< 1 Chroniques 16 >

1 Et ils introduisirent l'arche de Dieu, et la placèrent au milieu du tabernacle que David avait dressé pour elle, et l'on offrit devant Dieu des holocaustes et des hosties pacifiques.
Ha bubatara igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ guzobe ya nʼime ụlọ ikwu nke Devid manyere maka ya. Ha chekwara aja nsure ọkụ na aja udo nʼihu Chineke.
2 Quand David eut fait ses offrandes d'holocaustes et d'hosties pacifiques, il bénit le peuple au nom du Seigneur.
Mgbe Devid chụsịrị aja nsure ọkụ na aja udo ndị a, ọ gọziri ndị Izrel nʼaha Onyenwe anyị.
3 Et il donna à chaque homme et à chaque femme d'Israël un pain de boulanger, et un pain pétri avec du miel.
O nyekwara onye ọbụla nʼIzrel, ma nwoke ma nwanyị, otu ogbe achịcha, ọkpụrụkpụ anụ na achịcha mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ.
4 Et il institua devant l'arche de l'alliance du Seigneur ceux des lévites qui devaient y être employés, pour chanter et louer le Seigneur Dieu d'Israël, et lui rendre grâces.
Ọ họpụtara ụfọdụ ndị Livayị ka ha nọdụ nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ inye Onyenwe anyị, Chineke Izrel ekele na otuto na ịrịọ ya ngọzị nʼisi ndị ya Izrel. Ndị a bụ ndị o nyere ije ozi a:
5 Asaph fut le chef, et il eut pour second Zacharie; puis, Jehiel, Semiramoth et Jehiel, Matthathias, Eliab, Banaïas et Abdedom: Jehiel jouait de la lyre et de la harpe, et Asaph faisait retentir des cymbales.
Asaf bụ onyeisi ndị a. Ndị ọzọ bụ Zekaraya, Jeiel, Shemiramot, Jehiel, Matitaia, Eliab, Benaya, Obed-Edọm na Jeiel. Ọrụ ha bụ ịkpọ ụbọ akwara, na une, ma ọrụ Asaf bụ onye na-akụ ogene ọla na-ada ụda.
6 Banaïas et Oziel les prêtres, sonnaient toujours de la trompette devant l'arche de l'alliance du Seigneur.
Benaya na Jahaziel, ndị nchụaja, ketara ọrụ ịfụ opi nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Chineke kwamgbe kwamgbe.
7 Et ce jour-là, pour la première fois, David prescrivit que l'on chantât les louanges du Seigneur, sous la direction d'Asaph et de ses frères.
Nʼụbọchị ahụ ka Devid buru ụzọ họpụta Asaf na ndị otu ya ka ha nye Onyenwe anyị otuto nʼusoro dị otu a:
8 Cantique. Rendez hommage au Seigneur, invoquez-le par son nom, faites connaître aux peuples ses désirs.
Nyenụ Onyenwe anyị otuto, kwupụtakwa aha ya, meenụ ka amata nʼetiti mba niile banyere ihe niile ọ rụrụ.
9 Chantez-le, chantez ses louanges; racontez à tous les merveilles qu'a faites le Seigneur.
Bụkuonụ ya abụ, bụkuonụ ya abụ otuto; kwupụtaranụ mba niile ọrụ ebube ya niile.
10 Louez son saint nom; le cœur qui cherche à lui âtre agréable sera réjoui.
Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya; ka obi ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ṅụrịa ọṅụ.
11 Cherchez le Seigneur et soyez forts; cherchez toujours son visage.
Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya, chọọnụ ihu ya mgbe niile.
12 Souvenez-vous des prodiges qu'il a faits, des merveilles et des jugements sortis de sa bouche.
Chetanụ ọrụ ebube niile nke ọ rụrụ, ihe ịrịbama ya niile na ikpe ziri ezi niile nke si nʼọnụ ya pụta.
13 Enfants d'Israël, ses serviteurs; fils de Jacob, ses élus;
Unu, ụmụ Izrel, bụ ohu ya ụmụ Jekọb, ndị ọ họpụtara.
14 Le Seigneur seul est notre Dieu; ses jugements sont sur toute la terre.
Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị Chineke anyị; ikpe ya dị nʼụwa niile.
