< 2 Chroniques 30 >

1 Ezéchias envoya un message à tout Israël et Juda; il écrivit aussi des lettres à Ephraïm et Manassé, les invitant à venir au temple de l’Eternel à Jérusalem, pour célébrer la Pâque en l’honneur de l’Eternel, Dieu d’Israël.
Hezekaya zigaara ndị Izrel na Juda niile ozi, degakwara ndị Ifrem na Manase akwụkwọ ịkpọ oku ka ha bịa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị dị na Jerusalem maka ime Mmemme Ngabiga nye Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel.
2 Le roi et ses chefs et toute la communauté de Jérusalem furent d’avis de célébrer la Pâque au second mois.
Eze na ndịisi ya, na ndị nkpọkọta niile na Jerusalem kpebiri na Mmemme Ngabiga a ga-adị nʼọnwa nke abụọ.
3 Car ils n’avaient pu la célébrer en ce temps-là, parce que les prêtres ne s’étaient pas sanctifiés en nombre suffisant et que le peuple ne s’était pas réuni à Jérusalem.
Ha enweghị ike ime ya nʼoge e kwesiri ime ya nʼihi na ọtụtụ ndị nchụaja enwebeghị ike doo onwe ha nsọ nʼọnwa ahụ. Otu a kwa, ndị Izrel enwebeghịkwa ike zukọtaa na Jerusalem.
4 La chose plut aux yeux du roi et aux yeux de toute l’assemblée,
Eze na Izrel niile nwere otu mkpebi ime ya otu a.
5 et ils décidèrent de proclamer par tout Israël, de Bersabée à Dan, qu’on eût à venir célébrer la Pâque en l’honneur de l’Eternel, Dieu d’Israël, à Jérusalem, car on ne l’avait pas de longtemps célébrée ainsi qu’il était écrit.
Ha kpebiri ka e kwusaa nʼala Izrel niile site na Dan ruo na Bịasheba ka onye ọbụla bịa na Jerusalem maka ime Mmemme Ngabiga nye Onyenwe anyị, Chineke Izrel. Ọtụtụ mmadụ nʼIzrel esobeghị mee mmemme a dịka e nyere ya nʼiwu.
6 Les courriers partirent, nantis des lettres de la main du roi et de ses chefs, dans tout Israël et Juda, pour dire, conformément à l’ordonnance du roi: "Enfants d’Israël, revenez à l’Eternel, Dieu d’Abraham, d’Isaac et d’Israël, afin qu’il revienne à ce reste de vous qui a pu échapper à la main des rois d’Assyrie.
Ndị ọgba ọsọ weere akwụkwọ ozi sitere nʼaka eze na ndị ozi ya jegharịa nʼIzrel na Juda niile dịka ihe eze nyere nʼiwu si: “Unu ndị Izrel, lọghachikwutenụ Onyenwe anyị Chineke Ebraham, na Aịzik, na Jekọb, ka ọ laghachikwute unu bụ ndị eze Asịrịa na-emeribeghị.
7 Ne soyez point semblables à vos pères et à vos frères, qui furent infidèles à l’Eternel, Dieu de leurs pères, de sorte qu’il les livra à la désolation, comme vous le voyez.
Unu adịkwala ka nna unu ha, na ụmụnne unu ndị Izrel, ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, bụ Chineke nna nna ha, nke a mere o jiri were ha mee ihe iju anya, dịka unu hụrụ ya.
8 A présent, ne roidissez pas votre nuque comme vos pères; tendez la main vers l’Eternel, venez dans son sanctuaire, qu’il a consacré à jamais, servez l’Eternel, votre Dieu, afin qu’il détourne de vous le feu de sa colère.
Unu abụla ndị isiike dịka ha, kama werenụ onwe unu nye Onyenwe anyị. Bịakwanụ nʼụlọnsọ ya nke o doro nsọ ruo ebighị ebi. Fee Onyenwe anyị Chineke unu ofufe, ime ka iwe ya jụrụ nʼebe unu nọ.
9 C’Est par votre retour à l’Eternel que vos frères et vos enfants trouveront de la pitié auprès de leurs ravisseurs, de façon à retourner dans ce pays, car clément et miséricordieux est l’Eternel, votre Dieu, et il ne détournera pas sa face de vous, si vous revenez à lui."
