< Matteuse 22 >

1 Jeesus rääkis neile veel tähendamissõnades ja ütles:
Jisọs gwara ha okwu ọzọ nʼilu sị,
2 „Taevariik on kui kuningas, kes korraldas oma pojale pulmapeo.
“Alaeze eluigwe dị ka otu eze, nke kwadoro oke oriri ọlụlụ di na nwunye, nʼihi nwa ya nwoke.
3 Ta läkitas oma sulased juba kutsutuid pulmapeole paluma, aga nemad keeldusid.
O zipụrụ ndị ohu ya ka ha gaa chetara ndị ahụ a kpọrọ ka ha bịa. Ma ha niile achọghị ịbịa.
4 Taas ta läkitas teisi sulaseid ja käskis kutsutuile öelda: „Ma olen pidusöögi valmistanud. Mu härjad ja nuumvasikad on tapetud ja kõik on valmis. Tulge pulma!“
“O zipụkwara ndị ohu ya ọzọ na-ejere ya ozi ka ha gaa gwa ndị ahụ a kpọrọ oriri sị, ‘E dozichaala ihe oriri ugbu a, egburu m oke ehi, na anụ ọzọ gbara abụba. Edoziela ihe niile. Bịanụ nʼoriri ọlụlụ di na nwunye.’
5 Nemad aga ei teinud sellest väljagi ja läksid, kes põllule, kes äriasju ajama.
“Ma ndị ahụ niile a kpọrọ oriri gawaara mkpa ha nʼihi na ha akpọghị ya ihe ọbụla. Otu onye gara nʼala ubi ya, nke ọzọ nʼụlọ ahịa ya.
6 Mõned aga võtsid sulased kinni, mõnitasid neid jõhkralt ja tapsid nad ära.
Ndị fọdụrụ jidere ndị ohu ya, mee ha ihe ihere ma gbukwaa ha.
7 Kuningas sai väga vihaseks. Ta saatis oma sõjaväe, hukkas need mõrtsukad ja põletas maha nende linna.
Onye eze ahụ were iwe nke ukwuu, zipụ ndị agha ya ka ha gaa laa ndị ogbu mmadụ ahụ nʼiyi, rechapụkwa obodo ha nʼọkụ.
8 Siis ta ütles oma sulastele: „Pulmapidu on ette valmistatud, aga kutsutud ei olnud väärt tulema.
“Mgbe ahụ ọ gwara ndị ohu ya sị, ‘E doziela m oriri ọlụlụ di na nwunye, ma ndị a kpọrọ oku ekwesighị ekwesi.
9 Seepärast minge tänavanurkadele ja kutsuge pulma, keda te iganes leiate!“
Ugbu a, gaanụ nʼakụkụ ụzọ niile, kpọbatanụ ndị niile unu hụrụ, ka ha bịa nʼoriri ọlụlụ di na nwunye a.’
10 Ja sulased läksid välja teedele ja tõid kokku kõik, keda leidsid, nii häid kui halbu, ning pulmasaal sai täis külalisi.
Ndị ohu ahụ pụrụ gaa nʼokporoụzọ niile kpọbata mmadụ niile ha hụrụ. Ha kpọbatara ndị bụ ezi mmadụ na ndị bụ ajọ mmadụ. Ụlọ oriri ahụ jupụtakwara na ndị a kpọrọ.
11 Aga kui kuningas astus sisse külalisi vaatama, märkas ta meest, kellel ei olnud pulmariideid seljas.
“Ma mgbe eze ahụ batara ileta ndị niile nọ na nri, ọ hụrụ otu nwoke nke na-eyighị uwe ọlụlụ nwunye.
12 „Sõber, “ütles ta temale, „kuidas sina oled tulnud siia ilma pulmariieteta?“See aga ei suutnud midagi vastata.
Ọ jụrụ ya ajụjụ sị, ‘Enyi m, i si aṅaa bata nʼebe a mgbe ị na-eyighị uwe ọlụlụ di na nwunye?’ O mechiri ọnụ ya nʼihi na o nweghị ihe ọ ga-asa.
13 Siis kuningas ütles oma teenritele: „Siduge kinni tema jalad ja käed ning visake ta välja pimedusse, kus on ulgumine ja hammaste kiristamine!“
“Eze ahụ nyere ndị ozi ya iwu sị ha, ‘Keenụ ya eriri, aka na ụkwụ, tụpụkwanụ ya nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.’
14 Sest paljud on kutsutud, aga vähesed valitud.“
“Nʼihi na akpọrọ ọtụtụ mmadụ oku, maọbụ mmadụ ole na ole ka a họọrọ.”
