< 1 Rois 9 >

1 Lorsque Salomon eut achevé de bâtir la maison du Seigneur, ainsi que la demeure royale et tout ce qu’il avait désiré et projeté de faire,
Mgbe Solomọn rụchara ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na ụlọeze, rụzukwaa ihe niile bụ nke o bu nʼobi ime,
2 le Seigneur apparut une seconde fois à Salomon, comme il lui était apparu à Gabaon,
Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ya anya nke ugboro abụọ dịka o mere ka ọ hụ ya anya na Gibiọn.
3 et lui dit: "J’Accueille ta prière et la supplication que tu m’as adressée: cette maison que tu as bâtie, je la sanctifie en y faisant régner mon nom à jamais, en y dirigeant constamment mes yeux et ma pensée.
Onyenwe anyị sịrị ya, “Anụla m ekpere gị, na arịrịọ gị, nke ị rịọrọ nʼihu m. Edoola m ụlọnsọ a nke i wuru nsọ, site nʼitinye Aha m nʼebe ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Anya m na obi m abụọ ga-adịkwa nʼebe ahụ ụbọchị niile.
4 Pour toi, si tu marches devant moi comme a marché David, ton père, avec un cœur droit et sincère, en te conformant à tout ce que je t’ai prescrit, en gardant mes lois et mes statuts,
“Ma gị onwe gị, ọ bụrụ na ị jiri obi zuruoke na omume ziri ezi, bie ndụ nʼikwesị ntụkwasị obi nʼihu m dịka Devid nna gị mere, na-eme ihe niile m nyere nʼiwu, debe ụkpụrụ m na iwu m niile,
5 je maintiendrai à jamais ta royauté sur Israël, ainsi que je l’ai promis à David, ton père, en disant: Aucun des tiens ne sera jamais exclu du trône d’Israël.
mgbe ahụ, aga m eme ka ocheeze ọchịchị gị nʼIzrel guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi, dịka m kwere nna gị Devid nkwa, mgbe m sịrị, ‘Ị ghaghị inwe onye nnọchite anya nʼocheeze Izrel.’
6 Mais si vous vous détournez de moi, vous et vos descendants, si vous négligez d’observer mes préceptes, les lois que je vous ai données, et que vous alliez servir des dieux étrangers et vous prosterner devant eux,
“Ma ọ bụrụ na unu, maọbụ ụmụ ụmụ unu alaghachi azụ, site nʼebe m nọ, jụ idebe iwu na ụkpụrụ niile bụ nke m nyere unu, pụọ gbasoro chi ndị ọzọ ife ha ofufe na ịkpọ isiala nye ha,
7 je ferai disparaître Israël de la face du pays que je lui ai donné; cette maison, que j’ai consacrée à mon nom, je la répudierai, et Israël deviendra la fable et la dérision de tous les peuples;
mgbe ahụ, aga m esite nʼala ahụ nke m nyere ha wezuga Izrel. Aga m ajụkwa ụlọnsọ a m doro nsọ nye Aha m. Izrel ga-aghọ ihe eji atụ ilu na ihe ịkpa ọchị nʼetiti ndị niile.
8 et cette maison placée à un si haut rang ne produira plus, chez tout venant, que stupeur et raillerie; et quand on dira: "Pourquoi le Seigneur a-t-il traité ainsi ce pays et ce temple?"
Ọ bụ ezie na ụlọnsọ ukwu a kachasị elu ugbu a, ma ọnọdụ ya ga-eju ndị niile ga-esi nʼakụkụ ya gafee anya. Ha ga-emi ọnụ, sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee ala a na ụlọnsọ a, ihe dị otu a?’
9 On répondra: "Parce qu’ils ont abandonné le Seigneur, leur Dieu, qui avait délivré leurs pères de l’Egypte, ont adopté des divinités étrangères, les ont servies et adorées, c’est pour cela que le Seigneur leur a suscité tous ces malheurs."
