< Ézéchiel 25 >

1 La parole de Dieu me fut adressée en ces termes:
Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
2 " Fils de l'homme, tourne ta face vers les enfants d'Ammon; et prophétise contre eux.
“Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼala ụmụ Amọn buo amụma megide ha.
3 Tu diras aux enfants d'Ammon: Ecoutez la parole du Seigneur Yahweh: Ainsi parle le Seigneur Yahweh: Puisque tu dis: Ha! Ha!, sur mon sanctuaire parce qu'il a été profané, et sur la terre d'Israël parce qu'elle a été dévastée, et sur la maison de Juda parce qu'ils sont allés en captivité,
Gwa ndị Amọn, ‘Nụrụnụ okwu nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼihi na ị sịrị “Aha!” megide ebe nsọ m mgbe e merụrụ ya na megide ala Izrel, mgbe e mere ka ọ tọgbọrọ nʼefu, na mgbe a dọtara ndị Juda nʼagha duru ha gaa mba ọzọ dịka ohu,
4 à cause de cela, voici que je vais te donner en possession aux fils de l'Orient; ils établiront chez toi leurs campements, et fixeront chez toi leurs demeures; ce sont eux qui mangeront tes fruits, eux qui boiront ton lait.
nʼihi ya, aga m ewere gị nyefee nʼaka ndị si nʼọwụwa anyanwụ pụta, ka ị bụrụ ihe nketa ha. Ha ga-ewu ebe obibi nʼetiti gị, rie mkpụrụ ubi gị, ṅụọkwa mmiri ara ehi gị.
5 Et je ferai de Rabbath un pâturage de chameaux, et du pays des enfants d'Ammon un bercail de brebis, et vous saurez que je suis Yahweh.
Aga m eme ka obodo Raba ghọọ ebe ịta nri nye ịnyịnya kamel, meekwa ka ala Amọn ghọọ ebe igwe ewu na atụrụ na-amakpu. Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
6 Car ainsi parle le Seigneur Yahweh: Parce que tu as battu des mains, et que tu as frappé du pied, et que tu t'es réjouis dans ton âme avec tout ton dédain, au sujet de la terre d'Israël,
Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Nʼihi na ị kụrụ aka gị, zọọ ụkwụ gị nʼala gidim, ma sitekwa nʼịkpọ asị nke obi gị ṅụrịa ọṅụ megide ala Izrel,
7 à cause de cela, voici que je vais étendre ma main contre toi; je te donnerai en butin aux nations, je t'exterminerai d'entre les peuples, et je te retrancherai d'entre les pays; je t'anéantirai, et tu sauras que le suis Yahweh. "
nʼihi ya, lee, aga m esetipụ aka m megide gị, were gị nyefee nʼaka ọtụtụ mba, ndị ga-alụta gị nʼagha. Aga m eme ka ị gwụsịa, mee ka ị hapụ ịdịkwa ọzọ. Aga m ala gị nʼiyi. Ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’”
8 " Ainsi parle le Seigneur Yahweh: Parce que Moab et Séir disent: " Voici que la maison de Juda est comme toutes les nations, "
“Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Nʼihi na Moab na Sia sịrị, “Lee, Juda adịrịla ka mba ndị ọzọ niile,”
9 à cause de cela, voici que je vais ouvrir le flanc de Moab, depuis les villes, depuis ses villes, depuis sa frontière, la gloire du pays, Bethjésimoth, Beelméon et Cariathain.
nʼihi nke a, aga m emeghe akụkụ Moab, site nʼobodo nke nsọtụ oke ala ya niile, bụ Bet-Jeshimọt, Baal-Meon na Kiriatem, nke bụ ebube nke ala ahụ.
10 Je vais l'ouvrir aux fils de l'Orient, aussi bien que le pays des enfants d'Ammon, et je le leur donnerai en possession, afin qu'on ne se souvienne plus des enfants d'Ammon parmi les nations.
Aga m ewere Moab na Amọn nyefee ha nʼaka ndị ga-esi nʼọwụwa anyanwụ pụta, ka ọ bụrụ nke ha. Nʼụzọ dị otu a, a gaghị agụkwa maọbụ cheta Amọn nʼetiti mba niile.
11 J'exercerai des jugements en Moab, et ils sauront que je suis Yahweh. "
Aga m ata Moab ahụhụ. Mgbe ahụ, ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’”
12 " Ainsi parle le Seigneur Yahweh: Parce qu'Edom a exercé cruellement la vengeance contre la maison de Juda, et qu'il s'est rendu grandement coupable en se vengeant d'eux,
“Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Nʼihi na Edọm bọọrọ onwe ha ọbọ megide ụlọ Juda sitekwa nʼịbọ ọbọ ha bụrụ ndị ikpe mara,
13 à cause de cela, ainsi parle le Seigneur Yahweh: J'étendrai ma main contre Edom et j'exterminerai du milieu de lui hommes et bêtes; j'en ferai un désert depuis Théman, et jusqu'à Dédan ils tomberont par l'épée.
nʼihi nke a, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Aga m esetipụ aka m megide Edọm, gbuo ndị bi nʼime ya, ma mmadụ ma anụmanụ. Aga m eme ka ọ tọgbọrọ nʼefu. Ndị niile bi nʼala ahụ site na Teman ruo na Dedan ka a ga-eji mma agha gbuo.
14 J'exercerai ma vengeance sur Edom, par la main de mon peuple d'Israël; il traitera Edom selon ma colère et ma fureur, et ils connaîtront ma vengeance, — oracle du Seigneur Yahweh. "
Ọ bụ site nʼaka ndị nke m Izrel ka m ga-esi bọọ ọbọ megide Edọm, ha ga-emeso ndị Edọm dịka ịba ụba nke iwe m na ọnụma m si dị, ha ga-amata ihe ịbọ ọbọ bụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’”
15 " Ainsi parle le Seigneur Yahweh: Parce que les Philistins ont exercé la vengeance, et qu'ils se sont cruellement vengés, avec le dédain en leur âme, pour tout exterminer dans leur haine éternelle,
“Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: ‘Nʼihi na ndị Filistia esitela na mmụọ nke ịbọ ọbọ, na mmụọ ịkpọ asị nke dị ha nʼobi bọọrọ onwe ha ọbọ, chọọ ịla ha nʼiyi.
16 à cause de cela, ainsi parle le Seigneur Yahweh: Voici que j'étendrai ma main contre les Philistins, j'exterminerai les Crétois, et je détruirai le reste qui habite sur le rivage de la mer.
Ya mere, ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, ana m aga isetipụ aka m megide ndị Filistia. Aga m ebipụ ndị Keret, bibie ndị ahụ niile bi nʼọnụ mmiri osimiri.
17 J'exercerai sur eux de grandes vengeances, les châtiant avec fureur, et ils sauront que je suis Yahweh, quand je ferai tomber sur eux ma vengeance. "
Aga m esite nʼoke ọnụma bọọ ha ọbọ site na ịta ha ahụhụ. Mgbe ahụ ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m ga-abọgwata ha ọbọ.’”

< Ézéchiel 25 >