le mal qu'avait fait Ismaël.
“Onye na-anọ juu ka Moab bụ site na mgbe ọ bụ nwantakịrị, ọ dịka mmanya doro edo, nke a na-adịghị esi nʼotu udu wụgharịa ya nʼime udu ọzọ, o nwebeghị oge ọbụla e ji mee ka ọ ga biri nʼala ọzọ. Ọ bụ ya mere ụtọ ya adịghị agbanwe agbanwe, isisi ya agbanwekwaghị.
12 Et ils mirent en marche toute leur armée; et ils partirent pour le combattre, et ils l'atteignirent près des grandes eaux de Gabaon.
Ma ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eziga ndị ikom ọrụ ha bụ ịwụpụ ihe site nʼite, ha ga-awụpụkwa ya. Ha ga-agbapụ ihe niile dị nʼite ya niile, tụwakwaa ite ya niile.
13 Et quand tout le peuple qui était avec Ismaël vit Joanan et les chefs de l'armée qu'il commandait,
Mgbe ahụ, ihere Kemosh ga-eme Moab, dịka ihere si mee Izrel mgbe ha tụkwasịrị Betel obi ha.
14 Ils retournèrent auprès de Joanan.
“Unu si aṅaa ekwu sị, ‘Ndị dị ike nʼagha ka anyị bụ; anyị bụkwa dimkpa nʼagha’?
15 Mais Ismaël échappa avec huit hommes, et s'enfuit chez les fils d'Ammon.
A ga-ebibi ala Moab, busokwa obodo ya niile agha. Ụmụ okorobịa ya niile ndị ahọrọ ahọ ga-ada nʼogbugbu ahụ.” Otu a ka Eze ahụ kwubiri, onye aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
16 Et Joanan et les officiers de l'armée qui étaient avec lui recueillirent tous les restes du peuple, qui s'étaient éloignés d'Ismaël, et les hommes capables de porter les armes, ainsi que les femmes, le butin et les eunuques, et ils les ramenèrent à Gabaon.
“Ọdịda Moab dị nso; oke nhụju anya ya ga-abịakwa ọsịịsọ.
17 Et ils marchèrent, et ils firent halte à Gaberochamea, près de Bethléhem, pour se rendre en Égypte,
Kasịenụ ya obi, unu ndị niile gbara ya gburugburu, unu ndị niile maara na ọ bụ mba dị ukwuu. Kwupụtanụ sị, ‘Esi aṅa gbajie mkpanaka eze a, nke dị ike, lee ka e si gbajiekwa mkpanaka a nke dị ebube!’
18 Loin des Chaldéens; car ils en avaient crainte, parce que Ismaël avait tué Godolias, que le roi de Babylone avait fait gouverneur de la terre.
“Sitenụ nʼebe nsọpụrụ unu dị elu rịdata, bịa nọdụnụ nʼala kpọrọ nkụ, unu ndị bi nʼobodo bụ Ada Dibọn. Nʼihi na onye ahụ bibiri Moab ga-abịa ibu agha megide unu, ọ ga-alakwa obodo unu niile e wusiri ike nʼiyi.
Guzonụ nʼakụkụ ụzọ, hụrụ ihe na-eme, unu ndị bi nʼime Aroea. Jụọnụ nwoke unu hụrụ na-agba ọsọ, na nwanyị nke na-ewezuga onwe ya ajụjụ sị ha, ‘Gịnị mere?’
E meela ka ihere mee Moab, nʼihi na a tụpịala ya. Kwasienụ akwa ike, tiekwanụ mkpu akwa. Kwupụta ya nʼAnọn na e bibiela Moab.
Oge a ga-ekpe ndị bi nʼala dị larịị ikpe abịala, bụ ndị bi na Họlọn, Jahaz na Mefaat,
Dibọn, Nebo na Bet-Diblataim,
Kiriatem, Bet-Gamul na Bet-Meon,
Keriọt na Bozra, na obodo niile dị nʼala Moab, ndị dị nso, na ndị nke dị anya.
E bipụla mpi Moab, a gbajiekwala ogwe aka ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
“Meenụ ya ka ọ ṅụbiga mmanya oke, nʼihi na o nupuru isi megide Onyenwe anyị. Moab ga-atụrụ onwe ya nʼihe ọ gbọrọ. Ọ ga-aghọkwa ihe ọchị.
Izrel ọ bụghị ihe ọchị nye gị? Ọ bụ nʼetiti ndị na-ezu ohi ka e jidere ya, mere i ji na-efufere ya isi mgbe ọbụla ị na-ekwu okwu banyere ya?
Sitenụ nʼobodo unu niile gbapụ ọsọ; jeenụ biri nʼetiti nkume, unu ndị bi nʼala Moab. Dịrịnụ ka nduru nke na-ewu akwụ ya nʼakụkụ ọnụ ọgba nkume.
“Anyị anụla ihe banyere mpako Moab. Anyị anụla na mpako ahụ dị ukwuu, nụkwa ihe banyere oke mbuli elu nke ọ na-ebuli onwe ya, na oke nganga nke obi ya.