Ndị mmadụ ga-aza, ‘Nʼihi na ha gbakụtara Onyenwe anyị Chineke ha azụ, onye kpọpụtara ha site nʼala Ijipt azụ, makụọ chi ndị ọzọ, na-akpọ isiala na-efekwa ha ofufe. Ọ bụ nʼihi nke a ka O ji mee ka ihe ọjọọ niile ndị a bịakwasị ha.’”
10 Or, au bout des vingt ans employés par Salomon à construire les deux maisons, la maison du Seigneur et celle du roi,
Nʼọgwụgwụ iri afọ abụọ, mgbe Solomọn ji wuo ụlọ abụọ ndị a, ya bụ ụlọnsọ Onyenwe anyị na ụlọeze.
11 Hiram, roi de Tyr, ayant fourni à Salomon le bois de cèdre, le bois de cyprès, l’or et tout ce qu’il désirait, le roi Salomon donna à Hiram vingt villes de la province de Galilée.
Eze Solomọn nyere Hiram, eze Taịa, iri obodo abụọ dị na Galili, nʼihi osisi sida, na osisi junipa, na ọlaedo niile Hiram butere ya dịka o si chọọ ya.
12 Hiram sortit de Tyr pour examiner les villes que Salomon lui avait données; elles ne lui plurent point:
Ma mgbe Hiram si Taịa gaa ịhụ obodo ndị a nke Solomọn nyere ya, ha amasịghị obi ya.
13 "Qu’est-ce que ces villes, dit-il, que tu m’as données, mon frère?" Et il les appela le pays de Kaboul, nom qu’elles portent encore aujourd’hui.
Ya mere, ọ jụrụ sị, “Nwanne m nwoke, ụdị obodo dị aṅaa bụ ihe a i nyere m?” Nʼihi ya, ọ kpọrọ ha Kabul, aha ọ na-aza ruo taa.
14 Hiram envoya au roi cent vingt kikkar d’or.
Hiram zigaara eze ọlaedo dị puku kilogram anọ na iri asatọ.
15 Le but de l’impôt qu’avait levé le roi Salomon était de construire la maison de l’Eternel et sa propre maison, plus le Millo, la muraille de Jérusalem, Haçor, Meghiddo et Ghézer.
Nke a bụ akụkọ banyere ndị ọrụ mmanye niile eze bụ Solomọn chịkọtara maka ịrụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na ụlọeze nke ya, na ebe e wusiri ike nke Milo, na mgbidi Jerusalem, Hazọ, Megido nakwa Gaza.
16 Car Pharaon, roi d’Egypte, avait fait une incursion, s’était emparé de Ghézer, l’avait incendiée, avait fait périr les Cananéens habitant cette ville, et l’avait donnée en dot à sa fille, épouse de Salomon.
Fero eze Ijipt buru agha na mbụ merie Gaza, kpọọ ya ọkụ, gbukwaa ọtụtụ ndị Kenan bi nʼobodo ahụ, were ya nye nwa ya nwanyị, bụ nwunye Solomọn, ka ọ bụrụ ihe o ji duo ya ụlọ.
17 Et Salomon rebâtit Ghézer, ainsi que le Beth-Horôn inférieur,
Solomọn wugharịrị obodo Gaza, wuokwa ndịda Bet-Horon,
18 Baalat, le Tadmor du désert dans le même pays;
Baalat na Tadmọ nke dị nʼọzara nʼime ala ya.
19 plus toutes les villes d’approvisionnement de Salomon, les villes des chariots, celles des cavaliers, bref, ce qu’il plaisait à Salomon de construire à Jérusalem, au Liban et dans tout le pays soumis à sa domination.
O wukwara ọtụtụ obodo ebe nchịkọba ihe, obodo ebe idebe ụgbọ agha na ịnyịnya ya niile. O wuru ihe ọbụla gụrụ obi ya agụụ iwu na Jerusalem, Lebanọn na nʼoke ala ahụ niile ọ na-achị.