15 Siis variserid läksid ja pidasid nõu, kuidas Jeesus tema sõnadest lõksu püüda.
Mgbe ahụ ndị Farisii zukọtara na-achọ ụzọ ha ga-esi mee ka o kwuhie ọnụ ka ha site na ya jide ya.
16 Nad läkitasid ta juurde oma jüngreid koos heroodeslastega. „Õpetaja, “ütlesid nad, „me teame, et sina oled aus ja otsekohene ning õpetad Jumala teed tões ega lase end mõjutada kellestki, sest sa ei tee inimestel vahet.
Ha zigara ndị na-eso ụzọ ha na ndị nʼotu Herọd ka ha jụọ ya sị, “Onye ozizi, anyị maara nke ọma na ị bụ onye eziokwu, na ị na-ezikwa ụzọ Chineke nʼeziokwu. Ị dịghị asọkwa onye ọbụla anya, nʼihi na ị dịghị ele mmadụ anya nʼihu nʼagbanyeghị ndị ha bụ.
17 Seepärast ütle meile oma arvamus. Kas on õige maksta keisrile maksu või mitte?“
Ugbu a gwa anyị, gịnị bụ uche gị? O ziri ezi nʼiwu ịtụ ụtụ nye Siza, ka ọ bụ na o zighị ezi?”
18 Kuid Jeesus, teades nende alatust, ütles: „Miks te mind kiusate, silmakirjatsejad?
Ebe Jisọs maara ihe ọjọọ ha bu nʼobi, ọ zara sị ha, “Ndị ihu abụọ! Gịnị mere unu ji anwa m ọnwụnwa?
19 Näidake mulle maksumünti!“Nad tõid talle teenari,
Gosinụ m ego e ji akwụ ụgwọ ụtụ.” Ha wetaara ya otu mkpụrụ ego.
20 ja ta küsis neilt: „Kelle pilt ja nimi sellel on?“
Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Onye ka e sekwasịrị onyinyo ya nʼelu ego a? Aha onye kwa dị nʼokpuru onyinyo a?”
21 „Keisri, “vastasid nad. Siis Jeesus ütles neile: „Andke siis keisrile, mis kuulub keisrile, ja Jumalale, mis kuulub Jumalale!“
Ha zara sị ya, “Ọ bụ nke Siza.” Mgbe ahụ ọ gwara ha sị, “Ọ dị mma. Nyenụ Siza ihe ruuru Siza, ma nyekwanụ Chineke ihe niile bụ nke ruuru Chineke.”
22 Seda kuuldes nad hämmastusid, jätsid ta rahule ja lahkusid.
Mgbe ha nụrụ nke a, ọ gbagwojuru ha anya, nʼihi ya, ha hapụrụ ya pụọ.
23 Samal päeval tulid Jeesuse juurde saduserid, kes eitavad surnuist ülestõusmist, ja küsisid temalt:
Nʼụbọchị ahụ kwa, ụfọdụ ndị Sadusii, ndị na-asị na mbilite nʼọnwụ adịghị, bịakwutere ya ịghụ ya ọnụ.
24 „Õpetaja, Mooses on meile öelnud, et kui mees sureb lapsi saamata, siis peab tema vend abielluma lesega ja talle järglasi kasvatama.
Onye ozizi, “Mosis kwuru sị, ọ bụrụ na nwoke ọbụla anwụọ na-amụtaghị nwa, nwanne ya nwoke ga-alụrụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ, ka ọ mụtara nwanne ya nwoke ahụ nwụrụ anwụ nwa.
25 Meie hulgas oli seitse venda. Esimene võttis naise ja suri. Kuna tal ei olnud järglasi, jättis ta naise oma vennale.
Ugbu a, e nwere ụmụnne nwoke asaa nʼetiti anyị. Onye nke mbụ lụrụ nwunye, nwụọ, ma ebe ọ dịghị ụmụ ọ mụtara, ọ hapụrụ nwanne ya nwunye ya.
26 Samuti juhtus teise ja kolmandaga, kuni kõik seitse venda olid surnud.
Otu a ka nke abụọ mekwara, ma nke atọ, ruo na nke asaa.
27 Kõige viimasena suri naine.
Nʼikpeazụ, nwanyị ahụ nʼonwe ya nwụkwara.
28 Kui nüüd tuleb ülestõusmine, kelle naine neist seitsmest ta siis on? Ta on ju olnud abielus nende kõikidega.“
Ugbu a, nʼoge mbilite nʼọnwụ, nwunye onye ka nwanyị a ga-abụ, ebe ọ bụ na ụmụnne nwoke asaa ndị a lụtụchara ya mgbe ọ nọ nʼụwa?”
