< Jérémie 27 >

1 Au commencement du règne de Joakim, fils de Josias, roi de Juda, cette parole fut adressée à Jérémie de la part de Yahweh:
Na mmalite ọchịchị Zedekaya, nwa Josaya eze Juda, okwu ndị a si nʼọnụ Onyenwe anyị rute Jeremaya ntị.
2 Ainsi m'a parlé Yahweh: Fais-toi des liens et des jougs, et mets-les sur ton cou.
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị gwara m, “Jiri akpụkpọ anụ dị warawara na ụfọdụ okporo igwe, meere onwe gị ụdị agbụ ahụ a na-amanye ụmụ ehi nʼolu, nyakwasị ya nʼolu gị.
3 Puis envoie-les au roi d'Edom, au roi de Moab, au roi des enfants d'Ammon, au roi de Tyr et au roi de Sidon, par l'intermédiaire des ambassadeurs qui sont venus à Jérusalem auprès de Sédécias, roi de Juda.
Mgbe ahụ, zigara ndị eze Edọm, na Moab, na Amọn, na Taịa, na Saịdọn ozi site nʼọnụ ndị ozi ha bịara Jerusalem iwetara Zedekaya eze Juda ozi.
4 Donne-leur un message pour leurs maîtres, en ces termes: Ainsi parle Yahweh des armées, Dieu d’Israël: Voici ce que vous direz à vos maîtres:
Zie ha ozi ha ga-ezi ndị nwe ha, sị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, sị, “Zienụ ndị nna unu ukwu ozi a, sị,
5 C'est moi qui, par ma puissance et par mon bras étendu, ai fait la terre, l'homme et les animaux qui sont sur la face de la terre, et je la donne à qui il me plaît.
Ọ bụ site nʼike aka m, na site nʼogwe aka m, nke e setịrị eseti, ka m ji mee ụwa, na mmadụ, na anụmanụ dị nʼime ya. Mụ onwe m ka ọ dịkwara ikpebi itinye ha niile nʼaka onye ọbụla m họpụtara dịka o si dị m mma.
6 Et maintenant, moi j'ai donné toutes ces contrées aux mains de Nabuchodonosor, roi de Babylone, mon serviteur; je lui ai donné même les animaux des champs pour qu'ils le servent.
Ugbu a, ana m ewere alaeze unu niile nyefee ya nʼaka onye na-ejere m ozi bụ Nebukadneza eze Babilọn; aga m emekwa ka ọ bụladị ụmụ ajọ anụ ọhịa mee ihe o nyere nʼiwu.
7 Toutes les nations lui seront assujetties, à lui, à son fils et au fils de son fils, jusqu’à ce que vienne le temps de son pays, à lui aussi, et que des nations nombreuses et de grands rois l'assujettissent.
Mba niile ga-akpọ isiala nye ya; ha ga-akpọkwa isiala nye nwa ya na nwa nwa ya, tutu ruo mgbe m kpebiri na oge ha ezuola. Mgbe ahụ, aga m eme ka ọtụtụ mba na ọtụtụ ndị eze merie ya.
8 La nation et le royaume qui ne se soumettront pas à lui, Nabuchodonosor, roi de Babylone, et qui ne mettront pas leur cou sous le joug du roi de Balylonne, cette nation, je la visiterai par l'épée, par la famine et par la peste, — oracle de Yahweh, — jusqu'à ce que je l'achève par sa main.
“‘“Ma ọ bụrụkwa na mba maọbụ alaeze ọbụla ajụ ife Nebukadneza, bụ eze Babilọn, maọbụ jụ ijere ya ozi dịka ohu, aga m eji mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe, taa mba ahụ ahụhụ, tutu ruo mgbe m bibiri ya site nʼaka ya. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
9 Et vous, n'écoutez pas vos prophètes, ni vos devins, ni vos songes, ni vos augures, ni vos magiciens, qui vous disent: " Vous ne serez pas assujettis au roi de Babylone. "
Ya mere, unu aṅala ndị amụma unu, na ndị na-ajụ mmụọ ase, na ndị na-akọwara unu nrọ, na ndị mmụọ ọjọọ si nʼọnụ ha ekwu okwu, na ndị mgbaasị ntị. Unu aṅala ha ntị mgbe ha na-asị unu, ‘Unu agaghị abụ ndị ohu eze Babilọn.’
10 Car c'est le mensonge qu'ils vous prophétisent, pour qu'on vous éloigne de votre pays, pour que je vous chasse et que vous périssiez.
Nʼihi na ọ bụ naanị amụma ụgha ka ha na-eburu unu, okwu ụgha nke ga-eme ka e site nʼala unu wezuga unu, bulaa unu ala dị anya. Aga m esi nʼala unu chụsaa unu. Unu ga-alakwa nʼiyi.
11 Mais la nation qui mettra son cou sous le joug du roi de Babylone, et le servira, je la laisserai en repos dans son pays, — oracle de Yahweh; elle le cultivera et y demeurera.
Ma ọ bụrụ na mba ọbụla ekwere ịbụ ohu eze Babilọn, kwenyekwa ife ya ofufe, mba ahụ ka m ga-eme ka ọ nọgide nʼala nke aka ya. Ọ ga-akọ ala ahụ, birikwa nʼime ya. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.”’”