Amaara m ihe banyere mmụọ nke akpọghị onye ọzọ ihe ọbụla, nke dị nʼime ya, ma ọ gaghị abara ya uru ọbụla. Ịnya isi ya agaghị arụpụtakwa ihe ọbụla, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Nʼihi ya, aga m akwasị akwa ike nʼihi Moab, aga m eti mkpu akwa nʼihi ala Moab niile. Aga m asụ ude akwa nʼihi ndị Kia Hareset.
Akwa nke karịrị akwa Jeza ka m ga-akwa nʼihi gị, gị osisi vaịnị dị na Sibma. Alaka gị gbasara ruo nʼakụkụ osimiri, e, ha gbasara ruo nʼosimiri Jeza. Ma onye mbibi abịakwasịla mkpụrụ gị niile chara acha, e, ọ bịakwasịla mkpụrụ vaịnị gị niile.
Ọṅụ na obi ụtọ ka e wepụrụ site nʼubi vaịnị niile, na nʼala ubi niile nke Moab. E meela ka mmanya vaịnị kwụsị ịgbapụtakwa site nʼebe ịzọcha mmanya. Ọ dịkwaghị onye na-eji mkpu ọṅụ na-azọcha ha, Ọ bụ ezie na a na-anụ olu iti mkpu, ma ọ bụghị olu iti mkpu ọṅụ.
“A na-anụ ụda iti mkpu akwa ha site nʼobodo Heshbọn ruo Eleale, na Jehaz. A na-anụkwa ya site na Zoa ruo, ọ bụladị obodo ndị dị anya, dịka Horonaim, na Eglat Shelishiya. Nʼihi na mmiri niile nke Nimrim ataala.
Aga m eme ka ndị ahụ niile na-achụ aja nʼebe niile dị elu, na ndị ahụ niile na-achụrụ chi ha dị iche iche aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, hapụ ịdịkwa nʼala Moab,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
“Ụda akwa nke na-ada nʼime obi m nʼihi Moab dịka ụda ọja. Ụda akwa nke dịkwa ka ụda ọja na-adakwa nʼime obi m nʼihi ndị Kia Hareset. Akụ niile ha kpakọtara alaala nʼiyi.
A kpụchapụla agịrị isi niile, kpachakwa afụọnụ ha niile. E bipụkwala aka ha niile. Ọ bụkwa akwa mkpe ka e ji kpuchie ukwu niile.
Nʼelu ụlọ niile nke dị na Moab, nakwa nʼama egwuregwu niile, ọ dịghị ihe ọzọ karịa naanị iru ụjụ ka a na-ahụ. Nʼihi na e tiwaala m Moab dịka e si etiwa ite aja nke ọ dịghị onye bụla chọrọ ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
“Lee ka e si tipịa ya! Lee ka ha si akwasị akwa ike! Leekwa ka Moab si gbakụta azụ ya nʼihi ọnọdụ ihere ya! Moab aghọọla ihe ọchị, ọ ghọọla ihe iju anya nye ndị niile gbara ya gburugburu.”
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Lee, ọ dị otu ugo na-efedata, nke gbasapụrụ nku ya kpuchie ala Moab niile.
A ga-adọta Keriọt nʼagha, meriekwa ebe ya niile e wusiri ike. Nʼụbọchị ahụ, obi ndị bụ dike nʼagha nʼala Moab ga-adị ka obi nwanyị ime na-eme.
A ga-ebibi obodo Moab, mee ya ka ọ ghara ịdịkwa, nʼihi na ọ kagidere Onyenwe anyị anya.
Oke egwu na olulu, na igbudu nke onye na-esi ọnya nọ na-eche unu, unu ndị Moab,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
“Nʼoge ahụ, onye ọbụla gbapụrụ ọsọ site nʼihe oke egwu ga-adaba nʼolulu. Onye ọbụla ga-esikwa nʼolulu rịpụta ka igbudu ga-ejide. Nʼihi na aga m eme ka afọ ahụ a kara aka maka ịta Moab ahụhụ bịakwasị ya,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
“Nʼokpuru ndo Heshbọn ka ndị ahụ gbapụrụ ọsọ ndụ guzoro, na-enweghị onye inyeaka. Nʼihi na ọkụ esitela na Heshbọn rere na-aga; ire ọkụ dị ukwuu esitela nʼetiti Saịhọn na-apụ, na-erepịa egedege ihu ndị Moab, na okpokoro isi ndị ahụ ji oke ụzụ na-anya isi.
Ahụhụ dịrị gị, gị Moab! Ebibiela ndị Kemosh niile. A dọtakwala ụmụ gị ndị ikom na ụmụ gị ndị inyom nʼagha, buru ha gaa mba ọzọ.
“Ma emesịa, nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa, aga m eme ka ndị Moab a dọtara nʼagha lọghachi.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. Nke a bụ ọgwụgwụ ikpe ọmụma dịrị Moab.

< Jérémie 48 >