< Lévitique 19 >

1 Yahvé parla à Moïse et dit:
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
2 Parle à toute l'assemblée des enfants d'Israël, et dis-leur: « Vous serez saints, car moi, Yahvé votre Dieu, je suis saint ».
“Gwa ọgbakọ ụmụ Izrel niile okwu sị ha: ‘Dịnụ nsọ, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, dị nsọ.
3 "'Chacun de vous respectera sa mère et son père. Vous observerez mes sabbats. Je suis Yahvé ton Dieu.
“‘Onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịsọpụrụ nne na nna ya, debekwa iwu m nyere maka ụbọchị izuike, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
4 "'Ne vous tournez pas vers les idoles et ne vous faites pas de dieux en fonte. Je suis Yahvé, votre Dieu.
“‘Unu akpọla isiala nye arụsị, unu emekwarala onwe unu chi ndị e ji ọla kpụọ. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
5 "'Lorsque tu offriras un sacrifice de paix à Yahvé, tu l'offriras pour qu'il soit agréé.
“‘Mgbe unu ga-achụrụ Onyenwe anyị aja udo, soronụ ụkpụrụ m nyere unu chụọ ya, ka m nabata ya.
6 Il sera mangé le jour même où tu l'offriras et le jour suivant. S'il reste quelque chose jusqu'au troisième jour, on le brûlera au feu.
Unu ga-eri ya nʼụbọchị ahụ unu chụrụ ya, maọbụ nʼụbọchị nke na-eso ụbọchị ahụ. Nke ọbụla fọdụrụ ruo ụbọchị nke atọ ka unu ga-esure ọkụ.
7 Si l'on en mange le troisième jour, c'est une abomination. Elle ne sera pas acceptée;
Ọ bụrụ na unu erie ya nʼụbọchị nke atọ ihe arụ ka ọ bụ. A gaghị anabata aja ọbụla unu ga-eri nʼụbọchị nke atọ.
8 mais quiconque en mangera portera la peine de sa faute, car il a profané la chose sainte de l'Éternel, et cette personne sera retranchée de son peuple.
Ikpe ga-ama onye ga-eri ya nʼụbọchị nke atọ nʼihi na o meela ka ihe nsọ Onyenwe anyị bụrụ ihe arụ. A ga-ekewapụ onye ahụ site nʼetiti ndị ya.
9 "'Quand tu feras la moisson de ton pays, tu ne moissonneras pas entièrement les coins de ton champ, et tu ne ramasseras pas les glanes de ta moisson.
“‘Mgbe unu na-ewe ihe ubi, unu ewechala ihe niile dị nʼakụkụ ubi niile, maọbụ chịkọtachaa irighiri ihe ubi niile fọdụrụ nʼala.
10 Tu ne glaneras pas ta vigne, et tu ne ramasseras pas les raisins tombés de ta vigne. Tu les laisseras aux pauvres et à l'étranger. Je suis Yahvé ton Dieu.
A ghọrọchakwala mkpụrụ vaịnị niile mịrị nʼelu vaịnị gị, maọbụ chịkọrọ mkpụrụ ndị dara nʼala. Hapụrụ ha ụmụ ogbenye na ndị ọbịa, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
11 "'Tu ne voleras pas. "'Tu ne mentiras pas. "'Vous ne vous tromperez pas les uns les autres.
“‘Unu ezula ohi. “‘Unu aghala ụgha. “‘Unu aghọgbula ibe unu.
12 "'Tu ne jureras pas faussement par mon nom et tu ne profaneras pas le nom de ton Dieu. Je suis Yahvé.
“‘Unu aṅụla iyi ụgha, si otu a weta nkọcha nye aha Onyenwe anyị Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị.
13 "'Tu n'opprimeras pas ton prochain et tu ne le dépouilleras pas. "'Le salaire d'un mercenaire ne doit pas rester chez toi toute la nuit jusqu'au matin.
“‘Unu ejila ike pụnara onye agbataobi unu ihe ya, maọbụ zuru ihe o nwere nʼohi. “‘Kwụọnụ onye ọbụla unu goro ọrụ ụgwọ ọrụ ya ọsịịsọ. Unu echela ka chi bọọ tupu unu akwụọ ya ụgwọ ya.
14 "'Tu ne maudiras pas le sourd et tu ne mettras pas de pierre d'achoppement devant l'aveugle, mais tu craindras ton Dieu. Je suis Yahvé.
“‘Akọchala onye ntị chiri, edochikwarala onye ìsì ihe nʼụzọ. Tụọ egwu Chineke. Abụ m Onyenwe anyị.