15 Souvenons-nous toujours de son alliance, de la loi qu'il nous a donnée pour des milliers de générations,
Ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi; bụ nkwa o kwere nye puku ọgbọ.
16 De son alliance avec Abraham; de son serment à Isaac,
Ọgbụgba ndụ ahụ nke ya na Ebraham gbara, na iyi ọ ṅụrụ nye Aịzik.
17 Il l'a confirmé à Jacob comme un commandement, à Israël comme une alliance impérissable,
O mere ka o guzoro nye Jekọb dịka ụkpụrụ, ma nʼebe Izrel nọ dịka ọgbụgba ndụ ebighị ebi:
18 Disant: Je te donnerai la terre de Chanaan; c'est ta part d'héritage.
Sị, “Aga m enye gị ala Kenan ka ọ bụrụ ihe nketa gị.”
19 Alors, ils étaient en petit nombre, ils étaient humbles, et ils étaient passagers sur cette terre,
Mgbe ha dị ole na ole nʼọnụọgụgụ, nʼezie, ole na ole, bụrụkwa ọbịa nʼala ahụ.
20 Et ils allèrent d'une nation à l'autre, et d'un royaume à un autre peuple,
Ha wagharịrị site nʼotu mba gaa mba ọzọ, sitekwa nʼotu alaeze gaa na alaeze ọzọ.
21 Et à nul homme il ne permit de prévaloir sur eux, et à leur sujet il châtia des rois:
O kweghị ka onye ọbụla mekpaa ha ahụ; ọ baara ndị eze mba nʼihi ha, sị:
22 Ne touchez point à mes christs; ne maltraitez pas mes prophètes,
“Unu emetụkwala ndị m e tere mmanụ aka, unu emekpakwala ndị amụma m ahụ.”
23 Chantez le Seigneur: que toute la terre le chante, proclamez chaque jour que lui seul est notre salut.
Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ụwa niile; kwupụtanụ nzọpụta ya site nʼotu ụbọchị ruo nʼụbọchị nke ọzọ.
24 [Racontez aux nations sa gloire, à tous les peuples ses merveilles.] Car le Seigneur est grand et digne de louanges infinies; il est redoutable plus que tous les dieux.
Kwusaanụ ebube ya nʼetiti mba niile, kọsakwanụ banyere oke ọrụ ya niile nʼetiti ndị niile dị iche iche.
25 [Racontez aux nations sa gloire, à tous les peuples ses merveilles.] Car le Seigneur est grand et digne de louanges infinies; il est redoutable plus que tous les dieux.
Nʼihi na Onyenwe anyị dị ukwuu, ọ bụkwa onye kachasị ka e nye otuto. Onye a na-atụ egwu karịa chi ọzọ niile ka ọ bụkwa.
26 Car, tous les dieux des nations sont des idoles, et notre Dieu a créé le ciel.
Nʼihi na chi niile nke mba niile dị iche iche bụ arụsị efu, maọbụ Onyenwe anyị kere eluigwe niile.
27 Gloire et louange à lui face à face; force et joie au lieu où il réside.
Ịma mma na ebube dị nʼihu ya; ike na ọṅụ dị nʼebe obibi ya.
28 Tribus des nations, donnez au Seigneur, donnez au Seigneur force et gloire.
Nyenụ Onyenwe anyị, unu ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche, nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ na ike.
29 Glorifiez le nom du Seigneur; prenez des dons et offrez-les au Seigneur en sa présence, et adorez le Seigneur dans ses demeures saintes.
E, nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ ruuru aha ya, werenụ onyinye bịa nʼihu ya. Kpọọnụ isiala nye Onyenwe anyị nʼịma mma nke ịdị nsọ ya.
30 Que toute la terre ait crainte devant lui; que la terre s'affermisse et ne soit point ébranlée.
Maa jijiji nʼihu ya, unu ụwa niile. Elu ụwa niile kwụ chịm, a pụghị iwezuga ya nʼọnọdụ ya.
31 Que le ciel se réjouisse, que la terre tressaille d'allégresse, et qu'ils disent aux nations: Le Seigneur règne.
Ka eluigwe ṅụrịa, ka ụwa nwekwa obi ụtọ; ka ha kwupụta nʼetiti mba niile sị, “Onyenwe anyị na-achị.”