Ọ bụrụ na unu alọghachikwute Onyenwe anyị, ọ ga-eme ka e gosi ụmụnna unu na ụmụ unu a dọtara nʼagha obi ebere, meekwa ka ha site nʼebe e bugara ha lọghachikwa. Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu bụ onye obi ebere, na onye obiọma; ọ gakwaghị agbakụta unu azụ, ma ọ bụrụ na unu echegharịa, lọghachikwute ya.”
10 Les courriers passèrent de ville en ville dans le pays d’Ephraïm et de Manassé jusqu’en Zabulon, mais on se railla d’eux et on les bafoua.
Ya mere, ndị ọgbọ ọsọ ozi ahụ sitere otu obodo gaa obodo ọzọ nʼIfrem, na Manase, ọ bụladị ruo Zebụlọn. Ma ndị mmadụ chịrị ha ọchị, kwaakwa ha emo.
11 Seuls des hommes d’Aser, de Manassé et de Zabulon s’humilièrent et vinrent à Jérusalem.
Ma otu ọ dị, ụfọdụ ndị si nʼebo Asha na Manase, na Zebụlọn wedatara onwe ha ala, bịa Jerusalem.
12 En Juda aussi la main de Dieu agit pour leur donner un même cœur, afin d’accomplir l’ordre du roi et des chefs selon la prescription de l’Eternel.
Ma aka Chineke dịnyere ndị Juda inye ha otu obi, ime ihe eze na ndịisi ya nyere nʼiwu, site nʼokwu Onyenwe anyị.
13 Une population nombreuse se réunit à Jérusalem pour célébrer la fête des azymes au second mois; ce fut une affluence énorme.
Ya mere, ọtụtụ mmadụ bịara Jerusalem nʼọnwa nke abụọ nke afọ ahụ, maka mmemme achịcha ekoghị eko.
14 Ils se levèrent, ôtèrent les autels qui se trouvaient à Jérusalem; ils enlevèrent aussi les encensoirs et les jetèrent au torrent du Cédron.
Ha niile jiri otu obi bibie ụlọ arụsị Baal niile dị na Jerusalem, kụtuokwa ebe ịchụ aja na-esi isi ụtọ niile, buru ha niile bufuo ha na Ndagwurugwu Kidrọn.
15 Puis ils immolèrent le sacrifice pascal le quatorze du second mois; les prêtres et les Lévites eurent honte, se sanctifièrent et apportèrent des holocaustes au temple de l’Eternel.
Nʼabalị nke iri na anọ nke ọnwa abụọ ahụ, ndị mmadụ ahụ niile gburu atụrụ Mmemme Ngabiga ha. Nke a mere ka ihere mee ndị nchụaja na ndị Livayị. Ha mekwara ngwangwa doo onwe ha nsọ were aja nsure ọkụ bịa nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
16 Ils se tinrent à leur place selon leur règle, conformément à la loi de Moïse, homme de Dieu; les prêtres versaient le sang que leur passaient les Lévites.
Ha niile guzokwara nʼọnọdụ ha dịka e dere ya nʼiwu Mosis, onye nke Chineke. Ndị nchụaja fesara ọbara nke ndị Livayị bunyere ha nʼaka, nʼelu ebe ịchụ aja.
17 Car il y en avait beaucoup dans l’assemblée qui ne s’étaient point sanctifiés, et les Lévites étaient chargés d’immoler les sacrifices pascaux pour tous ceux qui n’étaient pas purs, afin de les consacrer à l’Eternel.
Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị so nʼigwe mmadụ ahụ edobeghị onwe ha nsọ, ndị Livayị gbuuru ha atụrụ Mmemme Ngabiga nʼihi na ha adịghị ọcha, ha apụghịkwa ido atụrụ ha nsọ nye Onyenwe anyị.
