< Zacharie 2 >

1 Je levai les yeux et je vis: Et voici un homme ayant à la main un cordeau à mesurer.
Mgbe m weliri anya m, ahụrụ m otu nwoke ji eriri ihe ọtụtụ nʼaka ya.
2 Et je dis: " Où vas-tu? " Et il me dit: " Je vais mesurer Jérusalem pour voir quelle en doit être la largeur et quelle en doit être la longueur. "
Ajụrụ m, “Ebee ka ị na-aga?” Ọ sịrị m, “Ana m aga ịtụ Jerusalem, ịchọta ịdị ogologo ya, na ịdị obosara ya.”
3 Et voici que parut l'ange qui parlait avec moi; et un autre ange apparut, allant à sa rencontre;
Mgbe mmụọ ozi na-ekwuru m okwu na-apụ, mmụọ ozi ọzọ bịara izute ya,
4 et il lui dit: " Cours! Parle à ce jeune homme en ces termes: C'est comme une ville ouverte que sera habitée Jérusalem, tant il y aura en son sein d'hommes et de bêtes.
ọ sịrị ya, “Gbaa ọsọ, gwa nwa okorobịa ahụ, sị, ‘Obodo na-enweghị mgbidi ka Jerusalem ga-abụ, nʼihi ọtụtụ igwe mmadụ na anụmanụ ga-ejupụta nʼime ya.
5 Et moi, je serai pour elle, — oracle de Yahweh, — une muraille de feu à l'entour, et je serai en gloire au milieu d'elle.
Ma mụ onwe m ga-abụrụ ya mgbidi ọkụ nke ga-agba ya gburugburu.’ Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. ‘Aga m aghọ ebube nʼetiti ya.’
6 Holà! Holà! Fuyez du pays du septentrion, — oracle de Yahweh, car je vous ai dispersés aux quatre vents du ciel, — oracle de Yahweh.
“Bịa, lee anya! Sitenụ nʼala dị nʼugwu gbapụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “nʼihi na achụsasịrị m unu nye ikuku anọ nke eluigwe,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
7 Holà! Sion, sauve-toi, toi qui habites chez la fille de Babylone!
“Bịanụ, unu ndị bi na Zayọn. Gbalaganụ, unu ndị bi nʼala nke ada Babilọn.”
8 Car ainsi parle Yahweh des armées: Pour sa gloire il m'a envoyé vers les nations qui vous ont pillés; car qui vous touche touche la prunelle de son œil.
Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Mgbe Onye ahụ dị ebube zipụrụ m ịga megide mba ndị ahụ niile kwakọọrọ ihe unu. Nʼihi na onye ọbụla metụrụ unu aka bụ mkpụrụ anya m ka ọ na-emetụ aka.
9 Car voici que j'agite ma main sur elles, et elles seront un butin pour ceux qui leur sont asservis; et vous saurez que Yahweh des armées m'a envoyé.
Aghaghị m iweli aka m imegide ha, meekwa ka ndị ohu ha kwakọrọ ihe niile ha nwere. Mgbe ahụ, unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zitere m.
10 Pousse des cris de joie et sois dans l'allégresse, fille de Sion; car voici que je viens et j'habiterai au milieu de toi, — oracle de Yahweh.
“Tie mkpu ọṅụ, ka obi tọkwaa gị ụtọ, gị Ada Zayọn. Nʼihi na ana m abịa ibi nʼetiti gị,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
11 Beaucoup de nations s'attacheront à Yahweh en ce jour-là, et elles seront mon peuple; et j'habiterai au milieu de toi, et tu sauras que Yahweh des armées m'a envoyé vers toi.
“Nʼụbọchị ahụ, ọtụtụ mba dị iche iche ga-adịnyere Onyenwe anyị, bụrụkwa ndị nke m. Aga m ebi nʼetiti gị, ị ga-amatakwa na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zitere m ka m bịakwute gị.
12 Yahweh possédera Juda comme sa portion sur la terre sainte, et il choisira encore Jérusalem.
Onyenwe anyị ga-eketa Juda dịka oke ya nʼime ala ahụ dị nsọ. Ọ ga-ahọrọkwa Jerusalem ọzọ.
13 Que toute chair fasse silence devant Yahweh, car il s'est élevé de sa sainte demeure.
Derenụ duu nʼihu Onyenwe anyị, unu mmadụ niile, nʼihi na o sitela nʼebe obibi ya dị nsọ kpalie onwe ya.”

< Zacharie 2 >