29 Jeesus vastas neile: „Te eksite, kuna ei tunne Pühakirja ega Jumala väge.
Jisọs zara ha sị, “Unu na-ejehie ụzọ nʼihi na unu aghọtaghị ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu. Unu aghọtakwaghị ụdị ike Chineke nwere.
30 Ülestõusmises ei võeta naisi ega minda mehele, vaid ollakse nagu inglid taevas.
Nʼihi na mbilite nʼọnwụ, ịlụ di na nwunye agaghị adịkwa, kama ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi nʼeluigwe.
31 Aga mis puutub surnute ülestõusmisse – kas te ei ole lugenud, mida Jumal teile on rääkinud:
Ma nʼihe banyere mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ọ bụ na unu agụtabeghị ihe Chineke gwara unu sị,
32 „Mina olen Aabrahami Jumal ja Iisaki Jumal ja Jaakobi Jumal!“Jumal ei ole surnute, vaid elavate Jumal.“
Mụ onwe m bụ Chineke nke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb. Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama ọ bụ nke ndị dị ndụ.”
33 Seda kuuldes rahvas hämmastus tema õpetusest.
Mgbe igwe mmadụ ahụ nụrụ nke a, ozizi ya juru ha anya.
34 Kui variserid kuulsid, et Jeesus oli sulgenud saduseridel suu, kogunesid nad sinna
Ma mgbe ndị Farisii nụrụ na ọ emeela ka ndị Sadusii mechie ọnụ ha, ha gbakọtara otu ebe.
35 ning üks kirjatundja nende seast küsis Jeesuselt teda proovile pannes:
Otu onye nʼime ha, bụ onye ozizi iwu bịara jụọ ya ajụjụ iji nwaa ya:
36 „Õpetaja, milline käsk Seaduses on suurim?“
“Onye ozizi, olee iwu nke kachasị mkpa nʼime iwu niile?”
37 Jeesus vastas: „ „Armasta Issandat, oma Jumalat, kogu oma südamest, kogu oma hingest ja kogu oma mõistusest!“
Ọ zara sị ya, “‘Hụ Onyenwe gị bụ Chineke gị nʼanya site nʼobi gị niile na site na mkpụrụobi gị niile, na site nʼuche gị niile.’
38 See on suurim ja ülim käsk.
Nke a bụ iwu nke mbụ, bụrụkwa iwu kachasị iwu niile.
39 Ja teine on selle sarnane: „Armasta oma ligimest nagu iseennast!“
Iwu ọzọ na-eso nke a nʼịdị mkpa bụ nke a, ‘Hụ onye agbataobi gị nʼanya dị ka i si hụ onwe gị nʼanya.’
40 Neis kahes käsus on koos kogu Seadus ja Prohvetid.“
Iwu ndị ọzọ niile na ihe niile ndị amụma kwuru dabeere nʼebe iwu abụọ ndị a nọ.”
41 Pöördudes kokku tulnud variseride poole, küsis Jeesus neilt:
Mgbe ndị Farisii gbakọrọ nʼotu ebe, Jisọs jụrụ ha,
42 „Mida te arvate Messia kohta: kelle poeg ta on?“„Taaveti poeg, “vastasid nad.
“Gịnị ka unu na-eche banyere Kraịst? Nwa onye ka ọ bụ?” Ha zara sị ya, “Ọ bụ nwa Devid.”
43 „Miks siis Taavet nimetab teda Pühas Vaimus rääkides Issandaks?“küsis Jeesus. „Ta ütleb ju:
Ọ sịrị ha, “Gịnị mekwaranụ Devid site na ntụziaka nke Mmụọ Nsọ jiri kpọọ ya ‘Onyenwe m’? Nʼihi na ọ sịrị,
44 „Issand ütles minu Issandale: „Istu mu paremale käele, kuni ma panen sinu vaenlased su jalge alla.““
“‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m sị ya, “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-edebe ndị iro gị nʼokpuru ụkwụ gị abụọ.”’
45 Kui nüüd Taavet hüüab teda Issandaks, kuidas ta siis on tema poeg?“
Ọ bụrụ na Devid kpọrọ ya ‘Onyenwe anyị,’ oleekwanụ otu o si bụrụkwa nwa ya?”
46 Ja ükski ei suutnud Jeesusele vastata sõnagi ning keegi ei söandanud sellest päevast alates temalt midagi rohkem küsida.
Ọ dịghị onye pụrụ ịsa ya okwu. Sitekwa nʼụbọchị ahụ, ọ dịghị onye ọbụla nwere anya ike ịjụ ya ajụjụ ọzọ.

< Matteuse 22 >