18 Une grande partie du peuple, beaucoup de gens d’Ephraïm et de Manassé, d’Issachar et de Zabulon, ne s’étaient pas purifiés; ils avaient mangé l’agneau pascal sans égard aux prescriptions; mais Ezéchias avait intercédé pour eux, disant: "L’Eternel, qui est bon, absoudra
Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị sitere nʼIfrem, na Manase, na Isaka, na Zebụlọn edoghị onwe ha ọcha, ma ha sokwa rie oriri ngabiga ahụ, si otu a mebie ihe e dere nʼiwu. Ma Hezekaya kpeere ha ekpere sị, “Ka Onyenwe anyị onye dị mma gbaghara onye ọbụla
19 quiconque aura disposé son cœur à rechercher l’Eternel, Dieu de ses pères, même sans la purification de sainteté."
bụ ndị ji obi ha na-achọ Onyenwe anyị Chineke nke nna nna ha, ọ bụladị ma ọ bụrụ na ha adịghị ọcha dịka iwu nke ebe nsọ si dị.”
20 L’Eternel exauça Ezéchias et pardonna au peuple.
Onyenwe anyị nụrụ ekpere Hezekaya gwọọkwa ha.
21 Les enfants d’Israël se trouvant à Jérusalem célébrèrent donc la fête des Azymes sept jours, en grande joie, et les Lévites et les prêtres louèrent l’Eternel jour par jour, avec des instruments puissants en l’honneur de l’Eternel.
Ya mere, ndị Izrel ahụ niile ji ọṅụ mee mmemme achịcha ekoghị eko ahụ na Jerusalem ụbọchị asaa. Ma ndị nchụaja na ndị Livayị ji abụ na ngwa egwu Onyenwe anyị too ya otuto ụbọchị ahụ niile.
22 Ezéchias adressa des encouragements à tous les Lévites qui se montraient très entendus au service de l’Eternel. Ils consommèrent les repas de la fête durant les sept jours, offrant des sacrifices d’actions de grâces et rendant hommage à l’Eternel, Dieu de leurs pères.
Hezekaya ji okwu dị mma gbaa ndị Livayị ume nʼihi ezi nghọta ha nwere nʼijere Onyenwe anyị ozi. Nʼime ụbọchị asaa ahụ niile, ha chụrụ aja udo, riekwa ihe ha ketara site nʼaja niile a chụrụ. Ha tokwara Onyenwe anyị Chineke nna nna ha otuto.
23 Toute l’assemblée fut d’accord pour célébrer sept autres jours, et ils célébrèrent sept jours de réjouissances.
Nʼihi oke ọṅụ ha niile nwere, ha kpebiri ime mmemme ahụ gaa nʼihu ụbọchị asaa ọzọ.
24 Car Ezéchias, roi de Juda, avait prélevé pour l’assemblée mille taureaux et sept mille moutons, les chefs avaient prélevé pour l’assemblée mille taureaux et dix mille moutons et des prêtres s’étaient sanctifiés en grand nombre.
Hezekaya eze Juda, nyere nzukọ ahụ otu puku oke ehi, na puku atụrụ asaa. Ndị ozi eze niile nyekwara ha, otu puku oke ehi na puku atụrụ iri. Ọtụtụ ndị nchụaja dooro onwe ha nsọ.
25 Toute l’assemblée de Juda se réjouit, ainsi que les prêtres, les Lévites, toute la foule venue du pays d’Israël et les étrangers, ceux qui étaient venus du pays d’Israël et ceux qui résidaient en Juda.
Nʼoge ahụ kwa, oke ọṅụ jupụtara nʼobi ndị Juda niile, na nʼobi ndị nchụaja na ndị Livayị, na nʼobi ndị ọbịa, na ndị sitere ala Izrel bịa.
26 Il y eut une grande joie à Jérusalem, car depuis le temps de Salomon, fils de David, roi d’Israël, il n’y avait rien eu de semblable à Jérusalem.
Oke ọṅụ jupụtara na Jerusalem nʼihi na site nʼoge Solomọn nwa Devid, eze Izrel ruo nʼoge a, e mebeghị mmemme dị otu a na Jerusalem.
27 Les prêtres et les Lévites se levèrent et bénirent le peuple; leur voix fut entendue et leur prière parvint au séjour de Sa sainteté, aux cieux.
Mgbe ahụ, ndị nchụaja na ndị Livayị guzoro gọzie ọha mmadụ ahụ niile. Chineke nụkwara ekpere ha site nʼebe obibi ya dị nsọ nke eluigwe.

< 2 Chroniques 30 >