< Numbers 32 >

1 And much cattle hath been to the sons of Reuben and to the sons of Gad, very many; and they see the land of Jazer, and the land of Gilead, and lo, the place [is] a place [for] cattle;
Mgbe ndị Izrel rutere ala Jeza na Gilead, ndị ebo Ruben na Gad ndị nwere ọtụtụ igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ chọpụtara na ala ahụ dị mma nke ukwuu maka ịzụ anụ ụlọ.
2 and the sons of Gad, and the sons of Reuben, come in and speak unto Moses, and unto Eleazar the priest, and unto the princes of the company, saying:
Ya mere, ha bịakwutere Mosis na Elieza onye nchụaja, na ndị ndu nzukọ Izrel, sị ha,
3 'Ataroth, and Dibon, and Jazer, and Nimrah, and Heshbon, and Elealeh, and Shebam, and Nebo, and Beon —
“Ala ndị a: Atarọt, Dibọn, Jeza, Nimra, Heshbọn, Eleale, Sebam, Nebo, na Beon,
4 the land which Jehovah hath smitten before the company of Israel, is a land for cattle, and thy servants have cattle.'
bụ ala nke Onyenwe anyị meriri nʼagha nʼihu nzukọ Izrel, dị mma maka ịzụ anụ ụlọ. Anyị onwe anyị kwa nwere igwe ewu na atụrụ.
5 And they say, 'If we have found grace in thine eyes, let this land be given to thy servants for a possession; cause us not to pass over the Jordan.'
Ọ bụrụ na anyị achọtala amara nʼihu unu, biko, kwerenụ ka akụkụ ala a bụrụ ihe nketa nke anyị bụ ohu unu. Unu emekwala ka anyị soro ndị Izrel gafee nʼakụkụ nke ọzọ nke osimiri Jọdan.”
6 And Moses saith to the sons of Gad and to the sons of Reuben, 'Do your brethren go in to the battle, and ye — do ye sit here?
Mosis jụrụ ndị Gad na Ruben ajụjụ sị, “Unu na-ekwu na unu chọrọ ịnọ nʼebe a mgbe ụmụnna unu ndị ikom niile ga-agafe osimiri Jọdan ịlụ agha niile ahụ dị na-eche ha?
7 and why discourage ye the heart of the sons of Israel from passing over unto the land which Jehovah hath given to them?
Ọ bụ nʼihi gịnị ka unu ji eme ka ndị Izrel daa mba ghara ịgafe banye nʼala ahụ Onyenwe anyị nyerela ha?
8 'Thus did your fathers in my sending them from Kadesh-Barnea to see the land;
Otu a ka nna unu ha mere mgbe m si Kadesh Banea zipụ ha inyocha ala ahụ.
9 and they go up unto the valley of Eshcol, and see the land, and discourage the heart of the sons of Israel so as not to go in unto the land which Jehovah hath given to them;
Mgbe ha letasịrị ala ahụ si na Ndagwurugwu Eshkọl lọghachi, ha mere ka obi ndị Izrel niile daa mba ịbanye nʼala ahụ Onyenwe anyị nyere ha.
10 and the anger of Jehovah burneth in that day, and He sweareth, saying,
Nʼihi nke a Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide ha nʼụbọchị ahụ. Ọ ṅụrụ iyi kwuo sị,
11 They do not see — the men who are coming up out of Egypt from a son of twenty years and upward — the ground which I have sworn to Abraham, to Isaac, and to Jacob, for they have not been fully after Me;
‘Nʼihi na unu jụrụ iji obi unu niile gbasoo m, o nweghị onye ọbụla nʼime ndị ahụ o si nʼala Ijipt kpọpụta, ndị gbara iri afọ abụọ rigoo, ga-ahụ ala ahụ m kwere Ebraham na Aịzik na Jekọb nkwa inye ha.’
12 save Caleb son of Jephunneh the Kenezite, and Joshua son of Nun, for they have been fully after Jehovah;
Naanị ndị ọṅụṅụ iyi a na-emegideghị bụ Kaleb, nwa Jefune onye Keniz, na Joshua nwa Nun, nʼihi na ha jiri obi ha niile sogide Onyenwe anyị.
13 and the anger of Jehovah burneth against Israel, and He causeth them to wander in the wilderness forty years, until the consumption of all the generation which is doing the evil thing in the eyes of Jehovah.
Iwe Onyenwe anyị dịịrị ọkụ megide Izrel, o mere ka ha wagharịa nʼọzara iri afọ anọ, tutu ruo mgbe ọgbọ ahụ niile nke mere ihe ọjọọ nʼanya ya nwụchara.
14 'And lo, ye have risen in the stead of your fathers, an increase of men — sinners, to add yet to the fury of the anger of Jehovah toward Israel;
“Ma lee unu ugbu a, agbụrụ ndị mmehie, ọ bụkwa otu ihe ahụ ka unu na-eme! Unu na-achọ ime ka iwe dị ukwuu wee Onyenwe anyị megide ndị Izrel.