15 "'Tu ne commettras pas d'injustice dans ton jugement. Tu ne seras pas partial envers le pauvre et tu ne feras pas preuve de favoritisme envers le grand, mais tu jugeras ton prochain avec droiture.
“‘Unu ekpela ikpe na-ezighị ezi, unu elela mmadụ anya nʼihu mgbe unu na-ekpe ikpe, ma onye unu na-ekpe ikpe ọ bụ ọgaranya maọbụ ogbenye. Kama kpeenụ ikpe kwụ ọtọ.
16 "'Tu ne seras pas un calomniateur parmi ton peuple. "'Tu ne mettras pas en danger la vie de ton prochain. Je suis Yahvé.
“‘Unu ejegharịla na-agbasa okwu nkwujọ nʼetiti ndị mmadụ. “‘Emela ihe ọbụla ga-ebutere onye agbataobi gị ọnwụ. Abụ m Onyenwe anyị.
17 "'Tu ne haïras pas ton frère dans ton cœur. Tu réprimanderas ton prochain, et tu ne porteras pas de péché à cause de lui.
“‘Akpọla nwanne gị asị nʼime obi gị. Tụọ onye agbataobi gị mmehie ya nʼihu ya, ka ị ghara iketa oke nʼikpe ọmụma dịrị ya.
18 "'Tu ne te vengeras pas et tu ne garderas pas rancune aux enfants de ton peuple, mais tu aimeras ton prochain comme toi-même. Je suis Yahvé.
“‘Abọla ọbọ, ebukwala iro nʼobi megide onye ọbụla nʼetiti ndị gị. Kama hụ onye agbataobi gị nʼanya dịka i si hụ onwe gị nʼanya. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị unu.
19 "'Vous observerez mes lois. "'Tu ne feras pas de croisement entre différentes espèces d'animaux. "'Tu ne sèmeras pas ton champ avec deux sortes de semences; "'Ne portez pas un vêtement fait de deux sortes d'étoffes.
“‘Unu ga-edebe iwu m niile. “‘Unu ejila otu ụdị anụ ụlọ unu na-agba ụdị anụ ụlọ ọzọ dị iche. “‘Akụla ụdị mkpụrụ abụọ nʼubi. “‘Eyila uwe e ji ụzọ ihe abụọ, dịka ajị anụ na ogho dụọ.
20 "'Si un homme couche charnellement avec une femme qui est une esclave, promise en mariage à un autre homme, et qui n'a pas été rachetée ou libérée, ils seront punis. Ils ne seront pas mis à mort, parce qu'elle n'était pas libre.
“‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla akpọrọ nwaagbọghọ bụ ohu nwanyị nke a na-agbapụtabeghị, maọbụ nke na-enwerebeghị onwe ya, nke nwoke ọzọ chọrọ ịlụ, mee ka ha abụọ dinakọọ, a ga-ekpe ha abụọ ikpe nʼụlọikpe, ma a gaghị egbu ha, nʼihi na nwanyị ahụ abụghị onye nwe onwe ya.
21 Il apportera son sacrifice de culpabilité à Yahvé, à l'entrée de la tente d'assignation, un bélier en sacrifice de culpabilité.
Ma nwoke ahụ ga-eweta aja ikpe ọmụma nye Onyenwe anyị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ọ ga-abụkwa ebule ka ọ ga-eji chụọ aja ahụ.
22 Le prêtre fera pour lui l'expiation avec le bélier du sacrifice de culpabilité devant Yahvé, pour le péché qu'il a commis; et le péché qu'il a commis lui sera pardonné.
Onye nchụaja ga-eji ebule aja ikpe ọmụma ahụ chụọrọ nwoke ahụ aja mkpuchi mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi mmehie o mere. A ga-agbaghakwara ya mmehie ya.
23 "'Quand tu seras entré dans le pays et que tu auras planté toutes sortes d'arbres pour te nourrir, tu compteras leur fruit comme interdit. Pendant trois ans, il te sera interdit. Vous n'en mangerez pas.
“‘Mgbe unu batara nʼala ahụ kụọ mkpụrụ osisi dị iche iche, unu erila mkpụrụ osisi ahụ mịrị nʼafọ nke mbụ, ọ bụ ihe rụrụ arụ. Ruo nʼafọ nke atọ, ha bụ ihe rụrụ arụ. Unu agaghị eri ha.