32 La mer bruira dans sa plénitude, et l'arbre des champs avec tout ce qu'il porte se réjouira.
Ka osimiri bigbọọ, na ihe niile dị nʼime ya, ka ala ubi niile na ihe niile dị nʼime ha jupụta nʼobi ụtọ.
33 Alors, les arbres de la forêt se réjouiront devant le Seigneur, parce qu'il est venu juger la terre.
Ka osisi niile nke oke ọhịa bụọ abụ, ka ha bụọ abụ ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe.
34 Rendez hommage au Seigneur, parce qu'il est bon et que sa miséricorde est éternelle.
Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
35 Et dites: Sauvez-nous, ô Dieu notre salut; recueillez-nous et séparez- nous des nations, afin que nous chantions les louanges de votre saint nom, et que noua mettions notre gloire à vous louer.
Tikuonụ ya mkpu sị, “Zọpụta anyị, gị Chineke, Onye nzọpụta anyị; chịkọta anyị, ma napụtakwa anyị site nʼaka mba dị iche iche, ka anyị nwee ike nye aha nsọ gị ekele; ma nyaakwa isi nʼime otuto gị.”
36 Béni soit le nom du Seigneur Dieu d'Israël dans tous les siècles des siècles, et tout le peuple dira: Amen. Et ils louèrent le Seigneur.
Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. Mgbe ahụ, mmadụ niile sịrị, “Amen” na “Toonu Onyenwe anyị.”
37 Et ils laissèrent là devant l'arche de l'alliance du Seigneur Asaph et ses frères, pour faire devant l'arche à perpétuité le service de chaque jour.
Devid hapụrụ Asaf na ndị Livayị ibe ya nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ ụbọchị niile ije ozi mgbe niile, dịka ọrụ ụbọchị ọbụla si dị.
38 Ils laissèrent aussi Abdedom et ses frères, au nombre de soixante-huit, et Abdedom, fils d'Idithun, et Osa pour être portiers.
Obed-Edọm nwa Jedutun so nʼime ha, ya na Hosa, na iri mmadụ isii na asatọ ọzọ. Obed-Edọm nwa Jedutun na Hosa bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ.
39 Et Sadoc le prêtre, avec ses frères les prêtres, fut laissé devant le tabernacle du Seigneur, sur le haut lieu de Gabaon,
Devid nyefekwara Zadọk, onye nchụaja, na ndị nchụaja ibe ya, ọrụ ịnọ nʼihu ụlọ nzute Onyenwe anyị, nʼebe dị elu nke Gibiọn.
40 Afin d'offrir des holocaustes au Seigneur, sur l'autel des holocaustes à perpétuité, matin et soir, selon qu'il est écrit en la loi du Seigneur, qu'il a donnée aux fils d'Israël par la voix de Moïse, son serviteur.
Nʼihi ịchụ aja nsure ọkụ mgbe niile nʼelu ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, ụtụtụ na anyasị niile nʼusoro dịka e si dee ya nʼakwụkwọ iwu Onyenwe anyị, nke o nyere ndị Izrel.
41 Et avec Sadoc étaient Hêman et Idithun, et le reste de ceux qu'on avait nominativement désignés pour louer le Seigneur, parce que sa miséricorde est éternelle.
Devid họpụtakwara Heman, na Jedutun, na ndị ọzọ a kpọrọ aha họpụta inye Onyenwe anyị ekele, “nʼihi ịhụnanya ya na obi ebere ya nke na-adị ruo mgbe ebighị ebi.”
42 Et ils avaient avec eux des trompettes et des cymbales, pour les faire retentir, et les instruments accompagnant les cantiques de Dieu. Et les fils d'Idithun étaient gardiens des portes.
Heman na Jedutun bụ ndị ọ dịịrị ịfụ opi, na ịkụ ogene ọla, na ihe egwu ndị ọzọ eji na-enye Chineke otuto. Ụmụ ndị ikom Jedutun bụ ndị nọ nche nʼọnụ ụzọ ama.
43 Et le peuple s'en retourna chacun en sa demeure, et David s'en alla pour bénir sa maison.
Mgbe mmemme ahụ gwụsịrị, onye ọbụla lara nʼụlọ ya. Devid lakwara ịgọzi ezinaụlọ ya.

< 1 Chroniques 16 >