15 when ye turn back from after Him, then He hath added yet to leave him in the wilderness, and ye have done corruptly to all this people.'
Ọ bụrụ na unu ajụ iso Onyenwe anyị ugbu a, Onyenwe anyị ga-emekwa ka ndị Izrel nọgide nʼọzara. Mbibi na ịla nʼiyi nke ga-abịakwasị ha ga-abụkwa nke unu ji aka unu kpatara ha.”
16 And they come nigh unto him, and say, 'Folds for the flock we build for our cattle here, and cities for our infants;
Ma ha zara sị ya, “Ọ gaghị adị otu a! Anyị ga-ewuru anụ ụlọ anyị ụlọ, tinye igwe ewu na atụrụ anyị nʼime ha. Anyị ga-ewukwara ndị nwunye anyị na ụmụntakịrị anyị obodo ebe ha ga-anọ.
17 and we — we are armed hasting before the sons of Israel till that we have brought them in unto their place; and our infants have dwelt in the cities of defence because of the inhabitants of the land;
Ma anyị onwe anyị ga-eburu ngwa agha anyị, buru ndị Izrel niile ọzọ ụzọ gaa nʼihu ịlụ ọgụ, tutu anyị edubata ha nʼala nke ha ga-eketa. Ma ndị nwunye anyị na ụmụntakịrị anyị ga-anọ nʼobodo e wusiri ike, ikpuchite ezinaụlọ anyị niile site nʼaka ndị iro bi anyị gburugburu.
18 we do not turn back unto our houses till the sons of Israel have inherited each his inheritance,
Anyị agaghị alọta nʼụlọ anyị tutu onye Izrel ọbụla enweta ihe nketa nke ya.
19 for we do not inherit with them beyond the Jordan and yonder, for our inheritance hath come unto us beyond the Jordan at the [sun] -rising.'
Anyị achọghị ihe nketa, nʼofe Jọdan nke ọzọ, nʼihi na anyị ewerela oke nke anyị nʼebe a, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan.”
20 And Moses saith unto them, 'If ye do this thing: if ye are armed before Jehovah for battle,
Mgbe ahụ, Mosis zara sị ha, “Ọ dị mma, ọ bụrụ na unu ga-eme dịka unu kwuru, jikere onwe unu, nʼihu Onyenwe anyị, ibu agha.
21 and every armed one of you hath passed over the Jordan before Jehovah, till his dispossessing His enemies from before Him,
Ọ bụrụ na ndị agha unu ga-eso gafee nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, soro ndị ọzọ buo agha tutu ruo mgbe Onyenwe anyị chụpụchara ndị iro ya niile,
22 and the land hath been subdued before Jehovah — then afterwards ye do turn back, and have been acquitted by Jehovah, and by Israel; and this land hath been to you for a possession before Jehovah.
mgbe ahụ, e merichaa mba ndị ahụ niile nʼihu Onyenwe anyị, unu nwere ike ịlọghachi nʼebe a, bụrụ ndị ikpe na-amaghị nʼebe Onyenwe anyị na ndị Izrel nọ. Ala a dị nʼọwụwa anyanwụ, ga-abụ ihe nketa unu nwere site nʼaka Onyenwe anyị.
23 'And if ye do not so, lo, ye have sinned against Jehovah, and know ye your sin, that it doth find you;
“Ọ bụrụkwanụ na unu ajụ ime dịka unu kwuru, mgbe ahụ, ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-emehie megide. Matakwanụ na unu ga-emesịa nata ụgwọ ọrụ mmehie unu.
24 build for yourselves cities for your infants, and folds for your flock, and that which is going out from your mouth do ye.'
Wuonụ obodo ebe ndị inyom na ụmụ unu ga-ebi, wuokwanụ ụlọ anụ maka igwe ewu na atụrụ unu, ma mezuokwanụ ihe niile unu kweere na nkwa.”
25 And the sons of Gad and the sons of Reuben speak unto Moses, saying, 'Thy servants do as my lord is commanding;
Ndị ebo Gad na Ruben sịrị Mosis, “Anyị bụ ndị ohu gị ga-eme dịka onyenwe anyị nyere nʼiwu.
26 our infants, our wives, our cattle, and all our beasts, are there in cities of Gilead,
Ụmụ anyị niile, na ndị inyom anyị niile, na igwe ewu na atụrụ anyị, na ehi anyị niile, ga-anọ nʼebe a, nʼobodo ndị a anyị wuru nʼala Gilead.
27 and thy servants pass over, every armed one of the host, before Jehovah, to battle, as my lord is saying.'
Ma anyị, ndị ohu gị, ndị niile tozuru ije agha, ga-agafe osimiri Jọdan ibu agha nʼihu Onyenwe anyị, dịka onyenwe anyị si kwuo.”