24 Mais la quatrième année, tous ses fruits seront saints, pour louer l'Éternel.
Nʼafọ nke anọ, mkpụrụ nke osisi ndị ahụ niile ga-amị dị nsọ. Unu ga-eji ya nye Onyenwe anyị onyinye otuto.
25 La cinquième année, vous mangerez de ses fruits, afin qu'elle vous donne ses produits. Je suis Yahvé, ton Dieu.
Site nʼafọ nke ise, mkpụrụ ọbụla ga-abụ nke unu. Nʼụzọ dị otu a ihe ha ga-amịpụta ga-adị ukwuu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
26 "'Tu ne mangeras pas de viande dont le sang est encore présent. Tu n'utiliseras pas d'enchantements et tu ne pratiqueras pas la sorcellerie.
“‘Unu erila anụ ọbụla ọbara dị nʼime ya. “‘Unu agbala afa maọbụ jụta mmụọ ase.
27 "'Tu ne couperas pas les cheveux sur les côtés de ta tête et tu ne couperas pas le bord de ta barbe.
“‘Unu akpụchala agịrị isi dị gburugburu akụkụ isi unu, maọbụ chabie ọnụ ọnụ afụọnụ unu.
28 "'Tu ne feras pas d'incisions dans ta chair pour les morts, et tu ne te tatoueras pas de marques. Je suis Yahvé.
“‘Unu akala ihe ọbụla nʼahụ unu, nʼihi onye nwụrụ anwụ maọbụ jiri mma ọkụ dee ihe nʼahụ unu. Abụ m Onyenwe anyị.
29 "'Ne profane pas ta fille pour en faire une prostituée, de peur que le pays ne tombe dans la prostitution et que le pays ne se remplisse de méchanceté.
“‘Emerụla nwa gị nwanyị site nʼịkwagide ya ka ọ bụrụ akwụna, ka ala unu ghara ijupụta nʼịgba akwụna na ihe ọjọọ dị iche iche.
30 "'Tu observeras mes sabbats et tu révéreras mon sanctuaire; je suis Yahvé.
“‘Debenụ iwu niile m nyere maka ụbọchị izuike m. Sọpụkwaranụ ebe nsọ m. Abụ m Onyenwe anyị.
31 "'Ne vous tournez pas vers ceux qui sont médiums, ni vers les sorciers. Ne les recherchez pas pour vous souiller avec eux. Je suis Yahvé ton Dieu.
“‘Unu ejekwurula ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase maọbụ chọgaa ndị dibịa afa, nʼihi na unu ga-emerụ onwe site na ha. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
32 "'Tu te lèveras devant la tête grise et tu honoreras le visage des vieillards, et tu craindras ton Dieu. Je suis Yahvé.
“‘Bilienụ ọtọ nʼihu okenye, sọpụrụnụ ndị okenye, ma tụọnụ egwu Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị.
33 "'Si un étranger vit avec vous comme un étranger dans votre pays, vous ne lui ferez pas de mal.
“‘Mgbe onye ọbịa soro unu biri nʼala unu, unu emejọla ya.
34 L'étranger qui vit avec toi comme un étranger sera pour toi comme le natif d'entre vous, et tu l'aimeras comme toi-même, car vous avez vécu comme des étrangers au pays d'Égypte. Je suis Yahvé ton Dieu.
Mesonụ onye ọbịa bi nʼetiti unu mmeso dịka ọ bụ otu nʼime ndị amụrụ nʼala. Hụnụ ha nʼanya dịka unu si hụ onwe unu, nʼihi na o nwere oge unu bụ ọbịa nʼala Ijipt. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.
35 "'Tu ne commettras pas d'injustice dans le jugement, dans les mesures de longueur, de poids ou de quantité.
“‘Unu ejila ihe ọtụtụ aghụghọ mgbe unu na-atụ ihe dị ogologo, maọbụ ihe dị arọ, maọbụ ihe dị ukwuu,
36 Tu auras des balances justes, des poids justes, un épha juste et un hin juste. Je suis Yahvé ton Dieu, qui t'a fait sortir du pays d'Égypte.
Jirinụ ezi ihe ọtụtụ tụọ ogologo, maọbụ ihe dị arọ, maọbụ ihe dị ukwuu. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu, onye si nʼala Ijipt kpọpụta unu.
37 "'Vous observerez toutes mes lois et toutes mes ordonnances, et vous les mettrez en pratique. Je suis Yahvé. »
“‘Debenụ ụkpụrụ m niile, na iwu m niile, gbasoonụ ha. Abụ m Onyenwe anyị.’”

< Lévitique 19 >