20 Toute la population survivante des Amorréens, des Héthéens, des Phérézéens, des Hévéens et des Jébuséens, lesquels ne font point partie des enfants d’Israël,
Ndị niile fọdụrụ ndụ nʼetiti ndị Amọrait, ndị Het, ndị Periz, ndị Hiv na Jebus (ndị ahụ abụghị ndị Izrel),
21 tous leurs descendants qui étaient restés après eux dans le pays, les enfants d’Israël n’ayant pu les exterminer, Salomon les obligea à payer tribut; ce qu’ils font encore aujourd’hui.
ndị ụmụ ụmụ ha niile fọdụrụ nʼala ahụ, ndị ahụ ndị Izrel na-enweghị ike egbuchapụ, ndị a ka Solomọn mere ndị ọrụ mmanye na ndị ohu, nke a bụkwa ọnọdụ ha ruo taa.
22 Pour les enfants d’Israël, Salomon n’en employa aucun comme esclave, ils étaient seulement ses hommes de guerre, ses fonctionnaires, ses officiers, capitaines, commandants de ses chars et de sa cavalerie.
Ma Solomọn emeghị ka onye Izrel ọbụla bụrụ ohu. Kama ha bụ ndị ikom agha, ndịisi ọrụ nʼọchịchị, ndịisi ndị ọchịagha, ndịisi ụgbọ agha na ndị na-agba ịnyịnya agha ya.
23 Les surveillants en chef des travaux de Salomon étaient au nombre de cinq cent cinquante, chargés de stimuler les travailleurs.
Ndị a bụkwa ndịisi na-ahụ ihe banyere ọrụ niile nke Solomọn ji nʼaka. Ndị Izrel dị narị ise na iri ise, ka e mere ndịisi na-elekọta ndị ọrụ Solomọn.
24 Quant à la fille de Pharaon, elle se transporta de la Cité de David dans la demeure que Salomon lui avait construite; c’est ensuite qu’il édifia le Millo.
Emesịa, ada Fero sitere nʼobodo Devid pụta gbagoo nʼụlọeze nke Solomọn wuuru ya. Solomọn wukwara ebe mpụta nke ụlọ ahụ.
25 Trois fois l’année, Salomon offrait des holocaustes et autres sacrifices sur l’autel qu’il avait élevé au Seigneur; il offrait, en outre, l’encens devant le Seigneur, et il compléta le service du temple.
Ugboro atọ nʼafọ, ka Solomọn na-achụ aja nsure ọkụ, na aja udo nʼelu ebe ịchụ aja o wuru nye Onyenwe anyị, tinyere aja nsure ọkụ ihe na-esi isi ụtọ ọ na-achụ nʼihu Onyenwe anyị. O si otu a wuchaa ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
26 Le roi Salomon fit aussi construire une flotte à Ecion-Ghéber, qui est près d’Elot, au bord de la mer de Souf, dans le pays d’Edom.
Eze Solomọn wukwara ọtụtụ ụgbọ mmiri nʼEziọn Geba, bụ nke dị nʼakụkụ Elat, nʼọnụ mmiri Oke osimiri Uhie nʼala Edọm.
27 Hiram envoya sur ces vaisseaux ses serviteurs, matelots experts dans la marine, pour aider les serviteurs de Salomon.
Hiram zigaara ndị ikom ya na-anya ụgbọ, ndị maara ihe banyere ime njem osimiri nke ọma, ka ha soro ndị ikom Solomọn jee ozi nʼime ụgbọ ndị a.
28 Ils arrivèrent à Ofir et en rapportèrent quatre cent vingt kikkar d’or, qu’ils remirent au roi Salomon.
Ha nyaara ụgbọ gaa Ọfịa, site nʼebe ahụ bulatara eze Solomọn ọlaedo nke ịdị arọ ya ruru puku kilogram iri na anọ na narị abụọ na asatọ.

< 1 Rois 9 >