28 And Moses commandeth concerning them Eleazar the priest, and Joshua son of Nun, and the heads of the fathers of the tribes of the sons of Israel;
Mgbe ahụ, Mosis nyere Elieza, bụ onye nchụaja, na Joshua nwa Nun, na ndịisi ezinaụlọ nke ebo Izrel niile iwu banyere ha,
29 and Moses saith unto them, 'If the sons of Gad and the sons of Reuben pass over with you the Jordan, every one armed for battle, before Jehovah, and the land hath been subdued before you, then ye have given to them the land of Gilead for a possession;
Ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na ndị ebo Gad na Ruben, onye ọbụla nke jikere ịga agha, ga-eso unu gafee Jọdan nʼihu Onyenwe anyị, mgbe ahụ, oge unu lụgburu ndị ala ahụ niile, unu aghaghị inye ha ala Gilead dịka ihe nketa ha.
30 and if they do not pass over armed with you, then they have possessions in your midst in the land of Canaan.'
Ma ọ bụrụ na ha ajụ iso unu, ha ga-eso ndị ọzọ keta oke nʼala Kenan.”
31 And the sons of Gad and the sons of Reuben answer, saying, 'That which Jehovah hath spoken unto thy servants — so we do;
Ndị ebo Gad na Ruben zara sị, “Ihe ọbụla Onyenwe anyị nyere nʼiwu ka anyị ga-eme.
32 we — we pass over armed before Jehovah [to] the land of Canaan, and with us [is] the possession of our inheritance beyond the Jordan.'
Anyị ga-ejikere soro Onyenwe anyị jee agha nʼala Kenan. Ma ihe nketa anyị ga-adị nʼebe a, nʼakụkụ Jọdan.”
33 And Moses giveth to them, to the sons of Gad, and to the sons of Reuben, and to the half of the tribe of Manasseh son of Joseph, the kingdom of Sihon king of the Amorite, and the kingdom of Og king of Bashan, the land by its cities, in the borders, the cities of the land round about.
Mosis nyere ndị ebo Gad, na Ruben, na ọkara Manase nwa Josef, alaeze niile Saịhọn eze Amọrị nakwa alaeze niile nke Ọg, eze ndị Bashan na-achị. O nyere ha ala ahụ niile, na obodo niile dị nʼala ahụ gburugburu.
34 And the sons of Gad build Dihon, and Ataroth, and Aroer,
Ndị ebo Gad wugharịrị ma wusiekwa obodo ndị a, Dibọn, Atarọt, Aroea
35 and Atroth, Shophan, and Jaazer, and Jogbehah,
Atrọt-Shofan, Jeza, Jogbeha,
36 and Beth-Nimrah, and Beth-Haran, cities of defence, and sheepfolds.
Bet-Nimra na Bet-Haran bụ obodo e wusiri ike, wukwaara igwe ewu na atụrụ ha ụlọ anụ nʼime ya.
37 And the sons of Reuben have build Heshbon, and Elealeh, and Kirjathaim,
Ma ndị ebo Ruben wugharịrị obodo ndị a: obodo Heshbọn, Eleale, Kiriatem,
38 and Nebo, and Baal-Meon (changed in name), and Shibmah, and they call by [these] names the names of the cities which they have built.
Nebo na Baal-Meon (ma a gbanwere aha ha) na Sibma. Ha gbanwere aha obodo niile ndị ahụ ha wugharịrị, gụọ ha aha ọhụrụ.
39 And sons of Machir son of Manasseh go to Gilead, and capture it, and dispossess the Amorite, who [is] in it;
Ndị agbụrụ Makia, nwa Manase gara nʼobodo Gilead lụgbuo ya, chụpụ ndị Amọrait bi nʼebe ahụ.
40 and Moses giveth Gilead to Machir son of Manasseh, and he dwelleth in it.
Ya mere, Mosis were obodo Gilead nye Makia, ụmụ Manase ka ha biri nʼebe ahụ.
41 And Jair son of Manasseh hath gone and captureth their towns, and calleth them 'Towns of Jair;'
Jia, onye sikwa nʼebo Manase gara buso ọtụtụ obodo nta ndị ọzọ agha, lụgbuo ha. Ọ gbanwere aha obodo nta ndị a, gụọ ha Havọt Jaịa.
42 and Nobah hath gone and captureth Kenath, and its villages, and calleth it Nobah, by his own name.
Nʼoge a kwa, otu nwoke a na-akpọ Nọba duuru ndị agha gaa nʼobodo Kenat, na nʼobodo nta ndị ọzọ gbara ya gburugburu, lụgbuo ha, bichie nʼime ha. Ọ gbanwere aha obodo ndị ahụ niile bido ịkpọ ha Nọba, nke bụ aha ya onwe ya.

< Numbers 32 >