12 Et à Sédécias, roi de Juda, je parlai selon toutes ces paroles, en disant: Mettez vos cous sous le joug du roi de Babylone; servez-le, lui et son peuple, et vous vivrez.
Otu ozi ahụ ka m ziri Zedekaya, bụ eze Juda. Asịrị m, “Were olu gị nyefee eze Babilọn nʼaka dịka ohu, feekwa ya na ndị ya, ị ga-adịkwa ndụ.
13 Pourquoi mourriez-vous, toi et ton peuple, par l'épée, par la famine et par la peste, comme Yahweh l'a dit de la nation qui ne voudra pas servir le roi de Babylone?
Nʼihi gịnị ka gị na ndị gị ga-eji nwụọ site na mma agha, na site nʼụnwụ na ọrịa na-efe efe, dịka nke Onyenwe anyị kwurula banyere mba ọbụla nke na-agaghị efe eze Babilọn?
14 N'écoutez pas les paroles des prophètes qui vous disent: " Vous ne serez point assujettis au roi de Babylone. " Car c'est le mensonge qu'ils vous prophétisent.
Egela ntị nʼokwu ndị amụma na-agwa gị sị, ‘Unu agaghị efe eze Babilọn,’ nʼihi na ọ bụ okwu ụgha ka ha na-agwa unu.
15 Car je ne les ai point envoyés, — oracle de Yahweh, — et ils prophétisent faussement en mon nom, afin que je vous chasse et que vous périssiez, vous et les prophètes qui vous prophétisent.
‘Ọ bụghị m zitere ha,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. ‘Ha ji aha m na-ebu amụma ụgha. Nʼihi ya, aga m achụpụ unu, unu ga-alakwa nʼiyi, unu na ndị amụma ahụ na-eburu unu amụma.’”
16 Et aux prêtres et à tout ce peuple je parlerai en ces termes: Ainsi parle Yahweh: N'écoutez pas les paroles de vos prophètes qui vous prophétisent en ces termes: " Voici que les ustensiles de la maison de Yahweh seront bientôt ramenés de Babylone. " Car c'est le mensonge qu'ils vous prophétisent.
Mgbe ahụ, agwara m ndị nchụaja na ndị mmadụ niile okwu sị ha, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Unu egela ndị amụma ahụ ntị, bụ ndị na-asị unu, ‘Na mgbe na-adịghị anya a ga-ebughachi ngwongwo ahụ e si nʼụlọnsọ Onyenwe anyị bulaa Babilọn.’ Ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu.
17 Ne les écoutez pas; soumettez-vous au roi de Babylone, et vous vivrez. Pourquoi cette ville serait-elle réduite en solitude?
Unu egela ha ntị. Feenụ eze Babilọn, nʼihi na ọ bụ naanị site nʼụzọ ahụ ka unu ga-esi dịrị ndụ. Nʼihi gịnị ka unu ga-eji kwenye ka obodo a ghọọ mkpọmkpọ ebe?
18 S'ils sont prophètes, si la parole de Yahweh est avec eux, qu'ils intercèdent auprès de Yahweh des armées pour que les ustensiles qui sont restés dans la maison de Yahweh, dans celle des rois de Juda et à Jérusalem, ne s'en aillent pas à Babylone!
Ọ bụrụ nʼezie na ọ bụ okwu Onyenwe anyị si nʼọnụ ndị amụma a na-apụta, ha rịọọnụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile arịrịọ ka ọ hapụ ikwe ka e bukọrọ ngwongwo fọdụrụ nʼime ụlọnsọ nakwa ndị fọdụrụ nʼụlọeze Juda, na nʼime Jerusalem bulaa Babilọn.
19 Car ainsi parle Yahweh des armées au sujet des colonnes, de la mer, des bases et des autres ustensiles qui sont restés dans cette ville,
Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru banyere ogidi niile ndị ahụ, na Oke osimiri bronz ahụ, na ihe ndọkwasị niile, na ihe niile fọdụrụ nʼobodo a,
20 que Nabuchodonosor, roi de Babylone, n’a pas pris, lorsqu’il a emmené captifs de Jérusalem à Babylone Jéchonias, fils de Joakim, roi de Juda, et tous les grands de Juda et de Jérusalem.
nke Nebukadneza, bụ eze Babilọn na-eburughị mgbe o sitere na Juda na Jerusalem, dọkpụrụ Jehoiakin nwa Jehoiakim, bụ eze Juda, na ndị niile a na-asọpụrụ bulaa Babilọn.
21 Car ainsi parle Yahweh des armées, Dieu d’Israël, au sujet des ustensiles qui restent dans la maison de Yahweh, dans la maison du roi de Juda et à Jérusalem:
E, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ Chineke Izrel kwuru banyere ihe niile fọdụrụ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, na ndị fọdụrụ nʼụlọeze Juda na nʼime Jerusalem.
22 Ils seront emportés à Babylone, et ils y resteront jusqu’au jour où je les visiterai, — oracle de Yahweh, — et je les ferai remonter et revenir dans ce lieu.
‘A ga-eburu ha niile bulaa ha Babilọn. Ebe ahụ ka ha ga-anọkwa tutu ruo mgbe m ga-abịa leta ha,’ ka Onyenwe anyị kwubiri. ‘Mgbe ahụ, aga m ebulatakwa ha, kpọghachitekwa ha nʼebe a.’”

< Jérémie 27 >